Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Jems na Pita

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Jems na Pita

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Jems na Pita

IHE fọrọ obere ka o ruo afọ iri atọ ka Pentikọst 33 O.A. gachara, onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems—onye otu nne ji ya na Jizọs—degaara “ebo iri na abụọ” nke Izrel ime mmụọ, akwụkwọ ozi. (Jems 1:1) Ebumnuche ya bụ: ịgba ha ume ka okwukwe ha sie ike na ka ha na-atachi obi mgbe ọnwụnwa bịara ha. Ọ dụkwara ha ọdụ banyere ihe ụfọdụ na-ekwesịghị ekwesị na-eme n’ọgbakọ ha.

Obere oge tupu Eze Ukwu ndị Rom bụ́ Nero amalite ịkpagbu Ndị Kraịst n’afọ 64 O.A., Pita onyeozi degaara Ndị Kraịst akwụkwọ ozi ya mbụ, na-agba ha ume ka ha nọgidesie ike n’okwukwe. N’akwụkwọ ozi ya nke abụọ, bụ́ nke o dere obere oge o dechara nke mbụ, Pita gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha na-amụ Okwu Chineke ma dọọ ha aka ná ntị banyere ọbịbịa nke ụbọchị Jehova. N’ezie, anyị ga-erite uru site n’ịgụ akwụkwọ ozi Jems na Pita.—Hib. 4:12.

NDỊ ‘JI OKWUKWE NA-ARỊỌ’ KA CHINEKE NA-ENYE AMAMIHE YA

(Jems 1:1–5:20)

Jems dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-atachi obi n’ọnwụnwa, n’ihi na mgbe a nwapụtara ya, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ.” Ndị ‘ji okwukwe na-arịọ’ ka Jehova na-enye amamihe ka ha nwee ike idi ọnwụnwa ndị na-abịara ha.—Jems 1:5-8, 12.

Ọ dịkwa mkpa ka ndị ‘bụ́ ndị ozizi’ n’ọgbakọ nwee okwukwe na amamihe. Mgbe Jems kwuchara na ire bụ “ihe dị nta nke dị n’ahụ́” ma o nwere ike ‘ime ka ahụ́ dum nwee ntụpọ,’ ọ dọrọ aka ná ntị banyere omume ndị ụwa bụ́ ndị nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Chineke. O kwukwara ihe onye ọ bụla na-arịa ọrịa ime mmụọ kwesịrị ime iji gbakee.—Jems 3:1, 5, 6; 5:14, 15.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:13—Olee otú o si bụrụ na “ebere na-emeri ikpe”? Mgbe a bịara n’ịza ajụjụ maka onwe anyị n’ihu Chineke, Chineke ga-echeta ebere anyị meere ndị ọzọ ma gbaghara anyị dabere n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya. (Rom 14:12) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji maka nke a na-emere nnọọ ndị ọzọ ebere?

4:5—Olee amaokwu Akwụkwọ Nsọ Jems na-ekwu okwu ya ebe a? Enweghị kpọmkwem otu amaokwu Akwụkwọ Nsọ Jems na-ekwu okwu ya ebe a. Otú ọ dị, o yiri ka okwu ndị a e ji ike mmụọ nsọ dee hà gbakwasịrị ụkwụ n’ihe ndị e dere n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Jenesis 6:5; 8:21; Ilu 21:10; na Ndị Galeshia 5:17.

5:20—Ònye ka “onye mere ka onye mmehie hapụ njehie nke ụzọ ya” ga-azọpụta mkpụrụ obi ya n’ọnwụ? Onye Kraịst nke mere ka onye mmehie hapụ njehie ya ga-azọpụta mkpụrụ obi onye mmehie ahụ chegharịrịnụ n’ọnwụ ime mmụọ nakwa ma eleghị anya zọpụta ya ná mbibi ebighị ebi. Onye na-enyere onye mmehie aka n’ụzọ dị otú a ga-ekpuchikwa ‘ọtụtụ mmehie onye ahụ mere.’

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:14, 15. Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ na-akpata mmehie. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka ọchịchọ ọjọọ nọgide n’obi anyị site n’ịnọ na-atụgharị ya n’uche. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịnọgide ‘na-echebara ihe ndị na-ewuli elu echiche,’ hụkwa na ọ bụ ihe ndị dị otú ahụ jupụtara n’uche na obi anyị.—Fil. 4:8.

2:8, 9. ‘Ile mmadụ anya n’ihu’ megidere ‘iwu ịhụnanya nke eze nyere.’ N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst adịghị ele mmadụ anya n’ihu.

2:14-26. ‘A zọpụtara anyị site n’okwukwe,’ ọ bụghịkwa ‘site n’ọrụ’ nke Iwu Mozis ma ọ bụ n’ọrụ anyị na-arụ dị ka Ndị Kraịst. Okwukwe anyị ekwesịghị ịbụ naanị ikwu na anyị kweere na Chineke. (Efe. 2:8, 9; Jọn 3:16) O kwesịrị ịkpali anyị ime ihe Chineke na-achọ.

