Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere Jizọs ji kpọọ Jehova “Aba, Nna” n’ekpere?

Okwu Arameik bụ́ ʼab·baʼʹ nwere ike ịpụta “nna” ma ọ bụ “Nna m.” Ugboro atọ ọ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ bụ mgbe a na-ekpe ekpere na mgbe a na-ekwu banyere Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova. Olee ihe okwu ahụ pụtara?

Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru, sị: “N’asụsụ ndị mmadụ na-asụkarị n’oge Jizọs, ʼabbāʼ bụ ihe ụmụaka na-akpọ nna ha nke na-egosi na ha na nna ha dị ná mma, nakwa na ha na-akwanyere ya ùgwù.” Ọ bụ ihe nwa na-akpọ nna ọ hụrụ n’anya, o sokwa n’okwu mbụ nwata na-amụta. Jizọs kpọrọ ya Nna ya mgbe ọ na-ekpeku ya ekpere si ya n’ala ala obi. N’ekpere ahụ Jizọs kpere n’ogige Getsemeni mgbe ọ fọrọ awa ole na ole ka ọ nwụọ, ọ kpọrọ Jehova “Aba, Nna.”—Mak 14:36.

Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “N’akwụkwọ ndị Juu dere n’oge ndị Gris na ndị Rom na-achị ụwa, o siri ike ịhụ ebe a kpọrọ Chineke ʼabbāʼ. O doro anya na ihe kpatara ya bụ na ọ ga-adị ka à na-akparị Chineke akparị ma a kpọọ ya aha a nke na-egosi oké adịm ná mma.” Ma, “Jizọs . . . ịkpọ Chineke ʼabbāʼ n’ekpere bụ ụzọ o si gosi na o kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị na ya na Chineke dị n’ezigbo mma.” Ebe abụọ ọzọ “Aba” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ, ya bụ, n’akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi dere, na-egosi na Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ na-ekwukwa ya mgbe ha na-ekpe ekpere.—Ndị Rom 8:15; Ndị Galeshia 4:6.

Gịnị mere e ji dee akwụkwọ ụfọdụ nke Baịbụl n’asụsụ Grik?

Pọl onyeozi kwuru na e nyefere “okwu dị nsọ nke Chineke” n’aka ndị Juu. (Ndị Rom 3:1, 2) Ọ bụ ya mere o ji fọ nke nta ka ọ bụrụ Hibru, bụ́ asụsụ ndị Juu, ka e ji dechaa mpaghara mbụ nke Baịbụl. Ma, ọ bụ asụsụ Grik ka e ji dee Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst. * Ọ̀ bụ maka gịnị?

Na narị afọ nke anọ Tupu Oge Anyị, ndị agha ndị lụụrụ Alexander Onye Ukwu agha sụrụ asụsụ Grik n’olumba dị iche iche a na-asụ n’oge gboo, bụ́ ndị gwakọtawara na-achọ ịghọ Koine, ma ọ bụ Grik ọha mmadụ na-asụ. Mmeri Alexander meriri mba dị iche iche n’agha so mee ka Koine bụrụ asụsụ a na-asụ ná mba niile n’oge ahụ. Ndị Juu bi ná mba dị iche iche n’oge ahụ Alexander nọ na-emeri n’agha. Ọtụtụ narị afọ tupu oge ahụ, mgbe a hapụrụ ndị Juu ka ha si Babịlọn, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha, laa, ọtụtụ n’ime ha alaghachighị Palestaịn. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu amakwaghị otú e si asụ ezigbo Hibru, ihe ha na-asụzi bụ Grik. (Ọrụ 6:1) Ọ bụ iji nyere ha aka mere e ji bipụta Septuagint, ya bụ, Akwụkwọ Nsọ Hibru e ji Koine, ma ọ bụ Grik ọha mmadụ na-asụ, sụgharịa.

Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na o nweghị asụsụ “dị ka asụsụ Grik ma a bịa n’inwe ọtụtụ okwu, n’ịdịrị onye ukwu na onye nta mfe ọsụsụ, nakwa n’ịgazu ebe niile n’ụwa.” N’ihi ọtụtụ okwu, ụtọ asụsụ na ngwaa dị iche iche o nwere, bụ́ ndị nwere ike ịkọwa ụdị ihe dị iche iche mmadụ chọrọ ikwu, ọ bụ “asụsụ e ji ekwurịta okwu na nke e ji agbasa ozi, nke bụ́ kpọmkwem ụdị asụsụ dị Ndị Kraịst mkpa.” Ó kwesịghị ekwesị na ọ bụ asụsụ Grik ka e ji dee Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 E dere akwụkwọ ole na ole dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Arameik. Ihe àmà na-egosi na Matiu bu ụzọ dee Oziọma ya n’asụsụ Hibru, ọ ga-abụkwa na o mechara sụgharịa ya n’asụsụ Grik.

[Foto dị na peeji nke 13]

Iberibe ihe odide Septuagint Grik

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara Israel Antiquities Authority ikike