Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nyere Ndị Si n’Ìgwè Atụrụ Chineke Kpafuo Aka

Nyere Ndị Si n’Ìgwè Atụrụ Chineke Kpafuo Aka

Nyere Ndị Si n’Ìgwè Atụrụ Chineke Kpafuo Aka

“Soronụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọtawo m atụrụ m nke furu efu.”—LUK 15:6.

1. Olee otú Jizọs si gosi na ya bụ onye ọzụzụ atụrụ hụrụ atụrụ ya n’anya?

A KPỌRỌ Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Jehova mụrụ naanị ya, “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ.” (Hib. 13:20) Akwụkwọ Nsọ buru amụma banyere ọbịbịa ya ma gosi na ọ bụ Onye ọzụzụ atụrụ pụrụ iche nke gbalịrị ịchọta “atụrụ furu efu” nke ụlọ Izrel. (Mat. 2:1-6; 15:24) Ọzọkwa, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ nkịtị nwere ike iji ndụ ya chụọ àjà iji chebe atụrụ ya, Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka ndị yiri atụrụ, bụ́ ndị ga-achọ irite uru n’àjà ahụ.—Jọn 10:11, 15; 1 Jọn 2:1, 2.

2. Olee ihe ndị o nwere ike ịbụ na ọ bụ ha mere ụfọdụ Ndị Kraịst ji kwụsị ijere Jehova ozi?

2 Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị yiri ka hà nwere ekele maka àjà Jizọs chụrụ ma rara ndụ ha nye Chineke esila n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụọ. O nwere ike nkụda mmụọ, ọrịa, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ mere ha ji jụọ oyi ma kwụsị ijere Jehova ozi. Ma, ọ bụ naanị n’ìgwè atụrụ Chineke ka ha ga-anọ obi eruo ha ala, ha enweekwa ụdị obi ụtọ ahụ Devid kwuru okwu ya n’Abụ Ọma nke iri abụọ na atọ. Dị ka ihe atụ, Devid bụrụ abụ, sị: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m.” (Ọma 23:1) N’ụzọ ime mmụọ, ọ dịghị ihe kọrọ ndị nọ n’ìgwè atụrụ Chineke, ma ọ bụghị otú a ka ọ dị atụrụ ndị kpafuru akpafu. Ònye ga-enyere ha aka? Olee otú e nwere ike isi nyere ha aka? Gịnị kpọmkwem ka e nwere ike ime iji nyere ha aka ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke?

Ònye Nwere Ike Inye Aka?

3. Olee otú Jizọs si gosi ihe e kwesịrị ime iji kpọghachite atụrụ ndị si n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo?

3 Ọ chọrọ mgbalị siri ike iji kpọghachite atụrụ ndị si n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo. (Ọma 100:3) Jizọs ji otu ihe atụ gosi na nke a bụ eziokwu mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na otu nwoke nwere otu narị atụrụ ma otu n’ime ha akpafuo, ọ́ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ahụ n’elu ugwu wee gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu? Ọ bụrụ na ọ chọta ya, n’ezie, ana m asị unu, ọ ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ya karịa otú ọ na-aṅụrị n’ihi iri itoolu na itoolu ahụ na-akpafughị akpafu. N’otu aka ahụ, ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.” (Mat. 18:12-14) Olee ndị nwere ike inyere ndị yiri atụrụ si n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo aka?

4, 5. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-ele ìgwè atụrụ Chineke anya?

4 Ọ bụrụ na ndị okenye ọgbakọ chọrọ inyere atụrụ kpafuru akpafu aka, ha kwesịrị iburu n’uche na ìgwè atụrụ Chineke bụ ọgbakọ nke ndị mejupụtara ya bụ ndị raara onwe ha nye Jehova—ndị bụ́ ‘ìgwè atụrụ dị oké ọnụ ahịa nọ n’ebe ịta nri Chineke.’ (Ọma 79:13) E kwesịrị iji ọmịiko na ịhụnanya na-elekọta atụrụ ndị a dị oké ọnụ ahịa, nke a pụtakwara na ndị ọzụzụ atụrụ hụrụ atụrụ ha n’anya kwesịrị inwe mmasị n’ebe atụrụ nke ọ bụla nọ. Ịgara ha nleta ọzụzụ atụrụ nwere ike inyere ha nnọọ aka. Agbamume onye ọzụzụ atụrụ ji ịhụnanya nye ha nwere ike ime ka okwukwe ha sie ike ma mee ka ọ gụsiwe ha agụụ ike ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke.—1 Kọr. 8:1.

