Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma!

Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma!

Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma!

“Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị; n’ihi na ị maghị ebe ọ ga-eme nke ọma.”—EKLI. 11:6.

1. Gịnị mere ikiri otú ihe a kụrụ n’ala si eto ji atụ n’anya ma na-eme ka mmadụ wetuo onwe ya ala?

ONYE ọrụ ubi kwesịrị inwe ndidi. (Jems 5:7) Ọ bụrụ na ọ ghachaa mkpụrụ, ọ ga-eche ruo mgbe ọ ga-epupụta ma too. Ọ bụrụ na ihe gaa otú o kwesịrị, mkpụrụ ahụ ga-eji nwayọọ nwayọọ tupuo ala ma pupụta. Ihe a a kụrụ ga-emecha mịa mkpụrụ. N’ikpeazụ, onye ọrụ ubi ahụ enweela ubi ọ ga-abịa ewe ihe ubi na ya. Otú ihe a kụrụ n’ala si eto na-adị nnọọ ịtụnanya! Icheta Onye na-eme ka ihe a kụrụ n’ala too na-eme ka anyị wetuo onwe anyị ala. Anyị nwere ike ilekọta ihe a kụrụ n’ala. Anyị nwekwara ike inye aka gbaa ya mmiri. Ma ọ bụ naanị Chineke nwere ike ime ka o too.—Tụlee 1 Ndị Kọrịnt 3:6.

2. Olee ihe ndị Jizọs kụziri banyere otú mmadụ si aghọ onye na-eso ụzọ ya n’ihe atụ ndị ahụ anyị tụlere n’isiokwu bu ụzọ?

2 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, Jizọs ji ọrụ ikwusa ozi ọma tụnyere onye ọrụ ubi na-agha mkpụrụ. N’ihe atụ ahụ banyere ụdị ala dị iche iche, Jizọs kwuru na ọ bụ ezie na onye ọrụ ubi ahụ ghara ezigbo mkpụrụ, ọ bụ obi onye a ghara mkpụrụ ahụ n’ime ya ga-ekpebi ma mkpụrụ ahụ ọ̀ ga-eto mịa mkpụrụ ma ọ̀ bụ na ọ gaghị eme otú ahụ. (Mak 4:3-9) N’ihe atụ nke ọgha mkpụrụ ahụ hiri ụra, Jizọs kwuru na onye ọrụ ubi ahụ aghọtachaghị otú mkpụrụ ahụ si pulite ma too ogologo. Nke a bụ n’ihi na ọ bụghị mgbalị mmadụ mere na-eme ka ihe a kụrụ too, kama ọ bụ Chineke na-eme ka o too. (Mak 4:26-29) Ugbu a ka anyị tụlekwuo ihe atụ atọ ndị ọzọ Jizọs nyere—nke mkpụrụ osisi mọstad, nke ihe iko achịcha, nakwa nke ụgbụ. *

Ihe Atụ nke Mkpụrụ Osisi Mọstad

3, 4. Olee ihe ndị ihe atụ nke mkpụrụ osisi mọstad ahụ na-eme ka anyị ghọta banyere ozi ọma Alaeze ahụ?

3 Ihe atụ nke mkpụrụ osisi mọstad, bụ́kwanụ nke e dekọrọ na Mak isi 4, mere ka ihe abụọ pụta ìhè: nke mbụ bụ otú ọtụtụ ndị si anabata ozi ọma Alaeze ahụ; nke abụọ bụ otú e si echebe ndị nabatara ozi ọma ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Olee ihe anyị ga-eji alaeze Chineke tụnyere, ma ọ bụ, olee ihe atụ anyị ga-eji kọwaa ya? Ọ dị ka mkpụrụ osisi mọstad, nke bụ́ mkpụrụ kasị nta n’ime mkpụrụ niile dị n’ụwa n’oge a kụrụ ya n’ala—ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-etolite ma dị ukwuu karịa mkpụrụ akụ́kụ́ niile ọzọ, ọ na-epupụtakwa alaka ndị buru ibu, nke mere na ụmụ nnụnụ nke eluigwe na-enwe ike ịchọta ebe ha ga-ebi n’okpuru ndò ya.”—Mak 4:30-32.

