Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Jikerela Maka Ụbọchị Jehova?

Ì Jikerela Maka Ụbọchị Jehova?

Ì Jikerela Maka Ụbọchị Jehova?

“Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” —ZEFANAỊA 1:14.

1-3. (a) Olee ihe Bible kwuru banyere ụbọchị Jehova? (b) Olee “ụbọchị Jehova” nke chere anyị ihu ugbu a?

OKÉ ụbọchị Jehova abụghị ụbọchị iri awa abụọ na anọ. Ọ bụ oge dị ogologo bụ́ mgbe a ga-emezu ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi ndị ajọ omume. E nwere ezi ihe mere ndị na-adịghị atụ egwu Chineke ga-eji tụọ ụbọchị ọchịchịrị ahụ, ụbọchị nrubiga ókè nke iwe, ụbọchị iwe dị ọkụ, ụbọchị ahụhụ, na ụbọchị ntọgbọrọ n’efu ahụ ụjọ. (Aịsaịa 13:9; Emọs 5:18-20; Zefanaịa 1:15) Amụma Joel kwuru, sị: “Ewo, ụbọchị ahụ! n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso, dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ ga-abịa.” (Joel 1:15) Otú ọ dị, n’oké ụbọchị ahụ, Chineke ga-abụ Onye Nzọpụta nke “ndị obi ha ziri ezi.”—Abụ Ọma 7:10.

2 Okwu ahụ bụ́ “ụbọchị Jehova” pụtara oge dị iche iche Chineke ji mezuo ihe o kpere n’ikpe. Dị ka ihe atụ, otu “ụbọchị Jehova” bịakwasịrị ndị bi na Jeruselem mgbe ndị Babilọn bibiri obodo ahụ n’afọ 607 T.O.A. (Zefanaịa 1:4-7) E nwekwara ụbọchị yiri nke ahụ Chineke ji mezuo ihe o kpere n’ikpe n’afọ 70 O.A. bụ́ mgbe Chineke ji ndị Rom mezuo ihe o kpere n’ikpe n’isi mba ndị Juu jụrụ Ọkpara ya. (Daniel 9:24-27; Jọn 19:15) Bible bukwara amụma banyere “ụbọchị Jehova” bụ́ mgbe ọ ‘ga-ebuso mba nile agha.’ (Zekaraịa 14:1-3) N’ike mmụọ nsọ, Pọl onyeozi jikọtara ụbọchị ahụ na ọnụnọ Kraịst, bụ́ nke malitere mgbe e chiri Jizọs Eze n’eluigwe n’afọ 1914. (2 Ndị Tesalonaịka 2:1, 2) Ka ụbọchị Jehova na-eru nso, isiokwu dịịrị afọ nke Ndịàmà Jehova maka afọ 2007 dabara nnọọ adaba. Isiokwu ahụ sitere na Zefanaịa 1:14 bụ: “Oké ụbọchị Jehova dị nso.”

3 Ebe ọ bụ na oké ụbọchị Chineke dị nso, ugbu a bụ oge i kwesịrị iji gosi na ị dị njikere. Olee otú ị pụrụ isi jikere maka ụbọchị ahụ? Ọ̀ dị ihe ndị ọzọ ọ dị gị mkpa ime iji jikere maka ụbọchị Jehova?

Gosipụta na Ị Dị Njikere

4. Olee nnukwu ule Jizọs jikeere ịgabiga?

4 Mgbe Jizọs Kraịst na-ebu amụma banyere ọgwụgwụ nke ajọ ụwa dị ugbu a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere.” (Matiu 24:44) Mgbe Jizọs kwuru okwu ahụ, ya onwe ya ejikerela maka otu nnukwu ule—ọnwụ ọ ga-anwụ iji gbapụta ụmụ mmadụ. (Matiu 20:28) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta site n’otú Jizọs si jikere?

5, 6. (a) Olee otú ịhụ Chineke na ndị mmadụ n’anya si enyere anyị aka ijikere maka ụbọchị Jehova? (b) A bịa n’ịhụ ndị agbata obi n’anya, olee ihe nlereanya Jizọs hapụụrụ anyị?

5 Jizọs ji obi ya nile hụ Jehova na ụkpụrụ ezi omume Ya n’anya. Ndị Hibru 1:9 kwuru banyere Jizọs, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị. Ọ bụ ya mere Chineke, bụ́ Chineke gị, ji were mmanụ aṅụrị tee gị karịa ndị ibe gị.” N’ihi otú Jizọs si hụ Nna ya nke eluigwe n’anya, ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke n’anya otú ahụ ma na-eme ihe ọ na-achọ, Ọ ga-echebe anyị. (Abụ Ọma 31:23) Ụdị ịhụnanya na nrubeisi ahụ ga-enyere anyị aka ijikere maka oké ụbọchị Jehova.

