Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Pita Si Gọnahụ Jizọs

Otú Pita Si Gọnahụ Jizọs

Maka Ndị Na-eto Eto

Otú Pita Si Gọnahụ Jizọs

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri anya nke uche gị kirie ebe ihe ahụ mere. Nụrụ olu ndị ahụ ị na-agụ banyere ha. Ka ihe ha na-eme ruo gị n’ahụ́.

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ MATIU 26:31-35, 69-75.

Mmadụ ole ka i chere nọ n’ebe ahụ?

․․․․․

Ì chere na ndị ahụ gwara Pita okwu ji obiọma gwa ya okwu, ka ọ̀ bụ iwe ji ha, ka hà na-ajụ ka ha mata ihe ha na-amaghị, ka ọ̀ ga-abụ n’ihi ihe ọzọ

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Pita mgbe ha na-ebo ya ebubo?

․․․․․

Gịnị mere Pita ji gọnahụ Jizọs? Ọ̀ bụ maka na ọ hụghị ya n’anya, ka ọ̀ bụ n’ihi ihe ọzọ?

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.—GỤỌ LUK 22:31-34; MATIU 26:55-58; JỌN 21:9-17.

Olee otú inwe obi ike gabiga ókè si mee ka Pita mehie?

․․․․․

Olee otú Jizọs si gosi na ya tụkwasịrị Pita obi, ọ bụ ezie na ọ maara na o nwere mgbe Pita ga-asụ ngọngọ?

․․․․․

Ọ bụ ezie na Pita gọnahụrụ Jizọs, olee otú o si gosi na ya nwere obi ike karịa ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs?

․․․․․

Olee otú Jizọs si gosi na ya gbaghaara Pita?

․․․․․

Olee ihe i chere mere Jizọs ji jụọ Pita ugboro atọ, sị, “Ị̀ hụrụ m n’anya?”

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Pita mgbe ya na Jizọs kparịtachara ụka, oleekwa ihe mere i ji chee otú a?

․․․․․

TINYE IHE Ị MỤTARA N’ỌRỤ. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Ịtụ mmadụ egwu.

․․․․․

Ọmịiko Jizọs meere ndị na-eso ụzọ ya, ọbụna mgbe ha mehiere.

․․․․․

Olee ihe kacha emetụ gị n’ahụ́ n’akụkọ a, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

․․․․․

․․․․․