Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Hibru, o kwuru okwu banyere “ibikwasị aka n’isi.” Pọl ọ̀ nọ na-ekwu banyere ịhọpụta ndị okenye ọgbakọ, ka è nwere ihe ọzọ dị iche ọ na-ekwu okwu ya?—Hib. 6:2.

Anyị enweghị ike ikwu kpọmkwem ihe Pọl bu n’obi, ma o yiri ka ọ na-ekwu okwu banyere ibikwasị ndị mmadụ aka n’isi ka ha nata onyinye nke mmụọ nso.

Ma e nwere ebe ndị Baịbụl kwuru okwu banyere ibikwasị ndị mmadụ aka n’isi iji họpụta ha ije ozi Chineke. Mozis “bikwasịrị [Jọshụa] aka n’isi” mgbe ọ họpụtara ya ka ọ nọchie ya. (Diut. 34:9) N’ọgbakọ Ndị Kraịst, a họpụtara ụfọdụ ụmụ nwoke ruru eru site n’ibikwasị ha aka n’isi. (Ọrụ 6:6; 1 Tim. 4:14) Pọl dọrọ aka ná ntị ka a ghara ibikwasị onye ọ bụla aka n’isi ngwa ngwa.—1 Tim. 5:22.

Ma Pọl gbara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ume ka ha,“jisie ike ruo ntozu okè” ugbu a ha hapụcharala “ozizi ndị mbụ.” O kwuziri ihe ndị dị ka “isi n’ọrụ nwụrụ anwụ chegharịa, na inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ, ozizi banyere baptizim na ibikwasị aka n’isi.” (Hib. 6:1, 2) Ịbụ okenye ọ̀ ga-abụ ihe ndị mbụ Ndị Kraịst kwesịrị ijisi ike ruo? Mba. Ịghọ okenye ọgbakọ bụ ihe mgbaru ọsọ ụmụnna nwoke tozuru okè kwesịrị ịgbalị iru ma jiri ihe ùgwù ahụ kpọrọ ihe.—1 Tim. 3:1.

Ma e nwekwara ihe ọzọ e ji ibikwasị aka n’isi mee. Na narị afọ mbụ, Jehova jụrụ mba Izrel ka ha gharazie ịbụ ndị ya ma were Izrel ime mmụọ, nke bụ́ ọgbakọ ndị e tere mmanụ, dochie anya ya. (Mat. 21:43; Ọrụ 15:14; Gal. 6:16) Otu ihe gosiri na e nweela mgbanwe dị otú ahụ bụ na e si n’ụzọ ọrụ ebube nye Ndị Kraịst oge ahụ onyinye nke mmụọ nsọ ndị dị ka ịsụ asụsụ dị iche iche. (1 Kọr. 12:4-11) Mgbe Kọniliọs na ndị ezinụlọ ya ghọrọ ndị kwere ekwe, ndị ọhụrụ a natara mmụọ nsọ, ha gosikwara nke a site n’ikwu okwu “n’asụsụ dị iche iche.”—Ọrụ 10:44-46.

Mgbe ụfọdụ, a na-enye mmadụ onyinye nke mmụọ nsọ site n’ibikwasị ya aka n’isi. Mgbe Filip kwusara ozi ọma na Sameria, e mere ọtụtụ ndị baptizim. Òtù na-achị isi zigara ndịozi bụ́ Pita na Jọn ebe ahụ. N’ihi gịnị? Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ahụ, [ha abụọ] bikwasịrị [ndị ahụ a ka mere baptizim ọhụrụ] aka n’isi, ha wee malite ịnata mmụọ nsọ.” Nke ahụ pụtara na ha natara onyinye nke mmụọ nsọ, nke bụ́ ihe ndị ọzọ pụrụ iji anya ha hụ. Ihe mere anyị ji kwuo nke a bụ n’ihi na mgbe Saịmọn, bụ́ onye nọ na-emebu anwansi, hụrụ otú mmụọ nsọ si na-arụ ọrụ, ọ chọwara ka e resị ya ikike ibikwasị ndị ọzọ aka n’isi ka ha wee nata mmụọ nsọ, nke ga-eme ka ha nwee ike ịrụkwa ọrụ ebube. (Ọrụ 8:5-20) E mechara mee mmadụ iri na abụọ baptizim n’Efesọs. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka n’isi, mmụọ nsọ dakwasịrị ha, ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche na ibu amụma.”—Ọrụ 19:1-7; tụlee 2 Timoti 1:6.

N’ihi ya, ná Ndị Hibru 6:2, o yiri ka ihe Pọl na-ekwu okwu ya ọ̀ bụ ibikwasị aka n’isi iji mee ka ndị ka ghọrọ ndị kwere ekwe ọhụrụ nata onyinye nke mmụọ nsọ.