Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata na Jizọs Bụ Devid Ka Ukwuu Nakwa Sọlọmọn Ka Ukwuu

Ịmata na Jizọs Bụ Devid Ka Ukwuu Nakwa Sọlọmọn Ka Ukwuu

Ịmata na Jizọs Bụ Devid Ka Ukwuu Nakwa Sọlọmọn Ka Ukwuu

“Lee! e nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.”—MAT. 12:42.

1, 2. Olee ihe mere ọ ga-eji ju ndị mmadụ anya na Chineke gwara Samuel ka o tee Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze?

DEVID adịghị ka onye a ga-eme eze. N’anya Samuel onye amụma, ihe ọ bụ bụ naanị nwa okorobịa na-azụ atụrụ. E wezụga nke ahụ, obodo ya bụ́ Betlehem, abụghị obodo a ma ama. E kwuru na ọ bụ ya “kachasị nta n’obodo ndị dị na Juda.” (Maị. 5:2) Ma, Samuel onye amụma ga-ete nwa okorobịa a e weere na ọ dịghị ihe ọ bụ, nke si n’obere obodo a, mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị Izrel n’ọdịnihu.

2 Nwa okoro ahụ bụ́ Devid abụghị onye mbụ nna ya bụ́ Jesi kpọtaara Samuel ka o tee mmanụ; ọ bụghịkwa ya bụ onye nke abụọ na onye nke atọ ọ kpọtara. Devid, onye bụ́ ọdụdụ nwa n’ime ụmụ nwoke asatọ Jesi mụrụ, anọghị ya mgbe Samuel bịara n’ụlọ ha. Samuel bịara ite otu n’ime ụmụ Jesi, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, mmanụ ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị Izrel. Ma, nke bụ́ isiokwu bụ na ọ bụ Devid ka Jehova họọrọ.—1 Sam. 16:1-10.

3. (a) Olee ihe Jehova na-achọ mgbe ọ na-enyocha mmadụ? (b) Mgbe e tere Devid mmanụ, gịnị malitere ịkpa ike n’ahụ́ ya?

3 Jehova hụrụ ihe Samuel na-ahụghị. Chineke hụrụ otú obi Devid dị, ihe ọ hụrụ masịkwara ya. Ihe dị Chineke mkpa abụghị otú mmadụ dị n’elu ahụ́, kama ọ bụ otú obi onye ahụ dị. (Gụọ 1 Samuel 16:7.) Mgbe Samuel hụrụ na Jehova ahọrọghị ụmụ ndị ikom asaa Jesi, bụ́ ndị nke okenye, o ziri ozi ka a gaa kpọọ ọdụdụ nwa Jesi n’ebe ọ nọ na-azụ atụrụ. Baịbụl sịrị: “[Jesi] wee zie ozi, e wee gaa kpọta [Devid]. Ọ na-acha ọbara ọbara, bụrụ nwa okorobịa anya ya mara mma, nke makwara mma ile anya. Jehova wee sị: ‘Bilie, tee ya mmanụ, n’ihi na ọ bụ onye a!’ Samuel wee were mpi mmanụ ahụ tee ya mmanụ n’etiti ụmụnne ya. Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ Devid malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.”—1 Sam. 16:12, 13.

Devid Sere Onyinyo Kraịst

4, 5. (a) Kwuo ebe ụfọdụ Devid na Jizọs yiri. (b) Olee ihe mere a ga-eji kpọọ Jizọs Devid ahụ Ka Ukwuu?

4 A mụrụ Jizọs na Betlehem mgbe ihe dị ka otu puku afọ na otu narị afọ gafere a mụrụ Devid. N’anya ọtụtụ ndị, Jizọs adịghịkwa ka eze. Ya bụ na ọ bụghị ụdị eze ọtụtụ ndị Izrel nọ na-atụ anya ya. Ma, dịkwa ka ọ dị Devid, ọ bụ Jizọs ka Jehova họọrọ. Jehova hụrụ ya n’anya otú ahụ o si hụ Devid. * (Luk 3:22) ‘Mmụọ Jehova malitekwara ịkpa ike n’ahụ́’ Jizọs.

