Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ise Mere Anyị Ji Kwesị Ịtụ Egwu Chineke, Ọ Bụghị Egwu Mmadụ

Ihe Ise Mere Anyị Ji Kwesị Ịtụ Egwu Chineke, Ọ Bụghị Egwu Mmadụ

Ihe Ise Mere Anyị Ji Kwesị Ịtụ Egwu Chineke, Ọ Bụghị Egwu Mmadụ

O RIRI nwa okorobịa ahụ ọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ tụrụ anya ihe ka mepụrụnụ. Ihe ya na Ndịàmà Jehova abụọ kwurịtara emepeela ya anya. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọ nọ na-eche ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrị, ma ugbu a e jirila Baịbụl mee ka o doo ya anya. Ọ maghị na ihe ndị dị oké mkpa ndị nwere ike ime mmadụ obi ụtọ juru na Baịbụl.

Nkeji ole na ole ndị ọbịa ahụ lawara, nwaanyị nwe ụlọ o bi ji iwe tibata n’ụlọ ya ma jụọ ya, sị, “Olee ndị bụ́ ndị ahụ?”

Ajụjụ ahụ enyeghị nwa okorobịa ahụ ọnụ okwu.

Nwaanyị ahụ baara ya mba, sị: “Ama m ndị ha bụ, ọ bụrụ na ị nabata ha ọzọ, ị ga-akwapụ, chọrọ ụlọ ebe ọzọ!”

Nwaanyị ahụ ji iwe mechie ụzọ pụwa.

Ezi Ndị Na-eso Ụzọ Kraịst Na-atụ Anya Mmegide

Ọ bụghị naanị nwa okorobịa a ka ụdị ihe a metụrụla. Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru, sị: “A ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) Kemgbe ụwa, ndị mmadụ anaghị enwekarị mmasị n’ebe Ndị Kraịst nọ. N’ihi gịnị? Jọn onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Anyị maara na anyị sitere na Chineke, ma ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” E jikwa Setan bụ́ Ekwensu tụnyere “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Jọn 5:19; 1 Pita 5:8) Otu ihe Setan ji enweta ndị mmadụ bụ egwu mmadụ.

A kwara ọbụna Jizọs Kraịst, bụ́ onye mere ọtụtụ ihe ọma, onye na-emeghịkwa mmehie ọ bụla, emo ma kpagbuo ya. O kwuru, sị: “Ha kpọrọ m asị na nkịtị.” (Jọn 15:25) N’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ga-eche ha ihu, sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọwo m asị tupu ya akpọọ unu asị. Chetanụ okwu m gwara unu, Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.”—Jọn 15:18, 20.

N’ihi ihe a Jizọs kwuru, obi akaghị ọtụtụ ndị ịmalite ife Chineke ezi ofufe. Baịbụl kwuru banyere ndị nọ na-achọ Jizọs n’otu oge, sị: “Otú ọ dị, ọ dịghị onye na-ekwu banyere ya n’ihu ọha n’ihi na ha na-atụ ndị Juu egwu.” (Jọn 7:13; 12:42) Ndị ndú okpukpe e nwere n’oge ahụ kwuru na ha ga-achụpụ onye ọ bụla kweere na Kraịst n’ụlọ nzukọ ha. N’ihi ya, egwu mmadụ gbochiri ọtụtụ ndị ịghọ Ndị Kraịst.—Ọrụ 5:13.

Ka e mesịrị, mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst maliterela ịdị, Akwụkwọ Nsọ kwuru na “a malitere ịkpagbu” ọgbakọ dị na Jeruselem. (Ọrụ 8:1) N’ezie, n’Alaeze Ukwu Rom dum, a kpagburu Ndị Kraịst. Ndị a ma ama na Rom gwara Pọl onyeozi, sị: “N’ihe metụtara òtù a, anyị maara na a na-ekwugide ya n’ebe niile.” (Ọrụ 28:22) Ee, a nọ na-akpagbu ezi Ndị Kraịst n’ebe niile.

