Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Ndị E Degaara Ndị Tesalonaịka nakwa Timoti

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Ndị E Degaara Ndị Tesalonaịka nakwa Timoti

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Ndị E Degaara Ndị Tesalonaịka nakwa Timoti

A NỌWO na-emegide ọgbakọ ọhụrụ ahụ dị na Tesalonaịka kemgbe e hiwere ya mgbe Pọl onyeozi gara ebe ahụ. N’ihi ya, mgbe Timoti, bụ́ onye o yiri ka o rubeghị afọ iri atọ mgbe ahụ, wetara ozi na-enye obi ụtọ mgbe o si Tesalonaịka lọta, Pọl degaara ndị Tesalonaịka akwụkwọ ozi iji jaa ha mma ma gbaa ha ume. O yiri ka ọ bụ n’afọ nke 50 O.A. ka e dere akwụkwọ ozi ahụ. Ọ bụkwa akwụkwọ ozi mbụ Pọl ji ike mmụọ nsọ dee. Obere oge ka o dechara nke mbụ, o degakwaara Ndị Kraịst bi na Tesalonaịka akwụkwọ ozi nke abụọ. Na nke abụọ a, ọ gbaziri echiche na-ezighị ezi nke ụfọdụ ndị nwere ma gbaa ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ume ka ha nọsie ike n’okwukwe.

Ka ihe dị ka afọ iri gachara, Pọl nọzi na Masedonia, Timoti anọrọkwa n’Efesọs. Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi, na-agba ya ume ka ọ nọrọ n’Efesọs iji nyere ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ aka ịnọsi ike n’okwukwe n’agbanyeghị ndị nkụzi ụgha nọ n’ọgbakọ dị ebe ahụ. Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi nke abụọ mgbe a malitere ịkpagbu Ndị Kraịst n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ ka ọkụ ọgbụgba kpachara mkpamkpa na Rom n’afọ 64 O.A. Ọ bụ nke a bụ akwụkwọ ozi ikpeazụ Pọl ji ike mmụọ nsọ dee. Anyị pụrụ irite uru na ndụmọdụ dị n’akwụkwọ ozi anọ ndị a, ha nwekwara ike ịgba anyị ume.—Hib. 4:12.

“MỤRỤ ANYA”

(1 Tesa. 1:1–5:28)

Pọl jara ndị Tesalonaịka mma maka ‘ọrụ ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ na ndọgbu ha ji ịhụnanya na-adọgbu onwe ha n’ọrụ nakwa ntachi obi ha.’ Ọ gwara ha na ha bụ ‘olileanya ya na ọṅụ ya na okpueze aṅụrị ya.’—1 Tesa. 1:3; 2:19.

Mgbe ọ gwachara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka ka ha jiri olileanya mbilite n’ọnwụ kasie ibe ha obi, Pọl kwuru, sị: “Ụbọchị Jehova na-abịa kpọmkwem dị ka onye ohi si abịa n’abalị.” Ọ gwara ha ka ha “mụrụ anya” ma nwee uche ziri ezi.—1 Tesa. 4:16-18; 5:2, 6.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

4:15-17—Olee ndị ka a ga-eburu “gaa n’ígwé ojii izute Onyenwe anyị na mbara igwe,” oleekwa otú nke a ga-esi mee? Ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ dị ndụ n’oge ọnụnọ Kraịst n’ike Alaeze ya. Ha ‘ga-ezute Onyenwe anyị’ Jizọs na mbara igwe a na-adịghị ahụ anya. Ma tupu nke a emee, ha ga-ebu ụzọ nwụọ, a kpọlitekwa ha n’ọnwụ ịbụ ndị mmụọ. (Rom 6:3-5; 1 Kọr. 15:35, 44) Ọnụnọ Kraịst amalitela kemgbe, n’ihi ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nke na-anwụ n’oge a anaghị anọgide n’ili. A “ga-eburu” ha ma ọ bụ kpọlite ha n’ọnwụ ozugbo.—1 Kọr. 15:51, 52.

