Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri

Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri

Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri

Ò nwetụla mgbe a gwara gị ka i mee ihe ị na-atụghị anya ya ma ọ bụ ka ị rụọ ọrụ i chere na ị gaghị arụli? Ọrụ ị na-arụ kwa ụbọchị iji kpata ihe ị ga-eri, ọ̀ gwụla gị ike? Ikekwe, i so n’ọtụtụ nde mmadụ ndị ahụ́ na-erughị ala na ndị egwu ji maka na ha agbaala ọsọ ndụ n’obodo a mụrụ ha. Ò nwere onye n’ime anyị ọ na-ewuteghị nke ukwuu, ya adịkwa ya ka ụwa ọ̀ gwụla, mgbe onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ?

Ị̀ MA na nsogbu niile a bịaara Meri, nne Jizọs? Ma, o meriri ha niile! Olee ihe anyị nwere ike ịmụta ná ndụ ya?

A ma Meri ama n’ebe niile n’ụwa. Ihe kpatara ya bụ na ọ rụrụ ọrụ pụrụ iche nke mezuru nzube Chineke. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ nde mmadụ na-enye Meri nsọpụrụ nke ukwuu. Chọọchị Katọlik na-asọpụrụ ya nke ukwuu n’ihi na ha weere ya na ọ bụ ezigbo Nne nke e kwesịrị iṅomi okwukwe ya, olileanya ya na ọrụ ebere ọ rụrụ. A kụzierela ọtụtụ ndị na a na-esi n’aka Meri agakwuru Chineke.

Olee otú i si were nne Jizọs? Ma, karịchaa, olee otú Chineke si were ya?

Ọrụ Pụrụ Iche

Meri, nwa Hilaị, si n’ebo Juda, n’Izrel. Ebe mbụ e kwuru okwu ya na Baịbụl bụ mgbe otu ihe pụrụ iche mere. Otu mmụọ ozi gara ná nke ya, sị ya: “Ndeewo, onye e meere amara dị ukwuu, Jehova nọnyeere gị.” Mgbe Meri nụrụ ekele ahụ, o nyere ya nsogbu n’obi, “o wee malite ịtụle ụdị ekele nke a pụrụ ịbụ.” Ka ọ nọ na-atụle ya, mmụọ ozi ahụ gwara ya na a họrọla ya ịrụ ọrụ dị ịtụnanya, nke takwara akpụ, ya bụ, na ọ ga-atụrụ ime Ọkpara Chineke, mụọ ya ma zụọ ya.—Luk 1:26-33.

Ọrụ a a gwara nwa agbọghọ a n’alụbeghị di ka ọ rụọ abụghị obere ọrụ. Olee ihe o mere? Ọ ga-abụ na Meri nọ na-eche n’obi ya ma ndị mmadụ hà ga-ekwetakwa ma ọ kọọrọ ha ihe mmụọ ahụ gwara ya. Ime a ọ ga-atụrụ, ò nwere ike ime ka Josef, bụ́ nwoke chọrọ ịlụ ya, hapụ ya ma ọ bụ mee ka ọha na eze mee ya ihe ihere? (Diuterọnọmi 22:20-24) Ọ nabatara ọrụ ahụ tara akpụ ozugbo.

Okwukwe siri ike Meri nwere mere ka o mee ihe Chineke ya, bụ́ Jehova, chọrọ ka o mee. Obi siri ya ike na Chineke ga-elekọta ya. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova! Ka o mee dị ka i kwuru.” Meri dị njikere idi ihe isi ike niile ga-abịara ya n’ihi na ọ ghọtara na ọrụ a e nyere ya bụ ọrụ pụrụ iche nke ga-ewetara Chineke otuto.—Luk 1:38.

Mgbe Meri gwara Josef na ya dị ime, Josef bu n’obi ịhapụ ya. O doro anya na ha abụọ nọ na-echegbu onwe ha n’oge ahụ. Baịbụl ekwughị ma oge ahụ ọ̀ dịtere aka ma ọ bụ na ọ dịteghị. Ma, ọ ga-abụrịrị na ahụ́ ruru nnọọ ma Meri ma Josef ala mgbe mmụọ ozi Jehova bịakwutere Josef ná nrọ. Mmụọ ozi ahụ kwuru otú Meri si dịrị ime, gwakwa Josef ka ọ kpọrọ ya laa n’ụlọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya.—Matiu 1:19-24.

