Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jisienụ Ike Ruo Ntozu Okè n’Ihi na “Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”

Jisienụ Ike Ruo Ntozu Okè n’Ihi na “Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”

Jisienụ Ike Ruo Ntozu Okè n’Ihi na “Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”

“Ka anyị jisie ike ruo ntozu okè.”—HIB. 6:1.

1, 2. Olee otú Ndị Kraịst narị afọ mbụ bi na Jeruselem na Judia si nweta ohere ha ji ‘gbaga n’ugwu’?

MGBE Jizọs nọ n’ụwa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, jụọ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’ Amụma Jizọs buru iji zaa ha ajụjụ ahụ mezuru nke mbụ ya na narị afọ mbụ. Jizọs buru amụma ihe ndị pụrụ iche ga-eme, bụ́ ndị ga-egosi na ọgwụgwụ eruwela. Mgbe ndị nọ na Judia ga-ahụ ihe ndị ahụ, ha ‘ga-amalite ịgbaga n’ugwu.’ (Mat. 24:1-3, 15-22) Ndị na-eso ụzọ Jizọs hà ga-aghọta ihe ịrịba ama ahụ ma mee ihe Jizọs gwara ha?

2 Mgbe ihe na-eruchaghị afọ iri atọ gafere, ya bụ, n’afọ 61 O.A., Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst, bụ́ ndị Hibru bi na Jeruselem, nakwa n’obodo ndị dị ya nso akwụkwọ n’ezoghị ihe ọ bụla ezo. Pọl na Ndị Kraịst ibe ya amaghị na ihe a ga-eji mata mmalite nke “oké mkpagbu” ahụ ga-amalite ime naanị n’ime afọ ise ọzọ. (Mat. 24:21) N’afọ 66 O.A., Cestius Gallus duuru ndị agha Rom gaa ibibi Jeruselem. Ma, na mberede, ha laghachiri azụ, bụ́ ihe mere ka ndị a gaara egbu nweta ohere ha ji gbapụ.

3. Olee ndụmọdụ Pọl nyere Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru, oleekwa ihe mere o ji nye ha ya?

3 Ndị Kraịst ahụ kwesịrị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ka ha wee mara ma ihe ndị ahụ na-eme hà na-emezu ihe Jizọs kwuru, ka ha wee nwee ike ịgbapụ. Ma, ụfọdụ n’ime ha ghọrọ “ndị ntị ike n’ịnụ ihe.” Ha dị ka ụmụ ọhụrụ “mmiri ara” dị mkpa. (Gụọ Ndị Hibru 5:11-13.) Ọbụna ndị ferela Chineke ọtụtụ afọ, na-eme ihe na-egosi na ha ‘ahapụla Chineke dị ndụ.’ (Hib. 3:12) Ụfọdụ ndị ‘na-ahapụkarị’ ịga ọmụmụ ihe n’oge ahụ ụbọchị Jehova “na-eru nso.” (Hib. 10:24, 25) Pọl nyere ha ndụmọdụ dị mkpa. Ọ sịrị: “Ebe anyị hapụworo ozizi ndị mbụ banyere Kraịst, ka anyị jisie ike ruo ntozu okè.”—Hib. 6:1.

4. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya?

4 Anyị bi n’oge ọ fọrọ obere ka amụma Jizọs buru mezuchaa. “Oké ụbọchị Jehova dị nso,” ya bụ, mgbe a ga-ebibi usoro ihe Setan. (Zef. 1:14) Anyị aghaghị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Anyị aghaghịkwa ime ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. (1 Pita 5:8) Ànyị na-eme ihe ndị a n’eziokwu? Ntozu okè ga-eme ka anyị mụrụ anya n’oge a anyị nọ na ya.

Ihe Ntozu Okè Pụtara

5, 6. (a) Olee ihe ndị anyị ga-eme iji tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ? (b) Olee ụzọ ihe abụọ anyị ga-agbalị ime ka anyị wee tozuo okè?

