Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Alụmdi na Nwunye Unu Nọgide Na-abụ “Ụdọ Atọ A Tụkọtara Ọnụ”

Ka Alụmdi na Nwunye Unu Nọgide Na-abụ “Ụdọ Atọ A Tụkọtara Ọnụ”

Ka Alụmdi na Nwunye Unu Nọgide Na-abụ “Ụdọ Atọ A Tụkọtara Ọnụ”

“Ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ, a pụghị ịdọbi ya ngwa ngwa.”—EKLI. 4:12.

1. Ònye jikọtara di na nwunye mbụ ahụ?

MGBE Jehova Chineke kechara osisi na ụmụ anụmanụ, o kere mmadụ mbụ ahụ bụ́ Adam. Chineke mechara mee ka oké ụra buru Adam, ma jiri otu n’ime ọgịrịga Adam meere ya onye inyeaka zuru okè. Mgbe Adam hụrụ ya, ọ sịrị: “Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m na anụ ahụ́ nke si n’anụ ahụ́ m.” (Jen. 1:27; 2:18, 21-23) Jehova gosiri na ya kwadoro nke a site n’ijikọta ha abụọ dị ka di na nwunye ma gọzie ha.—Jen. 1:28; 2:24.

2. Olee otú Setan si kpata nkewa n’etiti Adam na Iv?

2 Ma ọ dị nnọọ mwute na ka obere oge gachara, alụmdi na nwunye ha adịghịzi otú ahụ Chineke chọrọ ka ọ dịrị. Olee otú nke a si mee? Otu ajọ mmụọ, bụ́ onye e mechara kpọwa Setan, duhiere Iv ya agaa taa mkpụrụ osisi Chineke sịrị ha atala. Adam mechara soro nwunye ya nupụ isi, ha si otú a gosi na ha achọghị ka Chineke na-achị ha nakwa na ha achọghị nduzi ya ziri ezi. (Jen. 3:1-7) Mgbe Jehova jụrụ di na nwunye ahụ ihe ha mere, o doro anya na di na nwunye ahụ amalitela inwe nsogbu n’etiti onwe ha. Adam boro ya nwunye ya, sị: “Nwaanyị ahụ i nyere m ka mụ na ya biri, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ si n’osisi ahụ, m wee rie.”—Jen. 3:11-13.

3. Olee echiche na-ezighị ezi ụfọdụ ndị Juu nwere?

3 Kemgbe ahụ, Setan ejirila ụzọ aghụghọ dị iche iche na-akpata nkewa n’etiti ndị di na nwunye. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ o jirila ndị ndú okpukpe kụzie ihe ndị na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ banyere alụmdi na nwunye. Ụfọdụ ndị ndú okpukpe ndị Juu ledara iwu Chineke anya, ha na-ekwe ka ndị di na-agba nwunye ha alụkwaghịm n’ihi ihe ndị na-enweghị isi, dị ka nnu ịbọ n’ofe. Ma Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”—Mat. 19:9.

4. Olee otú alụmdi na nwunye si nọrọ ná nsogbu taa?

4 Setan ka na-agbasi mbọ ike ịhụ na o tisara ndị di na nwunye. Nwoke ịlụ nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya, nwoke na nwaanyị ibikọ n’alụghị alụ, na ịgba alụkwaghịm na-enweghị ihe kpatara ya, na-egosicha na Setan na-enwe nnọọ ihe ịga nke ọma n’itisa ndị di na nwunye. (Gụọ Ndị Hibru 13:4.) Gịnị ka anyị bụ́ Ndị Kraịst nwere ike ime iji ghara inwe echiche a na-ezighị ezi ọtụtụ ndị nwere banyere alụmdi na nwunye? Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ e ji ama di na nwunye na-enwe obi ụtọ ma na-ebi nke ọma.

Kwenụ Ka Jehova Nọgide n’Alụmdi na Nwunye Unu

5. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ” pụtara mgbe a bịara n’ihe metụtara alụmdi na nwunye?

5 Ka di na nwunye wee na-ebi nke ọma, ha kwesịrị ikwe ka Jehova bata n’alụmdi na nwunye ha. Baịbụl na-ekwu, sị: “Ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ, a pụghị ịdọbi ya ngwa ngwa.” (Ekli. 4:12) E ji okwu ahụ bụ́ “ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ” mee ihe atụ. Ọ bụrụ na e webata ihe atụ a n’alụmdi na nwunye, ụdọ abụọ ndị mbụ ahụ na-anọchi anya di na nwunye, bụ́ ndị a tụhịkọtara ha na nke atọ ahụ nọ n’etiti, bụ́ nke na-anọchi anya Jehova Chineke. Di na nwunye na Chineke ịdị n’otu na-eme ka ha nwee ike imeri nsogbu ndị ha na-ezute, ọ bụkwa isi ihe ga-enyere ha aka inwe obi ụtọ kasị ukwuu n’alụmdi na nwunye ha.

