Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-agwa Onye Agbata Obi Gị Eziokwu

Na-agwa Onye Agbata Obi Gị Eziokwu

Na-agwa Onye Agbata Obi Gị Eziokwu

“Ebe unu hapụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.”—EFE. 4:25.

1, 2. Olee otú ọtụtụ ndị si ele eziokwu anya?

ỌDỊLA anya ụmụ mmadụ kwuwere na ọ dịghị onye na-ekwu eziokwu. Na narị afọ nke isii T.O.A., onye Grik na-ede uri, bụ́ Alcaeus, kwuru, sị: “Eziokwu dị ná mmanya.” Ihe ọ na-ekwu bụ na ọ bụ mgbe mmadụ ṅụrara anya ka ọ na-ekwu eziokwu, ma ọ bụ, ka ọ na-achọ ikwu okwu. Na narị afọ mbụ, otu Gọvanọ bụ onye Rom, bụ́ Pọntiọs Paịlet, gosiri na ya amaghị ihe bụ́ eziokwu mgbe o ji nlelị jụọ Jizọs, sị: “Gịnị bụ eziokwu?”—Jọn 18:38.

2 Taa, e nwere otú dị iche iche e si akọwa ihe bụ́ eziokwu. Ọtụtụ ndị anaghị ekwucha ihe bụ́ eziokwu mgbe ha na-ekwu okwu, ebe ndị ọzọ na-anaghị ekwu eziokwu ncha ncha. Ndị ọzọ na-ekwu eziokwu naanị mgbe ọ na-agaghị etinye ha na nsogbu ma ọ bụkwanụ mgbe ọ ga-abara ha uru. Otu akwụkwọ nke na-ekwu na ịgha ụgha dị mkpa, sịrị: “Ọ bụ ezie na ikwu eziokwu dị mma, ma, o nweghị uru ọ baara onye na-agba mbọ n’oge a ịkpata ihe ọ ga-eri. O nweghị ihe mmadụ ga-eme banyere ya, onye chọrọ ịdị ndụ ga-agharịrị ụgha.”

3. Olee ihe mere Jizọs ji bụrụ nnọọ ezigbo ihe nlereanya n’ihe banyere ikwu eziokwu?

3 Ma, ndị na-eso ụzọ Kraịst na-ele ya anya dị iche. Jizọs eleghị eziokwu anya otú ndị a e kwuru okwu ha ná mmalite si ele ya. Ọ na-ekwu eziokwu mgbe niile. Ọbụna ndị iro ya kwetara nke a. Ha sịrị: “Onye Ozizi, anyị maara na ị na-ekwu eziokwu, ị na-ezikwa ụzọ Chineke n’eziokwu.” (Mat. 22:16) Taakwa, ezigbo Ndị Kraịst na-eṅomi Jizọs. Ha na-ekwu eziokwu mgbe niile. Ha ji obi ha dum kwere ihe Pọl onyeozi kwuru mgbe ọ dụrụ ụmụnna ya ọdụ, sị: “Ebe unu hapụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Efe. 4:25) Ka anyị tụlee ihe atọ dị n’okwu Pọl. Nke mbụ, ònye bụ onye agbata obi anyị? Nke abụọ, gịnị ka ikwu eziokwu pụtara? Nke atọ, olee otú anyị ga-esi na-ekwu eziokwu kwa ụbọchị?

Ònye Bụ Onye Agbata Obi Anyị?

4. Olee otú Jizọs si ṅomie Jehova n’ihe banyere onye bụ́ onye agbata obi, bụ́ nke dị iche n’otú ndị ndú ndị Juu na narị afọ mbụ si lee okwu ahụ anya?

4 Na narị afọ mbụ, ụfọdụ ndị ndú ndị Juu na-akụziri ndị mmadụ na ọ bụ naanị ndị Juu ibe ha na ezigbo ndị enyi ha ruru eru ịbụ “ndị agbata obi” ha. Ma, Jizọs ṅomiri nnọọ àgwà Nna ya, cheekwa echiche ka Nna ya. (Jọn 14:9) O gosiri ndị na-eso ụzọ ya na Chineke ahụghị otu agbụrụ ma ọ bụ mba n’anya karịa ọzọ. (Jọn 4:5-26) Mmụọ nsọ mekwara ka Pita onyeozi mata na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:28, 34, 35) N’ihi ya, anyị kwesịrị iwere onye ọ bụla ka onye agbata obi anyị. Anyị kwesịdịrị ịhụ ndị iro anyị n’anya.—Mat. 5:43-45.

