Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”

“Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”

Ṅomie Okwukwe Ha

“Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”

Ọ TỤRỤ Meri n’anya mgbe otu onye ọbịa bịara n’ụlọ ya. Onye ọbịa ahụ ajụghị ya maka nne ya ma ọ bụ nna ya. Ọ bụ ya ka ọ bịara ịhụ! Meri ma na ọ bụghị onye Nazaret. N’obodo nta dị ka nke Meri, ọ naghị esi ike ịmata ndị bịara abịa. Ma, onye ọbịa a dị nnọọ iche. O kelere Meri ekele ọ na-anụtụbeghị mbụ, sị: “Ndeewo, onye e meere amara dị ukwuu, Jehova nọnyeere gị.”—Luk 1:28.

Ọ bụ otú a ka Baịbụl si malite ịkọrọ anyị akụkọ Meri, nwa Hilaị, onye Nazaret nke dị na Galili. Akụkọ Meri malitere n’oge o nwere mkpebi dị mkpa ọ ga-eme ná ndụ. Ya na Josef onye ọkwa nkà kwere onwe ha nkwa ọlụlụ. Josef abụghị ọgaranya, ma, o kwesịrị ntụkwasị obi. N’ihi ya, o yiri ka Meri amatala otú ọdịnihu ya ga-adị, ya bụ, ọ gaghị ebi ndụ onye ukwu, ọ ga na-arụ ọrụ iji nyere di ya bụ́ Josef aka, ha abụọ ga-amụkwa ụmụ. Ma, na mberede, onye ọbịa ahụ gwara ya ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ, bụ́ nke ga-agbanwe ndụ ya.

O nwere ike ịtụ gị n’anya na Baịbụl akọrọghị anyị ọtụtụ ihe banyere Meri. O nweghị oké ihe ọ kọrọ banyere otú e si zụlite ya, banyere ụdị àgwà o nwere, ọ kọghịkwa ihe ọ bụla banyere otú ọ dị. Ma, ihe Okwu Chineke kwuru banyere ya dị nnọọ mkpa.

Ka anyị wee nwee ike ịmata onye Meri bụ, anyị kwesịrị ileghara ọtụtụ ihe a na-akụzi banyere ya n’okpukpe dị iche iche anya. N’ihi ya, ka anyị hapụgodị ọtụtụ “ihe oyiyi” ya e sere ese, ndị a tụrụ atụ ma ọ bụ ndị a kpụrụ akpụ. Ka anyị hapụkwuo ozizi dị mgbagwoju anya ndị okpukpe na-ezi nke mere ha ji nye nwaanyị a dị umeala n’obi oké aha bụ́ “Nne nke Chukwu” na “Eze Nwaanyị nke Eluigwe.” Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere ya. Ọ na-eme ka anyị ghọta ụdị okwukwe o nwere na otú anyị nwere ike isi ṅomie ya.

Mmụọ Ozi Letara Ya

Dị ka ị maara, onye ahụ bịara leta Meri abụghị mmadụ. Ọ bụ mmụọ ozi Gebriel. Mgbe ọ kpọrọ Meri “onye e meere amara dị ukwuu,” ihe o kwuru “nyere ya nsogbu nke ukwuu,” ya echewe ihe ụdị ekele a pụrụ iche pụtara. (Luk 1:29) Ònye meere ya amara a dị ukwuu? Meri atụghị anya ka ụmụ mmadụ kwanyere ya ùgwù pụrụ iche. Ma, mmụọ ozi ahụ na-ekwu banyere amara Jehova bụ́ Chineke meere ya. Nke ahụ dị Meri mkpa. Otú ọ dị, o jighị nganga were onwe ya na ya bụ onye Chineke meere amara. Ọ bụrụ na anyị na-agbalị ka Chineke meere anyị amara, anyị ekwesịghị iji nganga were na o meerela anyị amara, anyị ga-amụta ihe dị mkpa nwa agbọghọ ahụ bụ́ Meri ghọtara nke ọma. Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ hụrụ ndị wedara onwe ha ala na ndị dị obi umeala n’anya, ọ na-akwadokwa ha.—Jems 4:6.

