Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Hụ n’Anya E Kwe

A Hụ n’Anya E Kwe

A Hụ n’Anya E Kwe

‘Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst na ndị okpukpe ndị ọzọ kweere na e nwere ike ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke na ọdịnihu, ụfọdụ ndị kweere na mmadụ enweghị ike ịmata ihe ndị a. Ọ bụrụgodị na o nwere mgbe mmadụ ga-amata ihe bụ́ eziokwu banyere ihe ndị a, ọ bụghị ugbu a.’—ỌKÀ IHE ỌMỤMA BỤ́ BERTRAND RUSSELL, 1953.

ONYE chepụtara okwu bụ́ na “mmadụ enweghị ike ịmata ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụ na ọ dịghị” bụ ọkà mmụta banyere ndụ ụmụ anụmanụ bụ́ Thomas Huxley. A mụrụ Huxley na 1825. Ya na Charles Darwin dịkọrọ ndụ, ọ kwadokwara ozizi evolushọn. N’afọ 1863, Huxley dere na ya ahụghị ihe na-egosi na e nwere Chineke nke “hụrụ anyị n’anya ma nwee mmasị n’ebe anyị nọ dị ka Ndị Kraịst na-ekwu.”

Ọtụtụ ndị taa kweere ihe ahụ ndị ahụ a ma ama kwuru. Ha na-ekwu na ha ga-ekwere naanị n’ihe ha ji anya ha hụ. Ha na-asị na mmadụ inwe okwukwe n’onye ma ọ bụ n’ihe a na-enweghị ihe na-egosi na ọ dị adị bụ nzuzu.

Baịbụl ọ̀ na-agwa anyị ka anyị kwere na Chineke n’ebughị ụzọ hụ ihe na-egosi na ọ dị adị? Mbanụ. Baịbụl na-egosi na mmadụ ikwere n’ihe a na-enweghị ihe na-egosi na ọ dị adị bụ nzuzu. Baịbụl sịrị na “onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu 14:15.

Oleekwanụ maka ikwere na Chineke? Ò nwere ihe na-egosi na Chineke dị adị, ma ya fọdụzie ikwere na ọ hụrụ anyị n’anya ma nwee mmasị n’ebe anyị nọ?

Àgwà Chineke Pụtara Ìhè

Mgbe Pọl bụ́ onye so dee Baịbụl nọ na-agwa ndị Atens gụrụ oké akwụkwọ okwu, o kwuru na Chineke “kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya.” Pọl gwara ndị ahụ na-ege ya ntị bụ́ ndị nwere obi abụọ n’ihe ọ na-ekwu na Chineke nwere mmasị n’ebe ụmụ mmadụ nọ nakwa na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—Ọrụ 17:24-27.

Gịnị mere obi ji sie Pọl ike na Chineke dị adị nakwa na o nwere mmasị n’ebe ụmụ mmadụ O kere eke nọ? Pọl kwuru otu ihe kpatara nke a mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst ibe ya nọ na Rom akwụkwọ. O kwuru banyere Chineke, sị: “Àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke.”—Ndị Rom 1:20.

Peeji ndị na-esonụ ga-atụle àgwà atọ Chineke nwere ndị e nwere ike ịhụ nke ọma n’ihe ndị o kere eke. Mgbe ị na-agụ ihe atụ ndị a, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú àgwà Chineke ndị a m na-amụta si emetụta m?’

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

Baịbụl anaghị agwa anyị ka anyị kwere na Chineke n’ebughị ụzọ hụ ihe na-egosi na ọ dị adị