Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Kara Ndụ Anyị Aka?

À Kara Ndụ Anyị Aka?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

À Kara Ndụ Anyị Aka?

Ụfọdụ ndị na-asị na a kaala ụbọchị anyị ga-anwụ akaa. Ndị ọzọ na-ekwusi ike na Chineke ji aka ya kpebie ụbọchị anyị ga-anwụ. Ndị dị otú ahụ chekwara na mmadụ agaghị agbatali ihe ụfọdụ na-eme ná ndụ ya n’ọsọ. Ọ̀ bụ ihe i chere?

I nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Ya bụrụ eziokwu na anyị agaghị agbanweli akara aka anyị, ya bụrụkwa na Chineke ma ọ bụ akara aka eburula ụzọ kpebie ihe ga-eme anyị, olee uru ọ bara ikpewe ekpere? Ọ bụrụkwa na e burula ụzọ kaa ọdịnihu anyị akaa, olee ihe mere anyị ji ezere ọdachi? Olee ihe mere anyị ji ele anya aka nri na aka ekpe tupu anyị agbafee okporo ụzọ? Oleekwa ihe mere anyị ji ezere iji anya mmanya anya ụgbọala?’

Baịbụl akwadotụghị mmadụ ikwere ụdị ihe ndị ahụ ga-eme ka ọ na-ebi ndụ àna m anwụ anwụ. Kama Baịbụl ịkụzi na a kaala ihe niile akaa, o kwuru na Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha na-ezere ihe ọghọm. Dị ka ihe atụ, e nyere ha iwu ka ha rụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ ha. Ihe mere ha ga-eji eme ya bụ ka mmadụ ghara isi n’elu ụlọ dapụ n’amaghị ama. Oleezi ihe mere Chineke ga-eji nye ụdị iwu ahụ ma ọ bụrụ na a kaala ya akaa na mmadụ ga-esi n’elu ụlọ daa, nwụọ?—Diuterọnọmi 22:8.

Oleekwanụ maka ndị ọdachi na-emere onwe ha gburu ma ọ bụ ndị ihe ọghọm ha na-enweghị ike igbochi gburu? Ọ̀ pụtara na “oge ọnwụ” ha eruola? Mba. Eze Sọlọmọn, onye so dee Baịbụl, mere ka o doo anyị anya na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị [anyị] niile.” (Ekliziastis 9:11) N’ihi ya, otú ọ sọkwara ọdachi ya jọruo ná njọ, a kaghị ya aka.

Ma, ụfọdụ ndị chere na ihe a Sọlọmọn kwuru megidere nke mbụ o kwuru, nke bụ́: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe nwekwara oge: oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ.” (Ekliziastis 3:1, 2) Ma, ihe a Sọlọmọn kwuru ọ̀ pụtara n’ezie na a kara ihe niile aka? Ka anyị lerukwuo okwu ndị ahụ anya.

Sọlọmọn anaghị ekwu na a kara ụbọchị ọmụmụ na ụbọchị ọnwụ ụmụ mmadụ aka. Kama nke ahụ, ihe ọ na-ekwu bụ na otú ahụ ọtụtụ ihe na-emeghachi ugboro ugboro ná ndụ, ọ bụkwa otú ahụ ka a ga na-amụ ndị mmadụ, ha ana-anwụkwa. N’eziokwu, ihe ọma na ihe ọjọọ ga na-eme ná ndụ ụmụ mmadụ. Sọlọmọn kwuru, sị: “E nwere . . . oge ịkwa ákwá na oge ịchị ọchị.” Nsogbu na ọdachi ndị ahụ Sọlọmọn kwuru okwu ha bụcha ihe na-eme ná ndụ ụmụ mmadụ mgbe niile, ya bụ, ha na-eme ‘n’ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe.’ (Ekliziastis 3:1-8; 9:11, 12) Ihe o kwuru n’ikpeazụ bụzi na anyị ekwesịghị ikwe ka ndụ gbalụ gbalụ anyị na-ebi kwa ụbọchị mee ka anyị chefuo Onye kere anyị.—Ekliziastis 12:1, 13.

Ọ bụ eziokwu na ihe niile banyere ndụ na ọnwụ doro Onye kere anyị anya, ọ kaghị ndụ anyị aka. Baịbụl na-akụzi na Chineke nyere anyị niile olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ma, Chineke anaghị amanye anyị amanye inweta ndụ ebighị ebi ahụ. Kama nke ahụ, Okwu ya sịrị: “Onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 22:17.

N’ezie, anyị ga-achọrịrị ‘ịnara mmiri nke ndụ ahụ.’ N’ihi ya, ọ bụghị akara aka na-ekpebi ihe ọdịnihu anyị ga-abụ. Ihe anyị kpebiri ime, àgwà anyị, na otú anyị si eme omume ga-ekpebi ihe ọdịnihu anyị ga-abụ.