Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

ỌTỤTỤ ndị kweere na Atọ n’Ime Otu bụ “ozizi dị mkpa n’okpukpe Ndị Kraịst.” Ozizi a na-ekwu na Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ bụ ndị atọ dị n’otu Chineke. Kadinal John O’Connor kwuru banyere Atọ n’Ime Otu, sị: “Anyị maara na ọ bụ oké ihe omimi, nke anyị na-enweghị ike ịghọta.” Olee ihe mere Atọ n’Ime Otu ji esi nnọọ ike nghọta?

Akwụkwọ bụ́ The Illustrated Bible Dictionary gwara anyị otu ihe mere o ji dị otú ahụ. Akwụkwọ a kwuru banyere Atọ n’Ime Otu, sị: “Ọ bụghị ozizi Baịbụl n’ihi na ọ dịghị ebe Baịbụl kọwara ya.” Ebe ọ bụ na Atọ n’Ime Otu ‘abụghị ozizi Baịbụl,’ ọ na-esiri ndị kweere n’Atọ n’Ime Otu ike ịchọta amaokwu Baịbụl ndị ha ga-eji akwado ozizi a ha na-ezi, ha na-akọwahiedị ụfọdụ amaokwu iji kwado ya.

Amaokwu A Ọ̀ Na-akụzi Atọ n’Ime Otu?

Otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị a na-akọwahiekarị bụ Jọn 1:1. Na Bible Nsọ nke Union Version, amaokwu ahụ kwuru, sị: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke [ya bụ, ton the·onʹ n’asụsụ Grik] dịkwara, Okwu ahụ bụrụkwa Chineke [the·osʹ].” N’amaokwu a, e nwere ụzọ abụọ e si dee okwu Grik bụ́ the·osʹ (chi). N’ihu nke mbụ, e dere okwu bụ́ ton (ahụ), bụ́ okwu Grik a na-etinye mgbe a na-ekwu banyere otu onye ma ọ bụ otu ihe kpọmkwem, ọ bụkwa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ka the·onʹ nke mbụ a na-ekwu maka ya. Ma na nke abụọ ya, e deghị okwu ahụ bụ́ ton (ahụ) n’ihu the·osʹ. È chefuru ya echefu?

Asụsụ e ji dee Oziọma Jọn bụ asụsụ Koine, ma ọ bụ Grik ọha mmadụ na-asụ, bụ́ asụsụ nwere iwu ndị a kapịrị ọnụ na-achị otú e si ede ihe mgbe e nwere otu onye ma ọ bụ otu ihe kpọmkwem a na-ekwu okwu ya. Ọkà mmụta Baịbụl bụ́ A. T. Robertson kwuru na ọ bụrụ na e dere ton (ahụ) n’ihu onye ma ọ bụ ihe nke mbụ a na-ekwu okwu ya, deekwa ya n’ihu onye ma ọ bụ ihe nke ọzọ, ihe ọ pụtara bụ na “ha abụọ bụ otu onye ma ọ bụ otu ihe.” Robertson ji Matiu 13:38 mee ihe atụ, bụ́ ebe kwuru, sị: “Ubi ahụ [ho a·grosʹ, n’asụsụ Grik] bụ ụwa [ho koʹsmos, n’asụsụ Grik].” N’ihi iwu na-achị asụsụ Grik, n’ebe a, ụwa bụkwa ubi.

Ọ bụrụkwanụ na e dere ton (ahụ) n’ihu onye ma ọ bụ ihe mbụ a na-ekwu okwu ya, ma, e deghị ya n’ihu onye ma ọ bụ ihe nke ọzọ, dị ka ọ dị na Jọn 1:1? Ọkà mmụta bụ́ James Allen Hewett kwuru banyere amaokwu a, sị: “N’ụdị ahịrịokwu ahụ, onye mbụ e kwuru okwu ya na onye nke ọzọ abụghị otu onye, ha ahaghịkwa.”