6, 7. (a) Gịnị ka Ndị Kraịst nwere ike ime iji hụ na Chineke nọ n’alụmdi na nwunye ha? (b) Olee ihe kasị amasị otu nwanna nwaanyị banyere di ya?

6 Ma gịnị ka di na nwunye nwere ike ime iji hụ na alụmdi na nwunye ha dị ka ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ? Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime obi m.” (Ọma 40:8) Ọ bụkwa ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-eme ka anyị jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi. N’ihi ya, ma di ma nwunye ya kwesịrị ịhụ na ha na Jehova dị nnọọ ná mma, ime uche ya kwesịkwara ịdị na-atọ ha ụtọ. Ha kwesịkwara ịgbalị inyere di ma ọ bụ nwunye ha aka ịhụkwu Chineke n’anya.—Ilu 27:17.

7 Ọ bụrụ na iwu Chineke dị n’ime obi anyị n’ezie, anyị ga na-egosipụta àgwà ndị dị ka okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ha ga-enyekwa aka mee ka alụmdi na nwunye anyị bụrụ a kwaa akwụrụ. (1 Kọr. 13:13) Otu Onye Kraịst aha ya bụ Sandra, bụ́ onye lụrụla di ruo iri afọ ise kwuru, sị: “Ihe kasị amasị m banyere di m bụ ndụmọdụ ndị sitere na Baịbụl ọ na-adị na-enye m, ya na otú o si hụ Jehova n’anya, bụ́ nke siri ike karịa nke ọ hụrụ m.” Ndị bụ́ di, è nwere ike ikwu ụdị ihe a banyere unu?

8. Gịnị ka di na nwunye ga-eme iji nweta “ezi ụgwọ ọrụ”?

8 Ndị di na nwunye, ùnu na-ebute ihe ndị metụtara Jehova na Alaeze ya ụzọ ná ndụ unu? Ì weere di ma ọ bụ nwunye gị dị ka onye gị na ya na-efekọ Jehova? (Jen. 2:24) Eze maara ihe bụ́ Sọlọmọn dere, sị: “Abụọ dị mma karịa otu, n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha.” (Ekli. 4:9) N’ezie, di na nwunye kwesịrị ịrụsi ọrụ ike iji nwee ike inweta “ezi ụgwọ ọrụ” nke bụ́ ịhụnanya siri ike ga-adị n’etiti ha, bụ́ nke Chineke ga-eme ka ọ dịgide.

9. (a) Olee ọrụ ndị bụ́ di nwere? (b) Dị ka Ndị Kọlọsi 3:19 si kwuo, olee otú di kwesịrị isi na-emeso nwunye ya ihe?

9 Ihe na-egosi ma Chineke ọ̀ nọ n’alụmdi na nwunye bụ mgbe di na nwunye na-agbalịsi ike ime ihe ndị Jehova nyere n’iwu. Ọ bụ di bụ onye bụ́ isi ọ dịịrị inye ndị ezinụlọ ya ihe ndị dị ha mkpa n’ụzọ anụ ahụ́ na ịhụ na ha na Chineke nọgidere na-adị ná mma. (1 Tim. 5:8) A gbakwara ha ume ka ha na-echebara mmetụta nwunye ha echiche. Anyị na-agụ ná Ndị Kọlọsi 3:19, sị: “Unu ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, unu ewesola ha oké iwe.” Otu onye ọkà mmụta Baịbụl kwuru na okwu ahụ bụ́ “oké iwe” pụtakwara “ịgwa ha okwu ọjọọ ma ọ bụ ịkụ ha ihe, na ịghara igosi ha na ị hụrụ ha n’anya, ịghara ilekọta ha, ịghara inye ha ihe ndị dị ha mkpa, ịghara ichebe ha na ịghara inyere ha aka.” O doro nnọọ anya na e kwesịghị ịhụ ụdị àgwà a n’ezinụlọ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na di ejiri ịhụnanya na-arụ ọrụ ya dị ka onye bụ́ isi, nwunye ya ga-adị njikere ido onwe ya n’okpuru ya.