6 Jizọs hụkwara nnọọ ndị mmadụ n’anya. N’ezie, “o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) N’ihi ya, Jizọs ziri ndị ahụ ozi ọma, otú ahụ ịhụnanya si akpali anyị izi ndị agbata obi anyị ozi Alaeze ahụ. Ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya na-eme ka anyị na-ejechi ozi anya dị ka Ndị Kraịst ma si otú ahụ na-eme ka anyị dị njikere maka oké ụbọchị Jehova.—Matiu 22:37-39.

7. Ka anyị na-eche ụbọchị Jehova, olee ihe mere anyị nwere ike iji nwee ọṅụ?

7 Ime uche Jehova tọrọ Jizọs ụtọ. (Abụ Ọma 40:8) Ọ bụrụ na ọ dị anyị otú ahụ, ijere Chineke ozi dị nsọ ga na-enye anyị ọṅụ. Dị ka Jizọs, anyị ga na-emesapụ aka, nke ahụ ga-emekwa ka anyị nwee ezi obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Ee, “ọṅụ Jehova bụ ike” anyị. Ọṅụ dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ịdịkwu njikere maka oké ụbọchị Chineke.—Nehemaịa 8:10.

8. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji bịarukwuo Jehova nso n’ekpere?

8 Otu n’ime ihe ndị nyeere Jizọs aka ijikere maka ule dị iche iche e lere okwukwe ya bụ na ọ na-eji obi ya nile ekpegara Chineke ekpere. Ọ nọ na-ekpe ekpere mgbe Jọn mere ya baptizim. Tupu Jizọs ahọrọ ndị ga-abụ ndịozi ya, o ji otu abalị dum kpee ekpere. (Luk 6:12-16) Oleekwa onye na-agụ Bible nke ekpere Jizọs kpere n’abalị ikpeazụ ọ nọrọ n’ụwa na-agaghị emetụ n’ahụ́? (Mak 14:32-42; Jọn 17:1-26) Ì ji ekpere kpọrọ ihe, dị ka Jizọs? Na-ekpegara Jehova ekpere ugboro ugboro, ekpela ekpere gị ọsọ ọsọ, na-achọ nduzi nke mmụọ nsọ, na-adịkwa ngwa ịgbaso nduzi ahụ mgbe ị hụrụ ya. Ugbu a oké ụbọchị Chineke ji ọsọ na-abịa, ọ dị anyị mkpa ime ka mmekọrịta anyị na Nna anyị nke eluigwe sie ike. N’ihi ya, mee ike gị nile iji nọgide na-abịarukwu Jehova nso n’ekpere.—Jems 4:8.

9. Olee otú ichegbu onwe anyị banyere ido aha Jehova nsọ dịruru ná mkpa?

9 Ihe ọzọ nyeere Jizọs aka ijikere maka ule ndị ọ gabigara bụ na o chegburu onwe ya banyere ido aha nsọ Jehova nsọ. N’ezie, ọ kụziiri ụmụazụ ya na ekpere ha na-ekpegara Chineke kwesịrị ịgụnye arịrịọ bụ́: “Ka e doo aha Gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ọ bụrụ na ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ ka e doro aha Jehova nsọ, anyị ga-agbalịsi ike izere ime ihe ọ bụla nke ga-ewetara aha ya nkọcha. N’ihi ya, anyị ga-adịkwu njikere maka oké ụbọchị Jehova.

Ọ̀ Dị Ebe Ndị I Kwesịrị Ịgbanwe Ihe?

10. Olee ihe mere o ji kwesị ekwesị ka anyị nyochaa ndụ anyị?

10 Ọ bụrụ na ụbọchị Jehova abịa echi, ì ji n’aka na ị ga-adị njikere maka ya? Ọ dị mma ka onye ọ bụla n’ime anyị nyochaa ndụ ya iji hụ ma ọ̀ dị àgwà na echiche ndị ọ dị ya mkpa ịgbanwe. N’ihi otú ndụ ụmụ mmadụ na-adị ugbu a si dị mkpụmkpụ ma bụrụ nke a na-ejighị n’aka, ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ịmụrụ anya n’ihe banyere ofufe ọ na-efe Chineke kwa ụbọchị. (Eklisiastis 9:11, 12; Jems 4:13-15) N’ihi ya, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ o nwere ike ịdị mkpa ka anyị lebara anya ná ndụ anyị.