5 Ihe Pọl gbara Ndị Kraịst narị afọ mbụ, bụ́ ndị Hibru, ume ime abụghị naanị ka ha tozuo okè, ọ gwakwara ha ihe ndị ha ga-eme iji tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ. (Gụọ Hibru 5:14.) “Ndị tozuru okè” anaghị aṅụ naanị “mmiri ara.” Ha na-eri “nri siri ike.” N’ihi ya, ha ma “ihe ndị mbụ,” marakwa “ihe ndị miri emi” nke eziokwu Baịbụl. (1 Kọr. 2:10) E wezụga nke ahụ, ha na-azụ ikike nghọta ha, site n’iji ya eme ihe, ya bụ, site n’ime ihe ndị ha mụtara, bụ́ nke na-enyere ha aka ịma ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Mgbe ha chọrọ ikpebi ihe ụfọdụ, ọzụzụ a ha nwetara na-eme ka ha mata ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara mkpebi ahụ ha na-achọ ime na otú ha ga-esi mee ihe kwekọrọ na ha.

6 Pọl dere na ọ “dị mkpa ka anyị mee ka uche anyị dịrị n’ihe anyị nụrụ karịa otú anyị na-eme, ka anyị wee ghara ịkpafu mgbe ọ bụla.” (Hib. 2:1) Ma anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịkpafu wee kwụsị inwe okwukwe. Ihe ga-enyere anyị aka mee ka ụdị ihe a ghara ime anyị bụ ‘ime ka uche anyị dịrị’ n’ihe anyị na-amụ ma anyị na-amụ Baịbụl. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ọ̀ bụ naanị ihe ndị mbụ m mụtara n’Okwu Chineke ka m ka ma? Ò nwere ike ịbụ na ihe m na-eme bụ naanị iso ibe m na-eme ihe ha na-eme, n’ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe? Olee otú m ga-esi nwee ezigbo ọganihu n’ụzọ ime mmụọ?’ E nwere ụzọ ihe abụọ anyị ga-agbalị ime ka anyị wee tozuo okè. Anyị aghaghị ịma Okwu Chineke nke ọma. Anyị kwesịkwara ịna-erube isi.

Mara Okwu Chineke nke Ọma

7. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị amara Okwu Chineke nke ọma?

7 Pọl dere, sị: “Onye na-aṅụ mmiri ara amatabeghị okwu nke ezi omume, n’ihi na ọ bụ nwa ọhụrụ.” (Hib. 5:13) Anyị kwesịrị ịma okwu Chineke na ozi dị na ya nke ọma, ka anyị wee tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ. Ebe ọ bụ na ozi a dị n’ime Okwu ya, bụ́ Baịbụl, anyị kwesịrị ịna-amụsi Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ dị iche iche “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” na-ebipụta ike. (Mat. 24:45-47) Ịmụ Okwu Chineke nke ọma ga-eme ka anyị mara ihe bụ́ uche Chineke, ọ ga-enyekwara anyị aka ịzụ ikike nghọta anyị. Tụlee ihe otu Onye Kraịst aha ya bụ Orchid kwuru. * Ọ sịrị: “Otu n’ime ihe a na-agba anyị ume ka anyị na-eme, bụ́ nke barala m uru nke ukwuu, bụ ịgụchi Baịbụl anya. O were m ihe dị ka afọ abụọ tupu mụ agụchaa Baịbụl dum, ma, o yiri m ka ọ̀ bụ mgbe ahụ ka m matara onye Onye Okike m bụ. M matara banyere ụzọ ya, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya, matakwa na o nwere ike dị ukwuu na amamihe dị ukwuu. Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị nyeere m aka n’oge ndị m nwere nsogbu.”

8. Olee otú Okwu Chineke nwere ike isi kpaa ike n’ahụ́ anyị?

8 Ịgụchi Okwu Chineke anya na-eme ka ozi dị na ya “na-akpa ike” n’ahụ́ anyị. (Gụọ Hibru 4:12.) Ịgụ ya ga-akpụzi ụdị mmadụ anyị bụ ma mee ka anyị na-emekwu ihe na-amasị Jehova. Lee ma ị̀ ga-ewepụtakwu oge ị ga-eji na-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche na ya.