10. Olee àgwà Ndị Kraịst bụ́ nwunye kwesịrị ịkpa?

10 Ndị Kraịst bụ́ nwunye, bụ́ ndị chọrọ ka Jehova nọrọ n’alụmdi na nwunye ha, ga na-emekwa ihe iwu Chineke kwuru. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, n’ihi na di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ.” (Efe. 5:22, 23) Setan duhiere Iv, si otú ahụ na-akwalite ụgha bụ́ na ụmụ mmadụ ga-enwe obi ụtọ na-adịgide adịgide ma ọ bụrụ na ha enwere onwe ha ime ihe otú o si masị ha. O doro nnọọ anya na ọtụtụ di na nwunye taa na-achọ ime ihe otú o si masị ha. Ma ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst adịghị ewere ido onwe ha n’okpuru di ha ha hụrụ n’anya dị ka ihe siri ike omume. Ha ma na Jehova mere Iv “onye inyeaka” di ya, o dokwara anya na Chineke weere ọnọdụ nwaanyị dị ka ihe dị ùgwù. (Jen. 2:18) Onye Kraịst bụ́ nwunye nke ji obi ya niile na-edo onwe ya n’okpuru di ya bụ n’ezie “okpueze” di ya.—Ilu 12:4.

11. Olee ihe otu nwanna nwoke kwuru nyeere ya aka n’alụmdi na nwunye ya?

11 Ihe ọzọ ga-enyere di na nwunye aka ime ka Chineke nọgide n’alụmdi na nwunye ha bụ ịdị na-amụkọ Okwu Chineke ọnụ. Gerald, bụ́ onye ya na nwunye ya na-ebi nnọọ n’udo kemgbe iri afọ ise na ise, kwuru sị, “Ihe kacha mkpa na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo bụ ịgụ na ịmụkọ Baịbụl ọnụ.” O kwukwara sị, “Imekọ ihe ọnụ, karịsịa ihe ndị metụtara ofufe Chineke, na-eme ka di na nwunye hụkwuo onwe ha n’anya, na-emekwa ka ha na Jehova dịkwuo ná mma.” Ịmụkọ Baịbụl ọnụ na-eme ka ezinụlọ na-eburu iwu Jehova n’uche, na-eme ka ha na Jehova dịkwuo ná mma, meekwa ka ha nọgide na-enwe ọganihu.

12, 13. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka di na nwunye na-ekpekọ ekpere ọnụ? (b) Olee ihe ndị ọzọ Ndị Kraịst na-eme bụ́ ndị na-eme ka alụmdi na nwunye ha bụrụ a kwaa akwụrụ?

12 Di na nwunye nwere obi ụtọ na-ekpekọkwa ekpere ọnụ. Ọ bụrụ na di ‘awụpụ obi ya’ site n’ịgwa Chineke kpọmkwem ihe ndị dị ha mkpa n’ekpere, nke a ga-eme nnọọ ka alụmdi na nwunye ha sikwuo ike. (Ọma 62:8) Dị ka ihe atụ, ọ ga-akacha mma ma gị na di ma ọ bụ nwunye gị chịfuo nghọtahie ọ bụla unu nwere ma ọ bụrụ na unu arịọla Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka o nyere unu aka! (Mat. 6:14, 15) Iji mee ihe kwekọrọ n’ekpere ahụ unu kpere, ọ ga-adị nnọọ mma ma onye ọ bụla n’ime unu kpebie inyere onye nke ọzọ aka ma “na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam.” (Kọl. 3:13) Chetakwa na ekpere unu na-ekpe na-egosi na unu tụkwasịrị Chineke obi. Eze Devid sịrị: “Ihe niile i kere eke nwere olileanya n’ebe ị nọ.” (Ọma 145:15) Ọ bụrụ na anyị ekpegara Chineke ekpere ma nwee olileanya na ọ ga-aza anyị, anyị agaghị na-echegbu onwe anyị n’ihi na anyị maara na ‘ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7.

13 Ụzọ ọzọ anyị si eme ka Jehova nọrọ n’alụmdi na nwunye anyị bụ site n’ịdị na-agakọ ọmụmụ ihe ọnụ na ịdị na-arụkọ n’ozi ọma. N’ọmụmụ ihe anyị, ndị di na nwunye na-amụta ụzọ ha ga-esi lụsoo “atụmatụ aghụghọ” Setan ji na-etisa ezinụlọ ọgụ. (Efe. 6:11) Di na nwunye na-arụkọ mgbe niile n’ozi ọma na-amụta ịbụ ndị ‘guzosiri ike, ndị kwụ chịm.’—1 Kọr. 15:58.