Ọbụna taa, Setan ka na-eji egwu mmadụ egbochi ọtụtụ ndị ịghọ ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst. A na-emegide ndị ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl ma ọ bụ na-akwa ha emo n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, n’ebe ha bi, ma ọ bụkwanụ ndị enyi ha ana-emegide ha. Ụjọ nwere ike ịtụwa ha na a ga-akwụsị ịkwanyere ha ùgwù, na ndị enyi ha ga-agbara ha ọsọ, ma ọ bụ na ha agakwaghị na-enweta ihe ndị dị ha mkpa. N’ime obodo ụfọdụ, ndị ọrụ ubi na-atụ ụjọ na ndị agbata obi ha agakwaghị na-enyere ha aka n’oge owuwe ihe ubi ma ọ bụ na ha agakwaghị na-elekọtara ha anụ ụlọ ha. Ma, n’agbanyeghị ihe ndị ahụ na-atụ ha ụjọ, ọtụtụ nde mmadụ ekpebisiela ike ịtụkwasị Chineke obi na ibi ndụ otú Okwu Chineke kwuru, dị ka Jizọs Kraịst mere. Jehova agọziela ha maka ime otú ahụ.

Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịtụ Egwu Chineke, Ọ Bụghị Egwu Mmadụ

Baịbụl gbara anyị ume ịtụ egwu Chineke, ọ bụghị egwu mmadụ. O kwuru, sị: “Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe.” (Abụ Ọma 111:10) Egwu a abụghị ụjọ na-enweghị isi, kama ọ bụ ịtụ egwu imejọ Onye nyere anyị ndụ. E nwere ike ikwu na ụdị egwu a na ịhụnanya na-arụkọ ọrụ. Ma, olee ihe mere anyị ji kwesị ịtụ egwu Chineke, ọ bụghị egwu mmadụ? Ka anyị tụlee ihe ise mere anyị ji kwesị ime otú ahụ.

1 Jehova bụ Onye Kasị Elu. Jehova ka nnọọ mmadụ ọ bụla ike. Ọ bụrụ na anyị ana-atụ egwu Chineke, ọ pụtara na anyị nọ n’akụkụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ́ onye “mba niile dị ka mmiri si na bọket tapụ” n’anya ya. (Aịzaya 40:15) Ebe ọ bụ na Chineke bụ onye pụrụ ime ihe niile, o nwere ikike imebi “ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso” ndị na-erubere ya isi ọgụ. (Aịzaya 54:17) Ebe ọ bụkwa ya ga-ekpebi onye ruru eru inweta ndụ ebighị ebi, anyị ekwesịtụghị ikwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị ịmụ banyere ya na ime uche ya.—Mkpughe 14:6, 7.

2 Chineke ga-enyere anyị aka ma chebe anyị. Baịbụl kwuru n’Ilu 29:25, sị: “Ịtụ mmadụ egwu na-eweta ọnyà, ma a ga-echebe onye tụkwasịrị Jehova obi.” Egwu mmadụ bụ ọnyà n’ihi na o nwere ike ime ka anyị ghara ikwupụta okwukwe anyị nwere na Chineke. Chineke mesiri anyị obi ike na ya ga-azọpụtali anyị, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike.”—Aịzaya 41:10.

3 Chineke hụrụ ndị na-abịaru ya nso n’anya. Pọl onyeozi dere ihe a na-emetụ n’ahụ́: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 8:37-39) Ọ bụrụ na anyị amụta ịtụkwasị Chineke, bụ́ Eze Eluigwe na Ala, obi ma na-erubere ya isi, ọ ga-anọgide na-ahụ anyị n’anya. Nke ahụ bụ ezigbo ihe ọma o meere anyị!

4 Anyị ji ihe niile Chineke meere anyị kpọrọ ihe. Jehova bụ Onye Okike anyị, onye mere anyị ji dịrị ndụ. E wezụga nke ahụ, o nyere anyị ma ihe ndị ga-eme ka anyị nọgide na-adị ndụ ma ihe ndị ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. N’ezie, ezi onyinye ọ bụla si n’aka ya. (Jems 1:17) Devid, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi nke ji obiọma Chineke kpọrọ ihe, dere, sị: “I mewo ọtụtụ ihe, Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị . . . Ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.”—Abụ Ọma 40:5.

