Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kpakpando Na-egosi Ike Chineke

Kpakpando Na-egosi Ike Chineke

Kpakpando Na-egosi Ike Chineke

“Lelienụ anya elu hụrụ. Ònye kere ihe ndị a? Ọ bụ Onye ahụ nke na-eme ka ha pụta n’ìgwè ọbụna dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, ọ na-akpọ ha niile ọbụna n’aha. Ọ dịghị otu n’ime ha ọ na-achọ achọ, n’ihi na ike ya dị ukwuu, n’ihi na o nwekwara ume dị ukwuu.”—AỊZAYA 40:26.

ANYANWỤ anyị bụ kpakpando na-ebuchaghị ibu. N’agbanyeghị nke a, o ji okpukpu narị puku atọ na puku iri atọ kara ụwa n’ịdị arọ. Ọtụtụ kpakpando ndị nọ ụwa nso dị ntakịrị karịa anyanwụ. Ma, kpakpando ndị ọzọ, dị ka nke aha ya bụ́ V382 Cygni, ji okpukpu iri abụọ na asaa ma ọ dịkarịa ala kara Anyanwụ anyị n’ịdị arọ.

Olee otú okpomọkụ nke na-esi n’anyanwụ anyị apụta hà? Chegodị echiche otú ọkụ ga-esi na-enwusi ike nke na ị nọrọgodị n’ebe dị kilomita iri na ise site n’ebe ọ na-enwu, ya aka na-ekpo gị ọkụ. Anyanwụ dị ihe dị ka otu narị nde kilomita na nde iri ise site n’ụwa. N’agbanyeghị nke a, n’ụbọchị anyanwụ na-achasi ike, ọ na-afụ ụfụ n’ahụ́! Ọ bụ ihe ịtụnanya ịmara na ọ bụ naanị ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ otu ijeri okpomọkụ nke anyanwụ na-erute n’ụwa. Ma, naanị obere okpomọkụ a ezuola ịkwado ihe ndị dị ndụ dị n’ụwa.

N’eziokwu, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala na okpomọkụ niile nke na-esi n’anyanwụ anyị apụta ezuola ime ka ndụ dịrị na puku ijeri mbara ala iri atọ na otu ndị hà ka ụwa anyị a. Ọ bụrụ na e kwuo nke a n’ụzọ ọzọ, ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na e wepụta okpomọkụ niile dị n’anyanwụ naanị n’otu tịnkọm tịnkọm, ọ ga-ezu inye United States “ọkụ ruo nde afọ itoolu, dabere n’otú ọkụ ha na-enwe ugbu a hà,” dị ka Space Weather Prediction Center (SWPC) si kwuo n’ebe ha na-edebe ihe ọmụma n’Ịntanet.

Ọ bụ n’etiti anyanwụ ka okpomọkụ ya si apụta, bụ́ ebe ọkụ ahụ na-eresi ike wee na-eme ka okpomọkụ na-enweghị atụ na-apụta. Anyanwụ buru ibu nke ukwuu, etiti ya dịkwa anya nke ukwuu nke na ọ na-ewe ọtụtụ nde afọ tupu okpomọkụ ndị dị n’etiti ya apụta n’elu ya. Dị ka Space Weather Prediction Center kwuru, “Ọ bụrụ na okpomọkụ akwụsị ịpụta n’Anyanwụ taa, nde afọ iri ise ga-agafe tupu ya emetụta Ụwa nke ukwuu!”

Ugbu a, chebara nke a echiche: Mgbe i leliri anya elu n’abalị mgbe eluigwe gbachapụrụ agbachapụ, ị na-ahụ ọtụtụ puku kpakpando. Ikike dị ukwuu na-esi na nke ọ bụla n’ime ha apụta, dị ka ọ dị anyanwụ anyị. Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na e nwere ijeri kwuru ijeri kpakpando n’eluigwe!