5. Gịnị ka ịgwa onye agbata obi anyị eziokwu pụtara?

5 Ma, gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru na anyị kwesịrị ịna-agwa ndị agbata obi anyị eziokwu? Ikwu eziokwu pụtara ikwu ihe mere eme, na-agaghị chọwa otú ị ga-esi ghọgbuo onye ị na-agwa okwu. Ezigbo Ndị Kraịst ekwesịghị ịgbagọ okwu iji duhie ndị ọzọ. Ha ‘kpọrọ ihe ọjọọ asị, na-ejidesikwa ezi ihe ike.’ (Rom 12:9) Anyị kwesịrị ịna-eṅomi “Chineke nke eziokwu” site n’ịna-ekwu eziokwu, na-emekwa ihe n’eziokwu. (Ọma 15:1, 2; 31:5) Ọ bụrụ na anyị na-akpachara anya n’ihe anyị na-ekwu, anyị nwere ike iji amamihe dozie nsogbu ma ọ bụ ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ihere mee anyị n’agaghị ghọwa aghụghọ.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:9, 10.

6, 7. (a) Ikwu eziokwu ọ̀ pụtara na anyị ga-agwa onye ọ bụla jụrụ anyị ajụjụ ihe niile? Kọwaa. (b) Olee ndị anyị nwere ike ịkọrọ ihe niile?

6 Ịgwa ndị ọzọ eziokwu ọ̀ pụtara na anyị ga na-agwa onye ọ bụla jụrụ anyị ajụjụ ihe niile anyị ma? Mba. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na e nwere ndị a na-ekwesịghị ịgwa ihe ụfọdụ. Mgbe ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị ihu abụọ, jụrụ ya ebe o si nweta ikike o ji na-eme ihe ịrịba ama ma na-arụ ọrụ ebube, ọ sịrị: “Aga m ajụ unu otu ajụjụ. Zaanụ m ya, m ga-agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.” Mgbe ndị odeakwụkwọ na ndị okenye jụrụ ịza ya ajụjụ ya, Jizọs sịrị: “M gaghịkwa agwa unu ikike m ji eme ihe ndị a.” (Mak 11:27-33) O kweghị aza ha ajụjụ ha n’ihi na ha bụ ndị arụrụala, ha enweghịkwa okwukwe. (Mat. 12:10-13; 23:27, 28) Taa, ndị Jehova kwesịkwara ịkpachara anya banyere ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị mmadụ ọjọọ, bụ́ ndị na-eji aghụghọ agbalị ịchọpụta ihe ụfọdụ ha ga-eji megide anyị.—Mat. 10:16; Efe. 4:14.

7 Pọl kwukwara na e nwere ndị a na-ekwesịghị ịkọrọ ihe niile. Ọ sịrị na “ndị asịrị na ndị na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha . . . na-ekwu okwu banyere ihe ha na-ekwesịghị ikwu.” (1 Tim. 5:13) N’eziokwu, ndị na-etinye anya n’ihe na-agbasaghị ha, ma ọ bụkwanụ ndị a na-enweghị obi ike na ha ga-ezochili ihe a na-ezo ezo, nwere ike ịchọpụta na e nwere ihe ndị ọzọ na-anaghị achọ ịkọrọ ha. Ọ ga-akacha mma ma anyị ṅaa ntị na ndụmọdụ Pọl ji ike mmụọ nsọ nye anyị. Ọ sịrị: “Kpebiekwa ibi ndụ n’ụzọ dị nwayọọ na ilekwasị anya n’ihe unu na-eme.” (1 Tesa. 4:11) Ma, mgbe ụfọdụ, ndị okenye nwere ike ịjụ anyị ihe ụfọdụ gbasara anyị ka ha wee nwee ike ịrụ ọrụ e nyere ha. Mgbe ha bịara maka nke a, ọ ga-amagbu onwe ya ma anyị gwa ha eziokwu n’ihi na nke a ga-enye ezigbo aka.—1 Pita 5:2.