Oge Ihe Isi Ike

Taa, ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị dị ime na-eji ọtụtụ ọnwa akwadebe maka nwa ha ga-amụ, ọ ga-abụkwa na Meri mere otú ahụ. Nke a bụ ime mbụ ya. Ma, o nwere ihe ndị mere ka ihe niile o dokwara ghasaa. Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ mmadụ niile ọnụ. Nke a pụtara na a ga-edeba aha onye ọ bụla n’akwụkwọ n’obodo a mụrụ ya. Ya mere, Josef kpọọrọ Meri, bụ́ onye di ime ọnwa itoolu mgbe ahụ, gaa njem were ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise. Ọ ga-abụ n’elu ịnyịnya ibu ka Meri nọ. Ndị mmadụ juru na Betlehem. Ma, Meri chọrọ ebe ọ ga-anọ mụọ nwa. Naanị ebe ọ hụrụ bụ ụlọ anụ. Ọ ga-abụrịrị na ọ dịghịrị Meri mfe ịmụ nwa n’ụlọ anụ. O nwere ike ịbụ na o mere ya ihere ma tụọ ya ụjọ.

N’oge a ihe siiri Meri ike, o doro anya na ọ kọọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-elekọta ya na nwa ya. Mgbe ọ mụchara nwa, ndị na-azụ atụrụ bịara n’ebe ha nọ, chọọ ịhụ nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ. Ha kwuru na ndị mmụọ ozi sịrị na nwa ahụ bụ ‘Onye Nzọpụta, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị.’ Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Meri buuru okwu a niile n’obi ya, na-eche ihe ihe ndị a pụtara.” Ọ tụgharịrị uche n’okwu ndị ahụ, obi esie ya ike.—Luk 2:11, 16-19.

Anyịnwakwanụ? Nsogbu nwere ike ịbịara anyị ná ndụ. Baịbụl kwukwara na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” nwere ike ịbịakwasị onye ọ bụla n’ime anyị ma kpatara anyị ihe isi ike na nsogbu dị iche iche. (Ekliziastis 9:11) Ọ bụrụ na nke a emee, iwe ọ̀ na-ewe anyị, anyị atawa Chineke ụta? Ọ́ gaghị aka mma ka anyị mee otú Meri mere ma bịaruo Jehova bụ́ Chineke nso site n’ịmụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na-atụgharịkwa uche n’ihe anyị mụtara? O doro anya na ọ bụrụ na anyị mee otú ahụ, ọ ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa.

Ọ Dara Ogbenye, Gbaakwa Ọsọ Ndụ

Meri nwekwara ihe isi ike ndị ọzọ. Ọ dara ogbenye, o sikwa n’obodo ya gbaa ọsọ ndụ. Ihe ò sitụrụla gị ike otú ahụ? Otu akụkọ kwuru na “ọkara ndị bi n’ụwa, ya bụ, ihe fọrọ nke nta ka o ruo ijeri mmadụ atọ, anaghị eri ihe ruru dọla abụọ kwa ụbọchị,” ọtụtụ nde ndị ọzọ na-ahụsikwa anya ebe ha na-agbalị ka ha kpata ihe ha ga-eri, ọ bụ ezie na ha bi ná mba ndị a sị na ha bara ọgaranya. Gịnwakwanụ? Mgbalị ị na-eme kwa ụbọchị iji kpata ihe ezinụlọ gị ga-eri, ihe ha ga-eyi ma kwụọkwa ụgwọ ụlọ ha bi, ọ̀ na-agwụ gị ike, ma ọ bụkwanụ na-eme ka ike ụwa gwụ gị mgbe ụfọdụ?

