Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee mgbe ndị na-agụ kpakpando gara leta Jizọs?

A gwara anyị n’Oziọma Matiu na “ndị na-agụ kpakpando, bụ́ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ,” ji onyinye dị iche iche gaa leta Jizọs. (Matiu 2:1-12) E kwughị mmadụ ole na-agụ kpakpando gara leta nwata ahụ bụ́ Jizọs, o nweghịkwa ezigbo ihe na-egosi na ha dị mmadụ atọ dị ka ọtụtụ ndị kweere; Baịbụl ekwughịkwa aha ha.

Akwụkwọ bụ́ New International Version Study Bible kwuru banyere Matiu 2:11, sị: “Ndị ahụ na-agụ kpakpando eletaghị Jizọs mgbe e nyiwere ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri n’abalị ahụ a mụrụ ya bụ́ mgbe ndị na-azụ atụrụ gara leta ya, dị ka ọtụtụ ndị kweere. Ha gara leta ‘nwata’ ahụ ‘n’ụlọ’ ha mgbe ọnwa ole na ole gachara.” Ihe na-egosi na nke a bụ eziokwu bụ na mgbe Herọd chọrọ igbu nwatakịrị ahụ, o nyere iwu ka e gbuo ụmụntakịrị nwoke niile, malite ná ndị dị afọ abụọ gbadawa, bụ́ ndị nọ na Betlehem dum na ógbè ya niile. Ọ matara ndị ọ ga-egbu site n’ịgbakọ “oge ahụ ọ jụtara nke ọma n’ọnụ ndị ahụ na-agụ kpakpando.”—Matiu 2:16.

A sị na ndị ahụ na-agụ kpakpando gara leta Jizọs n’abalị ahụ a mụrụ ya ma nye ya ọlaedo na onyinye ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa, ọ bụghị naanị ụmụ nnụnụ abụọ ka Meri gaara enye mgbe abalị iri anọ ọ mụrụ nwa gachara, bụ́ mgbe o kutere Jizọs n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (Luk 2:22-24) Nke ahụ bụ ihe Iwu ahụ kwuru ka ndị ogbenye weta, bụ́ ndị na-agaghị enwe ike iweta nwa ebule. (Levitikọs 12:6-8) Ikekwe, ndị ahụ na-agụ kpakpando wetara onyinye ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa n’oge kwesịrị ekwesị, mgbe ọ baara ezinụlọ Jizọs uru maka mmefu niile ha mere n’Ijipt.—Matiu 2:13-15.

Gịnị mere irute n’ebe e liri Lazarọs ji wee Jizọs abalị anọ?

Azịza ya bụ na Jizọs kpachaara anya mee ya otú ahụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Leba anya n’akụkọ ahụ e dere na Jọn isi nke iri na otu.

Mgbe enyi Jizọs bụ́ Lazarọs, bụ́ onye bi na Betani, malitere rịasiwe ọrịa ike, ụmụnne ya ndị nwaanyị ziri Jizọs ozi. (Amaokwu nke mbụ ruo nke atọ) N’oge ahụ, ọ ga-ewe Jizọs ihe dị ka abalị abụọ isi n’ebe ọ nọ rute Betani. (Jọn 10:40) Ma eleghị anya, Lazarọs nwụrụ ihe dị ka mgbe ahụ ozi ahụ ruru Jizọs ntị. Gịnị ka Jizọs mere? Ọ “nọrọ ụbọchị abụọ n’ebe ahụ ọ nọ,” wee mechaa gawa Betani. (Amaokwu nke isii na nke asaa) Ya mere, ebe ọ bụ na o cheere abalị abụọ, jiri abalị abụọ mee njem, o rutere n’ili ahụ abalị anọ Lazarọs nwụchara.—Amaokwu nke iri na asaa.

Tupu oge ahụ, Jizọs akpọlitela mmadụ abụọ n’ọnwụ. Ọ kpọlitere otu onye ozugbo onye ahụ nwụrụ, ma eleghị anya, kpọlite onye nke ọzọ n’otu ụbọchị ahụ ọ nwụrụ, mgbe oge gafetụrụ. (Luk 7:11-17; 8:49-55) Ọ̀ ga-enwe ike ịkpọlite onye nwụrụ kemgbe abalị anọ, mgbe ozu onye ahụ maliterela ire ure? (Amaokwu nke iri atọ na itoolu) Otu akwụkwọ nke na-akọwa Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị Juu kweere na e nweghị olileanya na “mmadụ nwụrụ nọọ abalị anọ ga-adị ndụ ọzọ; ahụ́ ya amalitela ire ure mgbe ahụ, mkpụrụ obi ya nke e chere na ọ na-erugharị n’elu ahụ́ ya ruo abalị atọ ahapụla ya.”

Ọ bụrụ na o nwere ndị nwere obi abụọ n’ime ndị ahụ zukọtara n’ili ahụ, ha na-aga ịhụ na ike Jizọs ga-emeri ọnwụ. Jizọs guzo n’ihu ili ahụ e meghere emeghe tie mkpu, sị: “Lazarọs, pụta! Nwoke ahụ nwụrụ anwụ wee . . . pụta.” (Amaokwu nke iri anọ na atọ na iri anọ na anọ) Ọ bụ mbilite n’ọnwụ bụ ezi olileanya ndị nwụrụ anwụ nwere, ọ bụghị echiche ụgha ahụ ndị mmadụ nwere nke bụ́ na mkpụrụ obi na-adịrị ndụ gawa mgbe mmadụ nwụrụ.—Ezikiel 18:4; Jọn 11:25.