Olee ebe kpakpando niile a si bịa? Ọtụtụ ndị na-eme nchọpụta kweere na, n’ihi ihe ụfọdụ na-edochabeghị ha anya, eluigwe na ala pụtara n’onwe ha kemgbe ihe dị ka ijeri afọ iri na anọ gara aga. Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) O doro anya na Onye kere nnukwu ihe ndị a ikike na-esi na ha apụta, bụ́ kpakpando, ‘nwere ume dị ukwuu.’—Aịzaya 40:26.

Ihe Chineke Ji Ike Ya Eme

Jehova bụ́ Chineke na-eji ike ya akwado ndị na-eme uche ya. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi tinyere ume n’ịkụziri ndị ọzọ banyere Chineke. Pọl bụ mmadụ nkịtị, ma ọ rụrụ ọrụ dị ukwuu n’agbanyeghị oké mkpagbu. Olee otú o si mee nke a? O kwuru na Chineke nyere ya “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Ndị Kọrịnt 4:7-9.

O nweekwala mgbe Jehova bụ́ Chineke ji ike ya bibie ndị leziri anya na-ada iwu ya. Jizọs Kraịst gosiri na mbibi e bibiri Sọdọm na Gọmọra na Iju Mmiri e nwere n’ụbọchị Noa bụ ihe atụ nke mbibi Jehova ji ike ya bibie naanị ndị ajọ omume. Jizọs buru amụma na Jehova ga-eji ike ya bibie ndị ajọ omume ọzọ n’oge na-adịghị anya, bụ́ ndị na-eleghara iwu Ya anya.—Matiu 24:3, 37-39; Luk 17:26-30.

Olee Otú Obi Dị Gị n’Ihi Nke A?

Mgbe ị tụgharịrị uche n’otú kpakpando si egosi ike Chineke, obi nwere ike ịdị gị otú ọ dị Eze Devid onye kwuru, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ihe mkpịsị aka gị rụrụ, ọnwa na kpakpando ndị i kere, gịnị ka mmadụ efu bụ, nke mere i ji na-echeta ya, gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ, nke mere i ji na-elekọta ya.”—Abụ Ọma 8:3, 4.

N’ezie, ọ bụrụ na anyị ewere onwe anyị tụnyere otú eluigwe na ụwa si dịrị ukwuu, anyị na-aghọta na o nweghị ihe anyị bụ. Ma, ike Chineke ekwesịghị ịgwụ anyị ike. Jehova nyere Aịzaya onye amụma mmụọ ya ide okwu a na-akasi obi nke sịrị: “Ọ [Chineke] na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike; ọ na-emekwa ka onye na-enweghị ike nwee ume nke ukwuu. Ụmụ okoro ga-ada mbà, ike ga-agwụkwa ha, ụmụ okorobịa aghaghịkwa ịsụ ngọngọ, ma ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enwetaghachi ike. Ha ga-eji nku fegoo n’elu dị ka ugo. Ha ga-agba ọsọ ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-eje ije ma ha agaghị ada mbà.”—Aịzaya 40:29-31.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ime uche Chineke, obi sie gị ike na ọ ga-enye gị mmụọ nsọ ya nke ga-enyere gị aka ịnọgide na-eme uche ya. Ma, ị ga-ebu ụzọ rịọ ya ka o nye gị ya. (Luk 11:13) Site n’enyemaka Chineke, ị ga-enwe ike idi ọnwụnwa ọ bụla, nwetakwa ike ị ga-eji na-eme ihe ọma.—Ndị Filipaị 4:13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

Site n’enyemaka Chineke, ị ga-enweta ike ị ga-eji na-eme ihe ọma.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Malite n’elu, site n’aka ekpe gaa n’aka nri: ụyọkọ kpakpando bụ́ Whirlpool, nnukwu ụyọkọ kpakpando bụ́ Pleiades, ụyọkọ kpakpando bụ́ Orion Nebula, ụyọkọ kpakpando bụ́ Andromeda

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Anyanwụ ji okpukpu narị puku atọ na puku iri atọ kara ụwa n’ịdị arọ

[Ebe E Sigasị Nweta Foto ndị dị na peeji nke 7]

Pleiades: NASA, ESA na AURA/Caltech; ndị nke ọzọ: National Optical Astronomy Observatories