Baịbụl gosiri na Josef na Meri bụ ndị ogbenye. Olee otú anyị si mara? Otu n’ime ihe ole na ole Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn kwuru banyere di na nwunye a bụ na ụbọchị iri anọ Meri mụchara nwa, ya na Josef gara n’ụlọ nsọ ịga chụọ àjà a chọrọ n’aka ha, ya bụ, “nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.” * (Luk 2:22-24) Ọ bụ naanị ndị ogbenye na-agaghị azụtali nwa ebule na-eweta nnụnụ ndị a ka e jiri chụọrọ ha àjà. Ya mere, ọ ga-abụ na ọ na-esiri Josef na Meri ike ịkpata ihe ha na-eri. N’agbanyeghị nke ahụ, ha gbara mbọ mee ka ịhụnanya dịrị n’ezinụlọ ha. O doro anya na ihe ka ha mkpa ná ndụ bụ ife Chineke.—Diuterọnọmi 6:6, 7.

N’oge na-adịghị anya a mụchara Jizọs, nsogbu ọzọ siri ike bịaara Meri. Otu mmụọ ozi gwara Josef ka ọ kpọrọ ezinụlọ ya gbaga n’Ijipt. (Matiu 2:13-15) Ihe a bụ nke ugboro abụọ Meri ga-ahapụ ebe maara ya ahụ́. Ma ná nke ugbu a, ọ na-agbaga mba ọzọ. Ọtụtụ ndị Juu bi n’Ijipt. Ya mere, ọ ga-abụ na Meri na Josef gara biri n’ebe ndị Juu ibe ha bi. N’agbanyeghị nke ahụ, ibi ná mba ọzọ adịghị mfe, o nwekwara ike ime ka ahụ́ ghara iru mmadụ ala. Gị na ezinụlọ gị ùnu so n’ọtụtụ nde mmadụ kwapụrụ n’obodo a mụrụ ha n’ihi ọdịmma ụmụaka ha ma ọ bụ iji zere nsogbu? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-aghọta nnọọ ụfọdụ n’ime ihe isi ike bịaara Meri n’Ijipt.

Ezigbo Nwunye na Ezigbo Nne

E wezụga n’ebe ndị a kọrọ banyere ọmụmụ Jizọs na mgbe Jizọs dị obere, e kwukarịghị banyere Meri n’Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn. Ma, anyị ma na Meri na Josef mụrụ ụmụ isii ọzọ, ma ọ dịkarịa ala. Nke a nwere ike iju gị anya. Ma, lebagodị anya n’ihe Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn kwuru.

Josef ejighị ohere ọma e nyere Meri ịmụ Ọkpara Chineke gwurie egwu. Ọ bụ ya mere na ya na Meri enweghị mmekọahụ mgbe a ka bu Jizọs n’afọ. Matiu 1:25 kwuru na Josef na Meri “enweghị mmekọahụ ọ bụla ruo mgbe ọ mụrụ nwa nwoke.” Okwu ahụ bụ́ “ruo mgbe,” bụ́ nke e dere n’amaokwu a, na-egosi na mgbe a mụchara Jizọs, Josef na Meri nwewere mmekọahụ otú di na nwunye si enwe. Ọ bụ ya mere Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn ji kwuo na Meri na Josef mụrụ ụmụ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Jems, Josef, Saịmọn na Judas bụcha ndị nne ji ha na Jizọs. Ọ dịkarịa ala, Meri mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. (Matiu 13:55, 56) Ma, a tụrụ ime ha otú nwaanyị si atụrụ ime ma ya na nwoke nwee mmekọahụ. *

Meri ji adịm ná mma ya na Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụ ezie na Iwu Mozis ekwughị na ụmụ nwaanyị ga-agarịrị ememme Ngabiga, Meri na-eso Josef aga ememme ahụ na Jeruselem kwa afọ. (Luk 2:41) Ihe ọ pụtara bụ na ha na ụmụ ha ndị ka na-etolite etolite na-eso aga ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị kilomita atọ uje na ụla, kwa afọ. Ma, o doro anya na njem ahụ nyere ezinụlọ ha obi ụtọ.