5 Ndị ọzụzụ atụrụ nke ìgwè atụrụ Chineke nwere ọrụ nke ịchọwa atụrụ ndị kpafuru akpafu ma gbalịa inyere ha aka. Pọl onyeozi chetaara ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs oge ochie ọrụ dịịrị ha ịzụ atụrụ Chineke mgbe o kwuru, sị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Pita onyeozi nyekwara ndị okenye e tere mmanụ ndụmọdụ, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha; ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya, kama n’ịnụ ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa ime ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ̀ bụ unu nwe ha, kama ghọọrọnụ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.”—1 Pita 5:1-3.

6. Gịnị mere o ji kacha mkpa taa ka ndị ọzụzụ atụrụ na-elekọta atụrụ Chineke?

6 Ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọgbakọ kwesịrị iṅomi “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ bụ́ Jizọs. (Jọn 10:11) Ihe banyere atụrụ Chineke na-echu ya ụra, o kwusikwara okwu ike banyere mkpa ọ dị ilekọta ha mgbe ọ gwara Saịmọn Pita ka ‘ọ na-azụ ụmụ atụrụ Ya.’ (Gụọ Jọn 21:15-17.) Ọ kacha dị mkpa ka a na-elekọta atụrụ ahụ taa, bụ́ mgbe Ekwensu fooro ntutu taa na ọ ga-emerịrị ka ndị raara onwe ha nye Chineke kwụsị irubere Jehova isi. Setan na-agbalị ịnwata atụrụ Jehova ime ihe anụ ahụ́ ha na-ezughị okè chọrọ. Ọ na-agbakwa mbọ iji ihe nke ụwa mee ka ha tinye aka ná mmehie. (1 Jọn 2:15-17; 5:19) Ndị ọ ga-akacha adịrị ya mfe inweta bụ ndị na-adịghịzi ejere Jehova ozi. N’ihi ya, ha chọrọ enyemaka iji nwee ike ime ihe ahụ a dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme, nke bụ́ ka anyị “na-eje ije site na mmụọ nsọ.” (Gal. 5:16-21, 25) Ọ bụrụ na anyị chọrọ inyere atụrụ ndị dị otú a aka, ọ dị mkpa na anyị ga na-ekpechi ekpere anya maka enyemaka Chineke. Anyị kwesịkwara ikwe ka mmụọ nsọ ya na-eduzi anyị ma jiri Okwu ya na-eme ihe nke ọma.—Ilu 3:5, 6; Luk 11:13; Hib. 4:12.

7. Olee ókè ọ dịruru mkpa ka ndị okenye na-elekọta ndị yiri atụrụ e nyefere ha n’aka?

7 Onye ọzụzụ atụrụ n’Izrel oge ochie na-eji ogologo mkpara isi ya rọrọ arọ eduzi atụrụ ya. Ka atụrụ ya na-abanye ma ọ bụ na-apụ n’ogige atụrụ ahụ, ha na-agafe ‘n’okpuru mkpara ahụ,’ nke a na-emekwa ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ nwee ike ịgụ ha ọnụ. (Lev. 27:32; Maị. 2:12; 7:14) N’ụzọ yiri nke a, Onye Kraịst bụ́ onye ọzụzụ atụrụ kwesịrị ịma banyere atụrụ Chineke nke e nyere ya ka ọ na-elekọta. (Tụlee Ilu 27:23.) N’ihi ya, otú a ga-esi na-elekọta atụrụ Chineke bụ otu n’ime ọrụ ndị dị mkpa ndị okenye na-ekwurịta mgbe ha na-enwe nzukọ. Nke a gụnyere ime ndokwa inyere atụrụ ndị nke kpafuru akpafu aka. Jehova n’onwe ya kwuru na ya ga-achọ atụrụ ya ma lekọta ha dị ka o kwesịrị. (Ezik. 34:11) Ọ na-amasị Chineke n’ezie mgbe ndị okenye ṅomiri ya n’ịgbalị inyere atụrụ kpafuru akpafu aka ịlọghachi n’ìgwè atụrụ ya.