4 N’ebe a, anyị na-ahụ ihe atụ otú “alaeze Chineke” si too, bụ́ nke ihe gosiri ya bụ otú ozi ọma Alaeze ahụ si gbasaa, nakwa otú ọgbakọ Ndị Kraịst si mụbaa malite na Pentikọst 33 O.A. gawa. Mkpụrụ osisi mọstad na-adị nnọọ obere, a na-ejikwa ya anọchi anya ihe pere nnọọ mpe. (Tụlee Luk 17:6.) Mọstad na-emecha toruo ihe dị ka mita atọ ruo ise n’ogologo nke na ọ na-aghọ osisi gbara agba nwere alaka.—Mat. 13:31, 32.

5. Olee ụdị mmụba e nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ?

5 Ọ bụ n’afọ 33 O.A., bụ́ mgbe e jichara mmụọ nsọ tee ihe dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst dị otu narị na iri mmadụ abụọ mmanụ, ka ọgbakọ Ndị Kraịst malitere iji nke nta nke nta na-amụba. O teghị aka e nwee ọtụtụ puku ndị na-eso ụzọ Kraịst n’obere ọgbakọ ahụ. (Gụọ Ọrụ 2:41; 4:4; 5:28; 6:7; 12:24; 19:20.) Mgbe ihe dị ka iri afọ atọ gachara, ndị so na-ewe ihe ubi ahụ mụbara nke ukwuu nke na Pọl onyeozi nwere ike ịgwa ọgbakọ dị na Kọlọsi na e kwusaala ozi ọma “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Kọl. 1:23) Nke a bụ nnọọ mmụba dị ịtụ n’anya!

6, 7. (a) Olee mmụba e nwerela kemgbe 1914? (b) Olee mmụba a ka ga-enwe?

6 Kemgbe e hiwechara Alaeze Chineke n’eluigwe n’afọ 1914, alaka “osisi” mọstad ahụ amụbaala otú a na-atụghị anya ya. Ndị Chineke ahụla ka amụma ahụ Aịzaya dekọrọ na-emezu n’ụzọ nkịtị. Ọ sịrị: “Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike.” (Aịza. 60:22) Ọ dịghị otú obere ìgwè ndị ahụ e tere mmanụ nọ na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ná mmalite nke afọ ndị 1900 gaara esi echewe na ka ọ na-erule afọ 2008, ihe dị ka nde Ndịàmà asaa ga-eso na-arụ ọrụ a n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. Nke a bụ n’ezie mmụba dị ịtụnanya, nke yiri otú mkpụrụ osisi mọstad ahụ Jizọs ji mee ihe atụ si too!

7 Ma mmụba ahụ ọ̀ kwụsịrị ebe ahụ? Mba. Oge ga-abịa mgbe ndị niile bi n’ụwa ga-abụ ndị Alaeze Chineke na-achị. Tupu nke a, e wepụla ndị niile na-emegide Alaeze ahụ. Ọ bụghị mgbalị ụmụ mmadụ ga-eme ka nke a mee kama ọ ga-abụ n’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-etinye aka n’ihe na-eme n’ụwa. (Gụọ Daniel 2:34, 35.) Mgbe ahụ ka anyị ga-ahụzi mmezu ikpeazụ nke amụma ọzọ Aịzaya dekọrọ, bụ́ nke na-asị: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.”—Aịza. 11:9.

8. (a) Olee ndị ka nnụnụ ahụ dị n’ihe atụ Jizọs na-anọchi anya ha? (b) Olee ihe a na-echebe anyị pụọ na ya taa?

