Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iwe Nwanne Wesara Nwanne Ya

Iwe Nwanne Wesara Nwanne Ya

Maka Ndị Na-eto Eto

Iwe Nwanne Wesara Nwanne Ya

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri anya nke uche gị kirie ebe ihe ahụ mere. Nụrụ olu ndị ahụ ị na-agụ banyere ha. Ka ihe ha na-eme ruo gị n’ahụ́. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 4:1-12.

Olee otú i chere Ken dị, oleekwa ụdị àgwà o nwere? Oleekwanụ maka Ebel?

․․․․․

Olee “ọrụ nke anụ ahụ́” Ken tinyere aka na ya, oleekwa otú anyị si mara? (Ndị Galeshia 5:19-21)

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.—GỤGHACHI AMAOKWU NKE 4 RUO NKE 7.

Ọ̀ bụ naanị onyinye ndị ahụ ka Jehova nabatara ma ọ bụ jụ, ka ò nwere ihe ọzọ ka dịrị ya mkpa? (Ilu 21:2)

․․․․․

Olee mgbe iwe iwe na-abụghị ihe ọjọọ, ma, gịnị mere “iwe dị ọkụ” Ken were ji jọgbuo onwe ya?

․․․․․

Olee mgbe ekworo na-abụghị ihe ọjọọ, ma, olee ihe mere ekworo Ken kworo na-ejighị kwesị ekwesị? (1 Ndị Eze 19:10)

․․․․․

Olee ihe Ken gaara eme iji ‘merie’ iwe ya?

․․․․․

TINYE IHE Ị MỤTARA N’ỌRỤ. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Iwe.

․․․․․

Ekworo.

․․․․․

Otú mmadụ nwere ike isi ‘merie’ ọchịchọ ọjọọ.

․․․․․

OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A, Ọ̀ BỤ N’IHI GỊNỊ?

․․․․․