8. Olee ụzọ ndị okenye nwere ike isi na-elebara atụrụ nke ọ bụla anya?

8 Ọ bụrụ na onye ọzụzụ atụrụ Chineke agaa leta onye kwere ekwe ibe ya mgbe onye ahụ na-arịa ọrịa, nke a nwere ike ime ka onye ahụ nwee ọṅụ, o nwedịrị ike ịgba ya ume. Otu ihe a ga-emekwa mgbe e lebaara atụrụ na-arịa ọrịa ime mmụọ anya. Ndị okenye nwere ike ha na onye ahụ agụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ, gụọ otu isiokwu e bipụtara n’akwụkwọ anyị, ma kwurịta isi ihe ụfọdụ ndị a mụrụ n’ọmụmụ ihe. Ha nwekwara ike iso onye ahụ na-adịghị ejekwa ozi kpee ekpere, ma ọ bụ mee ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ha nwere ike ịgwa onye ahụ na ọ ga-atọgbu ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ atọgbu ịhụ ya ka ọ maliteghachiri ịbịa ọmụmụ ihe. (2 Kọr. 1:3-7; Jems 5:13-15) Ịga leta onye ahụ, ịkpọ ya na fon, ma ọ bụ idegara ya akwụkwọ ozi nwere ike ịgba ya ume nke ukwuu! Inyere atụrụ kpafuru akpafu aka nwekwara ike ime ka ndị ọzụzụ atụrụ nwere ọmịiko nwee ọṅụ dị ukwuu.

Onye Ọ Bụla Nwere Ike Inye Aka

9, 10. Olee ihe mere ị ga-eji kwuo na inyere atụrụ kpafuru akpafu aka abụghị ọrụ dịịrị naanị ndị okenye?

9 Oge anyị bi na ya dị oké egwu, ọ dịghịkwa onye na-enwe ohere. N’ihi ya, o nwere ike anyị agaghị achọpụta na onye kwere ekwe ibe anyị ji nwayọọ nwayọọ na-apụ n’ọgbakọ. (Hib. 2:1) Ma, atụrụ Jehova dị oké ọnụ ahịa n’anya ya. Nke ọ bụla n’ime ha dị mkpa, dị nnọọ ka akụkụ ahụ́ niile dị. N’ihi ya, anyị niile kwesịrị ịdị na-egosi mmasị n’ebe ụmụnna anyị nọ ma na-elekọta ibe anyị n’ezie. (1 Kọr. 12:25) Ị̀ na-eme otú a?

10 Ọ bụ eziokwu na ndị okenye na-ebute ụzọ n’ịchọ atụrụ ndị kpafuru akpafu na inyere ha aka, ọ bụghị naanị ndị okenye ọgbakọ ka ọ dịịrị inyere ndị kwere ekwe ibe anyị kpafuru akpafu aka. Ndị ọzọ nwere ike iso ndị ọzụzụ atụrụ a na-eme nke a. Anyị nwere ike ma kwesịkwa ịgba ụmụnna anyị ndị chọrọ enyemaka iji lọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke ume ma nyere ha aka ịkwụsi ike. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?

11, 12. Olee otú i nwere ike isi nwee ihe ùgwù nke inyere onye chọrọ enyemaka aka?

11 Mgbe ụfọdụ, ndị okenye nwere ike ime ndokwa ka ndị nkwusa Alaeze nwere ahụmahụ gaa duziwere ndị na-adịghị ejekwa ozi chọrọ ka e nyere ha aka ọmụmụ Baịbụl. Ihe e ji eme nke a bụ ka ndị dị otú a nweghachi “ịhụnanya ahụ [ha] nwere na mbụ.” (Mkpu. 2:1, 4) Anyị nwere ike iwusi ndị kwere ekwe ibe anyị a ike site n’ịmụrụ ha ihe ndị ha na-amụghị kemgbe ha kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe.

