Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Galeshia, Ndị Efesọs, Ndị Filipaị, na Ndị Kọlọsi

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Galeshia, Ndị Efesọs, Ndị Filipaị, na Ndị Kọlọsi

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Galeshia, Ndị Efesọs, Ndị Filipaị, na Ndị Kọlọsi

MGBE Pọl onyeozi nụrụ na ụfọdụ Ndị Kraịst kwere ka ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu rafuo ha ịhapụ ofufe dị ọcha, o degaara “ọgbakọ ndị dị na Galeshia” akwụkwọ ozi kpụ ọkụ n’ọnụ. (Gal. 1:2) O dere ya ihe dị ka n’afọ 50 ruo52 O.A., e nwere ihe ụfọdụ ọ dọrọ ha aka ná ntị banyere ya kpọmkwem ma gbaa ha ume ka ha gbalịa na-eme nke ọma.

Ka ihe dị ka afọ iri gachara, mgbe Pọl nọ na Rom dị ka “onye mkpọrọ n’ihi Kraịst Jizọs,” o degaara ọgbakọ dị n’Efesọs, Filipaị, nakwa Kọlọsi, akwụkwọ ozi o ji nye ha ndụmọdụ ndị katara ahụ́ na agbamume. (Efe. 3:1) Anyị onwe anyị taa nwere ike irite uru ma ọ bụrụ na anyị egee ntị n’ihe ndị ahụ e dere n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ndị Galeshia, Ndị Efesọs, Ndị Filipaị, nakwa Ndị Kọlọsi.—Hib. 4:12.

OLEE OTÚ E SI ‘KPỌỌ HA NDỊ EZI OMUME’?

(Gal. 1:1–6:18)

Ebe ọ bụ na ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu chọrọ iji ụzọ aghụghọ katọọ Pọl, Pọl kọrọ ihe ụfọdụ banyere ndụ ya iji gosi na ya bụ onyeozi. (Gal. 1:11–2:14) Pọl gbara ozizi ụgha ha n’anwụ site n’ikwu, sị: “A na-akpọ mmadụ onye ezi omume, ọ bụghị n’ihi ọrụ nke iwu, kama naanị site n’inwe okwukwe n’ebe Kraịst Jizọs nọ.”—Gal. 2:16.

Pọl kwuru na Kraịst ‘tọhapụrụ ndị nọ n’okpuru iwu’ ma mee ka ha ghọọ Ndị Kraịst nweere onwe ha. Ọ dụsiri ndị Galeshia ọdụ ike, sị: “Guzosienụ ike, unu ekwekwala ka e jichie unu ọzọ na yok nke ịnọ n’ohu.”—Gal. 4:4, 5; 5:1.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

3:16-18, 28, 29—Ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na Ebreham gbara ọ̀ ka bara uru? Ee, ọ ka bara uru. Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ abụghị ihe e ji dochie anya ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na Ebreham gbara kama a gbakwụnyere ya n’ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na Ebreham gbara. N’ihi ya, ọgbụgba ndụ Ebreham dịgidere mgbe e ‘wepụchara’ Iwu ahụ. (Efe. 2:15) Nkwa ndị e kwere n’ọgbụgba ndụ ahụ mezuru n’ahụ́ Jizọs Kraịst, onye bụ́ isi n’ezi “mkpụrụ” Ebreham na n’ahụ́ ndị bụ́ “ndị nke Kraịst.”

6:2—Gịnị bụ “iwu nke Kraịst”? Ihe ndị so n’iwu a bụ ihe niile Jizọs kụziri na ihe niile o nyere n’iwu. Otu nke kachanụ bụ iwu ahụ bụ́ “na-ahụrịta ibe unu n’anya.”—Jọn 13:34.

