Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú oké osimiri ahụ a wụrụ awụ nke dị n’ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn wuru hà?

Ihe e dere ná 1 Ndị Eze 7:26 kwuru na mmiri dị n’oké osimiri ahụ, bụ́ ebe ndị nchụàjà na-ekute mmiri, dị “puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat abụọ,” ma, ebe e dere ihe yiri nke ahụ na 2 Ihe E Mere 4:5 kwuru na mmiri dị na ya dị “puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat atọ.” * Nke a emeela ka ụfọdụ ndị kwuo na ihe kpatara ọdịiche a bụ na e dehiere ihe n’akwụkwọ Ihe E Mere.

Ma, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-enyere anyị aka ịghọta otú amaokwu abụọ ahụ si bụrụ otu. Ndị Eze nke Mbụ 7:26 sịrị: “Ọ na-aba puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat abụọ.” Lee ihe 2 Ihe E Mere 4:5 kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụ ihe e ji awụnye mmiri nke pụrụ ịba puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat atọ.” Ya mere, ihe 2 Ihe E Mere 4:5 kwuru bụ mmiri ga-eju efere ukwu ahụ dị n’ụlọ nsọ, mmiri pụrụ ịbanyecha na ya, ebe 1 Ndị Eze 7:26 kwuru otú mmiri a na-agbanyekarị n’efere ukwu ahụ nke dị n’ụlọ nsọ hà. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, a naghị agbaju ya mmiri n’ọnụ. O yiri ka ọ̀ bụ naanị mmiri dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat abụọ ka a na-agbanyekarị na ya.

Gịnị mere Jizọs na Pita ji were naanị otu mkpụrụ ego tụọ ụtụ isi a na-atụ maka ụlọ nsọ?

N’oge Jizọs, ọ bụ iwu na nwoke ọ bụla bụ́ onye Juu nke gaferela afọ iri abụọ ga-akwụ mkpụrụ ego drakma abụọ, ma ọ bụ otu mkpụrụ ego didrachma, kwa afọ, nke bụ́ ụtụ isi a na-atụ maka ụlọ nsọ. Nke a bụ ego a na-enweta n’ọrụ abalị abụọ. Mgbe a jụrụ banyere ịtụ ụtụ isi a, Jizọs sịrị Pita: “Gaa n’oké osimiri, tụnye nko azụ̀, werekwa azụ̀ mbụ i gbutere. Mgbe i meghere ọnụ ya, ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego steta. Were ya nye ha maka mụ na gị.”—Matiu 17:24-27.

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na mkpụrụ ego steta ahụ a kpọrọ aha n’amaokwu a bụ tetradrachma. Mkpụrụ ego a bụ drakma anọ, ma ọ bụ ụtụ isi mmadụ abụọ na-atụ maka ụlọ nsọ. Tetradrachma dị ebe niile, a na-ahụkwa ya karịa didrachma. N’ihi ya, akwụkwọ bụ́ The New Bible Dictionary kwuru, sị: “Ọ dị ka ndị Juu hà na-ejikọtakarị aka abụọ abụọ atụ ụtụ isi maka Ụlọ Nsọ.”

Ihe ọzọ bụkwa na onye ọ bụla nke chọrọ ịgbanwe ego iji tụọ ụtụ isi maka naanị otu onye ga-akwụ ụgwọ maka ịgbanwere ya ego. Ụgwọ ọ ga-akwụ nwere ike ịkarị ọkara ụtụ isi ahụ. Ma, ndị tụrụ ụtụ isi nke mmadụ abụọ anaghị akwụ ụgwọ a. Ya mere, ọbụna n’obere ihe a, ihe Matiu dere kwekọrọ n’ihe a na-eme n’oge Jizọs nọ n’ụwa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 “Puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat abụọ” bụ puku lita iri anọ na puku anọ (ya bụ, puku galọn iri na otu na narị isii na iri abụọ). “Puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat atọ” bụ puku lita iri isii na puku isii (ya bụ, puku galọn iri na asaa na narị anọ na iri atọ).

[Foto dị na peeji nke 15]

Tetradrachma e mere ka o buo ibu na foto