Ọtụtụ ụmụ nwaanyị taa na-eṅomi àgwà ọma Meri. Ha na-arụsị ọrụ ike ma na-ebute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ iji rụzuo ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ́ ọrụ ha. Ọtụtụ mgbe, ụmụ nwaanyị a a lụ alụ na-enwe ndidi na ntachi obi nke ukwuu, ha dịkwa nnọọ umeala n’obi. Ịtụgharị uche n’àgwà Meri na-eme ka ha jiri ofufe ha na-efe Chineke kpọrọ ihe karịa ntụsara ahụ́ na ihe ụtọ ahụ́ ha chọrọ. Dị ka o doro anya na Meri maara, ụmụ nwaanyị a maara na ha na di ha na ụmụ ha ifekọ Chineke ọnụ na-eme ka ezinụlọ dịrị n’otu ma na-emekọ ihe ọnụ.

O nwere otu oge Meri na Josef gara ememme na Jeruselem. Ikekwe, ha kpọ ụmụ ole na ole ha mụrụ gaa. Ma, mgbe ha na-alọta, ha chọpụtara na Jizọs, onye dị afọ iri na abụọ mgbe ahụ, esoghị ha. Chetụgodị echiche otú Meri si chịrị obi n’aka na-achọgharị nwa ha nwoke ruo abalị atọ. Mgbe ya na Josef mechara hụ ya n’ụlọ nsọ, Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?” Akwụkwọ Nsọ kwukwara ọzọ na Meri “buuru okwu a niile nke ọma n’obi ya.” Nke a bụ ihe ọzọ na-egosi na Meri ejighị ihe metụtara ofufe Chineke gwurie egwu. Ọ tụgharịrị uche nke ọma n’ihe niile merenụ bụ́ ndị gbasara Jizọs. Mgbe ọtụtụ afọ gafere, ọ ga-abụ na ọ kọọrọ ndị dere Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn akụkọ a, kọọkwara ha ihe ndị ọzọ merenụ mgbe Jizọs dị obere.—Luk 2:41-52.

O Diri Ihe Isi Ike na Ọnwụ Di Ya

Olee ihe mere Josef, bụ́ nna Jizọs n’ụwa? Mgbe e kwutụchara banyere Josef n’oge a na-akọ ihe ndị mere n’oge Jizọs dị obere, e kwuteghị okwu ya ọzọ n’Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn. Ụfọdụ ndị kweere na nke a na-egosi na Josef nwụrụ tupu Jizọs amalite ozi o jere. * Ma ọ̀ bụ mgbe ahụ ka ọ nwụrụ ma ọ bụ na ọ bụghị, o yiri ka di Meri anwụọla tupu Jizọs ejechaa ozi ya n’ụwa. N’oge Jizọs na-aga ịnwụ, o nyefere nne ya n’aka Jọn onyeozi. (Jọn 19:26, 27) Jizọs agaraghị eme otú ahụ ma a sị na Josef ka dị ndụ.

Ọtụtụ ihe mere mgbe Meri na Josef bi. Ndị mmụọ ozi gara zie ha ozi, ha gbanahụrụ onye ọchịchị aka ike, ha kwapụrụ n’ebe ha bi ọtụtụ ugboro, ha zụlitere ọtụtụ ụmụ. Ọ ga-abụrịrị na ọtụtụ mgbe, ha abụọ nọ ọdụ kọrịa banyere Jizọs, na-atụle ihe ga-abịara ya n’ọdịnihu, na-eche ma hà na-azụkwa ya ma na-akwadebe ya otú kwesịrị ekwesị. Ma, na mberede, ya afọzie naanị Meri.

Di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ nwụọla? Ọnwụ ya ọ̀ ka na-ewute gị, ike ụwa ana-agwụkwa gị n’agbanyeghị na o teela ọ nwụrụ? O doro anya na ihe kasiri Meri obi bụ na ọ maara na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ, kwerekwa na ọ ga-emezu. * (Jọn 5:28, 29) Ma, nke ahụ emeghị ka nsogbu Meri kwụsị. Dị ka ọ dị ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị di ha nwụrụla n’oge a, ọ bụ naanị ya lekọtara ụmụ ha.

