Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Onye Mmadụ Hụrụ n’Anya Nwụrụ

Mgbe Onye Mmadụ Hụrụ n’Anya Nwụrụ

Mgbe Onye Mmadụ Hụrụ n’Anya Nwụrụ

N’ihe dị ka elekere asaa ná mgbede Tuesday, July 17, 2007, otu ụgbọelu nke na-ebu ndị njem si n’okporo ụzọ ụgbọelu si efeli n’ọdụ ụgbọelu kacha ekwo ekwo na Brazil, nke dị n’etiti São Paulo, mapụta. Ụgbọelu ahụ mafeere okporo ụzọ wee kpọkasịa n’ebe a na-ebusa ihe. Ihe dị ka narị mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe mberede ahụ.

IHE mberede ahụ a sị na ọ bụ ihe mberede ụgbọelu kacha njọ metụrụla na Brazil agaghị apụ apụ n’obi ndị ihe mberede ahụ gburu ndị ha hụrụ n’anya. Claudete bụ otu n’ime ndị ihe mberede ahụ gburu ndị ha hụrụ n’anya. Ọ nọ na-ekiri TV nụ na ụgbọelu ahụ kpọkasịrị. Nwa ya nwoke, bụ́ Renato, nọ n’ụgbọelu ahụ. Ọ dị naanị afọ iri abụọ na isii. Ọ nọ na-akwado ịlụ nwaanyị n’October afọ ahụ. Obi kooro Claudete n’elu, ya ewee kpọwa ekwe ntị ya, ma o nwetaghị ya. Ya adaa n’ala kwaa ákwá nke ukwuu.

Na January 1986, onye chọrọ ịlụ Antje nwụrụ n’ihe mberede ụgbọala. Mgbe ọ nụrụ ya, ọ maghịzi ihe ọ na-eme eme. “Ná mmalite, ekwetaghị m na ọ nwụrụ n’eziokwu. Ọ dị m ka m nọ na-arọ nrọ ọjọọ, na m ga-eteta hụ na ọ bụghị eziokwu. Ahụ́ nọ na-ama m jijiji. Afọ ana-egbukwa m mgbu dị ka à ga-asị na e nwere onye kụrụ m ihe n’afọ.” Uche ghasasịrị Antje malite mgbe ahụ ruo afọ atọ. Ọ bụ ezie na ọ karịala afọ iri abụọ kemgbe ihe mberede ahụ mere, ahụ́ ka na-ama ya jijiji mgbe ọ bụla o chetara ya.

E nweghị ike iji ọnụ nkịtị kọwaa otú obi na-adị mmadụ ma onye ọ hụrụ n’anya nwụọ na mberede, ma otú uche si aghasasị ya, ma otú o si adị ya ka ọ̀ bụ ná nrọ, ma otú ike ụwa si agwụ ya. Ọ bụrụgodị na mmadụ ma na onye ọ hụrụ n’anya na-aga ịnwụ, dị ka ọ na-adị ma ọ bụrụ na ọ dịla anya onye ahụ rịawara ọrịa, ọnwụ ya ka nwekwara ike iwute ya nke ukwuu. O nweghị onye na-adịcha nnọọ njikere maka ọnwụ onye ọ hụrụ n’anya. Mama Nanci rịara ọrịa ogologo oge wee nwụọ na 2002. Ma, n’ụbọchị mama Nanci nwụrụ, ọ nọdụrụ n’ala nkịtị n’ụlọ ọgwụ, n’amaghị ihe ọ ga-eme eme. Ndụ gbụrụ ya. Afọ ise agafeela kemgbe ahụ, ma, ọ ka na-ebe ákwá mgbe ọ bụla o chetara mama ya.

Dr. Holly G. Prigerson kwuru, sị: “Ndị mmadụ anaghị echezọ ọnwụ ndị ha hụrụ n’anya, kama, ha na-ewere ụwa ha otú ha si hụ ya.” Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya nwụrụ, ma ọ̀ bụ na mberede ma ọ bụ na ọ bụghị, i nwere ike ịjụ, sị: ‘Èkwesịrị m iru uju? Olee otú m nwere ike isi die ọnwụ onye m hụrụ n’anya? M̀ ga-ahụ onye m hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?’ Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ i nwere.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 3]

EVERTON DE FREITAS/AFP/Getty Images