Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova—‘Onye Na-emere Ndị Ya Ụzọ Mgbapụ’ n’Oge Baịbụl

Jehova—‘Onye Na-emere Ndị Ya Ụzọ Mgbapụ’ n’Oge Baịbụl

Jehova—‘Onye Na-emere Ndị Ya Ụzọ Mgbapụ’ n’Oge Baịbụl

“Chineke, biko, mee ihe ngwa ngwa n’ihi m. Ị bụ onye na-enyere m aka na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.”—ỌMA 70:5.

1, 2. (a) Olee mgbe ndị na-efe Chineke ji agakwuru ya maka enyemaka? (b) Olee ajụjụ na-ebilitenụ, oleekwa ebe anyị pụrụ ịchọta azịza ya?

MGBE nne na nna nke otu nwaanyị dị afọ iri abụọ na atọ, nke lụrụla di, nọ n’ebe ha gara ezumike, ha nụrụ na a na-achọzi nwa ha nwaanyị achọ. Obi ha gwara ha na a tọọrọ ya atọrọ. Ha kwakọọrọ ngwongwo ha lawa ozugbo, na-arịọ Jehova ka o nyere ha aka. A chọpụtara na otu Onyeàmà dị afọ iri abụọ bu ọrịa nke ga-emecha kwarụọ ya ahụ́ dum. Ọ malitere ikpegara Jehova ekpere ozugbo a gwara ya nke a. Otu nne naanị ya na-azụ nwa nke na-adọga ịchọta ọrụ, enweghị ego ga-ezuru ya ịzụta ihe ya na nwa ya nwaanyị dị afọ iri na abụọ ga-eri. Ọ gwara Jehova otú ọ dị ya n’obi. Mgbe ndị na-efe Chineke nwere ezigbo ihe isi ike, ihe mbụ ha na-eme bụ ikpegara Chineke ekpere maka enyemaka. Ì kpegatụrụla Jehova ekpere mgbe ihe siiri gị ike?

2 E nwere otu ajụjụ dị mkpa na-ebilite: Ànyị nwere ike ịtụ anya n’ezie na Jehova ga-aza ekpere anyị na-ekpegara ya ka o nyere anyị aka? Anyị na-achọta azịza ya na-ewusi okwukwe ike n’Abụ Ọma nke iri asaa. Ọ bụ Devid, bụ́ ohu Jehova nke zutere ọtụtụ ọnwụnwa na ihe isi ike ná ndụ ya, dere abụ ọma a na-emetụ n’ahụ́. Mmụọ nsọ kpaliri ọbụ abụ a ikwu banyere Jehova, sị: “Chineke, biko, . . . Ị bụ onye na-enyere m aka na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.” (Ọma 70:5) Ịtụle Abụ Ọma nke iri asaa a nwere ike inyere anyị aka ịhụ ihe mere anyị onwe anyị ga-eji nwee ike ịgakwuru Jehova mgbe ihe na-esiri anyị ike ma nwee nnọọ obi ike na ọ ga-abụ ‘Onye na-emere anyị ụzọ mgbapụ.’

“Ị Bụ . . . Onye Na-Emere M Ụzọ Mgbapụ.”

3. (a) Olee arịrịọ enyemaka dị oké mkpa nke dị n’Abụ Ọma nke iri asaa? (b) Olee obi ike Devid kwupụtara n’Abụ Ọma nke iri asaa?

3 Ihe e ji malite Abụ Ọma nke iri asaa bụ arịrịọ ka Chineke bịa ngwa ngwa nye aka, ọ bụkwa ya ka e ji mechie ya. (Gụọ Abụ Ọma 70:1-5.) Devid rịọrọ Jehova ka ọ “bịa ngwa ngwa” nakwa ka o “mee ihe ngwa ngwa” iji napụta ya. N’amaokwu nke abụọ ruo nke anọ, Devid rịọrọ arịrịọ ise, o ji okwu bụ́ “ka” malite nke ọ bụla, na-egosi ihe ndị ọ chọrọ. Atọ ndị mbụ n’ime ha bụ banyere ndị na-achọ igbu ya. Devid rịọrọ Jehova ka o meriere ya ndị iro ya ka ihere mee ha n’ihi obi ọjọọ ha. Arịrịọ abụọ ndị ọzọ dị n’amaokwu nke anọ bụ banyere ndị Chineke. Devid kpere ekpere ka e mee ka ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ ma too Ya. Mgbe Devid na-emechi abụ ya, ọ gwara Jehova, sị: “Ị bụ onye na-enyere m aka na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.” Ị ga-ahụ na Devid asịghị “Bụrụ onye na-enyere m aka” dị ka à ga-asị na ọ na-arịọ arịrịọ ọzọ. Kama nke ahụ, ọ sịrị, “Ị bụ,” na-egosi na o nweghị obi abụọ. Devid kweere na Chineke ga-enyere ya aka.

