Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Jehova Buru n’Amụma Na-emezu

Ihe Jehova Buru n’Amụma Na-emezu

Ihe Jehova Buru n’Amụma Na-emezu

“ABỤ m Chineke, ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ, ọ dịghịkwa onye dị ka m; Onye na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, onye na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.” (Aịzaya 46:9, 10) Nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ onye na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu, ya emezuo.

O doro anya na ọtụtụ ihe ụmụ mmadụ na-ekwu na ha ga-eme n’ọdịnihu adịghị emezu. Ebe ọ bụ na Baịbụl bụ akwụkwọ amụma, nke a kwesịrị ime ka ndị niile na-achọ eziokwu leba ya anya iji mata ma ọ̀ bụ Chineke chepụtara ya n’eziokwu. Ka anyị tụlee amụma ụfọdụ e buru na Baịbụl ndị mezurula emezu.

Mba Ndị Dịrị n’Oge Ochie

Chineke buru amụma na a ga-ebibi Babịlọn, Idọm, Moab, na Amọn ka ha gharakwa ịdị ruo mgbe ebighị ebi. (Jeremaya 48:42; 49:17, 18; 51:24-26; Obedaya 8, 18; Zefanaya 2:8, 9) Ihe na-egosi na Okwu amụma Chineke bụ eziokwu bụ na mba ndị a n’otu n’otu adịkwaghị taa.

Otú ọ dị, mmadụ nwere ike ịsị na onye ọ bụla nwere ike ikwu na a ga-emecha bibie mba siri ike n’agbanyeghị otú o siruru ike. Ma, onye kwuru otú ahụ leghaara eziokwu dị mkpa anya nke bụ́ na Baịbụl kwukwara otú a ga-esi bibie mba ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, o kwuru otú a ga-esi bibie Babịlọn. Baịbụl kwuru na ọ bụ ndị Midia ga-emeri ya, na ọ bụ Saịrọs ga-abụ onye ndú ndị agha ahụ, nakwa na a ga-eme ka osimiri nke na-echebe obodo ahụ taa.—Aịzaya 13:17-19; 44:27–45:1.

Ọ bụghị mba niile ma ọ bụ ndị niile e meriri n’agha ka Baịbụl kwuru na ha agakwaghị adị ruo mgbe ebighị ebi. Iji gosi na nke a bụ eziokwu, mgbe Chineke buru amụma na ndị Babịlọn ga-ebibi Jeruselem, o kwuru na ndị Juu ga-emecha lọghachi n’obodo ha, n’agbanyeghị na ndị Babịlọn anaghị ahapụ ndị ha ji eji ka ha laa. (Jeremaya 24:4-7; 29:10; 30:18, 19) Nke a mezuru, a ka nwekwara mba bụ́ mba ndị Juu ruo taa.

Jehova bukwara amụma na a ga-ebibi Ijipt ka ọ ghara ịbụkwa mba na-achị ụwa. Ma, o kwukwara na “e mesịa, a ga-ebirighachi n’Ijipt dị ka ọ dị n’oge ochie.” Mba a nke na-achị ụwa “ga-aghọ alaeze dị ala” ma e mechaa. (Jeremaya 46:25, 26; Ezikiel 29:14, 15) Nke a mezukwara. Jehova bukwara amụma na a ga-ebibi Gris ka ọ ghara ịbụkwa mba na-achị ụwa, ma ọ dịghị mgbe o kwuru na mba a agakwaghị adị. Ebe ọ bụ na anyị ahụwo na mba ndị Jehova buru amụma na a ga-ebibi ha aghara ịdị ọzọ adịkwaghị, hụkwa na ndị ọ na-ekwughị na a ga-ebibi otú ahụ dị ugbu a, gịnị ka anyị mụtara na nke a? Anyị mụtara na amụma ndị dị n’Okwu Chineke bụ eziokwu, anyị pụkwara ịtụkwasị ha obi.

Ọtụtụ Ihe Dị Ịtụnanya Ndị Mezuru Emezu

Dị ka e kwuru na mbụ, Jehova kwuru ọtụtụ ihe banyere otú a ga-esi bibie Babịlọn. N’otu aka ahụ, akwụkwọ Ezikiel buru amụma na a ga-awụnye nkume, osisi, na ájá e ji wuo Taya “n’ime mmiri” mgbe a ga-ebibi ya. (Ezikiel 26:4, 5, 12) Amụma a mezuru n’afọ 332 T.O.A. mgbe Alexander Onye Ukwu na ndị agha ya bibiri mpaghara obodo ahụ nke dị ná mbara ala ma wụnye ihe niile si na ya na mmiri wee jiri ya mere ụzọ ha si banye ná mpaghara obodo Taya nke mmiri gbara gburugburu ma bibie ya.