9, 10. Olee ihe ịmata Okwu Chineke nke ọma pụtara? Nye ihe atụ.

9 Ịma Baịbụl nke ọma karịrị ịma ihe Baịbụl kwuru. Ndị ahụ bụ́ ụmụ ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ n’oge Pọl ma ihe ụfọdụ dị n’Okwu Chineke. Ma, ha emeghị ihe ndị ha mụtara na ya ka o wee rụpụta ezigbo ihe. Ha amụtaghị ozi dị na ya nke ọma, bụ́ nke gaara eme ka ha na-eme mkpebi ndị dị mma ná ndụ ha.

10 Mmadụ ịmata Okwu Chineke nke ọma pụtara onye ahụ ịmata ihe o kwuru na ime ihe ọ mụtara na ya. Ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kyle mere na-egosi otú anyị nwere ike isi mee nke a. Kyle na onye ọrụ ha sere okwu. Olee ihe o mere iji dozie esemokwu ahụ? Ọ sịrị: “Otu amaokwu Baịbụl batara m n’obi bụ Ndị Rom 12:18, nke sịrị: ‘ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.’ N’ihi ya, m gwara ya na mụ na ya ga-ahụ ma anyị gbasaa ọrụ.” Okwu ha gara nnọọ nke ọma, onye ọrụ ha ahụ nwekwara obi ụtọ na Kyle bịakwutere ya ka ha kpezie. Kyle sịrị: “M mụtara na anyị agaghị emehie ihe ma anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru.”

Na-erube Isi

11. Olee ihe na-egosi na irube isi anaghị adị mfe n’oge nsogbu?

11 Ime ihe anyị na-amụta n’Akwụkwọ Nsọ anaghị adịcha mfe, karịchaa n’oge nsogbu. Dị ka ihe atụ, mgbe obere oge gafere mgbe Jehova kpọpụtara ụmụ Izrel n’aka ndị Ijipt, bụ́ ndị ji ha mere ndị ohu, ha ‘sesara Mozis okwu’ wee “na-ele Jehova ule.” Gịnị mere ha ji sesa Mozis okwu? Ọ bụ n’ihi na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ. (Ọpụ. 17:1-4) Mgbe ha na Jehova gbachara ndụ, ha ekweta ime “ihe niile Jehova kwuru,” tupu ọnwa abụọ agafee, ha mebiri iwu Jehova wee kpeere arụsị. (Ọpụ. 24:3, 12-18; 32:1, 2, 7-9) À ga-asị na ihe mere ha ji mee nke a bụ na ụjọ bịara ha n’ihi na Mozis nọtere aka n’Ugwu Horeb mgbe ọ gara ịnata Iwu Iri ahụ? Ọ̀ ga-abụ na ha chere na ndị Amalek ga-ebuso ha agha ọzọ, nakwa na ọ dịghị onye ga-enyere ụmụ Izrel aka ebe ọ bụ na Mozis anọghị ya, bụ́ onye weliri aka elu, ha ewee merie ndị Amalek n’agha ha na ha lụrụ? (Ọpụ. 17:8-16) O nwere ike ịbụ n’ihi ihe ndị a, ma ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ụmụ Izrel ‘jụrụ irube isi.’ (Ọrụ 7:39-41) Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha “gbalịsie ike” ka ha ghara “ịdaba n’ụdị nnupụisi ahụ” ụmụ Izrel dabara mgbe ụjọ tụrụ ha ịbanye n’Ala Nkwa ahụ.—Hib. 4:3, 11.

12. Olee otú Jizọs si mụta nrubeisi, oleekwa uru ọ baara ya?

12 Anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike na-erubere Jehova isi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ itozu okè. Dị ka Jizọs Kraịst mere, a na-amụtakarị nrubeisi site n’ịta ahụhụ. (Gụọ Ndị Hibru 5:8, 9.) Jizọs na-erubere Nna ya isi tupu ya abịa n’ụwa. Ma, uche Nna ya o mere n’ụwa mere ka o nweta ahụ́ ụfụ na nchekasị. Ebe ọ bụ na Jizọs rubere isi mgbe ọ tara ahụhụ dị ukwuu, Chineke mere ka o “zuo okè,” n’ihi ọkwá ọhụrụ ọ chọrọ inye ya, ya bụ, ịbụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà.

