Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?

Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?

Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?

“ONYENWE ANYỊ, ị̀ na-eweghachiri Izrel alaeze ahụ n’oge a?” (Ọrụ 1:6) Ọ gụsiri ndịozi Jizọs agụụ ike ịmata mgbe Jizọs ga-eweta Alaeze ya. Taa, mgbe ihe dị ka puku afọ abụọ gaferela, ọ ka na-agụsi ndị mmadụ agụụ ike ka a zaa ajụjụ bụ́: Olee mgbe Alaeze Chineke ga-abịa?

Ebe ọ bụ na ihe Jizọs ji mere isiokwu ya mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma bụ Alaeze Chineke, ọ ga-abụ na ọ zara ajụjụ ahụ. N’ezie, ọ zara ya! O kwuru okwu ọtụtụ ugboro banyere oge pụrụ iche nke ọ kpọrọ oge “ọnụnọ” ya. (Matiu 24:37) Oge ọnụnọ ya ahụ na mgbe Alaeze Mesaya ga-amalite ịchị ga-abụ otu mgbe. Gịnị ka ọnụnọ ya a pụtara? Ka anyị tụlee ihe anọ dị oké mkpa Baịbụl kwuru banyere ọnụnọ Kraịst.

1. Ọnụnọ Kraịst ga-amalite ma ogologo oge gafechaa mgbe ọ nwụrụ. N’otu ihe atụ Jizọs mere, o ji onwe ya tụnyere otu nwoke nke “jere n’ala dị anya ka ọ gaa nweta ike ọchịchị ma lọta.” (Luk 19:12) Olee otú amụma a yiri ihe atụ si mezuo? Jizọs nwụrụ e wee kpọlite ya n’ọnwụ. O wee gaa “n’ala dị anya,” ya bụ, eluigwe. Dị ka Jizọs buru n’amụma n’ihe atụ yiri nke ahụ, mgbe ọ ga-alọta wee malite ịchị ga-abụ “mgbe ogologo oge gasịrị.”—Matiu 25:19.

Afọ ole na ole mgbe Jizọs rịgochara eluigwe, Pọl onyeozi dere, sị: “Nwoke a [ya bụ, Jizọs] chụrụ otu àjà maka mmehie ruo mgbe niile wee nọdụ ala n’aka nri Chineke, malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ọ nọ na-echere ruo mgbe a ga-edebe ndị iro ya ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.” (Ndị Hibru 10:12, 13) Ya mere, mgbe Jizọs ruru n’eluigwe, o cheere ruo ogologo oge. Oge ahụ zuru mgbe Jehova bụ́ Chineke mere Ọkpara ya Eze Alaeze Mesaya bụ́ Alaeze e kwere nkwa ya kemgbe. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọnụnọ Kraịst malitere. Ndị mmadụ nọ n’ụwa hà ga-ahụ ihe a pụrụ iche mgbe ọ na-eme?

2. Ndị mmadụ agaghị eji anya nkịtị hụ ọnụnọ ya. Cheta na Jizọs kwuru banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya. (Matiu 24:3) Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ ga-eji anya nkịtị hụ ọnụnọ ya, ihe ịrịba ama ọ̀ ga-adị mkpa? Ka e were ya na ị na-aga ịhụ oké osimiri. I nwere ike ịhụ ihe e dere ede ga-egosi gị ụzọ e si aga ebe ahụ, ma ozugbo i rutere n’ikpere oké osimiri ahụ wee guzoro hụ ka ebe niile bụ mmiri mmiri, ị̀ ka ga-atụ anya ka ị hụ nnukwute bọọdụ e dere ihe nke sịrị: “Ihe a bụ Oké Osimiri”? Mbanụ! Ọ̀ bara uru idere gị ihe ga-egosi gị ihe i ji anya gị abụọ na-ahụ?

Ihe mere Jizọs ji kwuo ihe ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya abụghị iji gosi ndị mmadụ ihe ha nwere ike iji anya ha hụ, kama ọ bụ iji nyere ha aka ịghọta ihe ga-eme n’eluigwe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Alaeze Chineke agaghị abịa n’ụzọ pụtara oké ìhè.” (Luk 17:20) Oleezi otú ihe ịrịba ama ahụ ga-esi gosi ndị nọ n’ụwa na ọnụnọ Kraịst amalitela?

3. Ihe a ga-eji amata ọnụnọ Jizọs ga-abụ oké nsogbu ga-adị n’ụwa a. Jizọs kwuru na ihe a ga-eji amata oge ọnụnọ ya, mgbe ọ ga-abụ Eze n’eluigwe, ga-abụ agha, ụnwụ, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, na mmebi iwu. Ihe ndị a ga-ejupụta n’ụwa. (Matiu 24:7-12; Luk 21:10, 11) Gịnị ga-akpata nsogbu a niile? Baịbụl kwuru na iwe ji Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa a,” maka na ọ maara na ugbu a Kraịst ghọrọ Eze, ọnụnọ Jizọs amalitekwa, oge ya fọdụrụ nnọọ ntakịrị. (Jọn 12:31; Mkpughe 12:9, 12) N’oge anyị a, e nwere ọtụtụ ihe a na-ahụ anya ndị na-egosi na iwe ji Setan nakwa na ọnụnọ Kraịst amalitela. Ihe àmà ndị a juru ebe niile n’ụwa karịchaa kemgbe 1914, bụ́ afọ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme kwetara na ọ bụ mgbe ihe gbanwere n’ụwa.

