Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Ime Obi Gị?

Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Ime Obi Gị?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Ime Obi Gị?

Ọtụtụ ndị taa kweere na azịza ajụjụ a bụ ee. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia sịrị: “Alaeze Chineke pụtara . . . Chineke ịchị obi anyị.” Ọ bụ ya ka ndị ụkọchukwu na-akụzikarị. Baịbụl ọ̀ na-akụzi n’ezie na Alaeze Chineke dị n’ime obi ụmụ mmadụ?

Ụfọdụ chere na ọ bụ Jizọs bụ onye mbụ kwuru na Alaeze Chineke dị n’ime obi ụmụ mmadụ. N’ezie, Jizọs sịrị: “Lee! alaeze Chineke dị n’etiti unu.” (Luk 17:21) Ụfọdụ nsụgharị sụgharịrị amaokwu a, sị: “Alaeze Chineke dị n’ime unu.” Nsụgharị ndị ahụ hà kwutere ihe Jizọs kwuru? Jizọs ò kwuru n’ezie na Alaeze Chineke dị n’ime obi ụmụ mmadụ?

Burugodị ụzọ tụlee ihe obi mmadụ bụ. Mgbe Baịbụl kwuru banyere obi ihe atụ, ihe ọ na-ekwu bụ ihe mmadụ bụ n’ime, ya bụ, ebe echiche ya, àgwà ya, na ihe dị ya n’uche na-esi apụta. Ikwu na ihe magburu onwe ya bụ́ Alaeze Chineke dị n’ime obi ụmụ mmadụ n’ihi otú o si agbanwe ụmụ mmadụ na otú o si eme ka ha ka mma nwere ike ịtọ ụtọ ná ntị, ma ezi uche ọ̀ dị n’ikwu otú ahụ?

Baịbụl gwara anyị, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.” (Jeremaya 17:9) Jizọs n’onwe ya sịrị: “Ọ bụ n’ime mmadụ, n’obi ụmụ mmadụ, ka echiche ọjọọ dị iche iche si apụta: ịkwa iko, izu ohi, igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, inwe anyaukwu, ajọ omume.” (Mak 7:20-22) Chebara nke a echiche: Ọ́ bụghị n’obi ụmụ mmadụ nke na-emehie emehie ka ọtụtụ nhụjuanya anyị na-ahụ n’ụwa taa sitere? Oleezi otú Alaeze Chineke, bụ́ ihe zuru okè, ga-esi si n’ebe dị otú ahụ bịa? N’eziokwu, otú ahụ ogwu na-enweghị ike ịmị mkpụrụ fig, obi ụmụ mmadụ enweghị ike iweta Alaeze Chineke.—Matiu 7:16.

Ugbu a, lebazie anya n’ụdị ndị Jizọs na-agwa okwu mgbe o kwuru okwu ahụ dị na Luk 17:21. Amaokwu bu ya ụzọ sịrị: “Mgbe ndị Farisii jụrụ ya oge alaeze Chineke ga-abịa, ọ zara ha.” (Luk 17:20) Ndị Farisii bụ ndị iro Jizọs. Jizọs kwuru na ndị ihu abụọ ahụ agaghị aba n’Alaeze Chineke. (Matiu 23:13) Ọ bụrụ na ndị Farisii agaghị aba n’Alaeze Chineke, Alaeze ahụ ọ̀ pụrụ ịdị n’ime obi ha? Mbanụ! Gịnị ka Jizọs kwuru?

Ọtụtụ nsụgharị Baịbụl ndị e ji nlezianya sụgharịa sụgharịrị ihe ahụ Jizọs kwuru otú ahụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si sụgharịa ya. Ụfọdụ n’ime ha sịrị na Alaeze Chineke dị “n’etiti unu.” Olee otú Alaeze Chineke si dịrị n’etiti ndị nọ n’oge ahụ, tinyere ndị Farisii? Jizọs bụ onye Jehova bụ́ Chineke họpụtara ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze ahụ. Jizọs bụ́ Onye A Họpụtara Ịbụ Eze nọ n’etiti ndị ahụ. Ọ kụziri banyere Alaeze Chineke, rụọkwa ọrụ ebube, si otú a gosi ha ihe Alaeze ahụ ka ga-eme. N’ihi ya, a pụrụ ikwu n’ezie na Alaeze ahụ dị n’etiti ha.

O doro anya na ọ dịghị ebe ọ bụla Akwụkwọ Nsọ kwuru ihe na-akwado echiche ahụ bụ́ na Alaeze Chineke dị n’ime obi ụmụ mmadụ. Kama nke ahụ, ọ bụ ọchịchị dị adị n’ezie, nke ga-eme ka ụwa gbanwee nke ukwuu, dị nnọọ ka ndị amụma buru n’amụma.—Aịzaya 9:6, 7; Daniel 2:44.