Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ Bụ Eziokwu, Ọ Bụghị Akụkọ Ifo

Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ Bụ Eziokwu, Ọ Bụghị Akụkọ Ifo

Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ Bụ Eziokwu, Ọ Bụghị Akụkọ Ifo

Ọ̀ NA-AGỤ gị agụụ ibi n’ụwa ka nke a mma, ya bụ, ụwa nke ndị mmadụ na ibe ha ga-ebi n’udo, nke agha, mpụ, na mmegbu na-agaghị adị? Ọ bụrụ otú ahụ, akụkọ mere eme nke ọ ga-abụ na ị ma nke ọma ga-agba gị ume. Ọ bụ akụkọ Noa, bụ́ onye ezi omume nke wuru ụgbọ nke zọpụtara ya na ezinụlọ ya mgbe e ji iju mmiri bibie ndị ajọ omume.

A ma akụkọ a nke ọma n’ọtụtụ ebe. Ebe a kọrọ ihe banyere Noa na Baịbụl bụ na Jenesis, isi nke isii ruo isi nke itoolu. A kọkwara ihe yiri ya na Koran nakwa n’akụkọ ifo nke ndị bi n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ọ̀ dị mgbe e nwere Iju Mmiri n’ezie, ka ọ̀ bụ akụkọ ifo e ji akụziri ndị mmadụ ka ha mewe ezi ihe? Ndị ọkà mmụta okpukpe na ndị ọkà mmụta sayensị anọwo na-arụrịta ụka kemgbe ọtụtụ narị afọ ma akụkọ Iju Mmiri ahụ ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ akụkọ ifo. Ma, Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke, kwuru hoo haa na akụkọ ahụ bụ eziokwu, ọ bụghị akụkọ ifo. Tụlee ihe mere o ji bụrụ otú ahụ:

Akwụkwọ Jenesis gwara anyị kpọmkwem afọ, ọnwa, na ụbọchị Iju Mmiri ahụ bidoro, gwakwa anyị mgbe ụgbọ ahụ kwụsịrị na ebe ọ kwụsịrị nakwa mgbe mmiri ahụ tachara n’ụwa. Ihe dị iche iche e kwuru banyere ụgbọ ahụ dokwara anya—otú ọ dị, otú akụkụ ya dị iche iche hà, na ihe ndị e ji wuo ya. Ma, ihe a na-akọ n’akụkọ ifo anaghị edocha anya.

Akụkọ usoro ọmụmụ abụọ a kọrọ na Baịbụl na-egosi na Noa dịrị ndụ n’ezie. (1 Ihe E Mere 1:4; Luk 3:36) Ma Ezra ma Luk ji nlezianya mee nnyocha tupu ha edee akụkọ usoro ọmụmụ ndị ahụ. Luk kọrọ akụkọ usoro ọmụmụ Jizọs kọruo ya na Noa.

Aịzaya onye amụma na Ezikiel onye amụma na ndịozi Kraịst bụ́ Pọl na Pita kwukwara banyere Noa na Iju Mmiri ahụ.—Aịzaya 54:9; Ezikiel 14:14, 20; Ndị Hibru 11:7; 1 Pita 3:19, 20; 2 Pita 2:5.

Jizọs Kraịst kwuru banyere Iju Mmiri ahụ, sị: “Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa, otú ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ: ha nọ na-eri ihe, ha nọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom nọ na-alụ nwunye, a nọkwa na-eke ndị inyom di, ruo ụbọchị ahụ Noa banyere n’ụgbọ, iju mmiri ahụ wee bịa bibie ha niile.” (Luk 17:26, 27) Ọ bụrụ na e nweghị Iju Mmiri ahụ, ihe Jizọs kwuru banyere ‘ụbọchị Nwa nke mmadụ’ agaraghị enwe isi.

Pita onyeozi buru amụma na “ndị na-akwa emo” ga-eji ihe Baịbụl kwuru mere ihe ọchị. Pita dere, sị, ‘Dị ka ha si chọọ, ha na-echezọ eziokwu a, na . . . e bibiri ụwa nke oge Noa mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.’ Ànyị kwesịrị ichezọ “eziokwu a”? Mbanụ! Pita kwukwara, sị: “Eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:3-7.

Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume ọzọ, e nwekwara ndị ọ na-agaghị ebibi. Ọ bụrụ na anyị eṅomie Noa, anyị nwere ike iso ná ndị a ga-azọpụta ka ha biri n’ụwa ka nke a mma.