Hewett ji 1 Jọn 1:5 mee ihe atụ, bụ́ ebe kwuru, sị: “Chineke bụ ìhè.” N’asụsụ Grik, otú e si dee “Chineke” bụ ho the·osʹ, n’ihi ya kwa, o nwere ihe na-egosi na ọ na-ekwu banyere otu onye kpọmkwem. Ma, e deghị okwu ọ bụla na-egosi na ọ dị otu ìhè a na-ekwu okwu ya n’ihu okwu bụ́ phos, ya bụ, “ìhè.” Hewett kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike . . . ịsị na Chineke bụ ìhè; ma, mmadụ enweghị ike ịsị na ìhè bụ Chineke.” Ihe atụ yiri ya dị na Jọn 4:24, bụ́ ebe sịrị na “Chineke bụ Mmụọ,” nakwa na 1 Jọn 4:16, bụ́ ebe sịrị na “Chineke bụ ịhụnanya.” N’amaokwu abụọ a, e denyere ihe na-egosi na Chineke bụ otu onye kpọmkwem, ma, e denyeghị ya n’ihu okwu ndị bụ́ “Mmụọ” na “ịhụnanya.” N’ihi ya, mmadụ agaghị asị na onye a na-ekwu maka ya na ihe e kwuru maka ya bụ otu. Amaokwu ndị a emekataghị pụta “Mmụọ bụ Chineke” ma ọ bụ “ịhụnanya bụ Chineke.”

À Na-ekwu Banyere Onye “Okwu ahụ” Bụ?

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta asụsụ Grik na ndị na-asụgharị Baịbụl kwetara na ihe Jọn 1:1 lekwasịrị anya abụghị onye “Okwu ahụ” bụ, kama ọ bụ otú ọ dị. Onye nsụgharị Baịbụl bụ́ William Barclay kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na [Jọn onyeozi] etinyeghị okwu na-egosi na ọ na-ekwu banyere otu onye kpọmkwem n’ihu theos, ọ pụtara na o ji ya na-akọwa ihe . . . Ihe Jọn na-ekwu n’ebe a abụghị na Okwu ahụ bụ Chineke. N’igbu ya nkenke, o kwughị na Jizọs bụ Chineke.” Ọkà mmụta bụ́ Jason David BeDuhn kwukwara, sị: “N’asụsụ Grik, ọ bụrụ na i tinyeghị ton (ahụ) n’ihu theos n’ahịrịokwu dị ka nke ahụ dị na Jọn 1:1ch, ndị na-agụ ya ga-ewere ya na ihe ị na-ekwu bụ ‘chi.’ . . . Ebe ọ bụ na e tinyeghị ya, o mere ka theos dị nnọọ iche na ho theos, otú ahụ ‘chi’ si dị iche na ‘Chineke’ n’asụsụ Bekee.” BeDuhn kwukwara, sị: “Na Jọn 1:1, Okwu ahụ abụghị otu onye ahụ naanị ya bụ Chineke, kama, ọ bụ chi, ma ọ bụ onye yiri Chineke.” Ma ọ bụ, e kwuo ya otú Joseph Henry Thayer, bụ́ ọkà mmụta so rụọ ọrụ na Baịbụl bụ́ American Standard Version si kwuo ya: “Logos [ma ọ bụ, Okwu] ahụ bụ chi, ọ bụghị Chineke n’onwe ya.”

Ịmata onye Chineke bụ ò kwesịrị ịbụ “oké ihe omimi”? Jizọs echeghị otú ahụ. Mgbe Jizọs na-ekpegara Nna ya ekpere, o mere ka o doo anya na ya na Nna ya dị iche mgbe o kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na anyị ekwere ihe ahụ Jizọs kwuru, ghọtakwa ozizi doro anya nke Baịbụl, anyị ga na-asọpụrụ Jizọs dị ka Ọkpara Chineke nke yiri Chineke. Anyị ga na-efekwa Jehova dị ka “onye naanị ya bụ ezi Chineke.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 19]

Olee ihe mere ozizi Atọ n’Ime Otu ji esi nnọọ ike nghọta?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 19]

Jizọs mere ka o doo anya na ya na Nna ya dị iche

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 19]

Chọọchị dị na Tagnon, France