Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Luk

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Luk

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Luk

NDỊ e bu n’obi dee Oziọma Matiu bụ ndị Juu, ebe Oziọma Mak bụ maka ndị na-abụghị ndị Juu. Ma, ndị e bu n’obi dee Oziọma Luk bụ ndị nke mba niile. E dere Luk n’ihe dị ka n’afọ 56 ruo 58 O.A., ọ kọrọ ọtụtụ ihe ndị mere ná ndụ na n’ozi Jizọs.

Luk bụ́ ọgwọ ọrịa nke nwere ọmịiko ma bụrụ onye anya ruru ala ‘si ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi,’ ihe ndị ọ kọkwara bụ ihe ndị mere n’ime afọ iri atọ na ise—malite n’afọ nke 3 T.O.A. ruo n’afọ nke 33 O.A. (Luk 1:3) Ihe karịrị ọkara n’ihe ndị Luk kọrọ n’Oziọma ya adịghị n’Oziọma Matiu, Mak na Jọn.

MMALITE OZI JIZỌS

(Luk 1:1–9:62)

Mgbe Luk kọchara ka e si mụọ Jọn Onye Na-eme Baptizim na Jizọs, ọ gwara anyị na Jọn malitere ozi ya n’afọ nke iri na ise nke ọchịchị Taịbiriọs Siza, nke bụ́, ná mmalite nke afọ 29 O.A. (Luk 3:1, 2) Ọ bụ n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ ahụ ka Jọn mere Jizọs baptizim. (Luk 3:21, 22) Ka ọ na-erule n’afọ 30 O.A., ‘Jizọs laghachiri Galili ma malite izi ihe n’ụlọ nzukọ ha.’—Luk 4:14, 15.

Jizọs malitere njem nkwusa ozi ọma mbụ ya na Galili. Ọ gwara ìgwè mmadụ, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 4:43) Ọ kpọọrọ Saịmọn, bụ́ onye na-akụ azụ̀ na ndị ọzọ. Ọ gwara ya, sị: “Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.” (Luk 5:1-11; Mat. 4:18, 19) Ndịozi iri na abụọ ahụ na Jizọs so mgbe ọ malitere njem nkwusa ozi ọma nke ugboro abụọ ya na Galili. (Luk 8:1) Ná njem ije ozi ya nke atọ, o zipụrụ ndịozi ya iri na abụọ ahụ “ka ha gaa kwusaa alaeze Chineke ma gwọọ ọrịa.”—Luk 9:1, 2.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:35—Ọ̀ bụ àkwá dị nakpa nwa Meri ka e ji mụọ Jizọs? Ka nwa ahụ Meri ga-amụ bụrụ n’ezie onye si n’agbụrụ Ebreham, Juda, na Devid, dị ka Chineke kwere ná nkwa, ọ bụ site n’àkwá dị n’akpa nwa Meri ka a ga-esi mụọ Jizọs. (Jen. 22:15, 18; 49:10; 2 Sam. 7:8, 16) Otú ọ dị, mmụọ nsọ Jehova ka e ji bufee ndụ zuru okè nke Ọkpara Chineke n’akpa nwa Meri nke mere ka a dịrị ime Jizọs. (Mat. 1:18) O yiri ka nke a ò mere ka a ghara inwe otú ọ bụla Meri ga-esi bufee nwa ahụ o bu n’afọ ezughị okè, nke a mekwara ka amalite n’oge chebe nwa ahụ e bu n’afọ ka ọ ghara inwe mmerụ ọ bụla.

1:62—Zekaraya ọ̀ dara ogbi, ntị echiekwa ya? Mba. Ọ bụ naanị ogbi ka ọ dara. Ndị mmadụ ‘ji aka’ jụọ Zekaraya ihe ọ chọrọ ka a kpọọ nwa ahụ ma ọ bụghị n’ihi na ntị chịrị ya. O yiri ka ọ nụrụ ihe nwunye ya kwuru a ga-agụ nwa ha. Ikekwe ndị ọzọ chọrọ ịjụta Zekaraya ihe o nwere ikwu site n’iji aka kọwaara ya ihe a na-ekwu. Eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ naanị okwu ka a ga-eme ka ọ maliteghachi ikwu gosiri na ntị echighị Zekaraya.—Luk 1:13, 18-20, 60-64.