Meri kwesịrị ịdị umeala n’obi n’ihi na mmụọ ozi ahụ nyere ya ihe ùgwù na-enweghị atụ. Ọ gwara ya na ọ ga-amụ nwa nke ga-aghọ onye kacha mkpa n’ime ụmụ mmadụ niile. Gebriel sịrị: “Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” (Luk 1:32, 33) O doro anya na Meri maara banyere nkwa Chineke kwere Devid n’ihe karịrị otu puku afọ tupu mgbe ahụ, ya bụ, na otu n’ime ụmụ ya ga-achị ruo mgbe ebighị ebi. (2 Samuel 7:12, 13) Ya mere, nwa ya ga-abụ Mesaya bụ́ onye ndị Chineke nọ na-atụ anya ya kemgbe ọtụtụ narị afọ!

Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya na ‘a ga-akpọ nwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu.’ Olee otú nwaanyị bụ́ mmadụ ga-esi mụọ Ọkpara Chineke? Oleedị otú Meri ga-esi mụọ nwa? Ya na Josef ka kwere onwe ha nkwa ọlụlụ, ma, ha alụbeghị. Meri jụrụ n’ezoghị ọnụ, sị: “Olee otú nke a ga-esi mee, ebe ọ bụ na mụ na nwoke ọ bụla enwetụbeghị mmekọahụ?” (Luk 1:34) Meri emeghị ihere ikwu na ya amaghị nwoke. Kama nke ahụ, ọ bụụrụ ya ihe ùgwù na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Taa, ọtụtụ ndị na-eto eto na-agbara ngwa ngwa mara nwoke ma ọ bụ nwaanyị, na-akwa ndị jidere onwe ha emo. N’ezie, ụwa agbanweela. Ma, Jehova adịghị agbanwe agbanwe. (Malakaị 3:6) Jehova hụrụ ndị na-eme omume ọma n’anya dị ka ọ hụrụ ha n’anya n’oge Meri.—Ndị Hibru 13:4.

Ọ bụ ezie na Meri bụ ezi ohu Chineke, ma, o zughị okè. Oleezi otú ọ ga-esi mụọ nwa zuru okè, bụ́ Ọkpara Chineke? Gebriel kwuru, sị: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.” (Luk 1:35) Ihe dị nsọ pụtara “ihe dị ọcha,” “ihe na-enweghị ntụpọ,” “ihe na-arụghị arụ.” Ụmụ mmadụ na-ebufe ụmụ ha adịghị ọcha na mmehie. Ma, n’ọmụmụ Jizọs, Jehova ga-arụ ọrụ ebube pụrụ iche. Ọ ga-esi n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa Meri, ma jiri ike ya nọ n’ọrụ, ma ọ bụ mmụọ nsọ, ‘kpuchie’ Meri, chebe nwa ahụ ka ọ ghara ibute mmehie. Meri ò kwetara ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya? Olee ihe o kwuru?

Ihe Meri Gwara Gebriel

Ndị na-ekweghị n’ọrụ ebube ahụ, nakwa ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst, ekweghị na nwaanyị na-amaghị nwoke nwere ike ịmụ nwa. N’agbanyeghị akwụkwọ niile ha gụrụ, ha anaghị aghọta eziokwu a dị mfe nghọta. Dị ka Gebriel kwuru, “n’ebe Chineke nọ, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.” (Luk 1:37) Meri kweere na ihe Gebriel gwara ya bụ eziokwu, n’ihi na ọ bụ nwa agbọghọ nwere okwukwe dị ukwuu. Ma, ọ naghị ekwere ihe ọ bụla ọ nụrụ. Dị ka mmadụ ọ bụla nke na-echezi echiche echezi, Meri ga-achọ ịhụ ihe àmà ga-eme ka o nwee okwukwe n’ihe a gwara ya. Gebriel dị njikere inye ya ihe àmà ahụ. Ọ gwara ya banyere otu onye ikwu ya merela agadi bụ́ Elizabet, onye a maara kemgbe na ọ bụ nwaanyị aga. Chineke emeela ka ọ tụrụ ime!