5:23—Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kpere n’ekpere ka ‘mmụọ na mkpụrụ obi na ahụ́ ụmụnna anyị bụrụ nke e chebere’? Ihe Pọl na-ekwu okwu ya bụ mmụọ, mkpụrụ obi, na ahụ́, nke bụ́ ọgbakọ Ndị Kraịst niile, gụnyere Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na Tesalonaịka. Kama ikpe ekpere naanị ka e chebe ọgbakọ ahụ, o kpere ekpere ka e chebe “mmụọ” ya, ma ọ bụ otú o si akpa àgwà. O kpekwara ekpere maka “mkpụrụ obi” ya, nke bụ́ ndụ ya, ya bụ́ ka ọ nọgide na-adị, nakwa maka “ahụ́” ya—nke bụ́ Ndị Kraịst niile e tere mmanụ. (1 Kọr. 12:12, 13) Ekpere a gosiri otú ihe banyere ọgbakọ si echu Pọl ụra.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:3, 7; 2:13; 4:1-12; 5:15. Otu ụzọ dị mma isi nye mmadụ ndụmọdụ bụ ịja onye ahụ mma n’ebe ndị ọ na-eme nke ọma ma gbaa ya ume imekwu nke ọma.

4:1, 9, 10. Ndị na-efe Jehova kwesịrị ịhụ na ha na Jehova nọgidere na-adị ná mma.

5:1-3, 8, 20, 21. Ka ụbọchị Jehova na-abịaru nso, anyị kwesịrị ‘inwe uche ziri ezi ma yiri ihe mgbochi obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu agha.’ Anyị kwesịkwara ịdị na-amụchi Okwu amụma Chineke bụ́ Baịbụl anya.

“GUZOSIENỤ IKE”

(2 Tesa. 1:1–3:18)

O yiri ka ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ gbanwere ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi ya mbụ wee na-ekwuzi na “ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst” eruwela. Iji gbazie ụdị echiche a, Pọl gwara ha ihe ‘ga-ebu ụzọ’ abịa.—2 Tesa. 2:1-3.

Pọl gbara ha ume, sị: “Guzosienụ ike, jidesiekwanụ aka ike n’omenala ndị a kụziiri unu.” O nyekwara ha iwu ka ha “zere nwanna ọ bụla nke na-adịghị agazi agazi.”—2 Tesa. 2:15; 3:6.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:3, 8—Ònye bụ “onye ahụ na-emebi iwu,” oleekwa otú a ga-esi gbuo ya? “Onye” a ọtụtụ ndị mejupụtara bụ ndị ụkọchukwu Krisendọm. Onye e nyere ikike ịgwa ndị ọjọọ okwu ikpe ọmụma Chineke ma nye iwu ka e gbuo ha bụ “Okwu ahụ”—nke bụ́ Jizọs Kraịst, Onye bụ́ isi na-ekwuchitere Chineke. (Jọn 1:1) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na Jizọs “ga-eji mmụọ [ike nọ n’ọrụ] nke ọnụ ya” gbuo onye ahụ na-emebi iwu.

2:13, 14—Olee otú o si bụrụ na Chineke ‘họọrọ ndị e tere mmanụ site ná mmalite ka e wee zọpụta ha’? A họpụtara ndị e tere mmanụ dị ka otu ìgwè mgbe Jehova zubere na mkpụrụ nwaanyị ahụ ga-egwepịa Setan n’isi. (Jen. 3:15) Jehova kwukwara ihe ndị ha na-aghaghị ime iji ruo eruo, ọrụ ha ga-arụ, nakwa ule ndị ha ga-enweta. O si otú a ‘kpọọ ha’ inweta ebube Kraịst.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:6-9. Ọ bụ naanị ndị dara iwu ka Jehova na-ama ikpe.