2:1, 2—Olee otú ihe e kwuru banyere “ndeba aha mbụ a e debara n’akwụkwọ” si nyere anyị aka ịghọta oge a mụrụ Jizọs? Mgbe Siza Ọgọstọs na-achị, e debara aha n’akwụkwọ ihe karịrị otu ugboro—e dere nke mbụ n’afọ nke 2 T.O.A. iji mezuo amụma e buru na Daniel 11:20 ebe nke abụọ bụ n’afọ nke 6 ma ọ bụ n’afọ nke 7 O.A. (Ọrụ 5:37) Kwiriniọs bụ gọvanọ na-achị Siria n’oge e mere ndeba aha abụọ ndị a, nke na-egosi na o yiri ka ọ́ ghọrọ gọvanọ ugboro abụọ. Ebe Luk kwutere okwu banyere ndeba aha nke mbụ ahụ, nke a gosiri na a mụrụ Jizọs n’afọ nke 2 T.O.A.

2:35—Olee otú a ga-esi manye “ogologo mma agha” n’ime mkpụrụ obi Meri? Nke a na-egosi ụdị obi mgbawa Meri ga-enwe mgbe ọ ga-ahụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ ga-ajụ ịnabata Jizọs dị ka Mesaya nakwa ụdị mwute ọ ga-enwe mgbe a ga-egbu Jizọs.—Jọn 19:25.

9:27, 28—Gịnị mere Luk ji sị na nnwogha ahụ mere “ụbọchị asatọ” ka Jizọs kwesịrị ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ụfọdụ n’ime ha “agaghị edetụ ọnwụ ire” ruo mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-abịa n’Alaeze ya, ebe ma Matiu ma Mak kwuru na ọ bụ “mgbe ụbọchị isii gasịrị”? (Mat. 17:1; Mak 9:2) O yiri ka ihe Luk mere bụ ịgụnye ụbọchị abụọ ọzọ—nke bụ́ ụbọchị ahụ e kwere nkwa ahụ na ụbọchị e mezuru nkwa ahụ.

9:49, 50—Gịnị mere Jizọs egbochighị otu nwoke ka ọ ghara ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ, n’agbanyeghị na nwoke ahụ abụghị onye na-eso ụzọ ya? Jizọs egbochighị nwoke ahụ n’ihi na enwebeghị ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ahụ. N’ihi ya, ọ dịghị mkpa na nwoke ahụ ga na-esogharị Jizọs iji gosi na o nwere okwukwe n’aha Jizọs ma na-achụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ.—Mak 9:38-40.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:32, 33; 2:19, 51. Meri buuru ihe niile na-emenụ na okwu ndị mezuru amụma n’obi. Ànyị na-ewe amụma ndị Jizọs buru banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a,” dị ka ihe dị oké mkpa, na-eji ihe ndị o kwuru na-aghọta ihe ndị na-eme eme taa?—Mat. 24:3.

2:37. Ihe nlereanya Ana na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịdị na-efe Jehova mgbe niile, ‘na-anọgidesi ike n’ekpere,’ ma ghara “ịhapụ nzukọ anyị.”—Rom 12:12; Hib. 10:24, 25.

2:41-50. Josef butere ihe ndị metụtara Chineke ụzọ ná ndụ ya, lekọtakwa ndị ezinụlọ ya anya n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ ime mmụọ. N’ụzọ ndị a niile, o setịpụụrụ ndị isi ezinụlọ ihe nlereanya mara mma.

4:4. Anyị ekwesịghị ikwe ka ụbọchị ọ bụla gafee n’atụleghị ihe ime mmụọ.

6:40. Onye na-akụzi Okwu Chineke kwesịrị nnọọ ịdị na-esetịpụrụ ndị ọ na-ezi ihe ihe nlereanya dị mma. O kwesịrị ime ihe ọ na-akụzi.

8:15. Iji bụrụ ndị “na-ejigide okwu ahụ” ma “jiri ntachi obi na-amị mkpụrụ,” anyị ga-aghọta Okwu Chineke, jiri ya kpọrọ ihe, ma kwe ka ọ bamie n’ime obi anyị. Ọ dị mkpa iji ekpere na-atụgharị uche mgbe anyị na-agụ Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.

NGWỤSỊ NKE OZI JIZỌS

(Luk 10:1–24:53)

Jizọs zipụrụ mmadụ iri asaa ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo nakwa n’ebe ndị dị na Judia. (Luk 10:1) O si “n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu nakwa site n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ezi ihe.”—Luk 13:22.

Mgbe ọ fọrọ ụbọchị ise ka Ememme Ngabiga nke afọ 33 O.A. ruo, Jizọs nọkwasịrị n’elu ịnyịnya ibu banye Jeruselem. Oge eruola ka okwu ahụ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya mezuo. Ọ gwara ha sị: “Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, a ga-egbukwa ya. N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”—Luk 9:22, 44.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

10:18—Gịnị ka Jizọs na-ekwu okwu ya mgbe ọ gwara ndịozi ya iri asaa, sị: “Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dara dị ka àmụ̀mà nke si n’eluigwe”? Jizọs adịghị ekwu na a chụpụlarị Setan n’eluigwe. Nke ahụ mere obere oge ka e chisịrị Kraịst Eze n’eluigwe na 1914. (Mkpu. 12:1-10) Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ikwu kpọmkwem ihe o bu n’uche, ma o yiri ka ihe mere Jizọs ji kwuo ihe o kwuru ọ̀ bụ iji mesie ya ike na ihe ahụ ọ na-ekwu ga-emerịrị.