Na-agwanụ Ndị Ezinụlọ Unu Eziokwu

8. Olee otú ikwu eziokwu si enyere ndị ezinụlọ aka ịdị n’otu?

8 Ọ bụ ndị ezinụlọ anyị kacha nọrọ anyị nso. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na ha na-adị ná mma, anyị ga na-agwa ha eziokwu. Anyị na ndị ezinụlọ anyị agaghị na-enwekarị nsogbu na nghọtahie ma ọ bụrụ na anyị na-agwarịta ibe anyị eziokwu, jirikwa obiọma na-agwa ha okwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị emejọọ ihe, ọ̀ na-esiri anyị ike ikweta n’ihu di ma ọ bụ nwunye anyị ma ọ bụ ụmụ anyị, ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị ndị ọzọ, na anyị mejọrọ ihe? Ịrịọ ezigbo mgbaghara na-eme ka udo dị n’ezinụlọ, ọ na-emekwa ka ezinụlọ dịrị n’otu.—Gụọ 1 Pita 3:8-10.

9. Olee ihe mere na ikwu eziokwu apụtaghị na anyị ga na-ekwu okwu otú masịrị anyị ma ọ bụkwanụ na-akparị ndị ọzọ?

9 Na anyị ga na-ekwu eziokwu apụtaghị na anyị ga na-edowe ọnụ otú ọ bụla masịrị anyị na-ekwu okwu. Ndị mmadụ anaghị akwanyere onye na-ekwu okwu mkparị ùgwù, ọ bụrụgodị na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Pọl sịrị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu. Ma nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.” (Efe. 4:31, 32) Ọ bụrụ na anyị na-eji obiọma agwa ndị ọzọ okwu otú na-egosi na anyị na-akwanyere ha ùgwù, ọ ga-eme ka e jiri okwu anyị kpọrọ ihe.—Mat. 23:12.

Na-ekwu Eziokwu n’Ọgbakọ

10. Olee ihe ndị okenye nwere ike ịmụta n’ezigbo ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’ihe banyere ikwu eziokwu?

10 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu n’ezoghị ọnụ. O ji ịhụnanya enye ha ndụmọdụ, ma, o kwughị okwu otú ga-eme ka ha ghara iji ihe ọ na-ekwu kpọrọ ihe. (Jọn 15:9-12) Dị ka ihe atụ, mgbe ndịozi Jizọs rụrụ ụka ugboro ugboro banyere onye ka ibe ya, o ji ndidi gwa ha okwu n’ezoghị ọnụ iji nyere ha aka ịghọta na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi. (Mak 9:33-37; Luk 9:46-48; 22:24-27; Jọn 13:14) Dị ka Jizọs mere, ndị okenye ọgbakọ na-ahụ na e mere ihe ziri ezi, ma, ha ekwesịghị ime atụrụ Chineke ka ọ̀ bụ ha nwe ha. (Mak 10:42-44) Ha na-eṅomi Kraịst site ‘n’inwe obiọma n’ebe ibe ha nọ, na-enwekwa obi ọmịiko’ n’ahụ́ ndị ọzọ.

11. Olee ihe anyị ga-eme ire anyị ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya?

11 Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ụmụnna anyị eziokwu, ọ bụghị ighewe ọnụ oghe na-ekwu okwu otú dị anyị mma, anyị nwere ike ịgwa ha otú ihe dị anyị n’obi n’agaghị kwuwe okwu mkparị. N’ezie, anyị ekwesịghị ‘ịmụ ire anyị dị ka agụba,’ jiri ya na-agwa ndị ọzọ okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu mkparị. (Ọma 52:2; Ilu 12:18) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ ga-eme ka anyị “Chee ire [anyị] nche ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, cheekwa egbugbere ọnụ [anyị] nche ka ọ ghara ikwu okwu aghụghọ.” (Ọma 34:13) Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị na-asọpụrụ Chineke ma na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu.