12 Ọ bụrụ na ndị okenye agwa gị ka ị mụwara onye kwere ekwe ibe gị chọrọ enyemaka ihe, kpegara Jehova ekpere ka o nyere gị aka, ka o meekwa ka mgbalị gị rụpụta ihe. N’ezie, “nyefee ọrụ gị n’aka Jehova, atụmatụ gị ga-eguzosikwa ike.” (Ilu 16:3) Buru ụzọ chebara akụkụ Baịbụl na ihe ndị na-ewusi okwukwe ike ndị ị ga-achọ ịkpọtụ uche echiche mgbe gị na ndị chọrọ enyemaka na-akparịta ụka. Chebara ezigbo ihe nlereanya Pọl onyeozi setịpụrụ echiche. (Gụọ Ndị Rom 1:11, 12.) Ọ gụsiri Pọl agụụ ike ịhụ Ndị Kraịst nọ na Rom ka o wee nyetụ ha onyinye ime mmụọ, ka ha wee guzosie ike. Ọ tụsikwara anya ike mgbe ha na ya ga-agbarịta ibe ha ume. Ọ̀ bụ na ó kwesịghị ịdị anyị otú a mgbe anyị chọrọ inyere atụrụ ndị si n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo aka?

13. Gịnị ka gị na onye na-adịghị ejekwa ozi nwere ike ịkparịta?

13 Mgbe unu na-akparịta ụka, i nwere ike ịjụ ya sị, “Olee otú i si nata eziokwu?” Gwa ya kọọrọ gị oge ndị nyere ya obi ụtọ mgbe ọ ka na-ejere Chineke ozi. Gbaa ya ume ịkọ ahụmahụ ndị na-enye obi ụtọ o nwetara n’ọmụmụ ihe, n’ozi ọma, nakwa ná mgbakọ. Chetara ya oge ndị mere unu abụọ obi ụtọ n’ozi Jehova. Kọọrọ ya otú ịbịaru Jehova nso si na-enye gị ọṅụ. (Jems 4:8) Kwuo otú obi dị gị maka otú Chineke si enye anyị bụ́ ndị ya ihe na-akpa anyị—karịsịa otú o si eme nke a site n’ịkasi anyị obi mgbe anyị nọ ná mkpagbu, nakwa otú o si mee ka anyị nwee olileanya na ihe ga-adị mma.—Rom 15:4; 2 Kọr. 1:3, 4.

14, 15. Olee ngọzi ndị na-adịghị ejekwa ozi na-enwebu ndị ọ ga-abụ i chetara ha ya enyere ha aka?

14 Eleghị anya, ọ ga-abara onye ahụ na-adịghị ejekwa ozi uru ma i chetara ya ụfọdụ ngọzi ndị o nwetara mgbe o so ọgbakọ na-emekọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ mụtara Okwu Chineke na nzube ya nke ọma. (Ilu 4:18) Mgbe ọ ‘na-eje ije dị ka onye mmụọ nsọ na-achị,’ obi abụọ adịghị ya na ọ dịịrị ya mfe izere ihe ndị na-anwa ya ọnwụnwa ime mmehie. (Gal. 5:22-26) Akọnuche dị ọcha nke a mere ka o nwee mere ka ọ dịrị ya mfe ikpegara Jehova ekpere, meekwa ka o nwee ‘udo nke Chineke nke karịrị echiche niile, bụ́ nke na-eche obi anyị na ike iche echiche anyị nche.’ (Fil. 4:6, 7) Buru ihe ndị a n’uche, gosi ezi mmasị n’ebe onye ahụ nọ, gbalịa ike gị niile iji ịhụnanya na-agba nwanna gị ume ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke.—Gụọ Ndị Filipaị 2:4.

15 Ka e were ya na ị bụ okenye nke gara nleta ọzụzụ atụrụ. I nwere ike ịgba di na nwunye na-adịghị ejekwa ozi ume ka ha cheta mgbe ha mụtara eziokwu nke Okwu Chineke ọhụrụ. Ọ tọrọ ha nnọọ ụtọ, ha hụkwara na ihe ha mụtara na ya enweghị mgbagha. O mekwara ka ọtụtụ ihe doo ha anya, ma nyere ha aka izere ozizi ụgha. (Jọn 8:32) Ha nwere nnọọ ekele maka ihe ha mụtara banyere Jehova, ịhụnanya ya, na nzube ya ndị na-enweghị atụ! (Tụlee Luk 24:32.) Chetara ha otú ha na Jehova sibu dịrị ná mma na ihe ùgwù na-enweghị atụ nke Ndị Kraịst raara onwe ha nye Chineke nwere ikpegara ya ekpere. Gbasie ndị na-adịghị ejekwa ozi ume ike ka ha nabataghachi “ozi ọma dị ebube nke Chineke bụ́ onye obi ụtọ,” bụ́ Jehova.—1 Tim. 1:11.