13. Olee ihe na-egosi na anyị na-erube isi?

13 Oleekwanụ maka anyịnwa? Ànyị ekpebisiela ike irubere Jehova isi ọbụna mgbe anyị nọ n’oké nsogbu? (Gụọ 1 Pita 1:6, 7.) Chineke kwuru hoo haa otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà, kwuokwa na anyị kwesịrị ịna-akwụwa aka ọtọ, na-ekwu okwu dị mma, na-agụ Baịbụl, na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, na-aga ọmụmụ ihe ma na-ekwusa ozi ọma. (Jọsh. 1:8; Mat. 28:19, 20; Efe. 4:25, 28, 29; 5:3-5; Hib. 10:24, 25) Ànyị na-erubere Jehova isi n’ihe ndị a, ọbụna mgbe anyị nwere nsogbu? Anyị na-egosi na anyị etozuola okè ma ọ bụrụ na anyị na-erube isi n’ihe ndị a.

Olee Uru Ntozu Okè Bara?

14. Nye ihe atụ otú ntozu okè nwere ike isi chebe mmadụ.

14 Ọ bụrụ na Onye Kraịst azụọ ikike nghọta ya nke ọma ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, ọ ga-echebe ya n’ụwa a, bụ́ ebe ‘mmehie ndị mmadụ na-adịkwaghị ewute ha.’ (Efe. 4:19) Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwoke aha ya bụ James, bụ́ onye na-agụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl mgbe niile ma jiri ha kpọrọ ihe, na-arụ ọrụ n’ebe ndị niile ya na ha na-arụ ọrụ bụ ụmụ nwaanyị. James kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime ha na-eme omume rụrụ arụ, ma otu n’ime ha yiri onye omume ya dị mma, ya enweekwa mmasị ịmụ Baịbụl. Ma, otu ụbọchị naanị mụ na ya nọ n’ime ụlọ dị n’ụlọ ọrụ anyị, ọ malitere ịdịda m aka. M chere na ọ na-egwu egwu, ma, o siiri m ike ịkwụsị ya. Ozugbo ahụ, m chetara otu ahụmahụ a kọrọ n’Ụlọ Nche banyere otu nwanna nwoke ụdị ọnwụnwa a bịaara n’ụlọ ọrụ ha. Isiokwu ahụ ji Josef na nwunye Pọtịfa mee ihe atụ. * M kwara nwa agbọghọ ahụ aka ozugbo, ya agbapụ.” (Jen. 39:7-12) James nwere obi ụtọ na ihe ọjọọ adapụtaghị n’ihe ahụ merenụ nakwa na akọnuche ya dị ọcha.—1 Tim. 1:5.

15. Olee otú mbọ anyị na-agba iji tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ ga-esi mee ka obi ihe atụ anyị sie ike?

15 Ntozu okè bakwara uru n’ihi na ọ na-eme ka obi ihe atụ anyị sie ike, meekwa ka anyị ghara ịbụ ndị “e ji ozizi ọhụrụ dị iche iche bufuo.” (Gụọ Ndị Hibru 13:9.) Ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ inwe ọganihu ime mmụọ, uche anyị ga-adị ‘n’ihe ndị ka mkpa.’ (Fil. 1:9, 10) Nke a ga-eme ka anyị na-ekelekwu Chineke, meekwa ka anyị nwee obi ụtọ n’ihi ihe niile ọ na-enye anyị maka ọdịmma anyị. (Rom 3:24) Onye Kraịst bụ́ “dimkpa n’ike ịghọta ihe” na-enwe obi ụtọ, ya na Jehova na-adịkwa ná mma.—1 Kọr. 14:20.