6:8—Olee otú anyị si ‘agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ’? Anyị na-eme nke a site n’ibi ndụ otú ga-eme ka mmụọ nsọ Chineke nwee ike ịrụ ọrụ n’ime anyị n’enweghị ihe mgbochi. Ịgha mkpụrụ maka mmụọ nsọ pụtara iji obi anyị niile na-eme ihe ndị na-adịghị egbochi mmụọ nsọ Chineke ịrụ ọrụ.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:6-9. Ndị okenye ekwesịghị igbu oge ọ bụla n’ịhụ na e doziri nsogbu ọ bụla bilitere n’ọgbakọ. Site n’iji Akwụkwọ Nsọ mee ka ihe doo anya, ha nwere ike ịgbazi echiche ọ bụla na-ezighị ezi e nwere.

2:20. Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye Chineke nyere anyị. Anyị kwesịrị ịmụta ile ya anya otú ahụ.—Jọn 3:16.

5:7-9. Mkpakọrịta ọjọọ nwere ike ‘igbochi anyị ịnọgide na-erubere eziokwu ahụ isi.’ Anyị kwesịrị izere mkpakọrịta ọjọọ.

6:1, 2, 5. “Ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ” nwere ike inyere anyị aka ibu ibu anyị, dị ka nsogbu ndị anyị nwere n’ihi ihe anyị mejọrọ n’amaghị ama. Ma, ọ bụ anyị ga-ebu ibu dịịrị anyị dị ka Ndị Kraịst.

‘ỊCHỊKỌTA IHE NIILE N’IME KRAỊST’

(Efe. 1:1–6:24)

Mgbe Pọl na-akọwa ihe banyere ịdị n’otu Ndị Kraịst n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, o kwuru banyere “ilekọta ihe mgbe oge ahụ a kara aka zuru. . . ịchịkọtaghachi ihe niile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.” Kraịst enyela “onyinye n’ụdị mmadụ” iji nyere mmadụ niile aka ịdị “n’otu n’okwukwe.”—Efe. 1:10; 4:8, 13.

Iji sọpụrụ Chineke ma hụ na udo dị, Ndị Kraịst kwesịrị “iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ” ma ‘na-edo onwe ha n’okpuru ibe ha n’ịtụ egwu Kraịst.’ Ha kwesịkwara “iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu” site n’iyiri ekike agha zuru ezu e ji ebu agha ime mmụọ.—Efe. 4:24; 5:21; 6:11.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:4-7—Olee otú o si bụrụ na a họpụtara Ndị Kraịst e tere mmanụ ogologo oge tupu a mụọ ha? A họpụtara ha dị ka otu ìgwè, ọ bụghị n’otu n’otu. Nke a mere tupu Adam na Iv amụwa ụmụ ndị ketara mmehie. Amụma ahụ e dekọrọ na Jenesis 3:15, bụ́ nke e buru tupu a tụrụ ime onye ọ bụla n’ime ụmụ mmadụ na-ezughị okè, bụ nzube Chineke nke bụ́ inwe ụfọdụ ụmụazụ Kraịst ga-eso ya chịa n’eluigwe.—Gal. 3:16, 29.

2:2—Olee otú mmụọ nke ụwa si dị ka ikuku, oleekwa otú ikuku a si akpa ike n’ụwa? “Mmụọ nke ụwa,” ya bụ, mmụọ nke mmadụ ime ihe masịrị ya na nke nnupụisi, juru ebe niile dị ka ikuku anyị na-ekuru. (1 Kọr. 2:12) Ọ na-akpa ike site n’otú o si anọgide na-amanye ndị mmadụ ime ihe ọ chọrọ.

2:6—Olee otú o si bụrụ na Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ “n’ebe ndị dị n’eluigwe” mgbe ha ka nọ n’ụwa? “N’ebe ndị dị n’eluigwe” e kwuru okwu ya ebe a abụghị eluigwe e kwere ha nkwa na ha ga-enweta. Kama, ọ na-egosi otú ha na Chineke si dịrịkwuo nnọọ ná mma, bụ́ nke ‘iji mmụọ nsọ ahụ e kwere ha ná nkwa kaa ha akara’ mere ka o kwe omume.—Efe. 1:13, 14.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

4:8, 11-15. Jizọs Kraịst “dọọrọ ọtụtụ ndị n’agha,” ya bụ, ọ napụtara ha n’aka Ekwensu iji nwee ike jiri ha wulie ọgbakọ Ndị Kraịst elu. Anyị pụrụ isite “n’ịhụnanya tolite n’ihe niile n’ime . . . Kraịst” site n’irubere ndị na-edu ndú n’etiti anyị isi ma na-anọ n’okpuru ha nakwa site n’ikwenyere ihe ndị ha kwuru ka e mee n’ọgbakọ.—Hib. 13:7, 17.