Ihe a niile nwere ike ịdị ka akụkọ ọjọọ, ma, ọ bụghị akụkọ ọjọọ. Ihe ọ pụtara bụ na Alaeze Mesaya ahụ na-achị achị ugbu a n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọchịchị ahụ ga-amalite ịchị ụwa. Ma, olee otú ndị mmadụ ga-esi mara banyere Alaeze ahụ ka ha wee nabata ya ma ghọọ ndị ọ na-achị?

4. Ihe a ga-eji mata ọnụnọ Jizọs bụ ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile. Jizọs kwuru na oge ọnụnọ ya ga-adị ka “ụbọchị Noa.” * (Matiu 24:37-39) Ọ bụghị naanị ụgbọ ka Noa wuru; ọ bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Noa dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị na Chineke na-aga ikpe ụwa ikpe. Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga na-arụ ọrụ yiri nke ahụ n’oge ọnụnọ ya. O buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.

Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị niile dị n’ụwa a. Ọrụ ikwusa ozi ọma na-eme ka ndị mmadụ mara na ọchịchị eluigwe a ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya, na-emekwa ka mmadụ niile nwee ohere ịlanahụ mbibi na-abịa nakwa ịghọ ndị Alaeze ahụ na-achị. Ajụjụ dị mkpa bụ, Ị̀ ga-ege ntị?

Alaeze Chineke Ọ̀ Ga-abụrụ Gị Ozi Ọma?

Ozi Jizọs zisara mere ka ndị mmadụ nwee olileanya na-enweghị atụ. Mgbe ụmụ mmadụ nupụchara isi n’Iden n’ọtụtụ puku afọ gara aga, Jehova bụ́ Chineke zubere ihiwe ọchịchị nke ga-eme ka ihe dị mma. Ọchịchị ahụ ga-emekwa ka ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi malite ibi ụdị ndụ Chineke buuru ha n’obi ná mmalite, ya bụ, ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa a. Ò nwere ihe na-enye obi ụtọ karịa ịmara na ọchịchị a e kwere ná nkwa kemgbe na-achị achị ugbu a n’eluigwe? Nke a abụghị akụkọ ifo, kama ọ bụ ihe na-eme eme ugbu a!

Eze ahụ Chineke họpụtara na-achị ugbu a n’etiti ndị iro ya. (Abụ Ọma 110:2) N’ụwa a rụrụ arụ nke ya na Chineke na-adịghị ná mma, Mesaya ahụ na-eme ihe Nna ya chọrọ, ya bụ, ọ na-achọ ndị niile chọrọ ịmara onye Chineke bụ n’ezie, bụ́ ndị chọrọ ife ya ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ndị si n’agbụrụ niile, ma nwata ma okenye, ma onye ukwu ma onye nta, nwere ike inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi ma Alaeze Chineke chịwa. (Ọrụ 10:34, 35) Anyị na-agba gị ume ka ị ghara ikwe ka ohere a magburu onwe ya kwaa gị. Mụta banyere Alaeze Chineke ugbu a, ka i wee soro ná ndị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ọchịchị ezi omume a chịwa!—1 Jọn 2:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ihe Jizọs kwuru na-eme ka anyị ghara inwe echiche na-ezighị ezi ụfọdụ nsụgharị Baịbụl nyere bụ́ ndị na-asụgharịtaghị okwu ahụ bụ́ “ọnụnọ.” Ụfọdụ nsụgharị sụgharịrị ya “ọbịbịa,” ma ọ bụ “nlọghachi,” bụ́ nke na-egosi na ihe niile a agaghị ewe oge. Ma, cheta na Jizọs ejighị ọnụnọ ya tụnyere Iju Mmiri ụbọchị Noa, bụ́ nke na-eweghị oge ọ bụla, kama o ji ya tụnyere “ụbọchị Noa,” ya bụ, oge pụrụ iche. Ọnụnọ Kraịst ga-adị ka oge Noa n’ihi na ọ bụ mgbe ndị mmadụ ga-eji obi ha niile na-achụ ihe nke ụwa nke ga-eme ka ha leghara ịdọ aka ná ntị a na-adọ ha anya.

[Foto ndị dị na peeji nke 8 na 9]

Akụkọ ọjọọ ndị anyị na-anụ kwa ụbọchị na-egosi na ihe ọma ga-abịa n’oge na-adịghị anya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Égbè e ji agbatu ụgbọelu: foto Ndị Agha U.S.