Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Banyere Ezi Chineke

Banyere Ezi Chineke

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere Ezi Chineke

Chineke ò nwere aha?

Jizọs kụziri na Chineke nwere aha. Jizọs sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’” (Matiu 6:9) Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Mgbe Jizọs na-ekpeku Nna ya ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị.”—Jọn 17:26.

Ònye bụ Jehova?

Jizọs kpọrọ Jehova “onye naanị ya bụ ezi Chineke” n’ihi na Jehova bụ Onye Okike. (Jọn 17:3) Jizọs sịrị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị?” (Matiu 19:4) Jizọs kwukwara, sị: “Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) Ya mere, anyị enweghị ike ịhụ Chineke.—Ọpụpụ 33:17-20.

Gịnị ka Chineke chọrọ ka anyị mee?

Mgbe otu onye jụrụ Jizọs iwu kasị ukwuu, ọ zara ya, sị: “Nke mbụ bụ, ‘Nụrụ, Izrel, Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova, jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke abụọ bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’”—Mak 12:28-31.

Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya?

Jizọs sịrị: “M hụrụ Nna m n’anya.” Olee otú o si gosi na ọ hụrụ Nna ya n’anya? Ọ sịrị: “Ọbụna dị ka Nna m nyere m iwu ka m mee, otú ahụ ka m na-eme.” (Jọn 14:31) O kwukwara, sị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Anyị nwere ike ime Chineke obi ụtọ site n’ịmụ banyere ya. Mgbe Jizọs na-ekpe ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke.”—Jọn 17:3; 1 Timoti 2:4.

Olee otú anyị nwere ike isi mụta banyere Chineke?

Otu ụzọ anyị ga-esi mụta banyere Chineke bụ ikiri ihe ndị o kere eke. Dị ka ihe atụ, Jizọs sịrị: “Leruonụ anụ ufe nke eluigwe anya, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghị aghọrọ mkpụrụ, ha adịghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa ha?” Gịnị ka Jizọs na-ekwu? Anyị ekwesịghị ikwe ka nchegbu maka ihe ndị e ji ebi ndụ mee ka anyị kwụsị ijere Chineke ozi.—Matiu 6:26-33.

Ụzọ kacha mma anyị ga-esi mata Jehova bụ ịmụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Jizọs kpọrọ Akwụkwọ Nsọ “okwu Chineke.” (Luk 8:21) Jizọs gwara Chineke, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.”—Jọn 17:17; 2 Pita 1:20, 21.

Jizọs nyeere ndị mmadụ aka ka ha mụta eziokwu banyere Jehova. Otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs kwuru banyere Jizọs, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ mgbe ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ, mgbe ọ nọ na-akọwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?” (Luk 24:32) Iji mụta banyere Chineke, anyị aghaghị ịdị umeala n’obi, dịkwa njikere ka a kụziere anyị ihe. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu echigharịghị wee dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị.”—Matiu 18:3.

Olee ihe mere ịmụta banyere Chineke ji enye obi ụtọ?

Chineke na-eme ka anyị mata ihe mere anyị ji dịrị ndụ. Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Jehova na-akụziri anyị ụzọ kacha mma anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ. Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”—Luk 11:28; Aịzaya 11:9.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu banyere Chineke, lee isi nke mbụ nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 16]

“Emewokwa m ka ha mara aha gị.”—Jọn 17:26

[Foto ndị dị na peeji nke 16 na 17]

Anyị nwere ike ịmụta banyere Jehova site n’ihe ndị o kere eke nakwa site na Baịbụl