Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mụrụnụ Anya”

“Mụrụnụ Anya”

“Mụrụnụ Anya”

“Ọgwụgwụ ihe niile adịwo nso. . . . Mụrụnụ anya ka unu wee na-ekpe ekpere.”—1 PITA 4:7.

1. Olee ihe bụ́ isi Jizọs kụziiri ndị mmadụ?

MGBE Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ihe bụ́ isi ọ kụziiri ndị mmadụ bụ banyere Alaeze Chineke. Jehova ga-eji Alaeze ahụ gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị eluigwe na ala, ọ ga-ejikwa ya doo aha ya nsọ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpekuo Chineke ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 4:17; 6:9, 10) N’oge na-adịghị anya, Alaeze ahụ ga-ebibi ụwa Setan ma hụ na e mere uche Chineke n’ụwa dum. Dị ka Daniel buru n’amụma, Alaeze Chineke “ga-egwepịa alaeze ndị a niile [ya bụ, ndị dị n’oge a], mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Dan. 2:44.

2. (a) Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi mara na ọ malitela ịchị n’Alaeze ya? (b) Gịnị ọzọ ka ihe ịrịba ama ahụ ga-egosi?

2 Alaeze Chineke dị ndị na-eso ụzọ Jizọs oké mkpa. N’ihi ya, ha jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” (Mat. 24:3) Ebe ọ bụ na ndị nọ n’ụwa agaghị ahụ Kraịst anya ma ọ malite ịchị, a ga-enwe ihe ịrịba ama ndị a na-ahụ anya ga-eme ka a mata na ọ malitela ịchị n’Alaeze ya. A ga-enwe ọtụtụ ihe ga-eso n’ihe ịrịba ama ahụ, bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ buru n’amụma. Ihe ndị a ga-eme ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ndụ n’oge ọ malitere ịchị mata na ọ chịwala n’eluigwe. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ’ nke ajọ usoro ihe a nke na-achị ụwa ugbu a ga-amalite.—2 Tim. 3:1-5, 13; Mat. 24:7-14.

Mụrụ Anya n’Oge Ikpeazụ

3. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji kwesị ịmụrụ anya?

3 Pita onyeozi dere, sị: “Ọgwụgwụ ihe niile adịwo nso. Ya mere, nweenụ uche zuru okè, mụrụnụ anya ka unu wee na-ekpe ekpere.” (1 Pita 4:7) Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịmụrụ anya ka ha nwee ike ịhụ ihe ndị na-eme n’ụwa, bụ́ ndị na-egosi na Kraịst amalitela ịchị n’Alaeze ya. Ha ga-amụrụ anya karị ka oge ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a na-eru nso. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị mgbe nna nwe ụlọ ga-abịa [ime ụwa Setan ihe e kpere n’ikpe].”—Mak 13:35, 36.

4. Olee otú àgwà ndị Setan na-achị si dị iche n’àgwà ndị ohu Jehova? (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)

4 Ọ bụ Setan na-achị ọtụtụ ndị nọ n’ụwa a, ha amụghịkwa anya iji mara ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara. Ha amaghị na Kraịst amalitela ịchị n’Alaeze ya. Ma, ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst mụ anya, ha makwa ihe ihe ndị mewere kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị afọ pụtara. Kemgbe afọ 1925, Ndịàmà Jehova ma na Agha Ụwa nke Mbụ na ihe ndị mere ka agha ahụ gachara, na-egosi n’ụzọ doro anya na Kraịst malitere ịchị n’Alaeze ya n’eluigwe n’afọ 1914. N’ihi ya, oge ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a, bụ́ nke Setan na-achị, amalitela. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị anya ruru ala amaghị ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara, ha ma na e nwere ihe dị nnọọ iche n’otú ụwa dị tupu Agha Ụwa nke Mbụ na otú ọ dị kemgbe a lụchara ya.—Gụọ igbe bụ́  “Oge Ọgba Aghara Amalite.”

