Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”

Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”

Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”

“Ọ̀ bụ na ha niile abụghị ndị mmụọ na-ejere ọha mmadụ ozi, ndị e zipụrụ ijere ndị ga-eketa nzọpụta ozi?”—HIB. 1:14.

1. Olee otú Matiu 18:10 nakwa Ndị Hibru 1:14 si akasi anyị obi?

JIZỌS KRAỊST dọrọ ndị ọ bụla ga-anwa anwa mee ka ndị na-eso ụzọ ya sụọ ngọngọ aka ná ntị, sị: “Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta anya; n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.” (Mat. 18:10) Pọl onyeozi dere banyere ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ọ̀ bụ na ha niile abụghị ndị mmụọ na-ejere ọha mmadụ ozi, ndị e zipụrụ ijere ndị ga-eketa nzọpụta ozi?” (Hib. 1:14) Nke a na-emesi anyị obi ike na Chineke ji ndị mmụọ ozi na-enyere ndị mmadụ aka. Gịnị ka Baịbụl gwara anyị banyere ndị mmụọ ozi? Olee otú ha si enyere anyị aka? Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka ha?

2, 3. Olee ụfọdụ ọrụ ndị mmụọ ozi na-arụ?

2 E nwere nde kwuru nde ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi n’eluigwe. Ha niile ‘dị ike nke ukwuu, na-eme ihe Chineke kwuru.’ (Ọma 103:20; gụọ Mkpughe 5:11.) Ndị mmụọ ozi ndị a nwere ọchịchọ nakwa àgwà dị iche iche yiri àgwà Chineke, ha nwekwaara onwe ha ịhọrọ ihe ha chọrọ ime. A haziri ha nke ọma, Chineke nyekwara ha ọkwa dị iche iche. Onyeisi ndị mmụọ ozi bụ Maịkel (nke bụ́ aha Jizọs na-aza n’eluigwe). (Dan. 10:13; Jud 9) Onye a bụ́ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke” bụ “Okwu ahụ,” ma ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru Chineke, bụ onye Jehova si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile.—Kọl. 1:15-17; Jọn 1:1-3.

3 Ndị seraf nọ n’okpuru onyeisi ndị mmụọ ozi. Ha na-eme ka a mara na Jehova dị nsọ, na-enyekwara ndị ohu Chineke aka ime uche Jehova. E nwekwara ndị cherọb, bụ́ ndị na-akwado ọchịchị ya. (Jen. 3:24; Aịza. 6:1-3, 6, 7) Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ, ma ọ bụ ndị ozi, na-eme uche Chineke n’ụzọ dị iche iche.—Hib. 12:22, 23.

4. Olee ihe ndị mmụọ ozi mere mgbe a tọrọ ntọala ụwa? Oleekwa otú ndụ ndị mmadụ gaara adị ma a sị na ha ji onyinye Chineke nyere ha, nke bụ́ ịhọrọ ihe ha chọrọ ime, mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

4 Ndị mmụọ ozi niile ṅụrịrị ọṅụ mgbe a “tọrọ ntọala ụwa.” Ha jikwa ọṅụ na-arụ ọrụ e nyere ha iji mee ka ebe a mara mma pụrụ iche ghọọ ebe obibi ụmụ mmadụ. (Job 38:4, 7) N’agbanyeghị na Jehova kere mmadụ “ka ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi,” o kere ya “n’onyinyo” ya, nke mere ka mmadụ nwee àgwà dị iche iche mara mma Onye kere ya nwere. (Hib. 2:7; Jen. 1:26) A sị na Adam na Iv ji onyinye Chineke nyere ha, nke bụ́ ịhọrọ ihe ha chọrọ ime, mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ha na ụmụ ha gaara anọgide na-ebi ndụ na paradaịs ma soro n’ezinụlọ Chineke, nke gụnyere nke dị n’eluigwe na nke dị n’ụwa.

5, 6. Olee otú e si nupụrụ Chineke isi n’eluigwe, oleekwa ihe Chineke mere?

5 O doro anya na o wutere ndị mmụọ ozi nke ukwuu mgbe onye so n’ezinụlọ Chineke nupụụrụ Chineke isi. Otu onye n’ime ha achọghịzi iji obi ụtọ na-eto Jehova, kama, ọ chọrọ ka e fewe ya ofufe. O mere onwe ya Setan (nke pụtara “Onye Nguzogide”) site n’ikwu na otú Jehova si achị adịghị mma nakwa site n’iji nkamanya gbalịa ịmalite ọchịchị na-emegide ọchịchị Chineke. Mgbe Setan ghara ụgha mbụ a ghara n’ụwa, o ji aghụghọ mee ka di na nwunye mbụ soro ya nupụrụ Onye kere ha isi, bụ́ onye hụrụ ha n’anya.—Jen. 3:4, 5; Jọn 8:44.