5 Ụfọdụ ndị na-emegide anyị nwere ike ịgbanwe. Otú i nwere ike isi nyere ndị na-emegide gị aka bụ ịnọgide na-atụ egwu Chineke ma na-ahụ ya n’anya, ọ bụghị ịkwụsị ime otú ahụ. Cheta ndị ikwu Jizọs. Na mbụ, ha ekweghị na ya, kama ha kwuru, sị: “Isi emebiela ya.” (Mak 3:21; Jọn 7:5) Mgbe Jizọs nwụsịrị, a kpọlite ya n’ọnwụ, ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe. Ndị otu nne ji ha na Jizọs, bụ́ Jems na Jud, sodị dee Akwụkwọ Nsọ. Onye ọzọ bụ onye ji obi ọjọọ kpagbuo Ndị Kraịst, ya bụ, Sọl, onye ghọrọ Pọl onyeozi. Ndị na-enye anyị nsogbu ugbu a nwere ike imecha hụ na ihe anyị na-akụzi bụ eziokwu sitere na Baịbụl n’ihi otú anyị si jiri obi ike nọgide n’ozi anyị.—1 Timoti 1:13.

Dị ka ihe atụ, ọ dịla anya otu nwaanyị bi n’Africa, nke aha ya bụ Aberash, kpewere ekpere ka Chineke nyere ya aka ịmata eziokwu banyere Ya. Mgbe ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, ndị ikwu ya na ndị isi okpukpe ya megidewere ya nke ukwuu. Ụfọdụ ndị ikwu ya, bụ́ ndị malitekwarala ịmụ Baịbụl, kwụsịrị n’ihi egwu mmadụ. Ma, ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya ike na obi ike, e mesịkwara mee ya baptizim, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. N’ihi ya, ndị ikwu ya asatọ katara obi, maliteghachi ịmụ Baịbụl, ha na-emekwa nke ọma n’ọmụmụ Baịbụl ha.

I Nwere Ike Imeri Egwu Mmadụ

Ọ bụrụ na ị chọghị ka egwu mmadụ jide gị, mee ihe niile i nwere ike ime iji hụkwuo Chineke n’anya. Otú i nwere ike isi mee ya bụ ịmụ Baịbụl na ịtụgharị uche n’amaokwu ndị dị ka Ndị Hibru 13:6, nke kwuru, sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” Echefula ihe ndị mere ịtụ egwu Chineke kama ịtụ egwu mmadụ ji bụrụ ihe ziri ezi na ihe bara uru.

Chetakwa ngọzi niile ị ga-enweta ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl eme. I nwere ike ịmata azịza nke ajụjụ ndị dị mkpa ndị mmadụ na-ajụ banyere ndụ. Ị ga-enweta amamihe ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ. I nwere ike inwe olileanya magburu onwe ya n’agbanyeghị nsogbu tara akpụ ndị dị n’ụwa taa. Ị ga-enwekwa ike ikpeku Chineke pụrụ ime ihe niile ekpere mgbe ọ bụla ị chọrọ.

Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ugbu a bụ oge iguzosi ike na oge ije ije n’egwu Chineke. Kama ikwe ka egwu mmadụ mata gị n’ọnyà, i nwere ike kpebie ịnara ndụmọdụ a Chineke nyere gị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.” (Ilu 27:11) Nke ahụ bụ ohere magburu onwe ya o nyere anyị!

Cheta na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nwere ike inye gị ihe Chineke ga-enye ndị na-atụ egwu ya. Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Ihe ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu Jehova na-arụpụta bụ akụnụba na otuto na ndụ.”—Ilu 22:4.

[Foto dị na peeji nke 14]

Obi ike Aberash mere ka ndị ikwu ya asatọ nọgide na-amụ Baịbụl