11. Olee ihe mgbaru ọsọ i setịpụụrụ onwe gị n’ihe banyere ọgụgụ Bible?

11 Otu ihe dị mkpa ga-enyere anyị aka bụ ndụmọdụ ahụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi” na-enye anyị ịgụ Bible kwa ụbọchị. (Matiu 24:45) I nwere ike ime ya ihe mgbaru ọsọ gị ịgụ ma tụgharịa uche n’Akwụkwọ Nsọ site na Jenesis ruo Mkpughe otu ugboro kwa afọ. Ọ bụrụ na ị gụọ ihe dị ka isi anọ kwa ụbọchị, i nwere ike ịgụcha otu puku isiakwụkwọ, otu narị na iri asatọ na itoolu dị na Bible n’otu afọ. Eze nke ọ bụla chịrị Izrel ga-agụ Iwu Jehova “ụbọchị nile nke ndụ ya.” O doro anya na Jọshụa mere ihe yiri nke ahụ. (Deuterọnọmi 17:14-20; Joshua 1:7, 8) Ọ dị nnọọ mkpa na ndị ọzụzụ atụrụ ọgbakọ ga na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, n’ihi na nke a ga-enyere ha aka izi “ozizi na-enye ezi ndụ”!—Taịtọs 2:1.

12. Olee ihe ịdị nso nke ụbọchị Jehova kwesịrị ịkpali gị ime?

12 Otú ụbọchị Jehova si dị nso kwesịrị ịkpali gị ịgachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya na ikerechi òkè anya na ya dị ka o kwere gị mee. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ime otú ahụ ga-enyere gị aka imeziwanye nkà gị dị ka onye nkwusa Alaeze nke na-agba mbọ ịchọta ndị nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi na inyere ha aka. (Ọrụ 13:48) Ma eleghị anya, ọ dịkwa ụzọ ndị ọzọ ị pụrụ isi rụsikwuo ọrụ ike n’ọgbakọ, dị ka site n’inyere ndị agadi aka na ịgba ndị na-eto eto ume. Lee ka mgbalị ndị a nwere ike isi nye gị afọ ojuju!

Mmekọrịta Gị na Ndị Ọzọ

13. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị nwere ike ịjụ onwe anyị banyere iyikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ?

13 Ebe ọ bụ na ụbọchị Jehova dị nso, ọ̀ dị gị mkpa itinyekwu mgbalị iji ‘yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe’? (Ndị Efesọs 4:20-24) Ka ị na-azụlite àgwà ndị yiri nke Chineke, o yikarịrị ka ndị ọzọ hà ga-ahụ na ị ‘na-eje ije site na mmụọ Chineke’ ma na-egosipụta mkpụrụ ya. (Ndị Galeshia 5:16, 22-25) Ì nwere ike ikwu ihe ụfọdụ a hụrụ anya ndị gị na ezinụlọ gị na-eme bụ́ ndị na-egosi na unu eyikwasịla ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ? (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Dị ka ihe atụ, è ji imeso ndị kwere ekwe ibe gị na ndị ọzọ omume obiọma mara gị? (Ndị Galeshia 6:10) Ịmụchi Akwụkwọ Nsọ anya ga-eme ka ị zụlite àgwà ndị yiri nke Chineke bụ́ ndị ga-enyere gị aka ijikere maka ụbọchị Jehova.

14. Olee ihe mere mmadụ kwesịrị iji na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ ka ọ na-arụ ọrụ ịzụlite njide onwe onye?

14 Gịnị ma ọ bụrụ na ị na-ewe iwe ọkụ ma chọpụta na ọ dị gị mkpa inwekwu njide onwe onye? Àgwà ahụ so ná mkpụrụ ndị mmụọ nsọ Chineke nwere ike ịmịpụta n’ime gị. N’ihi ya, kpee ekpere maka mmụọ nsọ, n’ikwekọ n’okwu ndị a Jizọs kwuru: “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu. . . . Ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:9-13.