6 Jehova kpere Setan ikpe n’egbughị oge wee buo amụma mbụ e buru na Baịbụl, sị: “M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.” (Jen. 3:15) Iro ga na-adị n’etiti Setan na “nwaanyị” Chineke. N’ezie, Jehova weere ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’eluigwe dị ka nwunye ọ hụrụ n’anya. Amụma a mere ka e nwee olileanya, n’agbanyeghị na ọ bụ “ihe nzuzo dị nsọ” nke a ga-eji nke nta nta mee ka a mara ihe ọ pụtara. Nzube Chineke bụ na otu onye n’ime ndị ezinụlọ ya n’eluigwe ga-egwepịa ndị niile na-enupụrụ Chineke isi nakwa na a ga-esi n’aka onye ahụ chịkọta “ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.”—Efe. 1:8-10.

7. Gịnị ka ndị mmụọ ozi ụfọdụ mere mgbe Noa nọ ndụ, gịnịkwa ka Jehova mere ha?

7 Mgbe Noa nọ ndụ, ọtụtụ ndị mmụọ ozi hapụrụ “ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” wee bịa n’ụwa nwoghaa onwe ha iji nweta ihe ụtọ ha na-ekwesịghị inweta. (Jud 6; Jen. 6:1-4) Jehova tụbara ndị nnupụisi ahụ n’oké ọchịchịrị, nke mere ka ha na Setan ghọọ “ìgwè ndị mmụọ ọjọọ” nakwa ezigbo ndị iro nke ndị ohu Chineke.—Efe. 6:11-13; 2 Pita 2:4.

Olee Otú Ndị Mmụọ Ozi Si Enyere Anyị Aka?

8, 9. Olee otú Jehova sirila jiri ndị mmụọ ozi nyere ndị mmadụ aka?

8 Ebreham, Jekọb, Mozis, Jọshụa, Aịzaya, Daniel, Jizọs, Pita, Jọn, na Pọl so ná ndị ndị mmụọ ozi jeere ozi. Ndị mmụọ ozi ndị kwesịrị ntụkwasị obi mere ihe Chineke kpere n’ikpe, kpugheere ndị amụma amụma dị iche iche, nyekwa ntụziaka dị iche iche, nakwa Iwu Mozis. (2 Eze 19:35; Dan. 10:5, 11, 14; Ọrụ 7:53; Mkp. 1:1) Ebe ọ bụ na e dechaala Okwu Chineke, ya ezuo ezu, o nwere ike Chineke agaghị na-ezi ndị mmụọ ozi ozi ka ha zie anyị. (2 Tim. 3:16, 17) N’agbanyeghị na anyị anaghị ahụ ndị mmụọ ozi anya, ha na-arụsi ọrụ ike, na-eme uche Chineke ma na-akwado ndị ohu ya.

9 Baịbụl na-emesi anyị obi ike, sị: “Mmụọ ozi Jehova na-ama ụlọikwuu gburugburu ndị na-atụ egwu ya, ọ na-anapụtakwa ha.” (Ọma 34:7; 91:11) Jehova na-ahapụ Setan ka ọ nwaa anyị ụdị ọnwụnwa dị iche iche n’ihi na Setan kwuru na anyị ga-enupụrụ Chineke isi ma ọnwụnwa bịara anyị. (Luk 21:16-19) Ma, Chineke ma otú anyị ga-ediru ọnwụnwa, ya edoo anya na anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13.) Ya bụrụ uche Chineke ịnapụta anyị, ndị mmụọ ozi mụ anya mgbe niile ịgbatara anyị ọsọ enyemaka. Ha napụtara Shedrak, Mishak, Abednego, Daniel, na Pita, ma ha anapụtaghị Stivin na Jems n’aka ndị iro gburu ha. (Dan. 3:17, 18, 28; 6:22; Ọrụ 7:59, 60; 12:1-3, 7, 11) Ọnọdụ ha nọ na ya na ihe ndị mere ha dị iche na nke ndị nke ọzọ. N’otu aka ahụ, e gburu ụfọdụ n’ime ụmụnna anyị n’oge ndị Nazi tụrụ ha mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ, ma Jehova ekweghị ka e gbuo ọtụtụ n’ime ha.