16. Olee ihe mere ka obi otu nwanna nwaanyị ‘sie ike’?

16 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Louise kwuru na ihe mere ya ji nọgide na-efe Jehova kemgbe e mechara ya baptizim bụ iji mee ihe ga-adị ndị ọzọ mma. Ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe ọjọọ m na-eme, ma ejighị m obi m dum na-efe Jehova. Ọ bịara doo m anya na o nwere ihe ụfọdụ m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na m chọrọ inwe afọ ojuju n’ife Jehova. Ihe kacha mkpa m ga-eme bụ iji obi m dum na-efe ya.” Mbọ a Louise gbara mere ka ‘obi sie ya ike,’ nke a nyekwaara ya aka mgbe ọ rịara otu nnukwu ọrịa. (Jems 5:8) Louise sịrị, “Ọ dịghịrị m mfe. N’agbanyeghị nke ahụ, m bịaruru Jehova nso.”

‘Ghọọnụ Ndị Si n’Obi Na-erube Isi’

17. Olee ihe mere nrubeisi ji dị nnọọ mkpa na narị afọ mbụ?

17 Ndụmọdụ Pọl nyere Ndị Kraịst ka ha “jisie ike ruo ntozu okè” zọpụtara Ndị Kraịst narị afọ mbụ bi na Jeruselem na Judia. Ndị gere ntị na ndụmọdụ ahụ nwetara amamihe dị n’Okwu Chineke, bụ́ nke mere ka ha ghọta ihe ịrịba ama nke Jizọs kwuru na ha ga-ahụ wee “malite ịgbaga n’ugwu.” Mgbe ha hụrụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu . . . ka o guzo n’ebe nsọ,” ya bụ, mgbe ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu ma banye n’ime ya, ha ma na ọ bụ oge ha kwesịrị ịgbapụ. (Mat. 24:15, 16) Ndị Kraịst gere ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ Jizọs dọrọ ha mgbe o buru amụma banyere otú a ga-esi bibie Jeruselem. Ha si na Jeruselem gbapụ tupu e bibie ya wee gbaga na Pella nke dị n’ógbè Gilied bụ́ ugwu ugwu, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere okpukpe, onye aha ya bụ Eusebius, si kọọ. Nke a mere ka mbibi e bibiri Jeruselem n’ụdị na-enweghị atụ ghara imetụta ha.

18, 19. (a) Gịnị mere nrubeisi ji dị anyị ezigbo mkpa? (b) Olee ihe a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Mmụta anyị mụtara irube isi ka anyị na-agba mbọ iru ntozu okè ga-emekwa ka a zọpụta anyị mgbe amụma ahụ Jizọs buru, ya bụ, na “a ga-enwe oké mkpagbu” a na-enwetụbeghị ụdị ya, ga-emezu. (Mat. 24:21) Ànyị ga-erube isi ná ntụziaka ọ bụla dị mkpa “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi,” ga-enye anyị n’ọdịnihu? (Luk 12:42) Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị ‘ghọọ ndị si n’obi ha na-erube isi.’—Rom 6:17.

19 Anyị ga-azụ ikike nghọta anyị ka anyị wee tozuo okè. Ihe ga-enyere anyị aka ime nke a bụ ịgba mbọ mata Okwu Chineke nke ọma na irubere Chineke isi. Ọ na-esiri ndị na-eto eto ike nke ukwuu iru ntozu okè. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa otú ha ga-esi merie ihe ndị ahụ na-eme ka o siere ha ike.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 14 Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị E Wusiri Ike Ịjụ Ihe Ọjọọ,” nke dị n’Ụlọ Nche nke October 1, 1999.

Olee Ihe Ị Mụtara?

• Olee ihe ntozu okè n’ụzọ ime mmụọ pụtara, oleekwa otú anyị nwere ike isi ruo ya?

• Olee otú ịmara Okwu Chineke nke ọma ga-esi nyere anyị aka itozu okè?

• Olee otú anyị ga-esi na-erube isi?

• Olee ụzọ dị iche iche ntozu okè si abara anyị uru?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 10]

Ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka anyị mara ihe anyị kwesịrị ime mgbe nsogbu bịaara anyị

[Foto dị na peeji nke 12, 13]

Ntị Ndị Kraịst oge mbụ ṅara na ndụmọdụ Jizọs zọpụtara ha