5. Olee ihe mere o ji dị oké mkpa ka anyị mụrụ anya?

5 Kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị afọ, oké ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa dum na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-enye Kraịst iwu ka o duru ndị mmụọ ozi dị ike bibie ụwa Setan. (Mkpu. 19:11-21) A gwara ezi Ndị Kraịst ka ha na-eche nche. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị nọgide na-eche nche ka anyị na-atụ anya ọgwụgwụ nke usoro ihe a. (Mat. 24:42) Anyị aghaghị ịnọgide na-eche nche ma na-arụ ọrụ ahụ e nyere anyị, bụ́ nke Kraịst na-eduzi anyị ịrụ n’ụwa dum.

Ọrụ A Na-arụ n’Ụwa Niile

6, 7. Olee otú Ndịàmà Jehova sirila nwee ọganihu n’ọrụ nkwusa Alaeze n’oge ikpeazụ a?

6 Ọrụ ndị ohu Jehova na-arụ so n’ihe ịrịba ama ahụ e buru n’amụma nke na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a. Jizọs kwuru ihe bụ́ ọrụ a a na-arụ n’ụwa niile mgbe o kwuru ọtụtụ ihe ga-eme n’oge ikpeazụ. O kwuru otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mgbe ọ na-ebu amụma banyere oge ikpeazụ. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Mat. 24:14.

7 Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ banyere amụma a Jizọs buru. Ndị na-ekwusa ozi ọma dị obere mgbe oge ikpeazụ malitere n’afọ 1914. Ma ugbu a, ọnụ ọgụgụ ha amụbaala nke ukwuu. E nwere ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova asaa, ndị na-ekwusa ozi ọma n’ụwa dum. Ha nọ n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ. Nde mmadụ iri so Ndịàmà Jehova zukọta n’ụbọchị ha chetara ọnwụ Kraịst n’afọ 2008. Nke a ji ọnụ ọgụgụ dị ukwuu karịa mmadụ ole bịara nke afọ 2007.

8. Gịnị mere mmegide agaghị akwụsịli ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na-arụ?

8 N’ezie, a na-agba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke ná mba niile tupu usoro ihe a agwụ! A na-eme nke a n’agbanyeghị na ọ bụ Setan bụ “chi nke usoro ihe a.” (2 Kọr. 4:4) Ọ bụ ya ka ọchịchị, okpukpe, azụmahịa ụwa, na ihe ndị e ji agbasa echiche, dị n’aka. Oleezi ihe mere e ji nwee nnukwu ọganihu n’ọrụ nkwusa ahụ? Ọ bụ n’ihi na Jehova na-akwado ọrụ a. N’ihi ya, ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na-aga nnọọ n’ihu n’agbanyeghị mbọ Setan na-agba ịkwụsị ya.

9. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ọganihu ime mmụọ anyị na-enwe bụ ọrụ ebube?

9 E nwere ike ikwu na otú ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze si aga n’ihu, otú ndị Jehova si amụba, nakwa otú ha si amụta banyere Jehova, bụ ọrụ ebube. A sị na Chineke anaghị akwado ndị ya, nke gụnyere iduzi ha na ichebe ha, ọrụ ikwusa ozi ọma agaraghị aga n’ihu. (Gụọ Matiu 19:26.) Obi siri anyị ike na ebe ọ bụ na Chineke ji mmụọ nsọ na-akwado ndị mụ anya, bụ́ ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi, a ga-ekwusagide ozi ọma a ruo n’isi, “mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” Ọgwụgwụ ahụ eruwela n’ike n’ike.

‘Oké Mkpagbu Ahụ’

10. Olee otú Jizọs si kọwaa oké mkpagbu ahụ na-abịanụ?

10 Ajọ usoro ihe a ga-agwụ n’ihe Baịbụl kpọrọ ‘oké mkpagbu ahụ.’ (Mkpu. 7:14) Baịbụl agwaghị anyị mgbe oké mkpagbu ahụ ga-akwụsị, ma Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” (Mat. 24:21) Mkpagbu ndị ụmụ mmadụ nwerela n’oge a, dị ka ụdị nke e nwere n’Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ mgbe ihe dị ka nde mmadụ iri isii nwụrụ, na-egosi na oké mkpagbu ahụ nke gaje ịbịa ga-esi nnọọ ike. Ọ ga-akwụsị mgbe agha Amagedọn lụchara. Ọ bụ n’agha ahụ ka Jehova ga-eji ndị agha ya laa ihe fọdụrụ n’ụwa Setan n’iyi.—Mkpu. 16:14, 16.