10. E wezụga aka ndị mmụọ ozi na-enyere anyị, olee ebe ọzọ anyị nwere ike isi nweta enyemaka?

10 Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị na onye ọ bụla nọ n’ụwa nwere mmụọ ozi na-echebe ya. Anyị na-ekpe ekpere ma nwee obi ike na “ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ [Chineke] dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Ọ bụ eziokwu na Jehova nwere ike izi mmụọ ozi ka ọ bịa nyere anyị aka, ma, anyị nwere ike isi n’ebe ọzọ nweta enyemaka. Jehova nwere ike ịkpali ụmụnna anyị ka ha nyere anyị aka ma ọ bụkwanụ kasie anyị obi. Chineke nwere ike inye anyị amamihe na ike anyị ga-eji na-edi “ogwu” na-adụ anyị n’anụ ahụ́, bụ́ nke na-eme ka à ga-asị na ‘mmụọ ozi Setan na-ama anyị ụra.’—2 Kọr. 12:7-10; 1 Tes. 5:14.

Ṅomie Jizọs

11. Olee otú Jehova si jiri ndị mmụọ ozi nyere Jizọs aka, gịnịkwa ka isi o rubeere Chineke rụpụtara?

11 Tụlee otú Jehova si jiri ndị mmụọ ozi nyere Jizọs aka. Ha gwara ndị mmadụ mgbe a mụrụ Jizọs nakwa mgbe o bilitere n’ọnwụ. Ha jekwaara ya ozi mgbe ọ nọ n’ụwa. A si na ndị mmụọ ozi chọrọ, ha gaara eme ka a ghara ijide Jizọs, hụkwa na ndị ahụ obi tara mmiri egbughị ya. Kama nke ahụ, e zitere otu mmụọ ozi ka o mee ka ọ dị ike. (Mat. 28:5, 6; Luk 2:8-11; 22:43) Jizọs mere ihe kwekọrọ ná nzube Jehova, ya bụ, iji ndụ ya chụọ àjà, wee gosi na mmadụ zuru okè nwere ike iguzosi ike n’ezi ihe, n’agbanyeghị ule siri ike bịaara ya. Ya mere, Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ wee nye ya “ikike niile,” meekwa ka ndị mmụọ ozi nọrọ n’okpuru ya. (Mat. 28:18; Ọrụ 2:32; 1 Pita 3:22) Nke a mere ka Jizọs bụrụ “mkpụrụ” bụ́ isi nke “nwaanyị” Chineke.—Jen. 3:15; Gal. 3:16.

12. Olee otú anyị ga-esi ṅomie ihe nlereanya ọma Jizọs setịpụụrụ anyị?

12 Jizọs ma na ya ekwesịghị ile Jehova ule site n’iche na ndị mmụọ ozi ga-anapụta ya ma ya mee ihe ga-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ. (Gụọ Matiu 4:5-7.) Ya mere, ka anyị ṅomie ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ anyị site n’ibi ndụ “n’uche zuru okè” ma ghara ime ihe ga-etinye ndụ anyị n’ihe ize ndụ. N’agbanyeghị nke a, anyị ga-eji obi ike na-edi mkpagbu.—Taị. 2:12.

Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Ndị Mmụọ Ozi Kwesịrị Ntụkwasị Obi

13. Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị e kwuru okwu ha na 2 Pita 2:9-11?

13 Pita onyeozi kwuru banyere ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị mgbe ọ na-abara ndị “na-ekwujọ” ndị ohu Jehova e tere mmanụ mba. ‘N’ihi ùgwù ndị mmụọ ozi na-akwanyere Jehova,’ ha emeghị onwe ha ndị ikpe wee bo ndị ajọ omume ebubo, n’agbanyeghị na ha dị ike nke ukwuu. (Gụọ 2 Pita 2:9-11.) Ka anyị ghara ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe otú na-ekwesịghị ekwesị, ka anyị na-asọpụrụ ndị e nyere ọrụ ilekọta ọgbakọ, ka anyị hapụkwara Jehova ikpe, bụ́ Onye ikpe kacha ndị ikpe niile.—Rom 12:18, 19; Hib. 13:17.