3:8-12. Na ụbọchị Jehova dị nso abụghị ihe anyị ga-akụdo aka ghara ịrụ ọrụ iji gboo mkpa ndị anyị nwere ma nwee ike ịdị na-ekwusa ozi ọma. Ịnọ nkịtị nwere ike ime ka anyị dị umengwụ, meekwa ka anyị “na-enyonye anya n’ihe na-agbasaghị [anyị].”—1 Pita 4:15.

“CHEE IHE AHỤ E NYEFERE N’AKA GỊ NCHE”

(1 Tim. 1:1–6:21)

Pọl gwara Timoti ka ọ “na-ebu agha ọma ahụ; jidesie okwukwe na ezi akọ na uche ike.” Onyeozi ahụ kwukwara ihe ndị a ga-ele anya wee họpụta ụmụnna nwoke ndị ruru eru n’ọgbakọ. Pọl gwakwara Timoti ka ọ “jụ akụkọ ụgha ndị na-emerụ ihe dị nsọ.”—1 Tim. 1:18, 19; 3:1-10, 12, 13; 4:7.

Pọl dere, sị: “Abasirila okenye mba ike.” Ọ gbakwara Timoti ume, sị: “Chee ihe ahụ e nyefere n’aka gị nche, na-agbakụta okwu nzuzu ndị na-emerụ ihe dị nsọ azụ nakwa ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha nke a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha.”—1 Tim. 5:1; 6:20.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:18; 4:14—Gịnị bụ “amụma” ndị e buru banyere Timoti? Ha nwere ike ịbụ ihe ụfọdụ e buru n’amụma banyere ọrụ Timoti ga-arụ n’ọgbakọ n’ọdịnihu, bụ́ ihe ndị e ji ike mmụọ nsọ kwuo mgbe Pọl bịara Listra ná njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ. (Ọrụ 16:1, 2) Dabere n’ihe ndị ahụ e buru ‘n’amụma,’ ndị okenye nke ọgbakọ ebe ahụ ‘bikwasịrị Timoti aka n’isi’ ma họpụta ya ije ozi pụrụ iche.

2:15—Olee otú e si ‘echebe nwaanyị site n’ịmụ nwa’? Ịmụ nwa, ilekọta ụmụ ya, na ilekọta ezinụlọ ya nwere ike ‘ichebe’ nwaanyị ka ọ ghara ịnọ nkịtị ‘na-aghọ onye asịrị na onye na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ya.’—1 Tim. 5:11-15.

3:16—Gịnị bụ ihe nzuzo dị nsọ banyere nsọpụrụ Chineke? Ruo ọtụtụ afọ, ọ dịghị onye maara ma à ga-enwe mmadụ ga-erubere Jehova isi n’ụzọ zuru okè ma ọ bụ na a gaghị enwe. Ọ bụ Jizọs gosiri na nke a ga-ekwe omume site n’irubere Chineke isi n’ụzọ zuru okè ruo ọnwụ ya.

6:15, 16—Ọ̀ bụ Jehova Chineke ka ọ̀ bụ Jizọs Kraịst ka a na-ekwu maka ya ebe a? Ọ bụ Jizọs Kraịst, bụ́ onye a na-akọwa otú ọ ga-esi pụta ìhè, ka a na-ekwu okwu ya ebe a. (1 Tim. 6:14) Ọ bụrụ na e jiri ụmụ mmadụ bụ́ ndị eze na ndị ọchịchị tụnyere Jizọs, ọ bụ naanị Jizọs bụ “Eze Ukwu,” ọ bụkwa naanị ya bụ onye na-adịghị anwụ anwụ. (Dan. 7:14; Rom 6:9) Kemgbe ọ rịgoro n’eluigwe nke a na-adịghị ahụ anya, ọ dịghị mmadụ ọ bụla ‘pụrụ iji anya nkịtị hụ ya.’

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

4:15. Ma ànyị ka batara ọhụrụ n’ọgbakọ ma ọ̀ dịla anya anyị jewerela Jehova ozi, anyị niile kwesịrị ịgbalịsi ike ịdị na-enwe ọganihu ma hụ na anyị na Jehova na-adịkwu ná mma.