8 Jizọs kwuru na ụmụ nnụnụ nke eluigwe na-enwe ike ịchọta ebe ha ga-ebi n’okpuru ndo Alaeze a. Nnụnụ ndị a adịghị anọchi anya ndị iro nke Alaeze ahụ bụ́ ndị na-achọ irichapụ mkpụrụ ndị dị mma, dị ka nnụnụ ndị nke ahụ e kwuru okwu ha n’ihe atụ nke nwoke ahụ ghara mkpụrụ n’ụdị ala dị iche iche mere. (Mak 4:4) Kama n’ihe atụ a, nnụnụ ndị ahụ na-anọchi anya ndị nwere obi eziokwu, bụ́ ndị batara n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka e wee chebe ha. Ruokwa ugbu a, a na-echebe ndị dị otú a pụọ n’àgwà ọjọọ ndị na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma nakwa omume nke ụwa ọjọọ a ndị ga-eme ka ha bụrụ ndị rụrụ arụ n’anya Chineke. (Tụlee Aịzaya 32:1, 2.) N’ụzọ yiri nke a, Jehova ji Alaeze Mesaya ahụ tụnyere osisi ma buo amụma, sị: “N’ugwu dị elu nke dị n’Izrel ka m ga-adọgharị ya, ọ ga-awakwa alaka ma mịa mkpụrụ, ghọọkwa osisi sida dị ukwuu. Nnụnụ niile ndị nwere ụdị nku ọ bụla ga-ebi n’okpuru ya; ha ga-ebikwa na ndò nke alaka ya.”—Ezik. 17:23.

Ihe Atụ nke Ihe Iko Achịcha Ahụ

9, 10. (a) Olee ihe Jizọs mere ka ọ pụta ìhè n’ihe atụ nke ihe iko achịcha ahụ? (b) Na Baịbụl, gịnị ka ihe iko achịcha na-anọchikarị anya ya, oleekwa ajụjụ anyị ga-atụle banyere ihe iko achịcha Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ a?

9 Ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ na-ahụ otú ihe si eto. Jizọs mere ka nke a pụta ìhè n’ihe atụ ya nke sochirinụ. Ọ sịrị: “Alaeze eluigwe dị ka ihe iko achịcha, nke nwaanyị weere tinye n’ime ntụ ọka nke juru arịa atọ buru ibu, ruo mgbe ntụ ọka ahụ dum koro eko.” (Mat. 13:33) Gịnị ka ihe iko achịcha ahụ na-anọchi anya ya, oleekwa ihe jikọrọ ya na uto nke Alaeze ahụ?

10 Na Baịbụl, ihe iko achịcha na-anọchikarị anya mmehie. Pọl onyeozi kọwara mmehie dị ka ihe iko achịcha mgbe ọ na-ekwu otú onye mmehie nwere ike isi metụta ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt oge ochie. (1 Kọr. 5:6-8) Ihe iko achịcha Jizọs kwuru okwu ya ebe a ọ̀ na-anọchi anya uto nke ihe na-adịghị mma?

11. Olee ihe e ji ihe iko achịcha eme n’Izrel oge ochie?

11 Tupu anyị azaa ajụjụ ahụ, ọ dị mkpa ka anyị buru ihe atọ dị mkpa n’uche. Nke mbụ, ọ bụ eziokwu na Jehova ekweghị ka e jiri ihe iko achịcha mee ihe n’oge a na-eme Ememme Ngabiga, e nwere oge ndị ọzọ ọ nabatara àjà ndị e tinyere ihe iko achịcha. A na-etinye ihe iko achịcha n’àjà udo e ji enye Jehova ekele, bụ́ nke onye wetara ihe e ji chụọ àjà a na-eji obi ya eweta ya iji nye Jehova ekele maka ọtụtụ ụzọ o si gọzie ya. Nri a na-ewetara ndị so rie ya obi ụtọ.—Lev. 7:11-15.

12. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú e si eji ihe atụ akọwa ihe na Baịbụl?