4, 5. Gịnị ka anyị na-amụta banyere Devid site n’Abụ Ọma nke iri asaa, oleekwa otú nke a nwere ike isi mee ka obi sie anyị ike?

4 Gịnị ka Abụ Ọma nke iri asaa gosiri banyere Devid? Mgbe ndị iro ya fooro ntutu taa na ha ga-egburịrị ya, Devid agaghị bọwara onwe ya ọbọ. Kama nke ahụ, ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-eme ndị iro ya ihe mgbe dị ya mma nakwa otú o si masị ya. (1 Sam. 26:10) Obi siri nnọọ Devid ike na Jehova na-enyere ndị na-achọ Ya aka ma na-anapụta ha. (Hib. 11:6) Devid kweere na ndị na-efe Chineke nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ ma na-eto Jehova site n’ịgwa ndị ọzọ otú Jehova si dịrị ukwuu.—Ọma 5:11; 35:27.

5 Dị ka Devid, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova bụ Onye na-enyere anyị aka na “Onye na-emere [anyị] ụzọ mgbapụ.” N’ihi ya, mgbe ihe na-esiri anyị ike, ma ọ bụkwanụ mgbe enyemaka dịsi anyị mkpa ike, ọ dịghị njọ ma anyị kpegara Jehova ekpere ka ọ bịa ngwa ngwa nyere anyị aka. (Ọma 71:12) Ma gịnị ka Jehova nwere ike ime iji zaa ekpere anyị na-ekpeku ya maka enyemaka? Tupu anyị atụlewe otú Jehova pụrụ isi nyere anyị aka, ka anyị tụlee ụzọ atọ o si meere Devid ụzọ mgbapụ, otú o si nyere ya aka mgbe ihe ji ya n’olu.

A Napụtara Ya n’Aka Ndị Mmegide

6. Gịnị nyeere Devid aka ịmara na Jehova na-emere ndị ezi omume ụzọ mgbapụ?

6 Devid si n’ihe odide Baịbụl ndị e nwere n’oge ya mara na obi kwesịrị isi onye ezi omume ike na Jehova ga-enyere ya aka. Mgbe Jehova jiri Iju Mmiri bibie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke nọ n’ụwa, o chebere Noa na ezinụlọ ya, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke. (Jen. 7:23) Mgbe Jehova mere ka ọkụ na sọlfọ zokwasị ndị ajọ omume bi na Sọdọm na Gọmọra ka mmiri, o nyeere Lọt, bụ́ onye ezi omume, na ụmụ ya abụọ aka ịgbalaga ka ha ghara ịnwụ. (Jen. 19:12-26) Mgbe Jehova bibiri Fero dị mpako na ndị agha ya n’Osimiri Uhie, o chebere ndị ya, si otú a nyere ha aka ịgbanahụ mbibi. (Ọpụ. 14:19-28) Ka a sịkwa ihe mere Devid ji too Jehova n’abụ ọzọ ọ bụrụ ma kpọọ ya “Chineke nke na-enye nzọpụta.”—Ọma 68:20.

7-9. (a) Olee ihe mere Devid ji kwesị ịtụkwasị Chineke obi na ọ ga-azọpụta ya? (b) Ònye ka Devid kwuru na ọ bụ ya napụtara ya?

7 Devid nwekwara ihe ndị mere ya onwe ya, bụ́ ndị mere ka obi sie ya nnọọ ike na Jehova ga-azọpụta ya. Devid si n’ahụmahụ ndị o nwerela mara na ‘ogwe aka Jehova nke na-adịru mgbe ebighị ebi’ nwere ike ịnapụta ndị na-ejere Ya ozi. (Diut. 33:27) Ihe karịrị otu ugboro, Jehova napụtara Devid n’aka ‘ndị iro ya iwe ji.’ (Ọma 18:17-19, 48) Ka anyị tụlee otu n’ime ha.