11, 12. Olee ihe ga-eme nke ga-egosi na oké mkpagbu ahụ amalitela?

11 Amụma Baịbụl ekwughị ụbọchị ihe mbụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ ga-amalite, ma ọ gwara anyị na e nwere otu ihe dị egwu ga-eme nke ga-egosi na ọ malitela. Ihe ahụ ga-emenụ bụ na ndị ọchịchị ụwa ga-ebibi okpukpe ụgha niile. Amụma ndị dị ná Mkpughe isi nke 17 na nke 18 kwuru na okpukpe ụgha bụ nwaanyị akwụna nke ya na ọchịchị ụwa na-akwa iko. Mkpughe 17:16 gosiri na n’oge na-adịghị anya, ndị ọchịchị “ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị, laakwa ya n’iyi ma mee ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam.”

12 Mgbe oge nke a ga-eme ruru, Chineke ‘ga-etinye ya n’obi ndị ọchịchị ime echiche ya,’ ya bụ, ibibi okpukpe ụgha niile. (Mkpu. 17:17) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ọ bụ Chineke bibiri ya. Ọ bụ otú a ka ọ ga-esi mezuo ikpe ọ mara okpukpe ihu abụọ ndị nọworo na-akụzi ihe ndị megidere uche Chineke ma na-akpagbu ndị ohu ya kemgbe ụwa. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa anaghị atụ anya na a ga-ebibi okpukpe ụgha. Ma ndị ohu Jehova, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, na-atụ anya mbibi a. Ha anọwo na-agwa ndị mmadụ banyere ya n’oge ikpeazụ a.

13. Gịnị na-egosi na mbibi nke okpukpe ụgha agaghị egbu oge?

13 Ọ ga-atụ ndị mmadụ n’anya mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha. Amụma Baịbụl gosiri na ọbụna ụfọdụ n’ime “ndị eze ụwa” ga-ekwu banyere mbibi ahụ, sị: “Ewoo, ewoo . . . n’ihi na n’otu awa ka e mezuru ikpe e kpere gị!” (Mkpu. 18:9, 10, 16, 19) Okwu bụ́ “n’otu awa” na-egosi na nke a agaghị egbu oge.

14. Gịnị ka Chineke ga-eme mgbe ndị iro ya bịara ibuso ndị ohu ya agha?

14 Anyị ma na ọ bụrụ na e bibichaa okpukpe ụgha, a ga-ebuso ndị ohu Jehova agha, bụ́ ndị na-eme ka ndị mmadụ mara banyere ikpe Jehova mara ndị iro ya. (Ezik. 38:14-16) Mgbe ha ga-amalite ibuso ndị Jehova agha, Jehova ga-ebuso ha agha, n’ihi na o kwere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi nkwa ichebe ha. Jehova sịrị: “M ga-eji ekworo m na iwe m dị ọkụ kwuo okwu. . . . Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.” (Gụọ Ezikiel 38:18-23.) Chineke kwuru na Baịbụl, sị: “Onye na-emetụ unu [ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi] aka na-emetụ mkpụrụ anya m aka.” (Zek. 2:8) Ya mere, mgbe ndị iro Jehova ga-amalite ibuso ndị ohu ya agha n’ụwa niile, ọ ga-agbatara ha ọsọ enyemaka. Ọ ga-eme ihe ozugbo nke ga-eduga n’ihe ikpeazụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ, ya bụ, n’Amagedọn. Kraịst ga-eduru ụsụụ ndị mmụọ ozi dị ike mee ihe Jehova kpere n’ikpe ime ụwa Setan.