12 Nke abụọ, ọ bụ ezie na otu ihe nwere ike ịnọchi anya ihe na-adịghị mma n’Akwụkwọ Nsọ, e nwekwara ebe ndị ọzọ o nwere ike ịnọchi anya ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, na 1 Pita 5:8, e ji Setan tụnyere ọdụm, na-akọwa otú o si dị obi ọjọọ ma nwee ike ịdọgbu mmadụ. Ma ná Mkpughe 5:5, e ji Jizọs tụnyere ọdụm—“ọdụm nke si n’ebo Juda.” N’ebe a, ọdụm nọchiri anya iji obi ike ekpe ikpe ziri ezi.

13. Gịnị ka ihe atụ Jizọs banyere ihe iko achịcha na-egosi banyere otú mmadụ si aghọ onye na-eso ụzọ ya?

13 Nke atọ, n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere, o kwughị na ihe iko achịcha ahụ mebiri ntụ ọka ahụ niile, nke na o nweghịzi ihe a ga-eji ntụ ọka ahụ mee. Naanị ihe ọ nọ na-ekwu okwu ya bụ otú e si eme bred. Nwaanyị na-eme bred ezinụlọ ya ga-ata na-ama ụma etinye ihe na-eko achịcha na ya, ọ na-emekwa ka bred ya dị mma. Ihe iko achịcha ahụ na-ezo ná ntụ ọka e ji eme bred ahụ. Ya bụ na nwaanyị ahụ adịghị ahụ ihe iko achịcha ahụ mgbe ọ nọ ná ntụ ọka ahụ. Nke a na-echetara anyị nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ma lakpuo ụra n’abalị. Jizọs kwuru, sị: “Mkpụrụ ndị ahụ wee pulite ma too ogologo, otú o si mee, [nwoke ahụ] amaghị.” (Mak 4:27) Nke a bụ ụzọ dị nnọọ mfe nghọta isi kọwaa otú a na-adịghị ahụ anya mmadụ si aghọ onye na-eso ụzọ Kraịst! O nwere ike ná mmalite anyị agaghị ahụ otú nke ahụ si na-aga, ma n’ikpeazụ, ọ na-apụta ìhè.

14. Olee ihe banyere ọrụ nkwusa anyị nke okuko ihe iko achịcha ahụ koro ntụ ọka niile ahụ na-anọchi anya ya?

14 Ọ bụghị naanị na a naghị ahụ uto a kamakwa a na-enwe uto a n’ụwa niile. Nke a bụ ihe ọzọ pụtara ìhè n’ihe atụ nke ihe iko achịcha ahụ. Ihe iko achịcha ahụ na-eko ntụ ọka ahụ niile, ya bụ “arịa atọ buru ibu.” (Luk 13:21) Dị ka ihe iko achịcha, ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nke na-eme ka mmadụ ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst agbasaala ruo n’ókè nke na a na-ekwusa Alaeze ahụ ugbu a ruo “n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8; Mat. 24:14) Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù magburu onwe ya iso na-eme ka ọrụ Alaeze a na-agbasa!

Ụgbụ Ahụ

15, 16. (a) Kọọ ihe atụ ụgbụ ahụ ná mkpirikpi. (b) Gịnị ka ụgbụ ahụ na-anọchi anya ya, oleekwa ihe ihe atụ a na-akọwa banyere uto Alaeze ahụ?

15 Ihe dị mkpa abụghị mmadụ ole sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kama ọ bụ ụdị ndị na-eso ụzọ ha bụ. Jizọs mere ka ihe a metụtara uto Alaeze ahụ pụta ìhè mgbe o nyere ihe atụ ọzọ banyere ụgbụ. O kwuru, sị: “Ọzọ, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri nke na-ekpokọta ụdị azụ̀ niile.”—Mat. 13:47.

16 Ụgbụ ahụ, bụ́ nke na-anọchi anya ọrụ nkwusa Alaeze, nwụdere ụdị azụ ọ bụla. Jizọs gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe [ụgbụ ahụ] juru, ha dọgotara ya n’ikpere osimiri, ha wee nọdụ ala, chịkọta ndị dị mma wụnye n’arịa dị iche iche, ma ha tụfuru ndị na-adịghị mma. Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a: ndị mmụọ ozi ga-aga kewapụ ndị ajọ omume n’etiti ndị ezi omume, ha ga-atụbakwa ha n’oké ọkụ. N’ebe ahụ ka ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.”—Mat. 13:48-50.