15. Olee ihe e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na gị na onye kwere ekwe ibe gị adịghị ná mma?

15 Ka e were ya na gị na otu onye kwere ekwe ibe gị adịghị ná mma. Ya bụrụ na ọ dị otú ahụ, mee ike gị nile ịhụ na unu kpeziri, si otú ahụ na-atụnye ụtụ n’udo na ịdị n’otu nke ọgbakọ. (Abụ Ọma 133:1-3) Tinye ndụmọdụ Jizọs ndị e dekọrọ na Matiu 5:23, 24 ma ọ bụ Matiu 18:15-17 n’ọrụ. Ọ bụrụ na ị na-ekwebu ka anyanwụ daa ka ị nọ n’ọnọdụ mkpasu iwe, mee ihe ngwa ngwa ịgbanwe àgwà ahụ. Mgbe mgbe, nanị ihe dị mkpa bụ gị ịdị njikere ịgbaghara onye mejọrọ gị. Pọl dere, sị: “Bụrụnụ ndị na-emere ibe unu ebere, na-enwe obi ọmịiko, na-agbaghara ibe unu kpam kpam dị nnọọ ka Chineke gbaghakwaara unu kpam kpam site na Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:25, 26, 32.

16. Olee ebe ndị ọmịiko dị mkpa n’alụmdi na nwunye?

16 Mmekọrịta di na nwunye na-achọ obi ọmịiko nakwa mgbe ụfọdụ, mgbaghara. Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ịhụkwu di ma ọ bụ nwunye gị n’anya na inwekwu obi ọmịiko n’ahụ́ ya, gbaa mbọ imezu nke ahụ site n’enyemaka nke Chineke na Okwu ya. Ọ̀ dị ihe ọ dị mkpa ka i mee iji gbasoo ndụmọdụ dị ná 1 Ndị Kọrint 7:1-5 iji belata nsogbu na iji zere ekwesịghị ntụkwasị obi? N’ezie, nke a bụ otu ebe ọ dị mkpa ka di ma ọ bụ nwunye “na-enwe obi ọmịiko.”

17. Olee ihe mmadụ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o mere mmehie dị oké njọ?

17 Gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị mmehie dị oké njọ i mere? Mee ihe ngwa ngwa iji dozie ọnọdụ ahụ. Chọọ nnọọ enyemaka ndị okenye ọgbakọ. Ekpere ha na ndụmọdụ ha ga-enye aka mee ka gị na Chineke dịghachi ná mma. (Jems 5:13-16) Chegharịa ma kpegara Jehova ekpere. Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, obi gị ga na-ama gị ikpe, akọnuche gị ga na-enyekwa gị nsogbu. Ụdị ihe ahụ mere Devid, ma lee otú obi si ruo ya ala mgbe ọ gwara Jehova mmehie ya! Devid dere, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye e bupụworo njehie ya, onye e kpuchiworo mmehie ya. Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ mmadụ nke Jehova na-adịghị agụrụ ya ajọ omume, bụ́ onye ọ dịghị aghụghọ ọ bụla dị na mmụọ ya.” (Abụ Ọma 32:1-5) Jehova na-agbaghara ndị mere mmehie ma chegharịa site n’ala ala obi ha.—Abụ Ọma 103:8-14; Ilu 28:13.

Ya Adịla Mgbe Ị Ga-abụ Akụkụ nke Ụwa

18. Olee otú i kwesịrị isi na-ele ụwa anya?

18 O doro anya na ị na-atụ anya ịbanye n’ụwa ọhụrụ ahụ magburu onwe ya Nna anyị nke eluigwe kwere ná nkwa. Ya bụrụ otú ahụ, olee otú i si ele ụwa ndị ajọ omume nke na-adịghị agbaso ụkpụrụ Chineke anya? Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa,” enweghị ike n’ebe Jizọs Kraịst nọ. (Jọn 12:31; 14:30) O doro anya na ị chọghị ka Ekwensu na ụwa ya nwee ike n’ebe ị nọ, n’ihi ya, chebara okwu Jọn onyeozi kwuru echiche, nke bụ́: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya.” Nke ahụ bụ ihe amamihe dị na ya ime, n’ihi na “ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:15-17.

19. Olee ụdị ihe mgbaru ọsọ a gbara ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst ume isetịpụrụ onwe ha?

19 Ị̀ na-enyere ụmụ gị aka “idebe onwe [ha] n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị”? (Jems 1:27) Setan ga-achọ ịnwụde ụmụ gị otú mmadụ na-esi anwụde azụ. Nzube e ji hiwe klọb dị iche iche na òtù ndị ọzọ nke ụmụ mmadụ bụ ime ka ndị na-eto eto mewe ihe otú ụwa Setan si eme. Ma ndị na-ejere Jehova ozi adịla mbụ nọrọ na nzukọ nanị ya ga-alanahụ ọgwụgwụ nke ajọ ụwa dị ugbu a. N’ihi ya, e kwesịrị ịgba ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst ume ka ha na-enwe “ọtụtụ ihe . . . ime n’ọrụ Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Ọ dị ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke mkpa inyere ụmụ ha aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ga-eme ka ha bie ndụ obi ụtọ na afọ ojuju nke na-ewetara Chineke nsọpụrụ ma na-enyere ha aka ijikere maka ụbọchị Jehova.