Anyị kwesịrị ikweta na Jizọs malitere ịkpa afọ ezinụlọ ha mgbe Josef nwụrụ. Ka ụmụnne Jizọs ndị nwoke nọ na-etolite, ọ ga-abụ na ha rụrụ ọrụ ruuru ha n’ezinụlọ ha. Mgbe Jizọs “dị ihe dị ka afọ iri atọ,” ọ hapụrụ ụlọ ha ma malite ozi o jere n’ụwa. (Luk 3:23) Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ anaghị ama otú ọ na-adị ha adị mgbe nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwaanyị toro eto na-ahapụ ụlọ. N’ihi otú ha na nwa ha si dịrị ná mma na ogologo oge ha na ya nọrọla na mbọ ha gbaarala ya, ọ bụrụ na nwa ahụ ahapụ ụlọ, ọ naghị apụ ha apụ n’obi. Ò nweela nwa gị nwoke ma ọ bụ nwaanyị hapụrụ ụlọ gaa nọrọ nke ya? Ị̀ na-eji ya eme ọnụ, ma, ya ana-adịkwa gị mgbe ụfọdụ ka ya bụrụ na ọ nọ gị nso? Ya bụrụ otú ahụ, ị ga-aghọta otú obi dị Meri mgbe Jizọs hapụrụ ụlọ.

Ọnwụnwa Ọ Na-atụghị Anya Ya

N’ime ọnwụnwa niile bịaara Meri, o nwere otu ọ na-enweghị otú o si tụọ anya ya, ma eleghị anya. Mgbe Jizọs nọ na-ekwusa ozi ọma, ọtụtụ ndị sowere ya, ma, o nweghị otu n’ime ụmụnne ya ndị nwoke sooro ya. Akwụkwọ Nsọ sịrị: “N’eziokwu, ụmụnne ya ndị ikom enweghị okwukwe n’ebe ọ nọ.” (Jọn 7:5) Ọ ga-abụ na Meri kọọrọ ha ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya, ya bụ, na Jizọs bụ “Ọkpara Chineke.” (Luk 1:35) Ma, Jems, Josef, Saịmọn, na Judas enweghị otú ọzọ ha si were Jizọs ma ọ́ bụghị na ọ bụ nwanne ha nke tọrọ ha. Ọ bụ otú ahụ ka ezinụlọ Meri si ghọọ ezinụlọ na-anaghị ekpe otu okpukpe.

Ike ọ̀ gwụrụ Meri, ya ahapụzie ka onye ọ bụla mewe otú masịrị ya? Mbanụ! N’otu oge Jizọs nọ na-ezisa ozi ọma na Galili, ọ banyere n’otu ụlọ ịga rie nri, ìgwè mmadụ ezukọta ka ha gee ya ntị. Ma, o nwere ndị na-achọ ya n’èzí. Ọ bụ Meri na ụmụnne Jizọs ndị nwoke. Ya mere, mgbe ọ bụla Jizọs nọ nso n’ụlọ ha, Meri na-eso ya, ọ ga-abụkwa na ọ na-akpọrọ ụmụ ya ndị nke ọzọ, na-atụ anya na, ma eleghị anya, ha ga-agbanwe otú ha si ele Jizọs anya.—Matiu 12:46, 47.

O nwekwara ike ịbụ na ị na-agbasi mbọ ike na-eso ụzọ Jizọs, ma ndị ezinụlọ gị ndị ọzọ achọghị ime otú ahụ. Adala mbà n’obi, akwụsịkwala inyere ha aka! Dị ka o mere Meri, ọtụtụ ndị ji ndidi gbaa ndị ezinụlọ ha ume ruo ọtụtụ afọ tupu ha agbanwee. Ụdị ntachi obi a na-amasị Chineke nke ukwuu, ma ndị anyị na-agba ume hà gbanwere ma ọ bụ na ha agbanweghị.—1 Pita 3:1, 2.

Ọnwụnwa Kacha Siere Ya Ike

O doro anya na ọnwụnwa ikpeazụ Akwụkwọ Nsọ kwuru bịaara Meri bụ ọnwụnwa kacha agbawa obi. O ji anya ya hụ ka ndị obodo ha jụrụ nwa ya ọ hụrụ n’anya, hụkwa mgbe ọ tagidere ahụhụ nwụọ. E kwuola na nwa mmadụ ịnwụ bụ “ihe kacha njọ nwere ike ime mmadụ,” bụrụkwa “ọnwụ kacha ewute ewute,” ma nwa ahụ ò toola ma ọ bụ na o tobeghị. Dị ka e buru ya n’amụma n’iri afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, ọ dị Meri ka a manyere ya mma agha n’ime ahụ́.—Luk 2:34, 35.