5 E nwere ọtụtụ ebe Jizọs na Devid yiri. Dị ka ihe atụ, onye ndụmọdụ Devid bụ́ Ahitofel, gbara ya mgba okpuru, ebe onye na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ Judas Iskarịọt raara ya nye. (Ọma 41:9; Jọn 13:18) Ma Devid ma Jizọs nụụrụ ebe a na-anọ efe Jehova ọkụ n’obi nke ukwuu. (Ọma 27:4; 69:9; Jọn 2:17) Jizọs ga-anọ n’ocheeze Devid. Tupu a mụọ Jizọs, otu mmụọ ozi gwara nne ya, sị: “Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya.” (Luk 1:32; Mat. 1:1) Ma, Jizọs karịrị nnọọ Devid n’ihi na nkwa niile e kwere banyere Mesaya mezuru n’ahụ́ Jizọs. Ọ bụ ya bụ Devid ahụ Ka Ukwuu, ya bụ, Eze bụ́ Mesaya, onye a nọ na-atụ anya ya kemgbe ọtụtụ afọ.—Jọn 7:42.

Na-eso Eze ahụ Bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ

6. Olee ihe ndị gosiri na Devid bụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ?

6 Jizọs bụkwa onye ọzụzụ atụrụ. Olee ihe ndị e ji ama ezigbo onye ọzụzụ atụrụ? Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ bụ onye ji obi ike elekọta ìgwè atụrụ ya mgbe niile. Ọ na-enye ha nri, na-echekwa ha nche mgbe niile. (Ọma 23:2-4) Mgbe Devid bụ okorobịa, ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ, o lekọtakwara atụrụ nna ya nke ọma. Mgbe ọdụm, na anụ ọhịa bea, chọrọ ịdọgbu ha, o ji obi ike chebe ha.—1 Sam. 17:34, 35.

7. (a) Olee ihe kwadebere Devid ịrụ ọrụ onye eze? (b) Olee otú Jizọs si gosi na ya bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma?

7 Afọ ndị Devid nọrọ n’ọhịa nakwa n’ugwu na-elekọta atụrụ kwadebere ya ịrụ ọrụ na-adịghị mfe ọ ga-arụ mgbe ọ ga-elekọtawa mba Izrel. * (Ọma 78:70, 71) Jizọs egosikwala na ya bụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. Jehova na-enye ya ume, na-eduzikwa ya ka ọ na-azụ “ìgwè atụrụ nta” ya na “atụrụ ọzọ” ya. (Luk 12:32; Jọn 10:16) N’ezie, Jizọs bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma. Ọ ma ìgwè atụrụ ya nke ọma nke na ọ na-akpọ nke ọ bụla aha. Ọ hụrụ atụrụ ya n’anya nke ukwuu nke na mgbe ọ nọ n’ụwa, o ji onwe ya chụọ àjà n’ihi ha. (Jọn 10:3, 11, 14, 15) Dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma, Jizọs rụrụ ọrụ Devid na-arụlighị. Àjà mgbapụta ọ chụrụ mere ka e nwee ike ịnapụta ụmụ mmadụ n’ọnwụ. Ọ dịghị ihe ga-eme ka ọ kwụsị ịzụ “ìgwè atụrụ nta” ya ruo mgbe ha ga-enweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe, ọ gaghịkwa akwụsị ịzụ “atụrụ ọzọ” ya ruo mgbe ha ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-adị, bụ́ ebe ndị na-akpa àgwà ka nkịta ọhịa na-agaghị anọ.—Gụọ Jọn 10:27-29.

Na-eso Eze ahụ Na-enwe Mmeri

8. Olee ihe mere anyị ga-eji sị na Devid bụ eze na-enwe mmeri?

8 Devid bụ eze bụ́ dike n’agha, nke chebere ala ndị Chineke. ‘Jehova zọpụtakwara ya n’ebe ọ bụla ọ gara.’ Mgbe Devid na-achị, ọ napụtara ọtụtụ ndị iro ha ala. Ala ndị Izrel wee site n’osimiri Ijipt ruo n’osimiri Yufretis. (2 Sam. 8:1-14) Site n’ike Jehova, Devid ghọrọ eze kacha ike n’oge ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “Devid wee malite ide ude n’ala niile, Jehova wee mee ka ụjọ ya jide mba niile.”—1 Ihe 14:17.

9. Kwuo otú Jizọs, bụ́ Onye A Họpụtara Ịbụ Eze, si bụrụ onye mmeri.

9 Dị ka Eze Devid, Jizọs atụghị ụjọ mgbe ọ nọ n’ụwa. Mgbe a họpụtara ya ịbụ eze, o gosiri na ya ka ndị mmụọ ọjọọ ike site n’ịchụpụ ha n’ahụ́ ndị ha na-enye nsogbu. (Mak 5:2, 6-13; Luk 4:36) Ọbụna ajọ onye iro ya, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, enweghị ike n’ebe ọ nọ. Jehova nyeere Jizọs aka ya emerie ụwa a, bụ́ nke dị n’aka Setan.—Jọn 14:30; 16:33; 1 Jọn 5:19.