Na-eche Banyere Ihe Ndị Ga-eme Mgbe Oké Ụbọchị Jehova Gasịrị

20. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji buru ndụ ebighị ebi n’uche?

20 Ọ bụrụ na i buru ndụ ebighị ebi n’uche, obi ga-enwe ike iru gị ala ka ị na-eche ụbọchị Jehova. (Jud 20, 21) Ị na-atụ anya inweta ndụ ebighị ebi na Paradaịs, n’ihi ya kwa, i nwere olileanya nke inweghachi ume okorobịa na inwe oge na-agaghị agwụ agwụ iji ruo ezi ihe mgbaru ọsọ ndị i setịpụụrụ onwe gị na iji mụtakwuo ihe banyere Jehova. I nwedịrị ike ịnọgide na-amụta ihe banyere Chineke ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na ihe ụmụ mmadụ maara ugbu a bụ nanị “nsọtụ ụzọ ya nile.” (Job 26:14) Lee olileanya magburu onwe ya nke ahụ bụ!

21, 22. Olee ihe ndị i nwere ike ịmụta n’aka ndị e si n’ọnwụ kpọlite, oleekwa ihe ndị i nwere ike ịkụziri ha?

21 Na Paradaịs, ndị e si n’ọnwụ kpọlite ga-enwe ike ịkọrọ anyị ihe ndị mere n’oge ochie bụ́ ndị anyị na-amaghị. Ịnọk ga-anọ ebe ahụ ịkọrọ anyị otú o si nweta obi ike ikwusara ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ozi Jehova. (Jud 14, 15) Noa ga-akọrọ anyị nnọọ otú o si wuo ụgbọ ahụ. Ebreham na Sera ga-enwe ike ịkọrọ anyị otú obi dị ha mgbe ha hapụrụ ntụsara ahụ́ ha nwere n’obodo Ọọ ma gaa biwe n’ụlọikwuu. Chee banyere Esta ka ọ na-akọwa otú o si gbachitere ndị ya ma mebie nkata Heman kpara megide ha. (Esta 7:1-6) Cheedị banyere Jona ka ọ na-akọ ihe mere n’ụbọchị atọ ahụ ọ nọrọ n’ime afọ nnukwu azụ ahụ ma ọ bụ ka Jọn Onye Na-eme Baptizim na-akọwa otú obi dị ya mgbe o mere Jizọs baptizim. (Luk 3:21, 22; 7:28) E nwere nnọọ ọtụtụ ihe ndị na-adọrọ mmasị anyị ga-amụta!

22 N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, i nwere ike inwe ihe ùgwù nke inyere ndị e si n’ọnwụ kpọlite aka inweta “ihe ọmụma Chineke.” (Ilu 2:1-6) Lee ka o si eme anyị obi ụtọ ịhụ ka ndị mmadụ na-amụta ihe banyere Jehova Chineke ma na-etinye ihe ndị ha na-amụta n’ọrụ! Ma chee ọṅụ ị ga-enwe n’ọdịnihu mgbe Jehova ga-agọzi mgbalị ị na-eme ịkụziri ndị oge ochie ihe na ịhụ ka ha ji obi ụtọ na-etinye ihe ndị ha na-amụta n’ọrụ!

23. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

23 Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị agaghị agụtali uru anyị na-erite n’ihi ịbụ ndị Jehova ma ọ bụ tụlie ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. (Abụ Ọma 40:5) Ihe kasị enye anyị obi ụtọ bụ ihe ndị Chineke nyere anyị iji nyere anyị aka ịnọgide na-efe ya. (Aịsaịa 48:17, 18) N’agbanyeghị ọnọdụ anyị nọ na ya, ka anyị jiri obi anyị nile na-eje ozi dị nsọ ka anyị na-echere oké ụbọchị Jehova.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị bụ “ụbọchị Jehova”?

• Olee otú i nwere ike isi gosi na i jikerela maka ụbọchị Jehova?

• Ugbu a oké ụbọchị Chineke dịrịla ezi nso, olee mgbanwe ndị o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee?

• Olee ihe ndị ị na-atụ anya ha mgbe ụbọchị Jehova gasịrị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 12]

Jizọs gosiri na ọ dị njikere maka ule

[Foto dị na peeji nke 15]

Lee ihe ùgwù ọ ga-abụ inyere ndị e si n’ọnwụ kpọlite aka inweta ihe ọmụma Jehova!