Meri ò kwere ka ọnwụnwa ikpeazụ a gbawaa ya obi ma ọ bụkwanụ kwe ka o mee ka okwukwe o nwere na Jehova jụọ oyi? Mba. Oge ọzọ e kwuru okwu Meri na Baịbụl bụ mgbe a sịrị na ya na ndị na-eso ụzọ Jizọs ji otu obi “nọgide na-ekpe ekpere.” Ọ bụghị naanị ya bụ onye ezinụlọ ya nọ n’ebe ahụ. Ụmụ ya ndị nwoke, bụ́ ndị ọ ga-abụ na ha enweela okwukwe ugbu a n’ebe nwanne ha nke tọrọ ha nọ, so ya nọrọ. Ọ ga-abụrịrị na nke a kasiri Meri obi! *Ọrụ 1:14.

Ndụ Meri juru ya afọ. Ọ bụ nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa ezigbo nwaanyị a lụ alụ na ezigbo nne. Ọtụtụ ihe na-enye obi ụtọ mere ná ndụ ya ka ọ na-ejere Chineke ozi. O diri ọtụtụ ule na ọnwụnwa ndị bịaara ya. Ọ bụrụ na ihe isi ike anyị na-atụghị anya ya abịara anyị, ma ọ bụ nsogbu ezinụlọ emee ka obi koro anyị n’elu, anyị kwesịrị ịmụta ihe n’otú Meri si kwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ihe isi ike ndị bịaara ya.—Ndị Hibru 10:36.

Ma, oleekwanụ maka nsọpụrụ pụrụ iche ndị mmadụ na-enye Meri? Ihe Baịbụl kwuru banyere ọrụ pụrụ iche Meri rụrụ ọ̀ na-egosi na e kwesịrị inye ya nsọpụrụ pụrụ iche?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 A na-eji otu n’ime nnụnụ ahụ achụ àjà mmehie. (Levitikọs 12:6, 8) Ebe ọ bụ na Meri wetara nnụnụ ndị ahụ ka e jiri ha chụọrọ ya àjà, ọ pụtara na ọ maara na ya ketara ihe niile mmehie mmadụ mbụ bụ́ Adam kpatara, otú mmadụ niile ọzọ na-ezughị okè ketakwara.—Ndị Rom 5:12.

^ par. 26 E kwuola na ọkpụkpọ a na-akpọtụghị Josef aha n’ozi Jizọs jere na-egosi na ọ nwụọla mgbe ahụ n’ihi na e kwuru banyere ndị ezinụlọ Jizọs ndị ọzọ, ma nne ya, ma ụmụnne ya ndị nwoke, ma ụmụnne ya ndị nwaanyị. Dị ka ihe atụ, n’oriri agbamakwụkwọ e nwere na Kena, Meri nyere aka ma mee ihe ụfọdụ n’onwe ya, ma, a kpọtụdịghị Josef aha. (Jọn 2:1-11) N’oge ọzọ, mgbe ndị obodo Kraịst nọ na-ekwu banyere Jizọs, ha kpọrọ ya “nwa Meri,” kama ịkpọ ya nwa Josef.—Mak 6:3.

^ par. 28 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa mbilite n’ọnwụ Baịbụl kwere, gụọ isi nke asaa nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ par. 36 Gụọ igbe isiokwu ya bụ́,  “O Ji Obi Ike Gbanwee Okpukpe Ọ Na-ekpebu,” nke dị na peeji nke 7.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

 Jizọs Ò Nwere Ụmụnne Ndị Ikom na Ụmụnne Ndị Inyom?

