Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Na-ahụ Uru Anyị Bara

Onye Na-ahụ Uru Anyị Bara

Bịaruo Chineke Nso

Onye Na-ahụ Uru Anyị Bara

Luk 12:6, 7

“OBI anyị nwere ike ịma anyị ikpe.” Baịbụl kwuru okwu a iji gosi na mgbe ụfọdụ obi anyị nwere ike ime ka anyị na-ata onwe anyị ụta gafee ókè. N’ezie, o nwere ike na-agwasi anyị ike na anyị ekwesịghị iso ná ndị Chineke hụrụ n’anya na ndị ọ na-elekọta. Ma, Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.” (1 Jọn 3:19, 20) Chineke ma anyị karịa otú anyị ma onwe anyị. Otú o si ele anyị anya dị nnọọ iche n’otú anyị si ele onwe anyị anya. Olee otú Jehova Chineke, bụ́ onye echiche ya kacha mkpa n’okwu a, si ele anyị anya? Anyị nwere ike ịhụ azịza ya n’otu ihe atụ na-eru n’ahụ́ nke Jizọs mere ugboro abụọ.

N’otu oge, Jizọs sịrị na a na-ere “nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta.” (Matiu 10:29, 31) Dị ka e dere na Luk 12:6, 7, Jizọs kwukwara, sị: “A na-ere nza ise mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali naanị ihe dị nta, ka ọ́ bụghị ya? Ma a dịghị echefu otu n’ime ha n’ihu Chineke. . . . Unu atụla egwu; unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” Ihe atụ a dị mfe nghọta nke bụ́ ịgba na-akụziri anyị otú Jehova si ele onye ọ bụla n’ime ndị na-efe ya anya.

Nza so ná nnụnụ a na-eri eri kacha ọnụ ala. Ọ ga-abụ na Jizọs ahụtụla ndị inyom dara ogbenye—ọbụna nne mụrụ ya—n’ahịa ka ha na-azụ irighiri nnụnụ ndị a ndị ezinụlọ ha ga-eri. Mmadụ nwere ike iji otu assarion, nke bụ́ otu mkpụrụ ego na-erughị naịra ise ugbu a, zụta nza abụọ. Nnụnụ ndị a dị nnọọ ọnụ ala nke na a na-eji mkpụrụ ego abụọ zụta nnụnụ ise, ya bụ na otu nnụnụ bụ mmezi.

Jizọs kwuru na “a dịghị echefu otu n’ime ha n’ihu Chineke” ma ọ bụ na “o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala,” Nna anyị aghara ịma. (Matiu 10:29) Jehova na-ahụ mgbe ọ bụla nza dara n’ala, ma eleghị anya, mgbe o merụrụ ahụ́ ma ọ bụ mgbe ọ na-achọ nri n’ala. Nnụnụ ndị a ndị yiri ihe na-adịghị mkpa adịghị oké ntakịrị n’anya Jehova nke na o keghị ha, n’ihi ya, ha adịghị ntakịrị n’anya ya nke na ọ naghị echeta ha. N’eziokwu, ha bara uru n’anya ya, n’ihi na ha bụ ihe dị oké ọnụ ahịa dị ndụ. Ị̀ ghọtara ihe Jizọs ji ihe atụ a na-akụzi?

Jizọs na-ejikarị otu ihe atụnyere ihe ọzọ mgbe ọ na-ezi ihe, ọ na-eji obere ihe atụnyere nnukwu ihe. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwukwara, sị: “Ugoloọma adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghịkwa ewe ihe ubi, ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ nkwakọba ihe, ma Chineke na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa nnụnụ?” (Luk 12:24) Isi ihe Jizọs na-ekwu banyere nza edoola anya, ya bụ: Ọ bụrụ na Jehova na-elekọta irighiri nnụnụ ndị a, ọ ga-elekọta ụmụ mmadụ ndị hụrụ ya n’anya ma na-efe ya ofufe karịa!

N’ihi ihe a Jizọs kwuru, anyị ekwesịghị iche na anyị erughị eru ịbụ ndị Chineke, bụ́ onye “karịrị obi anyị,” na-ahụ ma na-elekọta. Ọ́ bụghị ihe na-emesi obi ike ịmara na Onye kere anyị nwere ike ịhụ ihe anyị na-enweghị ike ịhụ n’ime onwe anyị?

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 9]

Nza: © ARCO/D. Usher/age fotostock