Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onyeikpe nke Na-eme Ihe Ziri Ezi Mgbe Niile

Onyeikpe nke Na-eme Ihe Ziri Ezi Mgbe Niile

Bịaruo Chineke Nso

Onyeikpe nke Na-eme Ihe Ziri Ezi Mgbe Niile

Jenesis 18:22-32

IKPE ZIRI EZI. Ime mmadụ otú e mere ibe ya. Eleghị mmadụ anya n’ihu. Ọ̀ bụ na àgwà ọma ndị a anaghị amasị gị? Ọ na-amasị anyị niile ka a na-eme anyị otú e mere ibe anyị. Ọ dị anyị n’ọbara. Ọ dị mwute ikwu na ikpe na-ezighị ezi juru ebe niile n’ụwa taa. Ma, e nwere Onyeikpe anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ bụ Jehova Chineke. Ọ na-eme ihe ziri ezi mgbe niile. Ụka Jehova na Ebreham kparịtara, bụ́ nke e dere na Jenesis 18:22-32, mere ka nke a doo anya. *

Mgbe Jehova gwara Ebreham na ya ekpebiela ịga chọpụta ihe na-eme na Sọdọm na Gọmọra, Ebreham nọ na-echegbu onwe ya ma à ga-azọpụtakwa ndị ezi omume bi n’ebe ahụ, ma Lọt nwa nwanne ya. Ebreham jụrụ Jehova, sị: “Ị̀ ga-ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume? Ka e were ya na e nwere ndị ezi omume iri ise n’ime obodo ahụ. Ị̀ ga-ekpochapụ obodo ahụ wee ghara ịgbaghara ya n’ihi ndị ezi omume iri ise nọ n’ime ya?” (Amaokwu nke 23, 24) Chineke kwuru na ọ bụrụ na e nwere ndị ezi omume iri ise n’obodo ahụ, na ya agaghị ebibi ya. Ebreham rịọrọ Jehova ugboro ise ọzọ. Ná nke ọ bụla, ndị ezi omume ole ọ na-akpọ anaghị eru mmadụ ole o bu ụzọ kpọọ. O megidere otú ahụ ruo mgbe ọ rịọrọ maka ndị ezi omume iri. Ihe Chineke gwara ya ugboro ise ahụ bụ na ya agaghị emebi obodo ahụ ma ọ bụrụ na ndị ezi omume ole o kwuru nọ na ya.

Ebreham ọ̀ nọ na-arụ Chineke ụka? Mbanụ! Ọ gaara abụ mkparị na-enweghị atụ ma a sị na o mere otú ahụ. Otú Ebreham si kwuo okwu gosiri nkwanye ùgwù na ịdị umeala n’obi. O kwuru na ya bụ “ájá na ntụ” nkịtị. Ọ sịrị “biko” ugboro anọ. (Amaokwu nke 27, 30-32) Ihe Ebreham kwuru gosikwara na obi siri ya ike na Jehova ga-eme ihe ziri ezi. Mgbe Ebreham nọ na-ekwu ma Chineke ọ̀ ga-egbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume ọ sịrị, “Tụfịakwa!” ugboro abụọ, na Chineke agaghị eme ya. Nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwupụtara obi ike o nwere ‘na Onyeikpe nke ụwa dum ga-eme ihe ziri ezi.’—Amaokwu nke 25.

Ebreham ò kwutere ihe niile o kwuru n’oge ahụ? Azịza ya bụ ee, bụrụkwa ee e. O kwuteghị ya mgbe ahụ ọ sịrị na ọ ga-abụ na e nweruru ndị ezi omume iri na Sọdọm na Gọmọra. Ma, o kwutere ya nnọọ mgbe ọ sịrị na Chineke agaghị ‘ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume.’ Mgbe Chineke mechara bibie obodo ọjọọ ndị ahụ, ndị mmụọ ozi nyeere onye ezi omume bụ́ Lọt na ụmụ ya nwaanyị abụọ aka ịgbapụ.—2 Pita 2:7-9.

Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị banyere Jehova? Mgbe Jehova gwara Ebreham na ya chọrọ ilebara obodo ndị ahụ anya, ihe O mere bụ ịgwa Ebreham ka o kwuo obi ya. Ya ejirizie ndidi gee ntị ka enyi ya Ebreham na-ekwu ihe na-enye ya nsogbu n’obi. (Aịzaya 41:8) Akụkọ a na-akụziri anyị nke ọma na Jehova Chineke dị obi umeala, na-akwanyekwara ndị ohu ya nọ n’ụwa ùgwù. O doro anya na anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova, bụ́ Onyeikpe nke na-eme ihe ziri ezi mgbe niile, obi anyị dum.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ná mkparịta ụka ahụ, otu mmụọ ozi nke nọchiri anya Jehova kwuchitere ọnụ Ya. Gụọ Jenesis 16:7-11, 13, ka ị hụ ebe ọzọ mmụọ ozi kwuchiteere Jehova ọnụ Ya.

[Foto dị na peeji nke 24]

Ebreham rịọrọ Jehova arịrịọ maka Sọdọm na Gọmọra