8 Mgbe ụmụ nwaanyị Izrel malitere ito Devid maka ike ọ kpara n’agha, ekworo juru Eze Sọl obi nke na ọ tụrụ Devid ube ugboro abụọ. (1 Sam. 18:6-9) Devid zechara ha abụọ. Nke a ọ bụ n’ihi na Devid dị gara gara ma bụrụ ọkà n’ize mgbọ? Mba. Baịbụl kwuru na ọ bụ n’ihi na “Jehova nọnyekwaara ya.” (Gụọ 1 Samuel 18:11-14.) Mgbe mgbalị ọzọ Sọl mere ịhụ na ndị Filistia gburu Devid kụchara afọ n’ala, “Sọl wee hụ ma mata na Jehova nọnyeere Devid.”—1 Sam. 18:17-28.

9 Ònye ka Devid kwuru na ọ bụ ya napụtara ya? Ihe e dere n’elu Abụ Ọma nke iri na asatọ kwuru na Devid “gwara Jehova okwu dị n’abụ a n’ụbọchị Jehova napụtara ya . . . n’aka Sọl.” Devid bụrụ ihe dị ya n’obi n’abụ, sị: “Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ. Chineke m bụ oké nkume m. M ga-agbaba n’ime ya.” (Ọma 18:2) Ọ̀ bụ na ọ dịghị ewusi okwukwe anyị ike ịmara na Jehova nwere ike ịnapụta ndị ya?—Ọma 35:10.

E Nyeere Ya Aka Mgbe Ọ Nọ n’Ute Ọrịa

10, 11. Gịnị na-enyere anyị aka ịghọta mgbe ọ ga-abụ na Devid rịara ọrịa ahụ e kwuru okwu ya n’Abụ Ọma nke iri anọ na otu?

10 E nwere mgbe Devid rịara nnọọ ezigbo ọrịa, bụ́ nke e kwuru okwu ya n’Abụ Ọma nke iri anọ na otu. O nwere mgbe ọrịa ji Devid aka ọjọọ nke na ụfọdụ ndị iro ya chere na “ọ gaghị ebili ọzọ.” (Amaokwu nke 7, 8) Olee mgbe ọrịa a jituru Devid? E nwere ike ihe e dere n’abụ ọma a mere mgbe Devid na nsogbu na-alụ, bụ́ mgbe nwa ya bụ́ Absalọm gbalịrị ịnaghara ya ọchịchị.—2 Sam. 15:6, 13, 14.

11 Dị ka ihe atụ, Devid kwuru na otu enyi ya ọ tụkwasịrị obi, onye ya na ya na-eri n’otu efere, sowere ndị iro ya. (Amaokwu nke 9) Nke a nwere ike ichetara anyị otu ihe mere ná ndụ Devid. N’oge ahụ Absalọm nupụụrụ Devid isi, otu onye ndụmọdụ Devid tụkwasịrị obi bụ́ Ahitofel ghọrọ sabo ma sonyere Absalọm n’inupụrụ eze isi. (2 Sam. 15:31; 16:15) Cheedị nnọọ otú ọ ga-adị eze ahụ ike gwụrụ nke nọ n’ute ọrịa, ịchọpụta na ndị gbara ya gburugburu kemgbe bụ ndị sabo chọrọ ka ọ nwụọ ka ha wee nwee ike imezu ihe ọjọọ ha bu n’obi.—Amaokwu nke 5.

12, 13. (a) Olee obi ike Devid kwupụtara? (b) Olee otú o yiri ka Chineke ò si nye Devid ume?

12 Devid nọgidere na-atụkwasị ‘Onye na-eme ụzọ mgbapụ’ obi. Devid kwuru banyere onye na-arịa ọrịa nke ji ezi obi na-efe Jehova, sị: “Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi. Jehova ga-enye ya ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa; Ị ga-agbanwe ihe ndina ya dum n’oge ọ na-arịa ọrịa.” (Ọma 41:1, 3) N’ebe a kwa, okwu bụ́ “Jehova ga-emere ya” gosiri obi ike Devid nwere na Jehova. Devid enweghị obi abụọ ọ bụla na Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ. Olee otú Jehova ga-esi eme nke a?