10, 11. Olee ọrụ Jizọs, onye bụ́ Eze na Onye Agha n’eluigwe, na-arụ?

10 Mgbe ihe dị ka afọ iri isii gafere ka Jizọs laghachiri eluigwe mgbe o bilitere n’ọnwụ, Jọn onyeozi hụrụ ọhụụ banyere ọrụ Jizọs ga-arụ mgbe ọ ga-abụ Eze, bụ́ Onye Agha, n’eluigwe. Jọn dere, sị: “Lee! ịnyịnya ọcha; onye nọ n’elu ya ji ụta; e nyekwara ya okpueze, o wee gaa na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya.” (Mkpu. 6:2) Onye ahụ nọ n’elu ịnyịnya ọcha bụ Jizọs. E ‘nyere ya okpueze’ n’afọ 1914, bụ́ mgbe e chiri ya Eze nke Alaeze eluigwe. Mgbe nke ahụ gachara, “o wee gaa na-emeri.” N’ezie, dị ka Devid nwere mmeri, Jizọs bụ eze na-enwe mmeri. Ka obere oge gara mgbe Jizọs ghọrọ Eze na-achị Alaeze Chineke, o meriri Setan n’agha ma chụdata ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Mkpu. 12:7-9) Ọ ga-anọgide na-agba ịnyịnya ya ma na-enwe mmeri ruo mgbe ‘ọ ga-enwezu mmeri,’ ya bụ, mgbe ọ ga-ebibi usoro ihe ọjọọ Setan kpamkpam.—Gụọ Mkpughe 19:11, 19-21.

11 Jizọs bụ eze nwere ọmịiko ka Devid, ọ ga-echebekwa “oké ìgwè mmadụ” ahụ n’Amagedọn. (Mkpu. 7:9, 14) E wezụga nke ahụ, mgbe Jizọs na otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ a kpọlitere n’ọnwụ ga na-achị, a ga-enwe “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa, ga-enwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. Ihe ga-adịrị ha ezigbo mma n’ọdịnihu. Ka anyị niile kpebisie ike ịnọgide ‘na-eme ihe ọma,’ ka anyị wee dị ndụ mgbe ndị ezi omume, bụ́ ndị nwere obi ụtọ, ndị Devid ahụ Ka Ukwuu ga na-achị, ga-ejupụta n’ụwa.—Ọma 37:27-29.

A Zara Ekpere Sọlọmọn Kpere Ka E Nye Ya Amamihe

12. Gịnị ka Sọlọmọn rịọrọ n’ekpere?

12 Nwa Devid, bụ́ Sọlọmọn, sekwara onyinyo Jizọs. * Mgbe Sọlọmọn ghọrọ eze, Jehova bịakwutere ya ná nrọ wee gwa ya na ya ga-enye ya ihe ọ bụla ọ ga-arịọ ya. Ọ bụrụ na Sọlọmọn chọrọ, ọ gaara arịọ ka o nyekwuo ya akụnụba, ike, ma ọ bụkwanụ ogologo ndụ. Kama ịrịọ ihe ndị a, ọ rịọrọ Jehova ihe ndị ga-abara ma ya ma ndị ọzọ uru. Ọ sịrị: “Nye m amamihe na ihe ọmụma ka m wee na-apụ, na-abata n’ihu ndị a, n’ihi na ònye pụrụ ikpe ndị gị nke a dị ọtụtụ ikpe?” (2 Ihe 1:7-10) Jehova zara Sọlọmọn ekpere ahụ.—Gụọ 2 Ihe E Mere 1:11, 12.

13. Olee ihe mere anyị ga-eji kwuo na mgbe Sọlọmọn dị ndụ, ọ dịghị mmadụ nwere amamihe ka ya, oleekwa ebe o si nweta amamihe ahụ?

13 N’oge niile Sọlọmọn kwesịrị ntụkwasị obi, o nweghị onye maara ihe ka ya n’ime ndị niile ya na ha dịkọrọ ndụ. Sọlọmọn tụrụ “puku ilu atọ.” (1 Eze 4:30, 32, 34) E dere ọtụtụ n’ime ha na Baịbụl, ndị na-achọkwa amamihe ejighị ha egwu egwu. Eze nwaanyị Shiba gara ihe dị ka puku kilomita abụọ na narị anọ iji gaa jụọ Sọlọmọn “ajụjụ ndị na-agbagwoju anya,” ka o wee mara ma Sọlọmọn ò nwere amamihe. Ihe Sọlọmọn kwuru nakwa otú ọchịchị ya si na-aga nke ọma masịrị nwaanyị ahụ. (1 Eze 10:1-9) Baịbụl kwuru ebe Sọlọmọn si nweta amamihe ya. Ọ sịrị: “Ndị niile nọ n’ụwa na-achọkwa ịbịa n’ihu Sọlọmọn ka ha gee ntị n’amamihe ya, nke Chineke tinyere n’obi ya.”—1 Eze 10:24.