14. Olee otú ndị mmụọ ozi si egosi anyị otú anyị ga-esi jiri obi umeala na-ejere Jehova ozi?

14 Ndị mmụọ ozi Jehova na-egosi anyị otú anyị kwesịrị isi na-eji obi umeala na-ejere Jehova ozi. E nwere ndị mmụọ ozi na-ekweghị agwa ndị mmadụ aha ha. (Jen. 32:29; Ikpe 13:17, 18) N’agbanyeghị na e nwere nde kwuru nde ndị mmụọ ozi n’eluigwe, Baịbụl kwuru naanị aha Maịkel na Gebriel. Nke a ga-eme ka anyị ghara inye ndị mmụọ ozi ùgwù anyị na-ekwesịghị inye ha. (Luk 1:26; Mkpu. 12:7) Mgbe Jọn onyeozi dara n’ala ka o fee otu mmụọ ozi ofufe, mmụọ ozi ahụ dụrụ ya ọdụ sị: “Kpachara anya! Emela ya! Abụ m naanị ohu ibe gị na ohu ụmụnna gị.” (Mkpu. 22:8, 9) Ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ife ofufe, kpekuokwa ekpere.—Gụọ Matiu 4:8-10.

15. Olee otú ndị mmụọ ozi si na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-enwe ndidi?

15 Ndị mmụọ ozi na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-enwe ndidi. N’agbanyeghị na ọ na-agụsi ha agụụ ike ịmata ihe nzuzo dị iche iche banyere Chineke, ha amaghị ha niile. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ na-agụ ndị mmụọ ozi agụụ inyoba anya n’ihe ndị a.” (1 Pita 1:12) Gịnịkwanụ ka ha na-eme? Ha na-enwe ndidi chere ruo mgbe Chineke mere ka a ‘mara amamihe ya dịgasị iche iche site n’ọgbakọ ya.’—Efe. 3:10, 11.

16. Olee ihe àgwà anyị ga-akpali ndị mmụọ ozi ime?

16 Ndị Kraịst ọnwụnwa dakwasịrị bụ ‘ihe nkiri n’ebe a na-eme ihe ngosi n’anya ndị mmụọ ozi.’ (1 Kọr. 4:9) Obi na-adị ndị mmụọ ozi ụtọ ma ha hụ na anyị kwesịrị ntụkwasị obi, ha na-aṅụrịkwa ọṅụ ma onye mmehie chegharịa. (Luk 15:10) Ndị mmụọ ozi na-ahụkwa ezi omume nke ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst na-eme. Baịbụl kwuru na ‘nwaanyị kwesịrị inwe ihe àmà n’isi ya, nke na-egosi na ọ nọ n’okpuru ndị ikom, n’ihi ndị mmụọ ozi.’ (1 Kọr. 11:3, 10) N’ezie, ọ na-amasị ndị mmụọ ozi ịhụ ka ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst, na ndị niile bụ ndị ohu Chineke n’ụwa, na-erube isi. Nke a na-echetara ụmụ Chineke ndị a nọ n’eluigwe na ha kwesịrị ịna-erube isi.

Ndị Mmụọ Ozi Na-akwadosi Ikwusa Ozi Ọma Ike

17, 18. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na ndị mmụọ ozi na-akwado ozi ọma anyị na-ekwusa?

17 Aka ndị mmụọ ozi dị n’ụfọdụ ihe ndị dị oké mkpa na-eme “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” Ụfọdụ n’ime ihe ndị a bụ ọmụmụ a mụrụ Alaeze Chineke n’afọ 1914 nakwa nchụda “Maịkel na ndị mmụọ ozi ya” si n’eluigwe chụdata Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mkpu. 1:10; 11:15; 12:5-9) Jọn onyeozi hụrụ otu mmụọ ozi “ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe, o nwekwara ozi ọma ebighị ebi nke bụ́ ozi obi ụtọ ọ ga-ezisara ndị bi n’ụwa.” Mmụọ ozi ahụ sịrị: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe si n’aka ya eruwo, n’ihi ya, feenụ Onye ahụ nke kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri niile.” (Mkpu. 14:6, 7) Nke a na-egosi na ndị mmụọ ozi na-akwado ndị ohu Jehova ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ Chineke guzobere n’eluigwe, n’agbanyeghị mmegide dị egwu Ekwensu na-emegide ha.—Mkpu. 12:13, 17.