13 Devid adịghị atụ anya ka Jehova rụọrọ ya ọrụ ebube ma wepụ ọrịa ya. Kama nke ahụ, obi siri Devid ike na Jehova “ga-enye ya ume”—ya bụ na ọ ga-enyere ya aka mgbe ọ nọ n’ute ọrịa. Enyemaka dị otú ahụ dị Devid ezigbo mkpa. E wezụga ahụ́ na-arịa ya nke mere ka ike gwụ ya, ndị iro na-ekwu okwu ọjọọ banyere ya gbara ya gburugburu. (Amaokwu nke 5, 6) Ọ ga-abụ na Jehova nyere Devid ume site n’ime ka o cheta ihe ndị kasiri ya obi. Devid kwuru, sị: “Ị kwadowo m n’ihi iguzosi ike n’ezi ihe m.” (Amaokwu nke 12) Ọ ga-abụkwa na ihe ọzọ nyere Devid ume bụ icheta na n’agbanyeghị na ike adịghịzi ya nakwa okwu ọjọọ ndị iro ya na-ekwu banyere ya, Jehova ka weere ya ka onye na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. Devid mechara gbakee n’ọrịa ya. Ọ̀ bụ na ọ dịghị akasi obi ịmara na Jehova pụrụ inye ndị na-arịa ọrịa ume?—2 Kọr. 1:3.

E Nyere Ya Ihe Ndị Na-akpa Ya

14, 15. Olee mgbe ihe ụfọdụ dị Devid na ndị ohu ya mkpa, oleekwa otú e si nyere ha aka?

14 Mgbe Devid ghọrọ eze Izrel, ọ na-eri nri ndị kacha mma ma na-aṅụ mmanya ndị kacha mma, ọ kpọdịrị ọtụtụ ndị ọzọ ka ha bịa soro ya rie ma ṅụọ. (2 Sam. 9:10) Ma Devid makwa ihe ọ dị ka ya ịnọ n’ụkọ. Mgbe nwa ya bụ́ Absalọm na ndị òtù ya nupụụrụ Devid isi ma chọọ ịnaghara ya ọchịchị, Devid na ndị kwụsiri ike n’akụkụ ya si na Jeruselem gbapụ. Ha gbagara n’ala Gilied, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan. (2 Sam. 17:22, 24) Ebe ọ bụ na ha nọzi na-agbagharị ọsọ ndụ, ihe oriri na ihe ọṅụṅụ bịara nnọọ kọọ Devid na ndị ohu ya, ha chọkwara ebe ha ga-ezuru ike. Olee ebe ha ga-enweta ihe ndị a dị ha mkpa n’ịkpa a?

15 Devid na ndị ohu ya mechara rute Mahaneyim. Mgbe ha rutere, ha hụrụ ndị ikom atọ obi kara—ha bụ, Shobi, Mekia, na Bazilaị. Ha dị njikere iji ndụ ha chụọ àjà iji nyere eze Chineke họpụtara aka. Ihe mere nke a ji chọọ ndị obi kara bụ n’ihi na ọ bụrụ na Absalọm aghọọ eze, anaghị ajụ ajụ ma ọ̀ ga-emesikwa onye ọ bụla nyeere Devid aka ike. Mgbe ha hụrụ nsogbu Devid na ndị ohu ya nọ na ya, ụmụ nwoke atọ a kwụsiri ike n’akụkụ Devid nyere ha ihe ndị dị ha ezigbo mkpa, ndị gụnyere ihe ndina, ọka wit, ọka bali, ọka a ṅara n’ọkụ, akịdị, lentil, mmanụ aṅụ, mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, na atụrụ. (Gụọ 2 Samuel 17:27-29.) Ọ ga-abụrịrị na otú ndị ikom a siri lekọta Devid na ndị ohu ya ma gosi na ha kwụ chịm n’akụkụ Devid metụrụ Devid n’ahụ́. Olee otú Devid ga-esi echefu ihe a ha meere ya?

16. Ònye n’ezie nyere Devid na ndị ohu ya ihe na-akpa ha?