Amụma e dere na Daniel 8:5-8, 21, 22 na 11:3, 4 nwekwara ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị ọ kọrọ banyere “eze Gris” nke na-akpa ike dị ukwuu. Onye ọchịchị a ga-anwụ n’oge ọ ka na-akpa ike, a ga-ekewakwa alaeze ya ụzọ anọ, ma ọ bụghị ụmụ ya ga-eketa ya. Alexander Onye Ukwu ghọrọ nnukwu eze mgbe ihe karịrị narị afọ abụọ e dere amụma a gachara. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ọ nwụchuru ọnwụ, kwuokwa na e mechara kewaa alaeze ya ụzọ anọ n’etiti ndị ọchịagha ya anọ ndị na-abụghị ụmụ ya.

Ndị na-akatọ Baịbụl kwuru na ihe ndị a emechaala tupu e buo ha n’amụma. Ma, gụgodị akụkọ a ọzọ n’akwụkwọ Daniel. Ọ bụrụ na anyị aghọta na ọ bụ amụma, anyị ga-ahụ na ihe ndị e kwuru na ya dị ịtụnanya. Ma, ọ bụrụ na mmadụ elee ya anya dị ka akụkọ efu a sị na ọ bụ amụma, ọ́ bụghị mmadụ ịhụcha ụzọ banye ọhịa? A sị na ọ bụ onye aghụghọ nke dịrị ndụ mgbe Alexander dịchara ndụ dere ya, gịnị mere na o kwughị na ozugbo Alexander nwụrụ na ụmụ ya abụọ ga-agbalị ka ha bụrụ ndị eze, ma a ga-egbu ha? Gịnị mere na o kwughị na ọtụtụ iri afọ ga-agafe tupu ndị ọchịagha anọ ahụ achịwa mpaghara dị iche iche nke alaeze Alexander? Gịnịzi mere na o kwughị aha eze ukwu ahụ na aha ndị ọchịagha ya anọ?

Ọ dịla anya ndị mmadụ kwuwere na amụma Baịbụl bụ akụkọ merela eme tupu e buo ha n’amụma. Ma ndị na-ekwu nke a enweghị ihe ha ji egosi na ihe ha na-ekwu bụ eziokwu, ha achọghịkwa ibu ụzọ nyochaa ihe àmà ndị e nwere tupu ha ekwubie na o nweghị onye nwere ike ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ebe ọ bụ na ha achọghị ikweta na Baịbụl bụ Okwu Chineke, o nweghị ihe ọzọ ha na-eme ma ọ́ bụghị iji echiche mmadụ efu na-akọwa ihe niile. Ma, Chineke ji amamihe were mmụọ nsọ ya hụ na e dere amụma ndị ga-ezu iji gosi na ọ bụ ya chepụtara Baịbụl. *

Amụma ndị dị na Baịbụl pụrụ ime ka okwukwe gị sie ike ma ọ bụrụ na i wepụta oge tụgharịa uche n’amụma ụfọdụ na otú ha si mezuo. Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụọ banyere amụma ndị dị na Baịbụl? Chaatị dị n’akwụkwọ bụ́ Gịnị nEzie Ka Bible Na-akụzi?, peeji nke narị abụọ, nwere ike inyere gị aka ime nke a. * Ọ bụrụ na ị nabatara aro a, ka ihe mere i ji amụ ha bụrụ iji mee ka okwukwe gị sie ike. Agụla ha ọsọ ọsọ naanị ka ị gụchaa ha. Kama ime otú ahụ, chebara eziokwu a echiche nke ọma, ya bụ, ihe ọ bụla Jehova kwuru ga-emezurịrị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị na-egosi na e deghị amụma ndị dị na Baịbụl mgbe ha mecharala eme, gụọ akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You?, peeji nke otu narị na isii ruo nke otu narị na iri na otu. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ par. 14 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

ỤKPỤRỤ NDỊ NA-ENYE AKA NÁ NDỤ

Lekwa ihe ọzọ i kwesịrị ichebara echiche. Ọ bụ Chineke ahụ nke buru amụma ziri ezi banyere otú a ga-esi nwee mba ndị na-achị ụwa na otú ha ga-esi daa nyekwara anyị ụkpụrụ Baịbụl ndị na-enyere anyị aka ná ndụ. Lee ụfọdụ n’ime ha:

Ị ga-aghọrọ mkpụrụ ị kụrụ.Ndị Galeshia 6:7.

A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.Ọrụ 20:35.

Ihe ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ mmadụ igbo mkpa ime mmụọ ya.Matiu 5:3.

Ọ bụrụ na i tinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ ná ndụ gị, ha ga-eme ka i nwee obi ụtọ, nweekwa ihe ịga nke ọma.

[Foto ndị dị na peeji nke 22 na 23]

Okwu Chineke buru amụma na a ga-ebibi mba ndị a ka ha ghara ịdịkwa . . .

IDỌM

BABỊLỌN

. . . ma o kwughị otú ahụ banyere

GRIS

IJIPT

[Ebe e sigasị nweta foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

Foto WHO nke Edouard Boubat sere

[Foto dị na peeji nke 23]

Alexander Onye Ukwu