12. Olee mgbe e kwesịrị ihiwere mmadụ òtù ikpe n’ihi na ọ ghara ụgha? Kọwaa.

12 Ndị okenye na-agbasi mbọ ike ịhụ na ndị na-agha ụgha iji mebie aha ndị ọzọ anọgideghị n’ọgbakọ. (Gụọ Jems 3:14-16.) Ihe e ji agha ụdị ụgha a bụ ka e mee ka onye a na-aghagide ya taa ahụhụ. Ọ karịrị ikwu ihe na-abụchaghị eziokwu nke nwere ike iduhie mmadụ. Ihe anyị na-ekwu abụghị na e nwere ụgha na-adịghị njọ, ma, ọ bụghị ụgha niile ka e kwesịrị iji maka ya hiwe òtù ikpe. N’ihi ya, ndị okenye ga-eji ezi uche na amamihe kpebie ma onye ahụ kwuru ihe na-abụghị eziokwu ọ̀ bụ onye e ji ịgha ụgha obi ọjọọ mara, bụ́ nke e kwesịrị ihiwere òtù ikpe, ka naanị iji Akwụkwọ Nsọ dọsie ya aka ná ntị ike ọ̀ ga-ezu?

Na-ekwu Eziokwu n’Ebe Ị Na-achụ Nta Ego

13, 14. (a) Olee otú ụfọdụ ndị si aghara ndị were ha n’ọrụ ụgha? (b) Olee ezigbo ihe na-esi n’ime ihe n’eziokwu n’ebe anyị na-arụ ọrụ apụta?

13 Anyị bi n’oge ọtụtụ ndị na-anaghị eme ihe n’eziokwu, n’ihi ya, o nwere ike ịna-esiri gị ike ịgwa onye were gị n’ọrụ eziokwu. Ọtụtụ ndị na-agha ezigbo ụgha mgbe ha na-achọ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ide n’akwụkwọ ha ji achọ ọrụ na ha ga-arụli ihe ha na-agaghị arụli, ka e wee nye ha ọrụ na-enye ezigbo ego. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ ndị e were n’ọrụ na-arụ ọrụ nke ha ma ha bịa ọrụ kama ịrụ nke onye were ha n’ọrụ, n’agbanyeghị na ime otú ahụ megidere iwu ụlọ ọrụ ha. Ha nwere ike ịna-agụ ihe ọzọ na-agbasaghị ọrụ ha, na-akpọ ndị enyi ha na fon, jiri kọmputa na-ezigara ndị enyi ha ozi, ma ọ bụ na-achọgharị ihe n’Ịntanet.

14 Ezigbo Ndị Kraịst ma na ha ga na-eme ihe n’eziokwu mgbe niile, ọ bụghị mgbe ha chọrọ. (Gụọ Ilu 6:16-19.) Pọl sịrị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Hib. 13:18) N’ihi ya, Ndị Kraịst kwesịrị ịna-arụ ọrụ ruru ụgwọ a na-akwụ ha. (Efe. 6:5-8) Ọ bụrụ na anyị adị uchu n’ọrụ anyị, anyị nwere ike iwetara Nna anyị nke eluigwe otuto. (1 Pita 2:12) Dị ka ihe atụ, na Spen, onye Roberto na-arụrụ ọrụ jara ya mma n’ihi na ọ na-eme ihe n’eziokwu. Ụlọ ọrụ ahụ were ọtụtụ Ndịàmà ndị ọzọ n’ọrụ n’ihi àgwà ọma Roberto na-akpa. Ndịàmà ndị a e were n’ọrụ na-arụsikwa ọrụ ike. Roberto achọtarala ụmụnna iri abụọ na atọ e mere baptizim na mmadụ asatọ Ndịàmà na-amụrụ Baịbụl ọrụ!

15. Olee otú Onye Kraịst na-achụ nta ego kwesịrị isi gosi na ya na-ekwu eziokwu?

15 Ọ bụrụ na ị na-arụrụ onwe gị ọrụ, ị̀ na-eme ihe n’eziokwu ka ị̀ na-aghara onye agbata obi gị ụgha mgbe ụfọdụ? Onye Kraịst na-ere ahịa ekwesịghị ịgha ụgha banyere ngwá ahịa ya ka o wee repụ ya; o kwesịghịkwa inye aka azụ ma ọ bụ nara aka azụ. Anyị kwesịrị ịna-emeso ndị ọzọ ihe otú anyị ga-achọ ka a na-emeso anyị.—Ilu 11:1; Luk 6:31.

