Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Idi Ọnwụ Onye Ị Hụrụ n’Anya

Idi Ọnwụ Onye Ị Hụrụ n’Anya

Idi Ọnwụ Onye Ị Hụrụ n’Anya

“Ụmụ [Jekọb] ndị ikom niile na ụmụ ya ndị inyom niile bịara na-akasi ya obi, ma ọ nabataghị obi ha na-akasi ya. Ọ sịrị, ‘Mba, m ga-erugide uju gakwuru nwa m n’ili.’ Nna ya wee bewere ya ákwá.”—JENESIS 37:35, nsụgharị The Holy Bible —New International Version.

NNA ochie bụ́ Jekọb ruru uju nke ukwuu n’ihi ọnwụ nwa ya nwoke. Ọ chọrọ ịnọ na-eru uju ruo ụbọchị ọ ga-anwụ. Ọnwụ onye ị hụrụ n’anya nwere ike na-ewute gị nke ukwuu otú o wutere Jekọb nke na i nwere ike iche na o nweghị ihe ga-eme ka i die ya. Ọ̀ pụtara na onye na-eru ụdị uju ahụ enweghị okwukwe na Chineke? Mbanụ!

Baịbụl kwuru na Jekọb bụ nwoke nwere okwukwe. Ọ jara ma nna nna ya bụ́ Ebreham ma nna ya bụ́ Aịzik ma ya onwe ya mma maka okwukwe siri ike ha nwere. (Ndị Hibru 11:8, 9, 13) N’otu oge, ya na otu mmụọ ozi gbara mgba abalị dum ka o wee nweta ngọzi Chineke! (Jenesis 32:24-30) O doro anya na Jekọb na Chineke dị n’ezigbo mma. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’uju ahụ Jekọb ruru? Anyị na-amụta na mmadụ iru uju na inwe mwute nke ukwuu mgbe onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ apụtaghị na o nweghị okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ. Iru uju mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ dị anyị n’ọbara.

Gịnị Bụ Iru Uju?

E nwere ihe dị iche iche anyị na-eme mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ, ma, ọtụtụ ndị na-enwekarị oké mwute. Tụlee otú obi dị Leonardo, onye dị afọ iri na anọ mgbe ọrịa obi gburu papa ya na mberede. Leonardo agaghị echezọ ụbọchị nwanne mama ya gwara ya na papa ya anwụọla. Ná mmalite, o kwetaghị na ọ bụ eziokwu. Ọ hụrụ ozu papa ya mgbe a na-eli ya, ma, ọ dị ya ka ọ̀ bụ ná nrọ. Leonardo ebeghị ákwá ruo mgbe ọnwa isii gachara. Ọtụtụ mgbe, ọ na-anọ na-eche ka papa ya lọta ọrụ. O were ya ihe dị ka otu afọ tupu ya edochaa ya anya na papa ya anwụọla. Mgbe o doro ya anya, owu malitere ịma ya nke ukwuu. Ụmụ obere ihe, dị ka ịbata n’ụlọ n’enweghị onye nọ ya, na-echetara ya na papa ya anọkwaghị. Ụdị ihe a mee, ọ na-ebekarị ákwá. Ọnwụ papa ya na-ewute ya nke ukwuu.

Ihe mere Leonardo na-egosi na iru uju nwere ike ịkpa mmadụ aka ọjọọ. Ihe ọma dị na ya bụ na anyị nwere ike idi ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya. Ma, o nwere ike iwetụ oge. Otú ahụ ọ na-ewe oge tupu ebe ihe merụrụ mmadụ ahụ́ nke ukwuu alaa, ka idi ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya na-ewe oge. Idi ya nwere ike iwe ọtụtụ ọnwa, afọ ole na ole, ma ọ bụkwanụ karịa. Ma, oké mwute ị na-enwe ná mmalite ga-eji nwayọọ nwayọọ belata ka oge na-aga, ndụ ga-ejikwa nke nta nke nta maliteghachi ịdị gị ụtọ.