17. Olee oge nkewa ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ nke ụgbụ ahụ na-ezo aka na ya?

17 Nkewa a ọ̀ na-ezo aka n’ikpe ikpeazụ a ga-ekpe ụmụ atụrụ na ụmụ ewu nke Jizọs kwuru ga-eme mgbe ọ bịara n’ebube ya? (Mat. 25:31-33) Mba. A ga-ekpe ikpe ikpeazụ ahụ mgbe Jizọs ga-abịa n’oge oké mkpagbu ahụ. Ma nkewa ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ nke ụgbụ ahụ ga-abụ ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’ * Nke bụ́ oge anyị bi na ya ugbu a—oge na-eduga n’oké mkpagbu ahụ. Oleezi otú e si na-arụ ọrụ nkewa ugbu a?

18, 19. (a) Olee otú ọrụ nkewa si na-aga n’ihu ugbu a? (b) Gịnị ka ndị nwere ezi obi kwesịrị ime? (Leekwa ihe e dere n’ala ala peeji nke 21.)

18 N’ụzọ nkịtị, a na-adọta nnọọ ọtụtụ nde azụ ihe atụ si n’oké osimiri bụ́ ọha mmadụ, n’ọgbakọ Jehova n’oge a. Ụfọdụ n’ime ha na-abịa Ncheta nke ọnwụ Jizọs, ndị ọzọ na-abịa ọmụmụ ihe anyị, ebe ndị ọzọ na-enwe mmasị ka anyị na-amụrụ ha Baịbụl. Ma ndị a niile hà na-aghọ ezigbo Ndị Kraịst? Ha nwere ike iso ná ndị a “dọgotara n’ikpere osimiri,” ma Jizọs kwuru na ọ bụ naanị “ndị dị mma” ka a wụnyere n’arịa dị iche iche, bụ́ nke ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst na-anọchi anya ha. A tụfuru ndị nke na-adịghị mma, bụ́ ndị a ga-emecha tụba n’oké ọkụ ihe atụ, nke na-anọchi anya mbibi a ga-ebibi ha n’ọdịnihu.

19 Dị ka ọ dị azụ ndị nke ahụ na-adịghị mma, ọtụtụ ndị ndị Jehova na-amụrụ ihe akwụsịla ịmụ Baịbụl. Ụfọdụ ndị a mụrụ n’ezinụlọ Ndị Kraịst enweghị mmasị iso ụzọ Jizọs. Ha adịbeghị njikere ikpebi ijewere Jehova ozi, ụfọdụ ndị nke metụrụla otú ahụ akwụsịla ijere Jehova ozi. * (Ezik. 33:32, 33) Ma, ọ dị oké mkpa ugbu a ka ndị niile nwere obi eziokwu kwe ka a chịkọta ha n’ọgbakọ dị iche iche nke yiri arịa tupu ụbọchị ikpe ikpeazụ, ọ dịkwa mkpa ka ha nọgide n’ebe ga-echebe ha.

20, 21. (a) Gịnị ka anyị mụtarala site n’ịtụle ihe atụ ndị Jizọs nyere banyere uto? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

20 Olee ihe ndị anyị mụtara site ná ntụle a dị mkpirikpi anyị tụlere ihe atụ Jizọs nyere banyere uto? Nke mbụ, dị ka mkpụrụ mọstad si eto, e nweela uto dị ukwuu n’ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ụwa a. Ọ dịghị ihe ọ bụla ga-egbochi ọrụ Jehova ịga n’ihu! (Aịza. 54:17) Tụkwasị na nke ahụ, a na-echebe ndị gara ‘biri na ndò nke osisi ahụ’ ka Setan na ụwa ọjọọ ya ghara inweta ha. Nke abụọ, ọ bụ Chineke na-eme ka a na-enwe uto. Dị nnọọ ka ihe iko achịcha zoro ezo na-eko ntụ ọka buru ibu, ọ bụghị mgbe niile ka a na-ahụ ma ọ bụ ghọta uto a nke ọma, ma ọ na-eto n’ezie. Nke atọ, ọ bụghị ndị niile kwere ịmụ ihe na-emecha ghọọ ndị dị mma. Ụfọdụ aghọọla azụ ndị ahụ na-adịghị mma e kwuru okwu ha n’ihe atụ Jizọs.

