Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Arịrịọ A Na-arịọ n’Ụwa Dum

Arịrịọ A Na-arịọ n’Ụwa Dum

Arịrịọ A Na-arịọ n’Ụwa Dum

CHEGODỊ echiche banyere ọtụtụ nde mmadụ, ọbụna ọtụtụ ijeri mmadụ, ndị na-arịọ otu ihe. Ha na-arịọ onye nwere ikike kachasịnụ n’eluigwe na ụwa ka o meere ha ihe ha na-arịọ. Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha maara ihe ha na-arịọ. Ihe a ọ̀ bụ eziokwu? N’ezie, ọ na-eme kwa ụbọchị. Olee ihe mmadụ niile a na-arịọ? Ha na-arịọ ka Alaeze Chineke bịa!

Dị ka otu ngụkọ e mere si kwuo, ihe dị ka iri puku okpukpe atọ na puku asaa na-asị na ha bụ Ndị Kraịst. Ha na-asị na Jizọs Kraịst bụ Onye ndú ha. Ndị nọ n’okpukpe ndị ahụ karịrị ijeri mmadụ abụọ. Ọtụtụ n’ime ha na-ekpe ekpere a na-akpọ ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị. Ị̀ ma ekpere a? Dị ka Jizọs si kụziere ya ụmụazụ ya, e si otú a amalite ya: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:9, 10.

Kemgbe ọtụtụ narị afọ ugbu a, ndị na-aga ụka na-ekpe ekpere a ugboro ugboro n’ụlọ ụka ha. Ha bu ekpere a n’isi. Ha na ezinụlọ ha na-ekpe ya, ha na-ekpekwa ya naanị ha, ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe na-adịghị mma. Ha na-eji obi ha dum ekpe ekpere a, ha na-ekpesikwa ya ike. Ọtụtụ ndị ọzọ bu ya n’isi ma na-ekpe ya n’echeghị echiche ihe ọ pụtara. Ọ bụghị naanị ndị ụka nwere olileanya na Alaeze Chineke na-abịa, ọ bụghịkwa naanị ha na-ekpe ekpere ka ọ bịa.

Arịrịọ nke Okpukpe Ndị Ọzọ Na-arịọ

Ndị okpukpe ndị Juu nwere ekpere a ma nke ọma ha na-ekpe ma ha na-eru uju. Ọ bụ ezie na ekpere a anaghị ekwu banyere ọnwụ na iru uju, ha na-ekpekarị ya mgbe mmadụ nwụnahụrụ ha. Ha na-arịọ n’ekpere ahụ, sị: ‘Ka Chineke weta Alaeze ya mgbe ị nọ ndụ . . . ya weta ya ngwa ngwa.’ * Ekpere ọzọ a na-ekpe n’ụlọ nzukọ ndị Juu n’oge ochie na-ekwu banyere Alaeze Mesaya ha na-atụ anya ya, bụ́ onye ga-esi n’ụlọ Devid bịa.

Okwu metụtara Alaeze Chineke na-amasịkwa ndị ọzọ na-abụghị Ndị Kraịst. Otu onye a ma ama bụ́ onye ndú okpukpe n’India n’oge ochie, bụ́ onye nwere mmasị ime ka ndị Hindu, ndị Alakụba na Ndị Kraịst dị n’otu, kwuru n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times of India, sị: “Alaeze Chineke nke bụ́ ezigbo ya agaghị abịa ọ gwụla ma ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ na ndị bi n’ebe ọdịda anyanwụ hà malitere ịdị n’otu.” N’oge na-adịbeghị anya, otu onyeisi ụlọ akwụkwọ Alakụba nke dị na Strathfield, Australia, degaara otu ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ akwụkwọ ozi, sị: “Dị ka ndị Alakụba niile kweere, mụ onwe m kweere na Jizọs ga-abịaghachi weta Alaeze Chineke nke bụ́ ezigbo ya.”

O doro anya na ọtụtụ ijeri mmadụ na-atụ anya Alaeze Chineke ugbu a. Ma, chegodị echiche banyere ihe a.

Ma eleghị anya ị maara na anyị bụ́ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ebipụta magazin a, na-aga n’ụlọ n’ụlọ n’obodo unu na-akọrọ ndị mmadụ ihe dị na Baịbụl. Mgbe a na-ede magazin a, anyị ji ihe karịrị narị asụsụ anọ na-arụ ọrụ a n’ụwa dum, na narị ala abụọ na iri atọ na isii. Isiokwu ozi ọma anyị na-ekwusa bụ Alaeze Chineke. N’ezie, ị ga-ahụ na aha magazin a bụ Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova. Anyị na-ajụkarị ndị mmadụ ma hà na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa. Ọtụtụ ndị na-asị na ha na-ekpe ka ọ bịa. Ma, mgbe anyị jụrụ ha ihe Alaeze ahụ bụ, ọtụtụ ndị na-asị na ha amaghị. Mgbe ụfọdụ, ihe ha na-aza anaghị edocha anya.

Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa ọ bụ ezie na ha enweghị ike ịkọwa ihe ọ bụ? Ọ̀ bụ maka na Alaeze Chineke bụ ihe dị mgbagwoju anya, raakwa ahụ́ nkọwa? Ee e. A kọwachara ihe Alaeze ahụ bụ nke ọma na Baịbụl. Ihe ọzọ dị mkpa bụ na ihe Baịbụl na-akụzi banyere Alaeze ahụ nwere ike ime ka i nwee ezigbo olileanya n’oge a jọgburu onwe ya. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ahụ otú Baịbụl si kọwaa olileanya ahụ. Nke ahụ gachaa, anyị ga-ahụ mgbe a ga-aza ekpere ahụ Jizọs kụziri, ya bụ, ka Alaeze ahụ bịa.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Otú ahụ a na-ekpe n’ekpere ahụ Jizọs kụziri, ya bụ, ka e doo aha Chineke nsọ, ọ bụkwa otú ahụ ka a na-ekpe n’ekpere ahụ ndị okpukpe ndị Juu na-ekpe ma ha na-eru uju. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-arụ ụka ma ekpere ahụ ndị okpukpe ndị Juu na-ekpe ọ̀ malitere n’oge Kraịst nọ n’ụwa ma ọ̀ bụ tupu ya abịa n’ụwa, o kwesịghị iju anyị anya na ekpere abụọ ahụ yitewere. Mgbe Jizọs kụziiri ha ekpere ahụ, ihe o bu n’obi abụghị ịkụzi ihe ha na-anụtụbeghị ma ọ bụ ịgbanwe ihe ha ma. Ihe niile o kwuru n’ekpere ahụ hiwechara isi n’Akwụkwọ Nsọ ndị Juu niile nwere n’oge ahụ. Ihe Jizọs gbara ndị Juu ibe ya ume ka ha na-eme bụ ikpe ekpere maka ihe ndị ha kwesịrị ịdị na-ekpe n’ekpere.