Ma, iru uju bụ otu n’ime ihe ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ onye ọ hụrụ n’anya, ọ ga-enyekwara ya aka ime mgbanwe dị mkpa iji nabata otú ihe dịzi. Onye anyị na ya na-anọbu anọghịzi. Ọ dị mkpa ka anyị dịrị ndụ na-aga n’agbanyeghị na ọ nwụọla. Iru uju nwere ike inyere gị aka igosi otú obi dị gị. O doro anya na otú otu onye si eru uju nwere ike ịdị iche n’otú onye ọzọ si eru. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na: Ijide onwe gị ka ị ghara iru uju nwere ike ime ka uche, obi, na ahụ́ ghara ịkpakọ gị ọnụ. Olee otú ị ga-esi ruo uju n’erubigaghị ya ókè? Ndụmọdụ ndị ga-enyere gị aka dị na Baịbụl. *

Ihe Ga-enyere Gị Aka Mgbe Ị Na-eru Uju

Ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-achọpụta na ikwu okwu na-enyere mmadụ aka mgbe ọ na-eru uju. Dị ka ihe atụ, gụọ ihe onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya, bụ́ Job, kwuru, bụ́ onye ụmụ ya iri nwụrụ, ọdachi ndị ọzọ adakwasịkwa ya. Ọ sịrị: “Mkpụrụ obi m akpọwo ndụ m asị. M ga-ekwupụta nchegbu m na-enwe banyere onwe m. M ga-ekwu okwu dị ka o si ewute mkpụrụ obi m!” (Job 1:2, 18, 19; 10:1) Ị̀ hụrụ na Job chọrọ ‘ikwupụta’ ihe ndị na-echegbu ya? Olee otú ọ ga-esi mee nke ahụ? Ọ sịrị, “M ga-ekwu okwu.”

Paulo, onye mama ya nwụrụ, sịrị: “Otu n’ime ihe ndị nyeere m aka bụ ikwu banyere mama m.” Ya mere, ịkọrọ enyi gị ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị nwere ike inyetụrụ gị aka. (Ilu 17:17) Mgbe mama Yone nwụrụ, ọ gwara ụmụnna ya Ndị Kraịst ka ha na-abịa eleta ya karịa otú ha na-emebu. Ọ sịrị, “Ikwu okwu nyeere m aka.” Ịgwa onye ga-ege gị ntị nke ọma otú obi dị gị nwekwara ike ime ka ọ dịrị gị onwe gị mfe idi ọnwụ onye ị hụrụ n’anya.

Ide ihe bụ ihe ọzọ nwere ike inyere gị aka. O nwere ike ịkara ụfọdụ ndị ọ na-esiri ike ikwu otú ihe dị ha n’obi mfe ide ya ede. Nwoke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Devid dere abụ iru uju na-emetụ n’ahụ́ iji gosi na ọnwụ Sọl na Jọnatan wutere ya. E mechara denye abụ iru uju a na-emetụ n’obi n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Samuel nke Abụọ.—2 Samuel 1:17–27.

Ịkwa ákwá nwekwara ike inyere gị aka. Baịbụl sịrị, ‘E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, ọbụna oge ịkwa ákwá.’ (Ekliziastis 3:1, 4) O doro anya na oge onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ bụ “oge ịkwa ákwá.” Ákwá anyị na-akwa mgbe anyị na-eru uju ekwesịghị ime anyị ihere. Baịbụl kọrọ akụkọ banyere ọtụtụ ndị inyom na ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị kwara ákwá n’ihu ọha mgbe ha na-eru uju. (Jenesis 23:2; 2 Samuel 1:11, 12) “Anya mmiri gbara” Jizọs Kraịst mgbe o rutere nso n’ili ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs, bụ́ onye nwụrụ mgbe na-adịbeghị anya n’oge ahụ.—Jọn 11:33, 35.

Inwe ndidi dị gị mkpa mgbe ị na-eru uju, n’ihi na obi nwere ike ịgbanwe gị mgbe ọ bụla. Chetakwa na ịkwa ákwá ekwesịghị ime gị ihere. Ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi achọpụtala na ịkwa ákwá mgbe ha na-eru uju bụ otu n’ime ihe kwesịrị ekwesị ma dị mkpa nke na-eme ka ha nwetaghachi onwe ha.