3:13-17. “Amamihe nke si n’elu” karịrị nnọọ amamihe “nke ụwa, nke anụ ahụ́, nke ndị mmụọ ọjọọ”! Anyị kwesịrị ‘ịchọ amamihe nke Chineke dị ka akụ̀ zoro ezo.’—Ilu 2:1-5.

3:18. Ndị na-eme udo kwesịrị iji udo ghaa mkpụrụ nke ozi ọma Alaeze ahụ. Ọ dị mkpa na anyị ga-abụ ndị na-eme udo ọ bụghị ndị mpako, ndị na-esekarị okwu, ma ọ bụ ndị na-akpata ọgba aghara.

“SIENỤ IKE N’OKWUKWE”

(1 Pita 1:1–5:14)

Pita chetaara ndị kwere ekwe ibe ya ‘olileanya dị ndụ’ ha nwere, nke bụ́ iketa ndụ n’eluigwe. Pita gwara ha, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ.’” Mgbe o nyechara ndụmọdụ banyere ndị nwunye ido onwe ha n’okpuru di ha, ọ gbaziri mmadụ niile ume ka ha ‘nwee otu obi, ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ ha n’obi, ka ha nwee ịhụnanya ụmụnna, nwee obi ọmịiko, dịrị umeala n’obi.’—1 Pita 1:3, 4; 2:9; 3:8.

Ebe ọ bụ na “ọgwụgwụ [usoro ihe ndị Juu] adịwo nso,” Pita dọrọ ụmụnna aka ná ntị ka ha ‘nwee uche zuru okè, mụrụ anya ka ha wee na-ekpe ekpere.’ Ọ gwakwara ha, sị: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche. . . . Guzogidenụ [Setan], sienụ ike n’okwukwe.”—1 Pita 4:7; 5:8, 9.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

3:20-22—Olee otú baptizim si azọpụta anyị? Baptizim bụ ihe onye ọ bụla chọrọ ka a zọpụta ya ga-emerịrị. Ma, baptizim n’onwe ya adịghị azọpụta anyị. N’ezie, nzọpụta bụ “site ná mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst.” Onye a chọrọ ime baptizim aghaghị ikwere na naanị ihe mere ọ ga-eji kwe omume ịzọpụta ya bụ n’ihi na Jizọs nwụrụ iji zọpụta anyị, a kpọlite ya n’ọnwụ, ọ nọkwa “n’aka nri Chineke,” na-enwe ike n’ebe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ nọ. Baptizim nke gbakwasịrị ụkwụ n’okwukwe dị otú ahụ yiri nzọpụta a zọpụtara “mkpụrụ obi asatọ, gafee mmiri ahụ n’enweghị ihe mere ha.”

4:6—Olee ndị bụ “ndị nwụrụ anwụ” e “zisaara ozi ọma”? Ndị a bụ ndị ‘nwụrụ anwụ ná njehie ha,’ ma ọ bụ ndị nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ, tupu ha anụ ozi ọma ahụ. (Efe. 2:1) Ma mgbe ha kweere ozi ọma ahụ, ha malitere ‘ịdị ndụ’ n’ụdị na ha na Jehova bịaziri dịrị ná mma.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:7. Ka okwukwe anyị wee bụrụ nke bara ezigbo uru, ọ dị ezigbo mkpa na ọ ga-abụ nke a nwalere anwale. Okwukwe siri ike otú ahụ ‘na-echebe mkpụrụ obi ndụ.’ (Hib. 10:39) Anyị ekwesịghị ịtụ ule nke okwukwe ụjọ.

1:10-12. Ọ gụrụ ndị mmụọ ozi agụụ inyoba anya ma ghọta eziokwu ndị miri emi ndị amụma Chineke oge ochie dere banyere ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ma ihe ndị a bịara doo anya naanị mgbe Jehova na ọgbakọ ahụ malitere imekọ ihe. (Efe. 3:10) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iṅomi ndị mmụọ ozi ma gbalịa inyocha “ihe ndị miri emi nke Chineke”?—1 Kọr. 2:10.

2:21. Iji gosi na anyị na-eṅomi Onye nlereanya anyị bụ́ Jizọs Kraịst, anyị kwesịrị ịdị njikere ịta ahụhụ ọbụna nwụọ iji hụ na anyị rubeere Jehova isi.

5:6, 7. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova nchegbu anyị, ọ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ebute ofufe Ya ụzọ ná ndụ anyị kama ichegbu onwe anyị banyere ihe echi ga-eweta.—Mat. 6:33, 34.

“ỤBỌCHỊ JEHOVA GA-ABỊA”

(2 Pita 1:1–3:18)

Pita dere, sị: “Ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” Ige ntị n’okwu amụma a nwere ike ichebe anyị ka “ndị ozizi ụgha” na ndị ọzọ nwere ike imebi okwukwe anyị ghara inweta anyị.—2 Pita 1:21; 2:1-3.

