Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅomie Jizọs Site n’Ife Chineke Otú Dị Ya Mma

Ṅomie Jizọs Site n’Ife Chineke Otú Dị Ya Mma

Ṅomie Jizọs Site n’Ife Chineke Otú Dị Ya Mma

Chineke ji ịhụnanya na-akpọ “ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile” ka ha bịa fee ya. (Mkpu. 7:9, 10; 15:3, 4) Ndị nabatara òkù a a kpọrọ nwere ike ịhụ “ịdị mma Jehova.” (Ọma 27:4; 90:17) Ha ji olu dara ụda na-eto Chineke dị ka ọbụ abụ ahụ mere, sị: “Ka anyị fee ya ofufe kpọọrọ ya isiala, ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova bụ́ Onye kere anyị.”—Ọma 95:6.

Ụdị Ofufe Na-adị Jehova Mma

Ebe ọ bụ na Jizọs bụ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya, o nwere ohere zuru ezu ịmụta otú Nna ya si eche echiche, iwu ya, na otú o si eme ihe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji nwee nnọọ ike ịgwa ndị ọzọ otú ka mma isi fee Jehova. Ọ sịrị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”—Jọn 1:14; 14:6.

Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya na-enweghị atụ site n’iji obi umeala na-edo onwe ya n’okpuru Nna ya. Ọ sịrị: “Adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m; kama m na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.” Ọ gbakwụnyeziri, sị: “M na-eme ihe ọ bụla dị ya mma mgbe niile.” (Jọn 8:28, 29) Olee ụzọ ndị Jizọs si mee ihe ndị dị Nna ya mma?

Otu ihe doro anya bụ na Jizọs nyefere Nna ya onwe ya kpamkpam, bụ́kwanụ ihe bụ́ isi ife Chineke ofufe pụtara. Jizọs gosiri na ya hụrụ nnọọ Nna ya n’anya site n’irubere Ya isi na ime uche Ya, ọbụna mgbe ọ kpataara ya ahụhụ dị ukwuu. (Fil. 2:7, 8) Otu ụzọ dị mkpa Jizọs si fee Jehova bụ site n’ịrụchi ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anya, ruo n’ókè nke na ma ndị kwere ekwe ma ndị na-ekweghị ekwe kpọrọ ya Onye Ozizi. (Mat. 22:23, 24; Jọn 3:2) Jizọs jikwara oge ya na ume ya nyere ndị ọzọ aka. Àgwà ịchụ onwe onye n’àjà o nwere mere ka ọ ghara inwecha oge maka onwe ya, ma ijere ndị ọzọ ozi na-enye ya obi ụtọ. (Mat. 14:13, 14; 20:28) N’agbanyeghị na Jizọs enweghị ohere, o wepụtara oge kpegara Nna ya nke eluigwe ekpere. (Luk 6:12) N’ezie, ofufe Jizọs dị nnọọ Chineke mma!

Ịgbalị Ime Ihe Dị Chineke Ezi Mma

Jehova hụrụ àgwà ọma Ọkpara ya na-akpa ma gosi na ọ dị Ya mma. (Mat. 17:5) Setan bụ́ Ekwensu hụkwara àgwà ọma Jizọs. N’ihi ya, o bidoro siwere Jizọs ọnyà. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ dịbeghị mmadụ ọ bụla rubeere Chineke isi kpamkpam, ya bụ, fee nnọọ Chineke otú dị ya mma. Ekwensu chọrọ ime ka Jizọs kwụsị ife Jehova ofufe ruuru ya nnọọ.—Mkpu. 4:11.

Iji duhie Jizọs, Setan nyere ya ihe na-adọ akpịrị. Ọ kpọgara Jizọs “n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.” Ọ gwaziri Jizọs, sị: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.” Gịnị ka Jizọs mere? Ọ gwara ya, sị: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” (Mat. 4:8-10) N’ezie, Jizọs ghọtara na ọ ga-abụ ikpere arụsị ma ọ bụrụ na ya akpọọ isiala nye Setan n’agbanyeghị ihe ọ ga-enye ya. Ọ dịghịdị njikere ife onye ọ bụla ọzọ ofufe n’ụzọ ọ bụla ma ọ́ bụghị naanị Jehova.

