Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee asụsụ Jizọs sụrụ?

Ndị ọkà mmụta enweghị otu olu banyere asụsụ Jizọs sụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Otú ọ dị, o yiri ka ọ̀ bụ asụsụ Hibru na asụsụ Arameik ka ọ sụrụ. Mgbe Jizọs bịara Nazaret nke dị na Galili, ọ banyere n’ụlọ nzukọ dị n’ebe ahụ wee gụọ amụma Aịzaya. O doro anya na ọ gụrụ amụma ahụ otú e si dee ya n’asụsụ Hibru. Baịbụl ekwughị na Jizọs sụgharịrị ya n’asụsụ Arameik.—Luk 4:16-21.

Ọkà mmụta bụ́ G. Ernest Wright kwuru banyere asụsụ ndị a na-asụ na Palestaịn n’oge Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, sị: “O yiri ka asụsụ a na-asụkarị bụ Grik na Arameik . . . ikekwe, asụsụ ndị agha Rom na ndị ọzọ na-arụrụ ọchịchị Rom ọrụ ji akparịta ụka bụ Latịn, ebe ọ ga-abụ asụsụ Hibru a na-asụ n’oge ahụ ka ezigbo ndị Juu ji akparịta ụka.” Ọ bụ ya mere Paịlet ji jiri asụsụ atọ bụ́ Hibru, Latịn, na Grik dee ihe n’ihe ọ kụgidere n’elu osisi ịta ahụhụ a kwụwara Jizọs.—Jọn 19:20.

Alan Millard kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Discoveries From the Time of Jesus, sị: “O doro anya na ndị gọvanọ Rom na-asụ asụsụ Grik mgbe ha na-arụ ọrụ ha, ọ ga-abụkwa na Jizọs ji asụsụ Grik zaa Paịlet ajụjụ ndị ọ jụrụ ya mgbe ọ na-ekpe ya ikpe.” Ọ bụ ezie na Baịbụl ekwughị na Jizọs gwara Paịlet okwu n’asụsụ Grik, ọ dị mma ịmara na Baịbụl ekwughị na e nwere onye nsụgharị nke sụgharịrị ihe ha kwuru mgbe ha na-akparịta ụka.—Jọn 18:28-40.

Dị ka ọkà mmụta bụ́ Wright si kwuo, “o nweghị otú anyị ga-esi amata kpọmkwem ma [Jizọs] ọ̀ sụrụ Grik ma ọ bụ Latịn, ma, mgbe ọ na-ezi ihe ọ ga-abụ na asụsụ ọ na-asụkarị bụ Arameik, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ asụsụ Hibru a gwara asụsụ Arameik bụ́ nke ọtụtụ ndị na-asụ.”—Biblical Archaeology, 1962, peeji nke 243.

Olee otú nkume ndị e ji wuo ụlọ nsọ dị na Jeruselem hà n’ibu?

Ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara Jizọs banyere ụlọ nsọ dị na Jeruselem, sị: “Onye Ozizi, ị̀ hụkwara ụdị nkume ndị a na ụdị ụlọ ndị a?” (Mak 13:1) Olee otú nkume ndị ahụ hà n’ibu?

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Eze Herọd ewusaala Mkputamkpu Ala Ebe E Wuru Ụlọ Nsọ ahụ okpukpu abụọ ma e were ya tụnyere otú ọ dị n’oge Sọlọmọn. Ọ bụ mkputamkpu ala kacha ukwuu mmadụ wuru n’oge ochie. Ogologo ya dị narị mita anọ na iri asatọ, ùhiè ya adịrị narị mita abụọ na iri asatọ. E kwuru na ụfọdụ n’ime nkume e ji wuo ya, ma ọ bụ nkume a wara awa, dị mita iri na otu n’ogologo, mita ise n’obosara, dịrịkwa mita atọ n’ịdị elu. Ụfọdụ n’ime ha dị tọn iri ise n’ịdị arọ. Otu n’ime ha fọrọ ntakịrị ka o ruo narị tọn anọ. Otu ọkà mmụta sịrị na “o nweghị nkume haruru ka ya n’oge ochie.”

Ihe Jizọs zara ndị na-eso ụzọ ya bụ: “Ị̀ hụrụ nnukwu ụlọ ndị a? A gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya ma ọlị n’ebe a n’akwatughị ya.” (Mak 13:2) Ọtụtụ n’ime nnukwu nkume ndị ahụ ka dị n’ebe ha dara mgbe ndị agha Rom kwaturu ha n’afọ 70 O.A.

[Foto dị na peeji nke 26]

Nkume ụlọ nsọ ahụ a kwaturu, ndị tọgbọ n’ihu mkputamkpu ala ebe e wuru ụlọ nsọ ahụ, na Jeruselem