Soro Eze ahụ Nwere Amamihe

14. Olee otú Jizọs si bụrụ “onye ka Sọlọmọn”?

14 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ naanị ya bụ mmadụ amamihe ya karịrị nke Sọlọmọn. Jizọs Kraịst kwuru banyere onwe ya, sị: “E nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.” (Mat. 12:42) Jizọs kwuru “okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:68) Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu, ọ kọwakwuru ihe ụfọdụ Sọlọmọn tụrụ n’ilu. Sọlọmọn kwuru ọtụtụ ihe na-eme ka onye na-efe Jehova nwee obi ụtọ. (Ilu 3:13; 8:32, 33; 14:21; 16:20) Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ naanị ihe ndị metụtara ofufe Jehova na mmezu nke nkwa dị iche iche Chineke kwere na-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Mat. 5:3) Ndị na-eme ihe Jizọs kụziri na-abịaru Jehova nso, onye bụ́ “isi iyi nke ndụ.” (Ọma 36:9; Ilu 22:11; Mat. 5:8) Kraịst na-anọchi anya “amamihe nke Chineke.” (1 Kọr. 1:24, 30) Jizọs Kraịst, Eze bụ́ Mesaya, nwere “mmụọ amamihe.”—Aịza. 11:2.

15. Olee otú anyị ga-esi rite uru n’amamihe Chineke?

15 Olee otú anyị, bụ́ ndị na-eso ụzọ Sọlọmọn ahụ Ka Ukwuu, ga-esi rite uru n’amamihe Chineke? Ebe amamihe Jehova dị n’Okwu ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ya, anyị aghaghị iji nlezianya na-amụ Baịbụl. Nke ka nke, anyị ga-amụ ebe ndị ahụ e dere ihe Jizọs kwuru, na-atụgharịkwa uche n’ihe ndị anyị na-amụ. (Ilu 2:1-5) Anyị kwesịkwara ịnọgide na-arịọ Chineke ka o nye anyị amamihe. Okwu Chineke mesiri anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị ejiri ezigbo obi kpee ekpere ka Chineke nyere anyị aka, ọ ga-aza anyị ekpere anyị. (Jems 1:5) Ọ bụrụ na mmụọ nsọ enyere anyị aka, anyị ga-enweta amamihe dị oké ọnụ ahịa dị n’Okwu Chineke, bụ́ nke ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme mgbe anyị nwere nsogbu nakwa mgbe anyị chọrọ ime mkpebi ndị dị mma. (Luk 11:13) A kpọkwara Sọlọmọn, “onye mkpọkọta,” bụ́ onye “na-akụzikwara ndị mmadụ ihe ọmụma mgbe niile.” (Ekli. 12:9, 10) Jizọs, bụ́ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, bụkwa onye mkpọkọta nke ndị ya. (Jọn 10:16; Kọl. 1:18) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-aga ọmụmụ ihe, bụ́ ebe ‘a na-akụziri anyị ihe mgbe niile.’

16. Olee otú Sọlọmọn na Jizọs si yie?

16 Sọlọmọn rụrụ ọtụtụ ihe mgbe ọ bụ eze. O duziri ndị wuru ọtụtụ ihe n’Izrel dum. O duziri ndị wuru obí eze, ndị rụrụ okporo ụzọ dị iche iche, ndị rụrụ ọwara mmiri dị iche iche, ndị wuru obodo niile a na-akwakọba ihe, obodo ụgbọ ịnyịnya, na obodo ndị bụ́ maka ndị na-agba ịnyịnya. (1 Eze 9:17-19) Ihe ndị o wuru baara ndị ọ chịrị uru. Jizọs bụkwa onye na-ewu ihe. O wukwasịrị ọgbakọ ya n’elu ‘oké nkume.’ (Mat. 16:18) Ọ ga-eduzi ihe niile a ga-ewu n’ụwa ọhụrụ.—Aịza. 65:21, 22.