Ee, o nwere. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe anwaala ịrụ ụka na o nweghị, n’agbanyeghị na Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn gosiri ọtụtụ ugboro na o nwere. (Matiu 12:46, 47; 13:54-56; Mak 6:3) Ma, o nwere ụzọ ihe abụọ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru banyere echiche ahụ bụ́ na Meri amụghị nwa ọzọ. Ihe mbụ ha kwuru nke mere ndị ahụ ji ekwu na Meri amụghị nwa ọzọ bụ iji gbaa ozizi a malitere ịkụzi n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga ájá n’úkwù. N’oge ahụ, a malitere ịkụzi na Meri bụ nwaanyị na-amaghị nwoke ná ndụ ya dum. Ihe nke abụọ ndị ọkà mmụta Baịbụl ahụ kwuru bụ na echiche ahụ erijughị afọ ma e leruo ya anya.

Dị ka ihe atụ, otu ihe ndị na-akwado echiche ahụ kwuru bụ na ọ ga-abụ na ‘ụmụnne Jizọs ndị ikom’ ahụ bụ ụmụ nwunye Josef lụrụ tupu ya alụọ Meri. Echiche a erijughị afọ, n’ihi na ọ bụrụ na Jizọs abụghị diọkpara, ọ gaghị eru eru ịbụ eze n’alaeze Devid.—2 Samuel 7:12, 13.

Ihe ọzọ ha kwuru bụ na ụmụnne Jizọs ndị ikom ahụ bụ ụmụ nwanne nne ya ma ọ bụ ụmụ nwanne nna ya, n’agbanyeghị na ihe Akwụkwọ Nsọ Grik kpọrọ “nwanne,” dị iche n’ihe ọ kpọrọ “nwa nwanne nne” ma ọ bụ “nwa nwanne nna,” ọ dịkwa iche n’ihe ọ kpọrọ “onye ikwu.” Ya mere, ọkà mmụta bụ́ Frank E. Gaebelein kwuru na echiche ahụ ndị nkà mmụta okpukpe ahụ nwere adabatụdịghị adaba. O kwubiri, sị: “Ụzọ kacha mma isi ghọta ‘ụmụnne Jizọs ndị ikom’ . . . bụ na ha bụ ụmụ Meri na Josef. Nke a pụtara na nne ji ha na Jizọs.”

[Igbe dị na peeji nke 7]

 O Ji Obi Ike Gbanwee Okpukpe Ọ Na-ekpebu

Nne na nna Meri bụ ndị Juu, Meri kpekwara okpukpe ndị Juu. Ọ na-aga n’ụlọ nzukọ ndị Juu e nwere n’obodo ha, bụ́ ebe ndị Juu na-efe ofufe, na-agakwa n’ụlọ nsọ ha dị na Jeruselem. Ma, mgbe Meri matakwuru banyere nzube Chineke, ọ ghọtara na omenala nna nna ya hà adịkwaghị Chineke mma. Ndị isi okpukpe ndị Juu mere ka e gbuo Nwa ya, bụ́ Mesaya. Ma, tupu e gbuo Jizọs, Jizọs gwara ndị isi okpukpe ndị Juu, sị: “Lee! A hapụworo unu ụlọ unu.” (Matiu 23:38) Chineke kwụsịrị ịgọzi okpukpe ahụ Meri kpewere kemgbe ọ bụ nwata.—Ndị Galeshia 2:15, 16.

O nwere ike ịbụ na Meri dị ihe dị ka afọ iri ise mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst malitere ịdị. Gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ sịrị na kemgbe a mụrụ ya na ọ bụ okpukpe ndị Juu ka ya na-ekpe, n’ihi ya, na ya agaghị ahapụ omenala nna nna ya hà? Ọ̀ sịrị na ya akatala ahụ́ nke na ya agaghị enwe ike ịgbanwe okpukpe ya? Mbanụ! Meri ghọtara na ọ bụzi ọgbakọ Ndị Kraịst ka Chineke na-agọzi, n’ihi ya, o ji okwukwe na obi ike gbanwee okpukpe ọ na-ekpebu.

[Foto dị na peeji nke 5]

Oge ha gbara ọsọ ndụ gbaga Ijipt

[Foto dị na peeji nke 8]

Ihe kacha njọ nke nwere ike ime nne nwa