Na-agwa Ndị Ọchịchị Eziokwu

16. Gịnị ka Ndị Kraịst na-enye (a) ndị ọchịchị? (b) Jehova?

16 Jizọs sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.” (Mat. 22:21) Olee “ihe” ndị anyị ji Siza, ya bụ, ọchịchị, n’ụgwọ? Jizọs nọ na-ekwu banyere ụtụ isi mgbe o kwuru ihe a. N’ihi ya, ọ bụrụ na Ndị Kraịst chọrọ inwe akọnuche dị ọcha n’ihu Chineke na mmadụ, ha ga-erubere iwu na-achị ebe ha bi isi, gụnyere nke metụtara ịkwụ ụtụ isi. (Rom 13:5, 6) Ma, anyị ma na Jehova bụ Ọkaaka eluigwe na ala, ọ bụkwa naanị ya bụ ezi Chineke, onye anyị ji obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum, na ike anyị dum hụ n’anya. (Mak 12:30; Mkpu. 4:11) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-erubere Jehova Chineke isi n’ihe niile.—Gụọ Abụ Ọma 86:11, 12.

17. Olee ihe anyị kwesịrị icheta mgbe anyị na-achọ inweta enyemaka n’aka ndị ọchịchị?

17 Ọtụtụ mba na-enye ndị obodo ha ihe ụfọdụ iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. Ọ dịghị njọ ma Onye Kraịst nweta ụdị enyemaka a, ọ bụrụhaala na o ruru eru inweta ya. Iji gosi na anyị na-agwa ndị agbata obi anyị eziokwu, anyị agaghị aghara ndị ọchịchị ụgha ka ha wee nyere anyị aka.

Ngọzi Ndị Na-ekwu Eziokwu Na-enweta

18-20. Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị na-agwa ndị agbata obi anyị eziokwu?

18 Anyị na-enweta ọtụtụ ngọzi ma anyị na-ekwu eziokwu. Anyị nwere akọnuche dị ọcha, bụ́ nke na-eme ka obi ghara ịna-ama anyị ikpe. (Ilu 14:30; Fil. 4:6, 7) Akọnuche dị ọcha dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. Ọ bụrụkwa na anyị na-ekwu eziokwu n’ihe niile, obi agaghị na-amafu anyị na mmadụ nwere ike ịchọpụta ihe anyị na-eme.—1 Tim. 5:24.

19 E nwekwara ngọzi ọzọ. Pọl sịrị: “N’ụzọ niile, anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke, . . . site n’okwu bụ́ eziokwu.” (2 Kọr. 6:4, 7) Otu Onyeàmà bi na Britain mere nke a. Mgbe ọ chọrọ iresị mmadụ ụgbọala, ọ gwara onye ahụ ihe niile dị mma n’ụgbọala ahụ, gwakwa ya ihe ndị na-adịghị mma, ma ndị a na-anaghị ahụ anya. Mgbe onye ahụ gbagharịchara ụgbọala ahụ, ọ jụrụ nwanna ahụ ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova. Olee ihe mere o ji jụọ ya ajụjụ ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ chọpụtara na ihe niile nwanna ahụ gwara ya bụ eziokwu, chọpụtakwa na ọ dị ọcha n’anya. Nwanna ahụ gbaara ya àmà ka ha na-akparịta ụka.

20 Ànyị na-eji àgwà ọma anyị ewetara Onye kere anyị otuto dị ka nwanna a mere? Pọl sịrị: “Anyị ajụwo omume nzuzo ndị na-eme ihere, anyị adịghị eje ije n’aghụghọ.” (2 Kọr. 4:2) N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike na-agwa ndị agbata obi anyị eziokwu. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, anyị ga-eme ka a na-eto Nna anyị nke eluigwe na ndị ohu ya.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Ònye bụ onye agbata obi anyị?

• Gịnị ka ịgwa onye agbata obi anyị eziokwu pụtara?

• Olee otú anyị ga-esi ewetara Chineke otuto ma ọ bụrụ na anyị na-ekwu eziokwu?

• Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị na-ekwu eziokwu?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 17]

Ị̀ na-ekweta mgbe i mejọrọ ihe?

[Foto dị na peeji nke 18]

Ị̀ na-ekwu eziokwu mgbe ị na-achọ ọrụ?