Nọgide Na-egosi na Ị Hụrụ Ha n’Anya

16. Nye ihe atụ iji gosi na mgbalị e mere iji nyere onye na-adịghị ejekwa ozi aka na-arụpụta ihe.

16 Aro ndị a a tụrụ hà na-enye aka n’ezie? Ee. Dị ka ihe atụ, otu onye na-eto eto nke ghọrọ onye nkwusa Alaeze mgbe ọ dị afọ iri na abụọ kwụsịrị ije ozi mgbe ọ dị afọ iri na ise. Ma, ọ maliteghachiri ije ozi, ọ nọwokwa na-eje ozi oge niile kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ ugbu a. Ihe bụ́ isi mere o ji maliteghachi jewe ozi bụ aka otu okenye ọgbakọ nyeere ya. O nwere nnọọ ekele maka aka a o nyeere ya!

17, 18. Olee àgwà ndị ga-eme ka i nwee ike inyere onye si n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo aka?

17 Ọ bụ ịhụnanya na-akpali Ndị Kraịst inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka ịlọghachi n’ọgbakọ. Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) N’ezie, ịhụnanya bụ ihe e ji ama ezi Ndị Kraịst. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị igosi ịhụnanya dị otú a n’ebe Ndị Kraịst merela baptizim kwụsịrịla ije ozi nọ? Anyị kwesịrị! Ma e nwere àgwà ndị na-amasị Chineke anyị kwesịrị inwe mgbe anyị na-enyere ndị a aka.

18 Olee àgwà ndị i kwesịrị inwe iji nwee ike inyere onye si n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo aka? E wezụga ịhụnanya, ọ ga-adị mkpa ka i nwee ọmịiko, obiọma, dịrị nwayọọ n’obi, ma nwee ogologo ntachi obi. Na-adabere n’ọnọdụ e nwere, o nwekwara ike ịdị mkpa ka ị na-agbaghara mmejọ. Pọl dere, sị: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe. Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Kọl. 3:12-14.

19. Gịnị mere ịgbalịsi ike inyere ndị yiri atụrụ aka ịlọghachi n’ọgbakọ abụghị ihe furu ọhịa?

19 N’isiokwu na-eso nke a, a ga-atụle ihe mere ụfọdụ ndị ji esi n’ìgwè atụrụ Chineke akpafu. A ga-egosikwa otú ndị na-alọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke ga-atụ anya ka e si nabata ha. Ka ị na-amụ isiokwu ahụ ma na-atụgharị uche na nke a, obi sie gị ike na mgbalị ọ bụla i mere iji nyere ndị yiri atụrụ aka ịlọghachi n’ọgbakọ efughị ọhịa. N’ụwa ochie a, ọtụtụ ndị na-eji ndụ ha niile na-achụ akụnụba, ma ndụ naanị otu onye dị ezigbo mkpa karịa ego niile dị n’ụwa a. Jizọs mere ka nke a pụta ìhè n’ihe atụ o nyere banyere atụrụ furu efu. (Mat. 18:12-14) Buru nke a n’uche ka ị na-agbalị ike gị niile ime ihe ngwa ngwa iji nyere ndị yiri atụrụ Jehova hụrụ n’anya, bụ́ ndị kpafuworo akpafu, aka ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee ọrụ ndị ọzụzụ atụrụ e nwere n’ọgbakọ nwere ịrụrụ ndị yiri atụrụ kpafuru akpafu?

• Olee otú i nwere ike isi nyere ndị kwụsịrịla iso ọgbakọ aka?

• Olee àgwà ndị pụrụ ime ka i nwee ike inyere ndị sirila n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọgbakọ na-eji ịhụnanya agbalị inyere ndị si n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo aka