Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịhụnanya Nne Nwere n’Ebe Nwa Ya Nọ Na-egosi Ịhụnanya Chineke

Ịhụnanya Nne Nwere n’Ebe Nwa Ya Nọ Na-egosi Ịhụnanya Chineke

Ịhụnanya Nne Nwere n’Ebe Nwa Ya Nọ Na-egosi Ịhụnanya Chineke

“Nwaanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara, nke na ọ gaghị emere nwa ọ mụrụ ebere? Ọbụna ndị inyom a nwere ike ichefu, ma mụ onwe m agaghị echefu gị.”—AỊZAYA 49:15.

AHỤ́ na-eru nwa ọhụrụ ala mgbe nne ya ku ya na-enye ya ara. Otú o si kuru ya na-egosi obi ebere na ịhụnanya. Otu nne nke aha ya bụ́ Pam sịrị: “N’oge mbụ m kuuru nwa m, m malitere ịhụ ya n’anya nke ukwuu, m ghọtakwara na ọrụ dị ukwuu abịarala m.”

Ọ bụ ezie na o yiri ka ọ̀ bụ ihe onye ọ bụla ma, ma nnyocha ndị e mere na-egosi na ịhụnanya nne nwere n’ebe nwa ya nọ na-eme ka nwa ya na-eto nke ọma. Otu akwụkwọ nke ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Uche Ezughị Okè bipụtara kwuru, sị: “Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ụmụ ọhụrụ ndị mama ha gbahapụrụ anaghị enwe obi ụtọ, ha na-enwe mwute, mgbe ụfọdụ, ụjọ na-atụ ha.” Otu akwụkwọ ahụ kọrọ banyere otu nchọpụta e mere nke gosiri na ụmụaka ndị a hụrụ n’anya ma na-elekọta malite mgbe ha dị obere na-enwe ọgụgụ isi karịa ụmụaka e leghaara anya.

Alan Schore, bụ́ ọkà mmụta banyere uche ezughị okè n’otu mahadum dị na United States, kwuru banyere otú nne ịhụ nwa ya n’anya si dị mkpa, sị: “Mmekọrịta mbụ nwata na mama ya na-enwe, bụ́ nke mbụ nwata na onye ọzọ na-emekọ ihe, na-ekpebi otú mmekọrịta nwa ahụ na ndị ọzọ ga-enwe n’ọdịnihu ga-adị.”

Ọ dị mwute ikwu na nkụda mmụọ, ọrịa, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ nwere ike ime ka nne leghara nwa ya anya ma ọ bụ ọbụna ‘chefuo nwa ya ka na-aṅụ ara.’ (Aịzaya 49:15) Ma, nke a anaghị emekarị. N’eziokwu, o yiri ka ndị nne hà na-amalite ịhụ ụmụ ha n’anya ozugbo ha mụrụ ha. Ndị na-eme nnyocha achọpụtala na mgbe ndị nne na-amụ nwa, ahụ́ ha na-emepụtakwu ụdị mmiri na-adị n’ahụ́ nke a na-akpọ oxytocin, nke na-enyere ha aka ịmụpụta nwa, nke na-emechakwa mee ka ha nwee mmiri ara nke ọma. Otu mmiri a, nke na-adị n’ahụ́ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, dị ka e kweere, na-enyere ndị nne aka ịhụ ụmụ ha n’anya na iji obi ha niile na-elekọta ha.

Olee Ebe Ịhụnanya Si Malite?

Ndị na-akwado ozizi evolushọn na-akụzi na ịhụnanya na-adịghị achọ naanị ọdịmma onwe ya, dị ka nke na-adị n’etiti nne na nwa, malitere n’onwe ya, ụmụ mmadụ nọgidekwara na-enwe ya maka uru nke onwe ha. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ dị n’Ịntanet bụ́ Mothering Magazine kwuru, sị: “Otu n’ime ebe mbụ pụtaara onwe ya n’ụbụrụ anyị, ma e wezụga ụbụrụ anyị ketara n’anụmanụ, bụ ebe na-eme ka ihe na-emetụ mmadụ n’uche. Ọ bụ ebe a na-eme ka nne na nwa ya dịrị ná mma nke ukwuu.”

Ọ bụ eziokwu na nchọpụta e mere na-egosi na e nwere ebe na-eme ka ihe na-emetụ mmadụ n’uche n’ụbụrụ mmadụ. Ma, amamihe ọ̀ dị n’ikwu na ihe mere nne ji ahụ nwa ya n’anya bụ ụbụrụ pụtaara onwe ya n’elu ụbụrụ o ketara n’anụmanụ?

Legodị ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị na e kere ụmụ mmadụ n’onyinyo Chineke, ya bụ, ha nwere ikike ịkpa àgwà yiri àgwà Chineke. (Jenesis 1:27) Àgwà kacha pụta ìhè Chineke nwere bụ ịhụnanya. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke.” N’ihi gịnị? “N’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Biko, buru n’obi na amaokwu a asịghị na Chineke nwere ịhụnanya. Kama, ọ sịrị na Chineke bụ ịhụnanya. Ọ bụ ya malitere ịhụnanya.

Lee otú Baịbụl si kọwaa ihe bụ́ ịhụnanya: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrị ọnụ n’ihi ajọ omume, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada.” (1 Ndị Kọrịnt 13:4-8) Ezi uche ọ̀ dị n’ikweta na àgwà a nke magburu onwe ya malitere n’onwe ya?

Olee Otú Obi Dị Gị n’Ihi Nke A?

Mgbe ị gụrụ otú e si kọwaa ịhụnanya na paragraf bu nke a ụzọ, ị̀ chọrọ ka mmadụ gosi gị ụdị ịhụnanya a? Otú ahụ ka o kwesịrị ịdị. N’ihi gịnị? N’ihi na “anyị bụ ndị Chineke mụrụ.” (Ọrụ 17:29) E kere anyị ka a hụ anyị n’anya nakwa ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya. Obi kwesịkwara isi anyị ike na Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Jọn 3:16; 1 Pita 5:6, 7) Amaokwu nke dị ná mbido isiokwu a na-ekwu na Chineke hụrụ anyị n’anya ọbụna karịa otú nne hụruru nwa ya n’anya!

Ma, i nwere ike ịjụ, sị: ‘Ọ bụrụ na Chineke nwere amamihe, nwee ike dị ukwuu, hụkwa anyị n’anya, gịnị mere na ọ kwụsịbeghị ahụhụ? Gịnị mere o ji kwe ka ụmụaka na-anwụ, kwe ka mmegbu dịrị na-aga, kwekwa ka e jiri nrụrụ aka na anyaukwu na-emebi ụwa?’ Ezigbo ajụjụ ndị a kwesịrị ka a zaa ha nke ọma.

N’agbanyeghị ihe ndị kweere na mmadụ enweghị ike ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke na ọdịnihu nwere ike ikwu, anyị nwere ike ịmata azịza na-eju afọ nke ajụjụ ndị ahụ. Ọtụtụ nde mmadụ ndị bi n’ọtụtụ narị mba amatala azịza ajụjụ ndị ahụ site n’iso Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ndị bipụtara magazin a na-agwa gị ka i meekwa otú ahụ. Ka ị na-amụtakwu banyere Chineke site n’Okwu ya na ihe ndị o kere eke, ị ga-aghọta na ọ nọghị n’ebe dị anya nakwa na anyị nwere ike ịmata onye ọ bụ. Ma eleghị anya, obi ga-esi gị ike na Chineke ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’—Ọrụ 17:27.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Chineke hụrụ anyị n’anya ọbụna karịa otú nne hụruru nwa ya n’anya