Bịaruo Chineke Nso

Baịbụl gwara anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ekpere bụ otu n’ime ụzọ bụ́ isi anyị si abịaru Chineke nso. Eledala uru ọ bara anya! Baịbụl kwere anyị nkwa a na-akasi obi, sị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) O mesikwara anyị obi ike, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Chebagodịrị nke a echiche. Dị ka anyị kwuru na mbụ, ọtụtụ ndị achọpụtala na ịkọrọ enyi ha ha tụkwasịrị obi otú obi dị ha nyeere ha aka. Ọ́ gaghị enyere anyị aka karị ịgwa Chineke, bụ́ onye kwere nkwa na ya ga-akasi anyị obi, otú obi dị anyị?—2 Tesalonaịka 2:16, 17.

Paulo, bụ́ onye e kwuru banyere ya na mbụ, sịrị: “Mgbe ọ bụla ọnwụ mama m na-ekweghịzi m odidi, m na-egbu ikpere n’ala kpekuo Chineke ekpere. M na-arịọ ya ka o nyere m aka.” Obi siri Paulo ike na ekpere ya nyeere ya aka. Gị onwe gị ga-achọpụta na “Chineke nke nkasi obi niile” ga-aza ekpere ị na-ekpesi ike ma nye gị obi ike na ike ị ga-eji die ọnwụ onye ị hụrụ n’anya.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4; Ndị Rom 12:12.

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ

Jizọs kwuru, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25) Baịbụl na-akụziri anyị na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. * Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na ya nwere ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Otu ụbọchị, ọ kpọlitere otu nwatakịrị nwaanyị dị afọ iri na abụọ n’ọnwụ. Olee otú obi dị ndị mụrụ ya? Ha “nwere oké obi ụtọ.” (Mak 5:42) Mgbe Jizọs Kraịst bụ́ Eze eluigwe ga-amalite ịchị ụwa n’Alaeze ya, ọ ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa a, bụ́ nke udo na ezi omume ga-adị. (Ọrụ 24:15; 2 Pita 3:13) Chegodị echiche ụdị oké obi ụtọ a ga-enwe mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ wee hụ ndị ha hụrụ n’anya ọzọ!

Claudete, bụ́ onye nwa ya nwoke nwụrụ n’ihe mberede ụgbọelu, debere foto nwa ya ahụ, bụ́ Renato, n’elu friji. Ọ na-ekiri foto ahụ kwa mgbe kwa mgbe wee sị onwe ya, ‘Anyị ga-ahụ ọzọ mgbe i bilitere n’ọnwụ.’ Leonardo na-eji anya nke uche ahụ ka papa ya bilitere n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa. Ee, olileanya mbilite n’ọnwụ bụ ihe na-enye ha na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ezigbo nkasi obi. Ọ ga-akasikwa gị obi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ị chọọ ịhụ ebe a tụlere otú a ga-esi nyere ụmụaka aka idi ọnwụ onye ha hụrụ n’anya, gụọ isiokwu bụ́ “Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya,” nke dị na peeji nke 18 ruo nke 20 na magazin a.

^ par. 19 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere olileanya mbilite n’ọnwụ, gụọ isi nke asaa nke akwụkwọ bụ́ Gịnị nEzie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

“Chineke nke Nkasi Obi Niile”

“Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile bụrụ onye a gọziri agọzi.”—2 Ndị Kọrịnt 1:3.

Amaokwu a nke dị na Baịbụl na-egosi na Chineke nwere ike inyere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi aka idi nsogbu ma ọ bụ ihe isi ike ọ bụla nwere ike ịbịara ha. Otu n’ime ụzọ Jehova nwere ike isi kasie mmadụ obi bụ site n’aka enyi ya ma ọ bụ onye ọ hụrụ n’anya, bụ́ onye ya na ya nwere otu okwukwe.