5:22-24, 33. Ọ bụghị naanị na nwaanyị kwesịrị ido onwe ya n’okpuru di ya, o kwesịkwara ịkwanyere di ya ùgwù. Ọ na-eme nke a site n’igosipụta “mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ” nakwa site n’ịgbalị ime ka a na-asọpụrụ di ya site n’otú o si ekwu okwu ọma banyere di ya ma na-agba mbọ ịhụ na mkpebi di ya gara nke ọma.—1 Pita 3:3, 4; Taị. 2:3-5.

5:25, 28, 29. Dị nnọọ ka di “na-azụ” onwe ya, o kwesịrị ịdị na-enye nwunye ya ihe ọ chọrọ—ya bụ, ihe ahụ́ ya chọrọ, na-ahụ na obi dị ya mma, ma na-enyere ya aka ịhụ na ya na Chineke dị ná mma. O kwesịkwara igosi na ya hụrụ ya n’anya site n’ịdị na-ewepụta nnọọ oge ka ya na ya na-anọrị nakwa site n’ịdị na-agwa ya okwu ọma ma na-emeso ya omume ọma.

6:10-13. Iji nwee ike iguzogide ndị mmụọ ọjọọ, anyị kwesịrị iji obi anyị niile yiri ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke.

“NA-EJE IJE N’ỤZỌ KWESỊRỊ EKWESỊ”

(Fil. 1:14:23)

Ihe juru n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Filipaị bụ mkpa ịhụnanya dị. Ọ sịrị: “Ihe m na-ekpe n’ekpere bụ ka ịhụnanya unu na-abawanye ụba, ka unu nweekwa ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.” Iji nyere ha aka izere àgwà nke inwebiga obi ike ókè, ọ gbara ha ume, sị: “Jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.”—Fil. 1:9; 2:12.

Pọl gbara ndị tozuru okè ume ịchụso “ihe mgbaru ọsọ ahụ iji nweta ihe a na-agbata n’ọsọ.” Ọ sịrị: “Ruo n’otú anyị nweruru ọganihu, ka anyị na-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu ụkpụrụ a.”—Fil. 3:14-16.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:23—Olee “ihe abụọ” na-enye Pọl nsogbu, oleekwa “ntọhapụ” ọ chọrọ? N’ihi ọnọdụ Pọl nọ na ya, ihe abụọ chere ya ihu na-enye ya nsogbu n’obi: ndụ ma ọ bụ ọnwụ. (Fil. 1:21) Ọ bụ ezie na o kwughị nke ọ ga-ahọrọ, o mere ka a mata ihe ọ chọrọ—“ntọhapụ na iso Kraịst nọrọ.” (Fil. 3:20, 21; 1 Tesa. 4:16) “Ntọhapụ” a a ga-atọhapụ Pọl n’oge ọnụnọ Kraịst ga-eme ka Pọl nweta ụgwọ ọrụ Jehova kwadebeere ya.—Mat. 24:3.

2:12, 13—Olee otú o si bụrụ na Chineke na-eme ka anyị na-enwe “ọchịchọ ma na-eme ihe”? Mmụọ nsọ Jehova nwere ike ịrụ ọrụ n’ime obi na uche anyị iji mee ka anyị chọkwuo ime ike anyị niile n’ozi Jehova. N’ihi ya, anyị nwere ihe na-enyere anyị aka ka anyị ‘na-eme ihe ga-ewetara anyị nzọpụta.’

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:3-5. Ọ bụ ezie na ndị Filipaị dara ogbenye, ha setịpụụrụ anyị ihe nlereanya dị mma n’imesapụ aka.—2 Kọr. 8:1-6.