Olee ihe Meri ga-eme ugbu a? Ọ hụla ọrụ ọ ga-arụ, hụkwa ihe àmà na-egosi na Chineke ga-eme ihe niile Gebriel kwuru. Anyị ekwesịghị iche na ọrụ ọma a e nyere ya atụghị ya ụjọ, ma ọ bụ chee na o sighịrị ya ike. Otu ihe mere nke a ji bụrụ eziokwu bụ na ya na Josef kwere onwe ha nkwa ọlụlụ. Olee otú ọ ga-esi lụọ ya ma ọ bụrụ na ọ chọpụta na ọ dị ime? Ihe ọzọ bụ na ọrụ ahụ e nyere ya ga-abụrụ ya ọrụ na-adịghị mfe. Ọ ga-eburu ndụ nke onye kacha mkpa n’ihe niile Chineke kere eke n’afọ, ya bụ, Ọkpara Ya ọ hụrụ n’anya! Ọ bụ ya ga-elekọta ya mgbe ọ dị obere, chebekwa ya n’ime ụwa ọjọọ a. N’ezie, ọ bụ ọrụ tara akpụ!

Baịbụl gosiri na o nweela mgbe ndị ikom obi siri ike bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-ekwechaghị ịnara ọrụ siri ike Chineke nyere ha. Mozis kwuru na ya anaghị ekwu okwu were were, na ya agaghị abụli ọnụ na-ekwuru Chineke. (Ọpụpụ 4:10) Jeremaya kwuru na ya bụ “nwata,” na ya dị nnọọ obere ịrụ ọrụ Chineke nyere ya. (Jeremaya 1:6) Jona gbara ọsọ n’ihi ọrụ Chineke nyere ya! (Jona 1:3) Oleekwanụ maka Meri?

A ka na-echeta okwu o kwuru n’ihi na okwu ndị ahụ na-egosi ịdị umeala n’obi na nrubeisi. Ọ gwara Gebriel, sị: “Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova! Ka o mee dị ka i kwuru.” (Luk 1:38) Nwa agbọghọ bụ́ ohu bụ odibo kacha dị ala; ndụ ya dị n’aka onyenwe ya. Ọ bụ otú ahụ ka Meri si were onwe ya n’ebe Onyenwe ya, bụ́ Jehova, nọ. Ọ ma na ebe ndụ ya dị n’aka Chineke na o nweghị ihe ga-eme ya, na ọ na-eguzosi ike n’ihe n’ebe ndị na-eguzosi ike n’ihe n’ebe ọ nọ, nakwa na ọ ga-agọzi ya ma ọ bụrụ na ya emee ihe niile ya nwere ike ime n’ọrụ ahụ siri ike o nyere ya.—Abụ Ọma 18:25.

Mgbe ụfọdụ, Chineke na-agwa anyị ka anyị mee ihe nwere ike isi ike, ma ọ bụ ọbụna yie ihe na-agaghị ekwe omume, n’anya anyị. Ma, n’Okwu ya, ọ gwara anyị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tụkwasị ya obi, ma tinye ndụ anyị n’aka ya otú ahụ Meri mere. (Ilu 3:5, 6) Ànyị ga-eme otú ahụ? Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ga-akwụ anyị ụgwọ, bụ́ nke ga-eme ka anyị nwekwuo okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ.