18 Taa, ndị mmụọ ozi anaghị eduru anyị gakwuru ndị nwere ezi obi site n’ịgwa anyị okwu otú ahụ otu mmụọ ozi si gwa Filip okwu, wee gosi ya ọnaozi Itiopia. (Ọrụ 8:26-29) Ma, ọtụtụ ihe ndị na-eme n’oge a na-egosi na n’agbanyeghị na anyị anaghị ahụ ndị mmụọ ozi anya, ha na-akwado ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa ma na-eduga anyị na nke ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi.” * (Ọrụ 13:48) Ịgachi ozi ọma anya dị ezigbo mkpa ka anyị wee rụọ ọrụ nke dịịrị anyị, ya bụ, ịchọta ndị chọrọ ‘ife Chineke n’ime mmụọ na n’eziokwu.’—Jọn 4:23, 24.

19, 20. Olee ọrụ ndị mmụọ ozi na-arụ n’oge ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe a’?

19 Mgbe Jizọs na-ekwu okwu banyere oge anyị, ọ sịrị na “n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a,” ndị mmụọ ozi ‘ga-ekewapụ ndị ajọ omume n’etiti ndị ezi omume.’ (Mat. 13:37-43, 49) Ndị mmụọ ozi ga-eso chịkọta ndị ikpeazụ n’ime ndị e tere mmanụ, kaakwa ha akara. (Gụọ Matiu 24:31; Mkp. 7:1-3) Ihe ọzọkwa bụ na ndị mmụọ ozi na Jizọs ‘ga-ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ.’—Mat. 25:31-33, 46.

20 A ga-ala ndị niile “na-amaghị Chineke, na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs” n’iyi “mgbe a ga-ekpughe Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike.” (2 Tes. 1:6-10) Mgbe Jọn hụrụ otu ihe ahụ n’ọhụụ, o kwuru na Jizọs na ndị mmụọ ozi ndị nọ n’eluigwe gba ọtụtụ ịnyịnya ọcha na-alụ agha n’ezi omume.—Mkpu. 19:11-14.

21. Olee ihe mmụọ ozi ahụ “ji mkpịsị ugodi nke abis na agbụ ígwè dị ukwuu n’aka” ya ga-eme Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya?

21 Jọn hụkwara “otu mmụọ ozi ka o si n’eluigwe na-agbadata. O ji mkpịsị ugodi nke abis na agbụ ígwè dị ukwuu n’aka ya.” Mmụọ ozi a bụ onyeisi ndị mmụọ ozi, bụ́ Maịkel, bụ́ onye ga-eke Ekwensu agbụ ma tụba ya n’abis, tụbakwa ndị mmụọ ọjọọ, ma eleghị anya. A ga-atọhapụtụ ha ná ngwụcha nke Ọchịchị Otu Puku Afọ Kraịst, bụ́ mgbe a ga-ele ụmụ mmadụ zuru okè ule ikpeazụ. Nke ahụ gachaa, a ga-ebibi Setan na ndị ọzọ niile na-enupụrụ Chineke isi. (Mkpu. 20:1-3, 7-10; 1 Jọn 3:8) Otu a ka a ga-esi kpochapụ ndị nnupụisi niile.

22. Olee otú ndị mmụọ ozi ga-esi tinye aka n’ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-ele ọrụ ha anya?

22 Oge eruwela nnọọ mgbe a ga-azọpụta ndị mmadụ n’ajọ usoro ihe Setan. Ndị mmụọ ozi ga-arụ ọrụ dị mkpa mgbe ihe ndị a ga-eme iji gosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị, meekwa ka nzube ya banyere ụwa na ụmụ mmadụ mezuo. Ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi bụ n’ezie “ndị mmụọ na-ejere ọha mmadụ ozi, ndị e zipụrụ ijere ndị ga-eketa nzọpụta ozi.” Ya mere, ka anyị kelee Jehova Chineke maka otú o si eji ndị mmụọ ozi na-enyere anyị aka ime uche ya, nke ga-eme ka anyị keta ndụ ebighị ebi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Gụọ akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 549-551.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú e si hazie ndị mmụọ ozi?

• Gịnị ka ndị mmụọ ozi ụfọdụ mere n’oge Noa nọ ndụ?

• Olee otú Chineke si eji ndị mmụọ ozi enyere anyị aka?

• Olee ọrụ ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-arụ n’oge anyị a?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 21]

Ime uche Chineke na-enye ndị mmụọ ozi ọṅụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị mmụọ ozi mụ anya mgbe niile ịgbatara anyị ọsọ enyemaka, ma ọ bụrụ uche Chineke, dị ka ihe mere ná ndụ Daniel na-egosi

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Nwee obi ike, n’ihi na ndị mmụọ ozi na-akwado ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa!

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụwa: Foto si n’aka NASA