16 Ma ònye n’ezie nyere Devid na ndị ohu ya ihe ndị dị ha mkpa? Devid maara na Jehova na-elekọta ndị ya. Jehova nwere ike ịkpali ndị ohu ya ndị ọzọ ka ha nyere onye ha na ya na-efekọ Jehova nke nọ ná mkpa aka. Obi abụọ adịghị ya na mgbe Devid na-atụgharị ihe ahụ mere n’ala Gilied n’uche, ọ chọpụtara na ọ bụ Jehova si n’aka ndị ikom atọ ahụ lekọta ya. Mgbe ọnwụ ya na-eru nso, Devid dere, sị: “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume [nke gụnyere ya onwe ya] kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Ọma 37:25) Ọ́ bụghị ihe na-akasi obi ịmara na aka Jehova adịghị mkpụmkpụ?—Ilu 10:3.

‘Jehova Maara Otú O Si Anapụta Ndị Mmadụ’

17. Gịnị ka Jehova gosiworo ugboro ugboro?

17 Devid bụ naanị otu n’ime ọtụtụ ndị na-efe Jehova bụ́ ndị Jehova meere ụzọ mgbapụ n’oge Baịbụl. Kemgbe ahụ, e nweela ọtụtụ ugboro ndị ọzọ Chineke gosiri na ihe a Pita onyeozi kwuru bụ eziokwu. Pita sịrị: “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.” (2 Pita 2:9) Ka anyị tụlekwuo ihe atụ abụọ ọzọ.

18. Olee otú Jehova si napụta ndị ya n’oge Hezekaya?

18 Mgbe ndị agha Asiria dị ike bịara ibuso Juda agha ma yie ndị bi na Jeruselem egwu na narị afọ nke asatọ T.O.A., Eze Hezekaya kpere ekpere, sị: “Ugbu a, Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, zọpụta anyị . . . ka alaeze niile nke ụwa wee mara na ọ bụ naanị gị, Jehova, bụ Chineke.” (Aịza. 37:20) Ihe bụ́ isi na-echegbu Hezekaya bụ otú nke a ga-esi mebie aha Chineke. Jehova zara ekpere ahụ si ya n’ala ala obi. Naanị n’otu abalị, otu mmụọ ozi gburu otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise ndị Asiria, si otú a napụta ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.—Aịza. 37:32, 36.

19. Olee ịdọ aka ná ntị Ndị Kraịst narị afọ mbụ ṅara ntị na ya nke mere ka ha gbanahụ mbibi?

19 Abalị ole na ole tupu Jizọs anwụọ, o buru amụma iji dọọ ndị na-eso ụzọ ya nọ na Judia aka ná ntị. (Gụọ Luk 21:20-22.) Ọtụtụ iri afọ gachara ka o kwuchara nke a, ma n’afọ 66 O.A., isi ndị Juu nupụụrụ ndị Rom mere ka ndị agha Rom bịa ibuso Jeruselem agha. Ndị agha Cestius Gallus mebiri otu akụkụ nke mgbidi ụlọ nsọ ahụ; ma ha mechara lawa. Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi matara na nke a bụ ohere ha nwere ịgbanahụ mbibi ahụ Jizọs buru n’amụma, ha gbagara n’ugwu. Ndị agha Rom lọghachiri n’afọ 70 O.A. Na nke ugbu a, ha alaghị, e bibikwara Jeruselem kpamkpam. Ndị Kraịst ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs lanahụrụ ebelebe ahụ gburunụ.—Luk 19:41-44.

20. Olee ihe mere anyị ga-eji nwee ike ịtụkwasị Jehova obi na ‘Ọ ga-emere anyị ụzọ mgbapụ’?

20 Ịtụgharị uche n’akụkọ ndị a na-egosi na Jehova na-enyere ndị ya aka na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ihe ndị o mere n’oge gara aga na-eme ka obi sie anyị ike. N’agbanyeghị ihe isi ike ọ bụla anyị nwere ike izute ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu, anyị nwekwara ike ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam na ọ bụ ‘Onye na-emere ndị ya ụzọ mgbapụ.’ Oleekwanụ ụzọ Jehova nwere ike isi meere anyị ụzọ mgbapụ? Oleekwanụ maka ndị ahụ anyị kpọtụrụ aha ná mmalite? Olee otú ihe sizi gaara ha? Ka anyị hụ nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ì Chetara?

• Olee ihe Abụ Ọma nke iri asaa kwuru nke ga-eme ka anyị nwee obi ike?

• Olee otú e si nyere Devid aka mgbe ọ na-arịa ọrịa?

• Olee ihe atụ ndị na-egosi na Jehova nwere ike ịnapụta ndị ya n’aka ndị mmegide?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 6]

Jehova zara ekpere Hezekaya