Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Naanị Chineke Nwere Ike Ịzọpụta Ụwa

Naanị Chineke Nwere Ike Ịzọpụta Ụwa

Naanị Chineke Nwere Ike Ịzọpụta Ụwa

“IHE NA-EGBUKE EGBUKE NKE NA-ACHATỤ ANỤNỤ ANỤNỤ, NA-ACHATỤKWA ỌCHA.” Otú ahụ ka Edgar Mitchell, onye na-aga na mbara igwe, si kọwaa otú ụwa anyị a dị mgbe ọ nọ na mbara igwe lee ya anya.

Chineke rụrụ ọrụ dị ukwuu iji kwadebe ụwa ka ndị mmadụ biri n’ime ya. Otú o si kee ụwa mere ka ndị mmụọ ozi malite “iti mkpu otuto.” (Job 38:7) Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’otú ụwa a si dị ebube, ọ ga-eme ka anyị na-etikwa mkpu otuto. E nwere ọtụtụ ihe dị mgbagwoju anya n’ụwa bụ́ ndị na-eme ka ihe ndị dị ndụ n’ụwa nọgide na-adị ndụ. Otu n’ime ha a ma nke ọma bụ otú ahịhịa ndụ si eji anwụ, ikuku ụmụ mmadụ na-ekupu na mmiri, emere nri. Ahịhịa ndụ emepụtazie ikuku ndụ nke na-eme ka anyị dịrị ndụ.

Baịbụl kwuru na Chineke nyere mmadụ ụwa ka o lekọtawa. (Jenesis 1:28; 2:15) Ma, mmadụ ga na-akpa àgwà dị mma ma ọ bụrụ na ihe ndị dị ndụ n’ụwa ga na-arụ ọrụ nke ọma. N’eziokwu, ọ dị mkpa ka ọ hụ ụwa o bi n’anya. Ọ dị mkpa ka o nwee mmasị ilekọta ya nke ọma. Ma, ebe ọ bụ na e kere mmadụ ka o nwere onwe ya ịhọrọ ihe ọ chọrọ ime, o nwere ike họrọ imebisị ụwa. Ọ bụkwa nnọọ ihe o mere. Nzuzu mmadụ na anyaukwu ya emebisịala ihe nke ukwuu n’ụwa.

Lekwa ụfọdụ n’ime nsogbu nke a kpatarala: (1) Igbukpọsị oké ọhịa. Nke a emeela ka ụwa ghara inwe ike ịmịkọrọcha ikuku ọjọọ, bụ́ nke nwere ike ịkpaghasịkwu otú mmiri si ezo na otú anwụ si acha. (2) Iji ọgwụ egbu ahụhụ n’ike n’ike. Nke a egbukpọọla ahụhụ ndị na-arụ ọrụ dị mkpa n’ụwa, meekwa ka ahụhụ ghara ịna-enyere ihe ọkụkụ aka nke ọma. (3) Igbufe azụ̀ ókè na imetọ osimiri na oké osimiri. Nke a emeela ka a ghara inwekwa azụ̀ otú o kwesịrị. (4) Iji anyaukwu na-emefusị akụ̀ ndị dị n’ụwa. Nke a emeela ka a ghara inwekwa akụ̀ ga-ezuru ọgbọ ndị ga-adị ndụ n’ọdịnihu, e chekwara na ọ bụ ya mere ụwa ji na-ekpokwu ọkụ. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ndị na-agba mbọ ka a ghara imetọ ụwa kwuru na otú snoo si na-agbazesị na otú o si adakasị na-egosi na ụwa anyị a na-ekpokwu ọkụ.

Ebe a na-enwekwu ọdachi ndị na-emere onwe ha taa, ụfọdụ nwere ike ikwu na ụwa na-emegwara ụmụ mmadụ ihe ha mere ya, na-echi ha ọnụ n’ala. Chineke nyere anyị ụwa n’anaghị anyị kobo. Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ bi n’ụlọ ọ na-anaghị akwụ ụgwọ. (Jenesis 1:26-29) Ma, ihe ndị na-eme n’ụwa n’oge a na-egosi na ọtụtụ mmadụ enwetụdịghị mmasị ilekọta ụwa a mara mma. Kama nke ahụ, ọ bụ naanị ihe ndị dịịrị ha na-abata ha n’obi, ọ bụkwa ya ka ha na-eme. N’eziokwu, ụmụ mmadụ egosila na ha bụ ndị ọjọọ, “ndị na-ebibi ụwa” e nyere ha ka ha biri, dị ka e bu ụzọ kwuo ná Mkpughe 11:18 na ha ga-eme.

Amụma Baịbụl na-egosi na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ́ Jehova, Onye kere ụwa na ihe niile dị ndụ dị n’ime ya, ekwuola na oge eruola mgbe ya “ga-achụpụ” ndị ọjọọ na-emebi ụwa. (Zefanaya 1:14; Mkpughe 19:11-15) Tupu ụmụ mmadụ emebichaa ụwa, Chineke ga-agbata ọsọ enyemaka ngwa ngwa karịa mgbe anyị tụrụ anya ya. * (Matiu 24:44) N’eziokwu, naanị Chineke nwere ike ịzọpụta ụwa anyị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe mere o ji bụrụ na oge agwụla agwụ, gụọ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.