14:26—Olee ihe ụmụazụ Kraịst ‘ịkpọ ndị ikwu ha asị’ pụtara? N’ime Baịbụl, e nwere ike iji ‘ịkpọ asị’ kọwaa mgbe a na-ahụrughị mmadụ ma ọ bụ ihe n’anya otú a hụruru onye ọzọ ma ọ bụ ihe ọzọ. (Jen. 29:30, 31) Ndị Kraịst ‘ga-akpọ ndị ikwu ha asị’ n’ụdị na ha ga-ahụ Jizọs n’anya karịa ka ha hụrụ ndị ikwu ha.—Mat. 10:37.

17:34-37—Olee ndị bụ “ugo” ahụ, oleekwa ihe bụ́ “ozu” ha ga-ezukọta n’ebe ọ dị? E ji ugo bụ́ anụ nwere ike ịhụ ihe dị n’ebe dị anya tụnyere ndị “a ga-akpọrọ,” ma ọ bụ napụta. “Ozu” nke ha ga-ezukọta n’ebe ọ dị bụ n’ebe ezi Kraịst ahụ nọ n’oge ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya nakwa ná nri ime mmụọ Jehova na-enye ha.—Mat. 24:28.

22:44—Gịnị mere na obi erughị nnọọ Jizọs ala? E nwere ọtụtụ ihe mere na obi erughị ya ala. Jizọs nọ na-eche otú ọnwụ ya dị ka onye omekome ga-esi mee ka a kọchaa Jehova Chineke ma tinye aha Ya n’ihe ụta. Ihe ọzọkwa bụ na Jizọs maara nnọọ na ndụ ebighị ebi ya na nke ụmụ mmadụ niile dabeere na ya ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi.

23:44—Ọ̀ bụ chi na-adị na-eji mgbe ụfọdụ n’ehihie mere ka ọchịchịrị gbaa n’ebe niile ruo awa atọ? Mba. Ọ bụ naanị n’oge ọnwa ọhụrụ na-apụta ka chi ji eji n’ehihie, ọ bụghị mgbe ọnwa gbajuru agbaju, bụ́kwanụ otú ọ na-adịkarị n’oge Ememme Ngabiga. Ọchịchịrị ahụ gbara n’oge Jizọs nwụrụ bụ ọrụ ebube si n’aka Chineke.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

11:1-4. Ọ bụrụ na anyị atụlee otú ihe ndị e kwuru n’ekpere a si dịtụ iche n’ekpere Onyenwe anyị ahụ Jizọs kụziri n’Ozizi Elu Ugwu ya ihe dị ka ọnwa iri na asatọ gara aga, anyị ga-achọpụta nnọọ na ekpere anyị ekwesịghị ịbụ naanị ikwughachi okwu ụfọdụ ugboro ugboro.—Mat. 6:9-13.

11:5, 13. Ọ bụ ezie na Jehova dị njikere ịza ekpere anyị, anyị kwesịrị ịnọgide na-arịọ ya ihe na-akpa anyị.—1 Jọn 5:14.

11:27, 28. Ihe na-enye mmadụ ezi obi ụtọ bụ ime uche Chineke, ọ bụghị ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụ ihe onwunwe ndị anyị nwere.

11:41. Onyinye ebere anyị kwesịrị isi n’obi jupụtara n’ịhụnanya na nke dị njikere ime ihe.

12:47, 48. A ga-ata onye nwere ibu ọrụ buru ibu ma ya ahapụ ịrụ ya ụta karịa onye na-amaghị ma ọ bụ onye na-aghọtachaghị ihe bụ́ ọrụ ya.

14:28, 29. Ọ dị mma ka anyị kowe akpa anyị ebe aka anyị ga-eru.

22:36-38. Jizọs agwaghị ndị na-eso ụzọ ya ka ha were ngwá ọgụ maka iji chebe onwe ha. Kama, mma agha ahụ ha ji n’abalị ahụ a raara Jizọs nye nyeere Jizọs aka ịkụziri ha otu ihe dị oké mkpa: “Ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.”—Mat. 26:52.

[Foto dị na peeji nke 31]

Josef setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya dị ka onyeisi ezinụlọ

[Foto dị na peeji nke 32]

Ọ bụ Luk kacha kọruo akụkọ ihe ndị mere ná ndụ na ozi Jizọs n’isi