Pita dọrọ aka ná ntị, sị: “N’oge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa.” Ma “ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi.” Pita mechiziri akwụkwọ ozi ya site n’inye ndị “na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche” ndụmọdụ katara ahụ́.—2 Pita 3:3, 10-12.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:19—Ònye bụ “kpakpando ụtụtụ,” olee mgbe o biliri, oleekwa otú anyị si mara na nke a emeela? “Kpakpando ụtụtụ” ahụ bụ Jizọs Kraịst mgbe ọ ghọrọ Eze nke Alaeze Chineke. (Mkpu. 22:16) Na 1914, Jizọs biliri n’ihu ihe niile e kere eke dị ka Eze bụ́ Mesaya, iji gosi na ụbọchị ọhụrụ amalitela. Nnwogha ahụ mere ka a hụperetụ ebube Jizọs na Alaeze ya tupu oge ahụ eruo, si otú a na-egosi na okwu amụma Chineke ga-emezurịrị. Ịṅa ntị n’okwu ahụ na-eme ka ìhè na-enwubata n’obi anyị sikwa otú a na-eme ka anyị mara na Kpakpando Ụtụtụ ahụ ebiliela.

2:4—Gịnị bụ “Tatarọs,” oleekwa mgbe a tụbara ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi n’ime ya? Tatarọs bụ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ, bụ́ ebe a tụbara naanị ndị mmụọ e kere eke—ọ bụghị ụmụ mmadụ. Ọ bụ ọnọdụ ịnọ n’oké ọchịchịrị nke amaghị nzube ndị dị ebube nke Chineke. Ndị nọ na Tatarọs enweghị olileanya ọ bụla maka ọdịnihu. Chineke tụbara ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi n’oge Noa n’ime Tatarọs, ha ga-anọgidekwa n’ọnọdụ ahụ ruo mgbe a ga-ebibi ha.

3:17—Gịnị ka Pita bu n’uche mgbe o kwuru okwu banyere ‘ibu ụzọ mara ihe ndị a’? Pita na-ekwu banyere ibu ụzọ mara ihe ga-eme n’ọdịnihu, bụ́ nke e mere ka ya na ndị ọzọ so dee Baịbụl site n’ike mmụọ nsọ mara. Ebe ọ bụ na nke a abụghị ihe ọmụma na-adịghị agwụ agwụ, na Ndị Kraịst oge mbụ nwere ya apụtaghị na ha ma ihe niile ga-eme n’ọdịnihu. Ihe ha maara bụ naanị ihe onye ọ bụla nwere ike ịtụ anya ga-eme n’ọdịnihu.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:2, 5-7. E wezụga inyere anyị aka inwekwu ‘ezi ihe ọmụma nke Chineke na nke Jizọs,’ ịgbalịsi ike inwe àgwà ndị dị ka okwukwe, ntachi obi, na nsọpụrụ Chineke ‘ga-emekwa ka anyị ghara ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ’ n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma ahụ.—2 Pita 1:8.

1:12-15. Iji bụrụ ndị “nọsiri ike n’eziokwu,” ọ dị mkpa na a ga na-echetara anyị ihe mgbe mgbe dị ka ndị nke a na-echetara anyị n’ọmụmụ ihe ọgbakọ, n’ọmụmụ ihe onwe onye, nakwa n’ọgụgụ Baịbụl.

2:2. Anyị kwesịrị ilezi anya hụ na omume anyị adịghị ewetara Jehova na nzukọ ya nkọcha.—Rom 2:24.

2:4-9. N’ihi ihe ndị Jehova merela n’oge ndị gara aga, obi kwesịrị isi anyị ike na ‘ọ maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ ya n’ọnwụnwa, ma na-edebe ndị ajọ omume maka ụbọchị ikpe ka e wee bipụ ha.’

2:10-13. Ọ bụ ezie na “ndị dị ebube,” nke bụ́ ndị okenye ọgbakọ, nwere ebe ndị ha na-adịghị emetecha nke ọma, nweekwa ike imehie mgbe ụfọdụ, anyị ekwesịghị ikwu okwu ọjọọ banyere ha.—Hib. 13:7, 17.

3:2-4, 12. Ịṅa ntị ‘n’okwu ndị e kwuru na mbụ site n’ọnụ ndị amụma dị nsọ na ihe Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị nyere n’iwu,’ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-echeta na ụbọchị Jehova dị nso.

3:11-14. Ebe anyị “na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche,” anyị kwesịrị (1) inwe “àgwà dị nsọ,” site n’ịdị ọcha n’anụ ahụ́, n’echiche, n’omume, nakwa n’ime mmụọ; (2) ijupụta ‘n’omume ịsọpụrụ Chineke,’ ndị dị ka ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ nakwa ime ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs; (3) ime ka omume anyị na ụdị onye anyị bụ ghara inwe “ntụpọ,” ghara ikwe ka ụwa metọọ anyị; (4) ịbụ “ndị na-enweghị mmerụ,” ndị ji obi dị ọcha na-eme ihe niile ha na-eme; na (5) ịbụ “ndị nọ n’udo”—ndị ha na Chineke nọ n’udo, nakwa ndị ha na ụmụnna ha, na ụmụ mmadụ ndị ọzọ nọ n’udo.