2:5-11. Site n’ihe nlereanya Jizọs, anyị na-ahụ na ịdị umeala n’obi abụghị ihe e ji ama onye na-adịghị ike kama ọ bụ ihe e ji ama onye obi kara ime ihe dị mma. Jehova na-ebulikwa ndị dị umeala n’obi elu.—Ilu 22:4.

3:13. “Ihe ndị dị n’azụ” nwere ike ịbụ ihe ndị dị ka ọrụ na-enye ezigbo ego, ịbụ onye a mụrụ n’ezinụlọ bara ọgaranya, ma ọ bụkwanụ mmehie ndị dị oké njọ anyị mere n’oge ndị gara aga, bụ́ ndị anyị hapụrụla, ‘a sachaakwa anyị.’ (1 Kọr. 6:11) Anyị kwesịrị ichefu ihe ndị a, ya bụ, ghara ịdị na-echegbu onwe anyị banyere ha, ma ‘na-amatịkwu onwe anyị inweta ihe ndị dị n’ihu.’

“GBASIE IKE N’OKWUKWE”

(Kọl. 1:1–4:18)

N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọlọsi, ọ gbara echiche na-ezighị ezi nke ndị ozizi ụgha n’anwụ. Ọ sịrị na ihe a ga-eji azọpụta mmadụ abụghị n’ihi ihe Iwu ahụ kwuru, kama ọ bụ onye ahụ ‘ịnọgide n’okwukwe.’ Pọl gbara ndị Kọlọsi ume ka ha ‘na-eje ije dị ka ndị ha na Kraịst dị n’otu, ndị gbanyere mgbọrọgwụ n’ime ya, ndị a na-ewulikwa elu n’ime ya, na ndị a na-eme ka ha gbasie ike n’okwukwe.’ Olee otú ịgbasi ike n’okwukwe kwesịrị isi nyere ha aka?—Kọl. 1:23; 2:6, 7.

Pọl dere, sị: “E wezuga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu. Kwenụ ka udo nke Kraịst na-achịkwa obi unu.” Onyeozi ahụ gwakwara ha sị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-eme ya dị ka ọ̀ bụ Jehova ka unu na-emere ya, ọ bụghị ndị mmadụ.” O kwuru otú anyị ga-esi na-emeso ndị na-anọghị n’ọgbakọ, sị: “Na-ejenụ ije n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ.”—Kọl. 3:14, 15, 23; 4:5.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:8—Olee ihe ndị bụ́ “ihe ndị mbụ nke ụwa” nke Pọl dọrọ anyị aka ná ntị banyere ha? Ha bụ ihe ndị dị n’ụwa Setan—ihe ndị bụ́ isi so na-achịkwa ụwa ya ma ọ bụkwanụ ihe ndị nọ n’ime ya na-achụso. (1 Jọn 2:16) Nkà ihe ọmụma, ịhụ ihe onwunwe n’anya, na okpukpe ụgha ndị e nwere n’ụwa a socha n’ihe ndị a.

4:16—Gịnị mere akwụkwọ ozi e degaara ndị Leodisia esoghị na Baịbụl? Nke a nwere ike ịbụ n’ihi na ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ adịchaghị anyị mkpa taa. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ihe dị n’akwụkwọ ozi ahụ dịkwa n’akwụkwọ ozi ndị ọzọ.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:2, 20. Ihe mgbapụta ahụ, bụ́ nke Jehova nyere anyị n’ihi obiọma ya na-erughịrị mmadụ, nwere ike ime ka obi anyị ghara ịma anyị ikpe ma mee ka obi ruo anyị ala.

2:18, 23. Ịdị “umeala n’obi ụgha”—ya bụ, mmadụ ime ka ọ̀ dị umeala n’obi ka ndị ọzọ wee jaa ya, ikekwe site n’ịjụ inwe ihe onwunwe ma ọ bụ ịta ndụ ya ahụhụ—na-egosi na mmadụ bụ onye “echiche ya nke anụ ahụ́ na-achị na-afụli elu.”