Leonardo, onye nna ya nwụrụ, chetara otu ihe merenụ nke kasiri ya obi ma nye ya ume. Ọ lọtara n’ụlọ ha wee cheta na ọ dịghị onye nọ ya, ya amalite ịkwasi ákwá ike. Ya agaa n’otu ogige ntụrụndụ dị nso nọdụ n’oche na-akwa ákwá. Ka ọ nọ na-akwa ákwá, ọ rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka. Na mberede, otu ụgbọala kwụsịrị ya n’akụkụ, Leonardo wee hụ na onye na-akwọ ya bụ otu n’ime ụmụnna ya bụ́ Onye Kraịst. Nwanna ahụ nọ na-ebugara ndị ahịa ya ngwá ahịa mgbe ọ gahiere ụzọ. Ọhụhụ ahụ Leonardo na nwanna ahụ hụrụ kasiri ya obi.

Otu ụbọchị, owu nọ na-ama otu nwoke nwunye ya nwụrụ, ọ dakwara mbà n’obi. Ákwá ekweghịkwa ya nkwụsị n’ihi na o yiri ya ka ụwa ọ̀ gwụla. Ya arịọ Chineke ka o nyere ya aka. Fon ya kụrụ mgbe ọ ka nọ na-ekpe ekpere. Ọ bụ nwa nwa ya na-akpọ ya. Ọ sịrị: “Obere ụka mụ na ya kparịtara mere ka obi sie m ike ọzọ. Mgbe ọ kpọrọ m, mụ amara na Chineke azala ekpere m kpekuru ya ka o nyere m aka.”

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ịkasi Ndị Ọzọ Obi

“[Chineke] na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile, ka anyị wee nwee ike ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi site ná nkasi obi nke Chineke na-akasi anyị onwe anyị.”—2 Ndị Kọrịnt 1:4.

Ọtụtụ ezi Ndị Kraịst ahụla na ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ eziokwu. Ebe ọ bụ na ha nwetara nkasi obi nke mere ka ha die ọnwụ onye ha hụrụ n’anya, ha na-enwe ike ịgba ndị ọzọ ume na ịkasi ha obi.

Tụlee banyere Claudete, bụ́ onye na-aga ezi ndị ọzọ ozi ọma mgbe niile. Tupu nwa ya nwoke anwụọ, ọ na-aga eleta otu nwaanyị ọrịa leukemia gburu nwa ya nwoke. Nwaanyị ahụ na-enwe obi ụtọ mgbe ọ bụla Claudete gara na nke ya, ma, o chere na Claudete agaghị aghọtacha otú ọnwụ nwa ya si na-ewute ya. Ma, ozugbo nwa Claudete nwụrụ, nwaanyị ahụ gara na nke ya wee gwa ya na ya bịara ịmara ma okwukwe ya ọ ka sikwara ike kemgbe nwa ya nwụrụ. Okwukwe siri ike Claudete nwere metụrụ nwaanyị ahụ n’obi, ya na Claudete wee malite ịmụchi Baịbụl anya. Okwu Chineke na-akasikwa ya obi.

Leonardo kpebiri ịmụ asụsụ ndị ogbi mgbe papa ya nwụrụ, ka o wee jiri ya na-ezi ndị ntị chiri ozi ọma na-akasi obi nke dị na Baịbụl. Ọ chọpụtala na mbọ ọ na-agba inyere ndị ntị chiri aka abarala ya uru nke ukwuu. Ọ sịrị: “Otu n’ime ihe nyeere m aka idi ọnwụ papa m bụ ọchịchọ m nwere inyere ndị ntị chiri aka ịmara Chineke. M na-ewepụta oge na ume dị ukwuu na-enyere ha aka. Mwute m nọ na-enwe ghọrọ ọṅụ mgbe e mere onye mbụ mụ na ya na-amụ Baịbụl baptizim! N’eziokwu, ọ bụ mgbe ahụ bụ mgbe mbụ m nwere obi ụtọ dị ukwuu kemgbe papa m nwụrụ.”—Ọrụ 20:35.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ịkọrọ onye ọzọ otú obi dị gị nwere ike inyetụrụ gị aka

[Foto dị na peeji nke 6]

Ide ihe nwere ike inyere gị aka mgbe ị na-eru uju

[Foto dị na peeji nke 6]

Ịgụ banyere olileanya mbilite n’ọnwụ nwere ike ịkasi gị obi nke ukwuu

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Jizọs kwere nkwa na ya ga-eme ka ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ si n’ọnwụ bilie