21 Ọ bụ nnọọ ihe na-agba ume ịhụ ka Jehova na-adọta ọtụtụ ndị dị mma! (Jọn 6:44) Nke a emeela ka e nwee mmụba dị ukwuu ná mba dị iche iche. Ọ bụ Jehova Chineke ka otutu niile na-agara maka uto a. Mmụba ndị a niile anyị na-ahụ kwesịrị ịkpali onye ọ bụla n’ime anyị irube isi na ndụmọdụ e nyere ọtụtụ narị afọ gara aga, bụ́ nke na-asị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ . . . , n’ihi na ị maghị ebe ọ ga-eme nke ọma, ma ọ̀ bụ n’ebe a ma ọ bụ n’ebe ahụ, ma ọ̀ bụ na ha abụọ ga-adịcha mma.”—Ekli. 11:6.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 E mere mgbanwe ụfọdụ ná nkọwa e nyere ugbu a na nke dị n’Ụlọ Nche June 15, 1992, peeji nke 17-22, nakwa n’Ụlọ Nche nke April 1, 1976, peeji nke 205-222.

^ par. 17 Ọ bụ ezie na Matiu 13:39-43 na-ekwu banyere akụkụ dị iche nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, mmezu ya dabara n’oge ihe atụ ụgbụ ahụ na-emezu, ya bụ, n’oge “ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” Nkewa nke azụ ihe atụ ndị ahụ bụ ọrụ na-aga n’ihu, dị nnọọ ka ọrụ ịkụ mkpụrụ na iwe ihe ubi na-aga n’ihu n’oge a niile.—Ụlọ Nche, October 15, 2000, peeji nke 25-26; Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe, peeji nke 178-181, paragraf 8-11.

^ par. 19 Nke a ọ̀ pụtara na ndị mmụọ ozi atụfuola onye ọ bụla kwụsịrịla iso ndị Jehova na-amụ ihe ma ọ bụ onye kwụsịrịla ịbịa ọmụmụ ihe, na-agụnye ya ná ndị na-adịghị mma? Ee e! Ọ bụrụ na e nwee onye ji obi ya niile chọọ ịlọghachikwute Jehova, ọ ga-anabata ya.—Mal. 3:7.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Gịnị ka ihe atụ Jizọs banyere mkpụrụ mọstad ahụ na-akụziri anyị banyere uto ndị a na-enwe n’ihe ndị metụtara Alaeze ahụ na otú e si echebe anyị pụọ n’aka Setan na ụwa ọjọọ ya?

• Gịnị ka ihe iko achịcha ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ Jizọs na-anọchi anya ya, oleekwa eziokwu Jizọs mere ka ọ pụta ìhè banyere uto nke ihe ndị metụtara Alaeze ahụ?

• Olee ihe metụtara uto Alaeze ahụ nke ihe atụ ụgbụ ahụ na-akọwa?

• Olee otú anyị ga-esi hụ na anyị nọgidere bụrụ ndị a ‘wụnyere n’arịa dị iche iche’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Gịnị ka ihe atụ nke mkpụrụ mọstad na-akụziri anyị banyere mmụba a na-enwe n’ihe ndị metụtara Alaeze ahụ?

[Foto dị na peeji nke 19]

Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe atụ ahụ banyere ihe iko achịcha?

[Foto dị na peeji nke 21]

Gịnị ka ikewapụta azụ ndị na-adịghị mma site n’azụ ndị dị mma na-anọchi anya ya?