Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Meriri Ọnwụnwa

Jizọs Meriri Ọnwụnwa

MAKA NDỊ NA-ETO ETO

Jizọs Meriri Ọnwụnwa

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha.

CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ MATIU 4:1-11.

Kọwaa otú ala ịkpa ahụ Jizọs nọrọ abalị iri anọ dị.

․․․․․

Olee otú i chere olu Onye Ọnwụnwa ahụ dara? Oleekwa otú i chere olu Jizọs dara?

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Olee otú Setan si gosi na ya na-anwa mmadụ mgbe ọ ga-adịrị ya mfe inweta onye ahụ? (Gụgharịa amaokwu nke 2.)

․․․․․

Olee ihe mere Ekwensu ji gosi Jizọs alaeze niile nke ụwa, gosikwa ya “ebube ha”? (Gụgharịa amaokwu nke 8.)

․․․․․

Mgbe Setan na-anwa Jizọs ọnwụnwa, olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere o ji kpebie inye ya ọchịchị?

․․․․․

(a) Olee ihe nke ọ bụla n’ọnwụnwa Setan gosiri banyere otú o si eche echiche? ․․․․․

(b) Ma, gịnị ka nke ọ bụla n’azịza Jizọs gosiri? ․․․․․

MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Mgbe e nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa.

․․․․․

Ụzọ dị iche iche Setan nwere ike isi nwaa anyị.

․․․․․

Otú i nwere ike isi merie ọnwụnwa.

․․․․․

OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․