E nwere ike Setan agaghị ekwe nkwa inye anyị alaeze niile nke ụwa na ebube ha ma ọ bụrụ na anyị efee ya. Ma ọ ka na-agbalị ime ka ezi Ndị Kraịst kwụsị ife Chineke. Ekwensu chọrọ ka anyị na-efe onye ọzọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.—2 Kọr. 4:4.

Jizọs Kraịst kwesịgidere ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Site n’iguzosi ike n’akụkụ Chineke, Jizọs toro nnọọ Jehova n’ụzọ mmadụ ọ bụla ọzọ na-emetụbeghị. Anyị bụ́ ezi Ndị Kraịst taa na-agbalị iṅomi ụzọ Jizọs si bie ndụ site n’ibute ofufe anyị na-efe Onye Okike anyị ụzọ karịa ihe ọ bụla ọzọ. N’ezie, adịm ná mma anyị na Chineke bụ ihe kacha mkpa n’ihe niile anyị nwere.

Uru Ndị Dị n’Ife Jehova Otú Dị Ya Mma

E nwere ọtụtụ uru dị n’ife Jehova “ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ” n’anya ya. (Jems 1:27) Dị ka ihe atụ, anyị bi n’oge ọtụtụ mmadụ bụ ndị “hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi,” nakwa “ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.” (2 Tim. 3:1-5) Ma n’ezinụlọ Chineke, anyị nwere ihe ùgwù iso ndị dị ọcha, ndị na-agbalị ife Chineke otú dị ya mma, na-akpakọrịta. Nke a ọ́ dịghị agba anyị ume?

Ọ bụrụ na anyị anọgide ghara ikwe ka ụwa a merụọ anyị, anyị na-enwekwu ngọzi nke bụ́ akọnuche dị ọcha. Anyị kwesịrị ịnọgide na-enwe akọnuche dị ọcha site n’ime ihe ndị Chineke chọrọ n’aka anyị nakwa site n’irube isi n’iwu Siza ndị na-emegideghị iwu Chineke.—Mak 12:17; Ọrụ 5:27-29.

E nwekwara ngọzi ndị ọzọ anyị na-enweta site n’iji obi anyị dum na-efe Jehova. Ọ bụrụ na anyị ebute ime uche Chineke ụzọ ná ndụ anyị, anyị ga na-ebi ndụ dị ka ndị nwere nzube, anyị ga na-enwekwa obi ụtọ. Kama ịsị: “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ,” anyị nwere olileanya e ji n’aka nke ibi ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs n’elu ala.—1 Kọr. 15:32.

Akwụkwọ Mkpughe kwuru na oge ga-eru mgbe ndị ha na Jehova nọgidere na-adị ná mma ga-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” O kwuru na “onye ahụ nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ ga-agbasakwa ụlọikwuu ya n’isi ha.” (Mkpu. 7:13-15) Ọ bụ Jehova Chineke, onye kasị dị ebube n’eluigwe na ụwa, bụ onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ. Chetụdị ụdị obi ụtọ ị ga-enwe ma ọ kpọbata gị n’ụlọikwuu ya, na-echebe gị ka ihe ọ bụla ghara imerụ gị ahụ́! Ọ na-echebedị anyị ma na-elekọta anyị ugbu a ruo n’ókè ụfọdụ.

A kọwakwara na e dugara ndị niile na-efe Chineke otú dị ya mma “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.” Isi iyi ndị a na-enye ume ọhụrụ na-anọchite anya ndokwa niile Jehova mere iji mee ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. N’ezie, ‘Chineke ga-eji ihe mgbapụta Kraịst hichapụ anya mmiri ọ bụla n’anya ha.’ (Mkpu. 7:17) A ga-eme ka mmadụ niile zuo okè, bụ́ nke ga-ewetere ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala obi ụtọ dị ukwuu. Ọbụna ugbu a, ndị ji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi na-eti mkpu ọṅụ, ha ji obi ha niile na-ekele Jehova ma soro ndị nọ n’eluigwe na-efe ya, bụ́ ndị na-abụ abụ, sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube, Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Eze mgbe ebighị ebi. Olee onye na-agaghị atụ egwu gị, Jehova, ma too aha gị, n’ihi na ọ bụ naanị gị na-eguzosi ike n’ihe? N’ihi na mba niile ga-abịa kpọọ isiala n’ihu gị, n’ihi na e mewo ka iwu ezi omume gị pụta ìhè.”—Mkpu. 15:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 27]

Olee ihe Setan kwere nkwa inye anyị ma anyị fee ya?