Ihe Anyị Kwesịrị Ime

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ebe anyị maara na ọgwụgwụ usoro ihe a dị nso?

15 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ebe anyị maara na ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a dị nnọọ nso? Pita onyeozi dere, sị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a niile, chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:11) Okwu ndị a gosiri na anyị kwesịrị ịkpachara anya iji hụ na anyị na-akpa àgwà Chineke chọrọ nakwa na anyị na-eme ihe ndị na-egosi na anyị na-asọpụrụ Jehova, nke na-egosikwa na anyị hụrụ ya n’anya. Ịnọgide na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke tupu usoro ihe a agwụ so n’omume ịsọpụrụ Chineke. Pita dekwara, sị: “Ọgwụgwụ ihe niile adịwo nso. . . . Mụrụnụ anya ka unu wee na-ekpe ekpere.” (1 Pita 4:7) Ikpeku Jehova ekpere mgbe niile ka o jiri mmụọ nsọ ya na ọgbakọ ya na-eduzi anyị na-eme ka anyị bịaruo ya nso, ọ na-egosikwa na anyị hụrụ ya n’anya.

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịṅa nnọọ ntị na ndụmọdụ Chineke nyere anyị?

16 N’oge a dị egwu, anyị kwesịrị ịna-eme nnọọ ihe Okwu Chineke dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Efe. 5:15, 16) Ihe ọjọọ juru ebe niile ugbu a karịa otú ọ dị n’oge gara aga. Setan na-eme ọtụtụ ihe iji mee ka ndị mmadụ ghara ime uche Jehova, ma ọ bụkwanụ iji megharịa ha anya. Anyị, bụ́ ndị ohu Chineke, ma nke a, anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị kwụsị ime uche Chineke. Anyị makwa ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya, obi sikwara anyị ike na Jehova ga-emezu nzube ya.—Gụọ 1 Jọn 2:15-17.

17. Kọwaa otú obi ga-adị ndị na-anwụghị n’Amagedọn mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

17 Chineke ga-emezu nkwa o kwere na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ, n’ihi na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ị̀ hụrụ otú e si jiri okwu ahụ bụ́: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ” mesie nkwa ahụ ike? Nke a ga-emezurịrị, n’ihi na Jehova ekwela nkwa na ọ ga-eme. Aịzaya 26:19 kwere nkwa, sị: “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ. . . . Tetanụ tie mkpu ọṅụ, unu ndị bi n’ájá! . . . Ala ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.” Okwu a mezuru nke mbụ ya mgbe ndị ohu Chineke oge ochie laghachiri n’obodo ha. Nke a na-emekwa ka obi sie anyị ike na ọ ga-emezu ọzọ n’ụwa ọhụrụ, mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. A ga-enwe ọṅụ dị ukwuu mgbe ndị a kpọlitere n’ọnwụ na ndị ha hụrụ n’anya ga-ahụ onwe ha ọzọ. N’eziokwu, ọ fọrọ ntakịrị ka ụwa Setan gwụ, ụwa ọhụrụ Chineke dịkwa ezigbo nso. Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị mụrụ anya.

Ì Chetara?

• Olee ihe bụ́ isi Jizọs kụziri?

• Olee otú ọrụ nkwusa Alaeze ahụ sirila nwee ọganihu ugbu a?

• Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị mụrụ anya?

• Olee otú nkwa ahụ e kwere n’Ọrụ 24:15 si akasi gị obi?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16, 17]

 OGE ỌGBA AGHARA AMALITE

Aha akwụkwọ Alan Greenspan dere n’afọ 2007 bụ The Age of Turbulence: Adventures in a New World (Oge Ọgba Aghara: Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa Ọhụrụ). Alan Greenspan bụbu onyeisi oche nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụlọ akụ̀ niile e nwere ná mba United States. Ọ rụrụ ọrụ a ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri abụọ. Greenspan kwuru otú ihe si dị nnọọ iche n’otú ụwa dị tupu afọ 1914 na otú ọ dị kemgbe afọ 1914. Ọ sịrị:

“E nwere ọtụtụ akụkọ ndị gosiri na tupu afọ 1914, na mba ọ bụla na-akwanyere mba ndị ọzọ ùgwù, e nwekwara nnọọ ọganihu dị ukwuu n’ụwa; otú ihe si nnọọ na-aga nke ọma mere ka e chee na ụwa ga-amagbu onwe ya. Malite n’afọ 1800 gawa, a kwụsịrị ịgba ohu, nke bụ́ ihe jọgburu onwe ya a na-eme tupu mgbe ahụ. E nwechaghịkwa ndị na-emekpọ ndị ọzọ ọnụ. . . . E nwere ọtụtụ ihe ndị bara uru e mepụtara n’oge ahụ, ihe ndị dị ka, ụzọ ụgbọ okporo ígwè, telefon, ọkụ eletrik, sinima, ụgbọala, na imeriime ihe ndị e ji ebi n’ụlọ. Ọganihu ndị e nwere n’otú e si agwọ ọrịa, ihe oriri ndị na-edozi ahụ́, na otú ezigbo mmiri ọṅụṅụ si eru ọtụtụ ndị aka, mere ka ndị mmadụ ghara ịna-anwụ ngwa ngwa . . . Onye ọ bụla chere na ihe ga na-aka mma na-aga.”

Ma . . . “Agha Ụwa nke Mbụ lara ihe ndị a n’iyi, ma Agha Ụwa nke Abụọ ka laa ụmụ mmadụ n’iyi. . . . Agaghị m echefu otú ụwa dị tupu Agha Ụwa nke Mbụ. E chere n’oge ahụ na ihe ga-anọgide na-adịrị ụmụ mmadụ mma. Taa, ihe anyị na-eche banyere ọdịnihu dị nnọọ iche n’ihe e chere banyere ọdịnihu otu narị afọ gara aga, ma, o yiri ka otú anyị si ele ihe anya ugbu a bụ otú ihe dị n’ezie. Ndị na-eyi ọha egwu, otú ụwa si na-ekpo ọkụ karịa ka o kwesịrị, na ndị na-agba ndị ọchịchị mgba okpuru, hà ga-eme ụwa ihe Agha Ụwa nke Mbụ mere ụwa n’oge gara aga? O nweghị onye ma.”

Greenspan chetara ihe mere mgbe ọ na-aga akwụkwọ. O chetara ihe Prọfesọ Nkà Mmụta Akụnụba bụ́ Benjamin M. Anderson kwuru (onye a mụrụ n’afọ 1886, ya anwụọ n’afọ 1949). Ọ sịrị: “Ọ na-agụ ndị maara otú ụwa dị tupu Agha Ụwa nke Mbụ agụụ ka ihe dịghachi otú ọ dị mgbe ahụ. Ahụ́ ruru ndị mmadụ ala mgbe ahụ, e nwebeghịkwa ihe yiri ya ọzọ kemgbe ahụ.”—Economics and the Public Welfare.

G. J. Meyer kwuru ihe yiri nke a n’akwụkwọ ya bụ́ A World Undone, nke e bipụtara n’afọ 2006. Ọ sịrị: “A na-ekwu na e nwere ihe ụfọdụ ọ na-abụ ha mee ha ‘agbanwee ihe niile.’ Nke a bụ eziokwu banyere Agha Ukwu ahụ [nke a lụrụ malite n’afọ 1914 ruo n’afọ 1918]. Agha ahụ gbanwere ihe niile n’ezie: ma ókèala, ọchịchị, na ihe ndị na-eme na mba dị iche iche, ọ gbanwekwara otú ndị mmadụ si ele ụwa na ndụ ha anya kemgbe ahụ. Ọ bụ oge ọjọọ a na-agaghị echefu echefu, nke mere ka otú ụwa dị ugbu a dị iche n’otu ọ dị tupu a lụọ agha ahụ.”

[Foto dị na peeji nke 18]

Jehova ga-eji ndị mmụọ ozi dị ike lụọ agha Amagedọn