Soro Eze Udo

17. (a) Olee ihe ndị pụrụ iche mere mgbe Sọlọmọn na-achị? (b) Olee ihe ndị Sọlọmọn na-emelighị?

17 Aha ahụ bụ́ Sọlọmọn si n’okwu Hibru nke pụtara “udo.” Eze Sọlọmọn nọ na Jeruselem na-achị. Jeruselem pụtara “Ebe E Nwere Udo Gbara Mkpị.” E nwetụbeghị ụdị udo e nwere n’Izrel mgbe Sọlọmọn chịrị ha afọ iri anọ. Baịbụl kwuru banyere afọ ndị ahụ ọ chịrị, sị: “Juda na Izrel wee na-ebi n’obi iru ala, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, malite na Dan ruo Bia-shiba, n’ụbọchị niile nke Sọlọmọn.” (1 Eze 4:25) N’agbanyeghị amamihe niile Sọlọmọn nwere, ndị ọ na-achị nọgidere na-arịa ọrịa, na-eme mmehie, na-anwụkwa anwụ. Ma, Sọlọmọn ahụ Ka Ukwuu ga-anapụta ndị ọ ga-achị n’aka ihe ndị a niile.—Gụọ Ndị Rom 8:19-21.

18. Olee ngọzi ndị anyị nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst?

18 Taa, udo dị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. N’eziokwu, anyị nọ na paradaịs ime mmụọ. Anyị na Chineke na ndị agbata obi anyị nọ n’udo. Lee ihe Aịzaya buru n’amụma banyere ngọzi ndị anyị nwere taa. Ọ sịrị: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.” (Aịza. 2:3, 4) Anyị ga na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ iji gosi na mmụọ Chineke na-edu anyị.

19, 20. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ?

19 Ma, ọdịnihu ga-aka mma. Mgbe Jizọs ga na-achị ụwa, ụmụ mmadụ ndị na-erube isi ga-anọ nnọọ n’udo otú ha na-anọtụbeghị, ha ga-eji nwayọọ nwayọọ “nwere onwe [ha] pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure,” ruo mgbe ha ga-ezu okè. (Rom 8:21) Ọ bụrụ na ha agafee ule ikpeazụ a ga-ele ha ná ngwụcha Ọchịchị Otu Puku Afọ ahụ, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” (Ọma 37:11; Mkpu. 20:7-10) N’ezie, ọchịchị Kraịst Jizọs ga-akarị ọchịchị Sọlọmọn n’ụzọ na-enweghị atụ.

20 Otú ahụ ụmụ Izrel si nwee ọṅụ mgbe Mozis, Devid, na Sọlọmọn na-edu ha, otú ahụkwa ka anyị ga-enwe ọṅụ, ọbụna karị, mgbe Kraịst ga na-achị ụwa. (1 Eze 8:66) Ekele dịrị Jehova maka izitere anyị Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, onye bụ́ Mozis Ka Ukwuu, Devid Ka Ukwuu, nakwa Sọlọmọn Ka Ukwuu!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 E leghị anya, aha ahụ bụ́ Devid pụtara “Onye A Hụrụ n’Anya.” Mgbe e mere Jizọs baptizim nakwa mgbe o nwoghara, Jehova si n’eluigwe kpọọ ya “Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya.”—Mat. 3:17; 17:5.

^ par. 7 Devid dịkwa ka nwa atụrụ nke tụkwasịrị onye na-azụ ya obi. Ọ tụkwasịrị Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu, bụ́ Jehova, obi na ọ ga-echebe ma duzie ya. O ji obi ike kwuo, sị: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m.” (Ọma 23:1) Jọn Onye Na-eme Baptizim kpọrọ Jizọs “Nwa Atụrụ Chineke.”—Jọn 1:29.

^ par. 12 Ọ dị mma ịmara na aha ọzọ Sọlọmọn nwere bụ Jedidaya, nke pụtara “Onye Jaa Hụrụ n’Anya.”—2 Sam. 12:24, 25.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee otú Jizọs si bụrụ Devid Ka Ukwuu?

• Olee otú Jizọs si bụrụ Sọlọmọn Ka Ukwuu?

• Olee ihe masịrị gị n’ebe Devid Ka Ukwuu, onye bụ́kwa Sọlọmọn Ka Ukwuu nọ?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 31]

Amamihe Chineke nyere Sọlọmọn sere onyinyo amamihe Sọlọmọn ahụ Ka Ukwuu

[Foto dị na peeji nke 32]

Ọchịchị Kraịst Jizọs ga-akarị ọchịchị Sọlọmọn na nke Devid n’ụzọ na-enweghị atụ