6:2. Ọ bụrụ na onye anyị na-arụrụ ọrụ bụ onye kwere ekwe ibe anyị, kama ịghọwa aghụghọ n’ihi na ọ bụ nwanna anyị, anyị kwesịrị ịdịkwu njikere ịrụrụ ya ọrụ karịa ka anyị ga-arụrụ onye na-abụghị Onyeàmà ibe anyị.

“KWUSAA OKWU CHINEKE, JIRI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-EKWUSA YA”

(2 Tim. 1:1–4:22)

Iji mee ka Timoti dịrị njikere maka ihe isi ike ndị ọ ga-enweta n’ọdịnihu, Pọl dere, sị: “Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama nke ike na nke ịhụnanya na nke uche zuru okè.” A dọkwara Timoti aka ná ntị, sị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ, onye ruru eru izi ihe.”—2 Tim. 1:7; 2:24.

Pọl gbara Timoti ume, sị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere.” Ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ na-agbasa ozizi ha, n’ihi ya, onyeozi ahụ dụrụ nwa okorobịa a bụ́ onye nlekọta ọdụ, sị: “Kwusaa okwu Chineke, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya . . . , dọọ aka ná ntị, baa mba, gbaakwa ndị mmadụ ume.”—2 Tim. 3:14; 4:2.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:13—Gịnị bụ “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ”? “Okwu na-enye ezi ndụ” bụ “okwu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst”—ya bụ́ ozizi ezi Ndị Kraịst. (1 Tim. 6:3) Ihe Jizọs kụziri na ihe ndị o mere kwekọrọ n’Okwu Chineke, n’ihi ya, a pụkwara ikwu na okwu ahụ bụ́ “okwu na-enye ezi ndụ” gụnyere ozizi niile dị na Baịbụl. Ozizi ndị a nwere ike inyere anyị aka ịmara ihe ndị Jehova chọrọ ka anyị na-eme. Anyị na-ejidesi ụkpụrụ a ike site n’ime ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl.

4:13—Gịnị bụ́ “akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe” Pọl sị wetara ya? Ihe ahụ ọ kpọrọ “akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe” bụ akpụkpọ anụ ndị e meziri nke ọma ka e nwee ike na-ede ihe n’elu ha. O nwere ike ịbụ na ihe Pọl chọrọ bụ ka e wetara ya akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru ụfọdụ ka o nwee ike ịmụ ha mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom. O nwere ike ịbụ na e ji papaịrọs mee ụfọdụ n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ma jiri akpụkpọ anụ mee ndị ọzọ.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:5; 3:15. Ihe bụ́ isi mere Timoti ji nwee okwukwe na Jizọs Kraịst, ya bụ, ihe kpaliri Timoti ije ozi niile o jere, bụ n’ihi na e bidoro n’oge ọ bụ nwata kụziere ya ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ n’ezinụlọ ha. Ọ dị nnọọ mkpa ka ndị nwere ụmụ chebara otú ha si arụzu ọrụ ịzụ ụmụ Chineke nyere ha echiche!

1:16-18. Mgbe ndị kwere ekwe ibe anyị nwere ihe isi ike, a na-akpagbu ha, ma ọ bụkwanụ tụọ ha mkpọrọ, anyị kwesịrị icheta ha n’ekpere ma gbalịa ike anyị niile inyere ha aka.—Ilu 3:27; 1 Tesa. 5:25.

2:22. Ndị Kraịst, karịsịa ndị na-eto eto, ekwesịghị ikwe ka mmega ahụ́, egwú, ihe ntụrụndụ, ihe ndị na-amasịkarị ha ime, ime njem, mkparịta ụka ndị na-enweghị isi na ihe ndị yiri ya na-ewekọrọ oge ha nke na ha agaghị enwezi oge maka ihe ndị metụtara ofufe Chineke.

[Foto dị na peeji nke 31]

Olee nke bụ́ nke ikpeazụ n’akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ dee?