Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Banyere Alaeze Chineke

Banyere Alaeze Chineke

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere Alaeze Chineke

Gịnị ka Alaeze Chineke bụ?

Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-achị ụwa dum. Jizọs sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: . . . ‘Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’”—Matiu 6:9, 10; Daniel 2:44.

Ole ndị ga-abụ ndị ọchịchị nke Alaeze Chineke?

A mụrụ Jizọs ka ọ bụrụ Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke. Otu mmụọ ozi gwara nne Jizọs, sị: “Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa . . . dị ka eze.” (Luk 1:30-33) Jizọs họkwaara ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha soro ya chịa. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ọ bụ unu rapaara m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ maka alaeze, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbara ndụ.” (Luk 22:28, 29; Daniel 7:27) Otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-eso ya chịa.—Mkpughe 5:9, 10; 14:1.

Olee ebe ọchịchị ahụ ga-esi na-achị?

Alaeze Chineke ga-esi n’eluigwe na-achị. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụkwa na mụ agaa kwadebere unu ebe [n’eluigwe], m ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ. . . . M na-alakwuru Nna m.”—Jọn 14:2, 3, 12; Daniel 7:13, 14.

Olee ihe Alaeze Chineke ga-eme ihe ọjọọ?

Jizọs ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa. Jizọs sịrị: “Mgbe Nwa nke mmadụ [Jizọs] ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube. A ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya, ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ . . . Ndị a [ndị ajọ omume] ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi, ma ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.”—Matiu 25:31-34, 46.

Olee ndị Alaeze ahụ ga-achị n’ụwa?

Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5; Abụ Ọma 37:29; 72:8) Ndị nọ ugbu a na-amụ otú ha si ahụ ibe ha n’anya ga-ejupụta ụwa. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:34, 35.

Olee ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ ndị bi n’ụwa?

Jizọs ga-agwọ ụmụ mmadụ ọrịa. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ìgwè mmadụ “banyere alaeze Chineke, ọ gwọkwara ndị nwere mkpa ọgwụgwọ.” (Luk 9:11) Mgbe Jọn onyeozi hụchara Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ n’ọhụụ, ọ sịrị: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ . . . M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ.’”—Mkpughe 21:1-4.

Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs. Otu onye mmebi iwu e gburu ya na Jizọs kwuru, sị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” O wee sị ya: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:42, 43; Aịzaya 11:4-9.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu nke a, gụọ isi nke asatọ nke akwụkwọ bụ́ Gịnị nEzie Ka Bible Na-akụzi? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.