Mgbe E Nwere Ihe Isi Ike

14. Olee ihe ndị nwere ike ịkpata nsogbu n’alụmdi na nwunye?

14 Ọ bụ eziokwu na ihe ndị a e kwuru pụrụ ịdị gị ka ihe ndị ị mabu ama, ma ọ́ gaghị adị mma ma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kparịta ha? Leenụ ma è nwere ebe ụfọdụ unu kwesịrị imezitụkwu ihe n’alụmdi na nwunye unu. Baịbụl kwudịrị na ndị Chineke nọ n’alụmdi na nwunye ha “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Kọr. 7:28) N’ihi ezughị okè mmadụ, ụwa ajọ omume a anyị bi n’ime ya, na ọnyà Ekwensu sijuru ebe niile, alụmdi na nwunye nke ndị ohu Chineke ji ikwesi ntụkwasị obi na-efe ya nwedịrị ike inwe nsogbu. (2 Kọr. 2:11) Ma Jehova na-enyere anyị aka idi ya. N’ezie, anyị ga-edili ya. Anụ ụlọ nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job nwụnahụrụ ya, ndị na-ejere ya ozi na ụmụ ya anwụokwa. Ma, Baịbụl sịrị: “N’ihe a niile, Job emehieghị, o kwujọghịkwa Chineke.”—Job 1:13-22.

15. Olee ihe ihe isi ike nwere ike ime ka ndị mmadụ mee, gịnịkwa ka di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ime mgbe otu onye n’ime ha mewere otú ahụ?

15 Nwunye Job gwara ya, sị: “Ị̀ ka nọ na-eguzosi ike n’ezi ihe? Kọchaa Chineke nwụọ!” (Job 2:9) N’ezie, ọ bụrụ na e nwee ọdachi ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ, obi mgbawa nwere ike ime ka mmadụ mee ihe n’echeghị ya eche. Nwoke ahụ maara ihe kwuru, sị: “Mmegbu pụrụ ime ka onye maara ihe na-eme ara ara.” (Ekli. 7:7) Ọ bụrụ na ihe isi ike ma ọ bụ “mmegbu” emee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuo okwu n’iwe, agala sawa ya okwu. Ịsawa ya n’iwe nwere ike ime ka otu onye n’ime unu ma ọ bụ unu abụọ kwuo ihe ga-eme ka ọnọdụ ahụ ka njọ. (Gụọ Abụ Ọma 37:8.) N’ihi ya, leghara “okwu nzuzu” ọ bụla e kwuru n’iwe anya.—Job 6:3.

16. (a) Olee otú e nwere ike isi webata ihe Jizọs kwuru na Matiu 7:1-5 n’alụmdi na nwunye? (b) Gịnị mere ọ dịghị mma ka di na nwunye na-esi ọnwụ?

16 Di na nwunye kwesịrị ịtụ anya ihe ga-ekwe omume n’aka ibe ha. Otu onye nwere ike ịchọpụta àgwà ụfọdụ na-adịchaghị mma di ma ọ bụ nwunye ya na-akpa ma chee na ya nwere ike ịgbanwe ya. Ọ bụrụ na i jiri ịhụnanya na ndidi na-enyere ya aka, o nwere ike iji nke nta nke nta gbanwee. Ma echefula na Jizọs jiri onye na-atụchagharị ndị ọzọ tụnyere onye na-ahụ “irighiri ahịhịa” nke dị n’anya nwanna ya ma ọ naghị ahụ “ntụhie” dị n’anya nke ya. Jizọs gbaziri anyị ume, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe.” (Gụọ Matiu 7:1-5.) Nke a apụtaghị na ha ga-eleghara àgwà ọjọọ anya. Robert, bụ́ onye lụrụla nwaanyị ruo iri afọ anọ kwuru, sị: “Ka di na nwunye wee nwee ike ịdị na-agwa nnọọ ibe ha eziokwu, ma dị njikere ikweta mmejọ ha, ọ dị mkpa ka ha mee mgbanwe ná ndụ ha.” N’ihi ya, adịla na-esi ọnwụ. Kama ịdị na-ewe iwe na di gị ma ọ bụ nwunye gị adịghị akpa àgwà ụfọdụ ị ga-achọ ka ọ na-akpa, gbalịa ka àgwà ọma ndị nke o nwere ugbu a na-eme gị obi ụtọ.—Ekli. 9:9.

17, 18. Olee ebe anyị nwere ike ịga maka enyemaka mgbe nsogbu yiri ka ọ karịwala?