O Letara Elizabet

Ihe Gebriel gwara Meri banyere Elizabet baara ya uru nke ukwuu. Ọ dịghị nwaanyị ọzọ nọ n’ụwa ga-aghọta ọnọdụ ya otú Elizabet ga-aghọta ya. Meri gawara ngwa ngwa n’ógbè Juda bụ́ ugwu ugwu, njem ahụ were ya ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ, ma eleghị anya. Mgbe ọ banyere n’ụlọ Elizabet na Zekaraya bụ́ onye nchụàjà, Jehova mere ka Meri hụkwuo ihe àmà doro anya ga-eme ka okwukwe ya sie ike. Ozugbo Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa o bu n’afọ maliri elu n’ihi ọṅụ. O jupụtara na mmụọ nsọ, o wee kpọọ Meri “nne nke Onyenwe m.” Chineke kpugheere Elizabet na nwa Meri ga-abụ Onyenwe ya, bụ́ Mesaya. Mmụọ nsọ kpalikwara ya ịja Meri mma maka otú o si rube isi ma kwesị ntụkwasị obi, sị: “Obi ụtọ na-adịkwara nwaanyị nke kweere.” (Luk 1:39-45) N’ezie, ihe niile Jehova kwere Meri ná nkwa ga-emezu!

Meri mechara kwuo okwu. E jikwa nlezianya dee ihe o kwuru na Luk 1:46-55. Ọ bụ nke a kacha ogologo n’okwu niile Meri kwuru e dere na Baịbụl, o mekwara ka a mata ọtụtụ ihe banyere ya. O gosiri na o nwere ekele mgbe o nyere Jehova otuto maka otú o si gọzie ya site n’inye ya ọrụ ọma nke ịbụ nne Mesaya. O gosiri okwukwe dị ukwuu mgbe o kwuru na Jehova na-eweda ndị mpako na ndị nwere ike n’ala ma na-enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na ndị ogbenye bụ́ ndị na-efe ya ofufe aka. O gosikwara otú o nweruru ihe ọmụma. Otu nchọpụta e mere gosiri na o kwuru ihe karịrị ihe iri abụọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru!

O doro anya na Meri chebaara Okwu Chineke echiche nke ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị umeala n’obi, o kwuru ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, ọ bụghị ihe si n’echiche nke aka ya. Nwa ahụ ọ dị ime ya ga-emecha mee otú ahụ o mere. Ọ sịrị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-akwanyere Okwu Chineke ụdị ùgwù a? Ka m̀ na-enwe mmasị n’echiche nke m na n’ozizi nke m?’ Ihe Meri mere doro anya.

Meri nọnyeere Elizabet ruo ọnwa atọ, o doro anya na ha gbarịtara onwe ha ume nke ukwuu. (Luk 1:56) Ụmụ nwaanyị abụọ ahụ na-echetara anyị uru enyi bara. Ọ bụrụ na anyị na-eme ndị hụrụ Chineke anyị, bụ́ Jehova, n’anya enyi, anyị na Chineke ga-adịkwu ná mma, anyị ga-abịarukwu ya nso. (Ilu 13:20) N’ikpeazụ, oge ruru ka Meri laa n’ụlọ ya. Gịnị ka Josef ga-ekwu ma ọ hụ ọnọdụ ya?

