Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwa Okorobịa nke Nwere Obi Ike

Nwa Okorobịa nke Nwere Obi Ike

Maka Ndị Na-eto Eto

Nwa Okorobịa nke Nwere Obi Ike

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ihe na-eme ugbu a.

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ 1 SAMUEL 17:1-11, 26, 32-51.

Kọwaa otú i chere Golayat dị na ụdị olu o ji kwuo okwu.

․․․․․

N’agbanyeghị na Devid esoghị na ndị agha Izrel, gịnị mere o ji soro ha lụso Golayat agha? (Gụọ amaokwu nke 26.)

․․․․․

Gịnị mere obi ji sie Devid ike na Jehova ga-enyere ya aka? (Gụghachi amaokwu nke 34 ruo nke 37.)

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Jiri akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ ihe i nwere gbalịa ka ị mata

(1) Otú Golayat haruru n’ogologo. (1 Samuel 17:4)

Kubit isii na otu ntụ ọbụ aka pụtara = ․․․․․.

(2) Otú uwe agha Golayat na-anyịru n’arọ. (1 Samuel 17:5)

Puku shekel ọla kọpa ise pụtara = ․․․․․.

(3) Otú ọnụ ube Golayat na-anyịru n’arọ. (1 Samuel 17:7)

Narị shekel ígwè isii pụtara = ․․․․․.

MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Obi ike.

․․․․․

Ịtụkwasị Jehova obi kama ịtụkwasị ike ọkpụkpụ aka gị obi.

․․․․․

IHE NDỊ ỌZỌ Ị GA-AMỤTA.

Olee nsogbu ndị na-esiri gị ike imeri otú ahụ o siiri ndị Izrel ike imeri Golayat?

․․․․․

Olee ihe ndị metụrụla (gịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ) bụ́ ndị mere ka obi sie gị ike na Jehova agaghị ahapụ gị?

․․․․․

OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․