17 Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe ụfọdụ ná ndụ di na nwunye, nke a nwere ike ịkpata nsogbu ụfọdụ. Di na nwunye nwere ike inwe ihe isi ike ụfọdụ ma ha malite ịmụ ụmụ. Di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ nwa ha nwere ike ịda ezigbo ọrịa. O nwere ike ịdị mkpa ka a na-elekọta ndị nne na nna merela agadi. Ọ bụrụ na ụmụaka etoo, ha nwere ike ịkwaga n’ebe dị nnọọ anya. Ibu ibu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ nwere ike ịgbanwe ihe ụfọdụ. Mgbanwe ndị a niile nwere ike ibute nsogbu n’etiti di na nwunye.

18 Ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka nsogbu gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-enwe akarịala gị ike, gịnị ka i nwere ike ime? (Ilu 24:10) Adala mba! Ọ dịghị ihe ga-atọ Setan ụtọ karịa ịhụ na otu n’ime ndị ohu Chineke hapụrụ ofufe dị ọcha. Ọ ga-atọgbudị ya atọgbu ma di na nwunye mee otú ahụ. N’ihi ya, mee ihe niile i nwere ike ime iji hụ na alụmdi na nwunye gị nọgidere bụrụ ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ. Baịbụl kọrọ banyere ọtụtụ ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị nsogbu ndị tara akpụ bịaara ha. Dị ka ihe atụ, e nwere otu oge Devid gwara Jehova otú ọ dị ya n’obi, sị: ‘Chineke, biko, meere m amara, n’ihi na mmadụ efu na-emegbu m ogologo ụbọchị dum.’ (Ọma 56:1) Ọ̀ dịtụla mgbe ọ dị gị ka “mmadụ efu” ọ̀ na-emegbu gị? Ma ọ̀ bụ onye èzí na-akpatara gị nsogbu ma ọ bụ onye ezinụlọ gị, cheta na Devid nwetara ume iji die nke ya, gị onwe gị nwekwara ike inweta ume. Devid kwuru, sị: “Ajụrụ m Jehova ase, o wee za m, ọ napụtakwara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.”—Ọma 34:4.

Ngọzi Ndị Ọzọ

19. Olee otú anyị ga-esi zere ịbụ ndị Setan nwetara?

19 N’oge ikpeazụ a, ndị di na nwunye kwesịrị ịdị ‘na-akasirịta ibe ha obi ma na-ewulirịta ibe ha elu.’ (1 Tesa. 5:11) Unu echefula na Setan kwuru na ihe mere anyị ji na-erubere Jehova isi bụ n’ihi ihe ndị anyị na-erite n’aka ya. Ọ ga-eme ihe ọ bụla o nwere ike ime, nke gụnyere itisa di na nwunye, iji hụ na anyị kwụsịrị irubere Chineke isi. Ka Setan ghara inweta anyị, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi anyị niile. (Ilu 3:5, 6) Pọl dere, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Fil. 4:13.

20. Olee ngọzi di na nwunye na-enweta ma ọ bụrụ na ha ekwe ka Chineke nọgide n’alụmdi na nwunye ha?

20 E nwere ọtụtụ ngọzi ndị a na-enweta ma Chineke nọrọ n’alụmdi na nwunye. Joel na nwunye ya ya na ya lụrụla iri afọ ise na otu achọpụtala na nke a bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ana m ekele Jehova mgbe niile maka inye m ụdị nwunye a o nyere m nakwa maka otú anyị si na-ebi n’obi ụtọ. Ọ bụụrụ m nnọọ ezigbo onye inyeaka.” Gịnị mere alụmdi na nwunye ha ji kwụrụ chịm? O kwuru, sị: “Anyị na-agbalịsi ike igosi ibe anyị obiọma, ndidi, na ịhụnanya.” Ọ dịghị onye n’ime anyị ga-emetecha ihe ndị a niile otú kwesịrịnụ n’ụwa ochie a. N’agbanyeghị nke ahụ, ka anyị na-arụsi ọrụ ike iji na-eme ihe Baịbụl kwuru ma kwe ka Jehova nọgide n’alụmdi na nwunye anyị. Ọ bụrụ na anyị emee nke a, alụmdi na nwunye anyị ga-adị ka ‘ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ nke a na-apụghị ịdọbi ngwa ngwa.’—Ekli. 4:12.

Ì Chetara?

• Gịnị ka ikwe ka Jehova nọrọ n’alụmdi na nwunye pụtara?

• Gịnị ka di na nwunye kwesịrị ime ma ihe siere ha ike?

• Olee otú anyị si ama mgbe Jehova nọ n’alụmdi na nwunye?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ikpekọ ekpere ọnụ na-enyere di na nwunye aka imeri nsogbu