Meri na Josef

Meri ahapụghị ka afọ ya buo ibu tupu ya agwa Josef banyere ya. O doro anya na ọ kọọrọ Josef. Tupu ya agakwuru Josef, ọ ga-abụ na ọ nọ na-eche ihe nwoke omume ọma a, nke na-atụ egwu Chineke, ga-eme mgbe ọ ga-anụ ihe ọ ga-akọrọ ya. Ma, ọ gakwuuru ya ma gwa ya ihe niile merenụ. Dị ka i nwere ike iche, o nyere Josef nsogbu n’obi nke ukwuu. Ọ chọrọ ikweta ihe nwa agbọghọ a ọ hụrụ n’anya kwuru, ma ihe ọ kọọrọ ya emetụbeghị mbụ. Baịbụl ekwughị ihe ọ nọ na-eche. Ma, ihe Baịbụl kwuru bụ na o kpebiri ịgba ya alụkwaghị m, n’ihi na n’oge ahụ, a na-ewere ndị kwere onwe ha nkwa ọlụlụ dị ka di na nwunye. Otú ọ dị, ọ chọghị imenye ya ihere n’ihu ọha ma ọ bụ mee ka a taa ya ahụhụ, ọ bụ ya mere o ji chọọ ịhapụ ya na nzuzo. (Matiu 1:18, 19) Ọ ghaghị ịbụ na o wutere Meri ịhụ na ọnọdụ a a na-ahụtụbeghị mbụ wutere nwoke obi ọma a nke ukwuu. Ma, o wuteghị Meri na Josef ekwetaghị ihe ọ gwara ya.

Jehova ekweghị ka Josef mee ihe ahụ o chere kacha mma ime. Mmụọ ozi Chineke gwara ya ná nrọ na ime Meri dị bụ ọrụ ebube. Nke ahụ mere ka obi lọdata ya. Josef meziri ihe Meri mere ná mmalite, ya bụ, ịgbaso ihe Jehova kwuru. Ọ lụrụ Meri ma jikere ịrụ ọrụ pụrụ iche nke bụ́ ilekọta Ọkpara Jehova.—Matiu 1:20-24.

Ndị lụrụ di na nwunye na ndị ka na-achọ ịlụ alụ kwesịrị ịmụta ihe n’aka di na nwunye ahụ lụrụ na puku afọ abụọ gara aga. Mgbe Josef hụrụ ka nwunye ọhụrụ ya na-arụ ọrụ e nyere ya ma na-elekọta nwa ahụ, o doro anya na obi tọrọ ya ụtọ na mmụọ ozi Jehova gwara ya ihe ọ ga-eme. Ọ ghaghị ịbụ na Josef hụrụ na ọ dị mkpa mmadụ ịdabere na Jehova mgbe ọ na-eme mkpebi ndị dị mkpa. (Abụ Ọma 37:5; Ilu 18:13) O doro anya na ọ nọgidere jiri nlezianya na obiọma na-eme mkpebi dị ka onyeisi ezinụlọ.

N’aka nke ọzọ, olee ihe anyị nwere ike ikwu n’ihi otú Meri si nwee mmasị ịlụ Josef? Ọ bụ ezie na o siiri Josef ike ikweta ihe Meri kọọrọ ya, Meri cheere ka onye a ga-abụ onyeisi ezinụlọ ya kpebie ihe ọ ga-eme. N’ezie, ọ mụtara na inwe ndidi dị mkpa nke ukwuu, ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst taa kwesịkwara ịmụta ihe na ya. N’ikpeazụ, ọ ga-abụ na ihe ndị ahụ merenụ kụziiri ma Josef ma Meri na ikwurịta okwu nke ọma n’ezoghị ihe ọ bụla bara uru nke ukwuu.

N’ezie, di na nwunye ahụ malitere alụmdi na nwunye ha n’ezi ntọala. Ha abụọ hụrụ Jehova bụ́ Chineke n’anya karịa ihe ọ bụla, ha chọsikwara ike ime ihe ga-atọ ya ụtọ site n’ịbụ nne na nna ji ọrụ ha kpọrọ ihe, ndị hụrụ nwa ha n’anya. N’eziokwu, ha ka ga-enweta ngọzi dị ukwuu, nwetakwa ọrụ siri ike. Ọrụ chere ha ihu bụ ịzụ Jizọs, bụ́ onye ga-eto ghọọ nwoke kacha ukwuu nke bitụrụla n’ụwa.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ịhụ Chineke n’anya bụ ntọala kacha mma maka alụmdi na nwunye