Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Nwere Ike Iji Kwụọ Jehova Ụgwọ?

Gịnị Ka M Nwere Ike Iji Kwụọ Jehova Ụgwọ?

Gịnị Ka M Nwere Ike Iji Kwụọ Jehova Ụgwọ?

Dị ka Ruth Danner si kọọ

Mama anyị na-ejikarị egwuregwu ekwu na afọ 1933 bụ afọ ọdachi: Ọ bụ n’afọ ahụ ka Hitler malitere ịchị, poopu kwuru na ọ bụ Afọ Dị Nsọ, ọ bụkwa n’afọ ahụ ka a mụrụ m.

N’OGE ahụ, ndị mụrụ m bi n’obodo a na-akpọ Yutz, nke dị na Lorraine. Ọ dị nso n’ókè France na Germany, bụ́ ebe ọtụtụ ihe mere na France mere. N’afọ 1921, papa anyị, bụ́ onye Protestant, lụrụ mama anyị, bụ́ ezigbo onye Katọlik. A mụrụ nwanne m nwaanyị nke tọrọ m, bụ́ Helen, n’afọ 1922. Mama m na papa m gara Chọọchị Katọlik ka e mee ya baptizim mgbe a ka ku ya n’aka.

Otu ụbọchị n’afọ 1925, papa anyị nwetara otu akwụkwọ aha ya bụ́ The Harp of God, nke e dere n’asụsụ German. Mgbe ọ gụrụ akwụkwọ ahụ, o doro ya anya na ihe akwụkwọ ahụ na-ekwu bụ eziokwu. O deere ndị bipụtara ya akwụkwọ, ha emee ka ya na ndị Bibelforscher, bụ́ ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova na Germany n’oge ahụ, hụ. N’egbughị oge, papa anyị malitere ịkọrọ ndị ọzọ ihe ọ mụtara. Ma, nke a adịghị mama anyị mma. Ọ na-ejikarị olu ọma agwa papa anyị n’asụsụ German, sị: “Mewe ihe ọ bụla dị gị mma, ma, agakwala ndị Bibelforscher nso!” Ma, papa anyị ekpebiela ịbụ Onyeàmà Jehova, e mekwara ya baptizim n’afọ 1927.

Nke a mere ka nne nne m malite ịgwa mama anyị ka ọ gbaa papa anyị alụkwaghịm. Ka ụkọchukwu nọ na-edo Mas otu ụbọchị, ọ gwara ndị chọọchị ya ka ha “ghara ịga otu onye amụma ụgha aha ya bụ́ Danner nso.” Mgbe nne nne m lọtara Mas ahụ, ọ nọ n’elu ụlọ elu anyị tụọ papa anyị nọ n’ala ite e ji etinye okooko osisi. Nnukwu ite ahụ tụrụ ya n’ubu, ihe ọma merenụ bụ na ọ bụghị n’isi ya. Ihe a nne nne m mere mere ka mama anyị chewe na okpukpe na-eme ka ndị mmadụ chọọ igbu ibe ha enweghị ike ịbụ ezigbo ya. Nke a mere ka ọ malite ịgụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova. N’oge na-adịghị anya, o doro ya anya na ihe ọ na-agụta bụ eziokwu, e wee mee ya baptizim n’afọ 1929.

Mama m na papa m mere ihe niile ha nwere ike ime ka mụ na nwanne m nwaanyị hụ Jehova n’anya. Ha na-agụrụ anyị akụkọ ndị dị na Baịbụl. Ha gụchaa, ha ajụọ anyị ihe mere ndị ha gụrụ banyere ha ji mee ihe ha mere. N’oge ahụ, papa anyị anaghị arụ ọrụ ná mgbede ma ọ bụkwanụ n’abalị, n’agbanyeghị na nke a ga-eme ka ego a na-akwụ ya ghara ịna-ezuchara ezinụlọ anyị. Ọ chọrọ inwekwu ohere ịga ọmụmụ ihe, ịga ozi ọma, nakwa ịmụrụ ụmụ ya ihe.

Agwọ Nọ n’Akịrịka

Papa m na mama m na-anabatakarị ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị na-eje ozi na Betel si Switzerland na France. Ha na-agwakwa anyị otú e si na-akpagbu ụmụnna anyị na Germany, bụ́ ebe dị nso n’ụlọ anyị. Ọchịchị ndị Nazi nọ na-akpụga Ndịàmà Jehova n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, na-anapụkwa ndị mụrụ ụmụ n’ime ha ụmụ ha.

A kwadebere mụ na Helen otú anyị ga-esi die mkpagbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Papa anyị na mama anyị nyeere anyị aka, anyị ewee buru amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka, n’isi. Ha na-agwa anyị, sị: “Ọ bụrụ na unu amaghị ihe unu ga-eme, chetanụ ihe dị n’Ilu 3:5, 6. Ọ bụrụ na ụjọ ejide unu n’ụlọ akwụkwọ n’ihi mkpagbu, chetanụ 1 Ndị Kọrịnt 10:13. Ọ bụrụ na a kpọga unu ebe anyị na-agaghị na-ahụ unu, chetanụ ihe dị n’Ilu 18:10.” M bu Abụ Ọma nke 23 na nke 91 n’isi, obi sikwara mụ ike na Jehova ga na-echebe m mgbe niile.

N’afọ 1940, ọchịchị Germany nke dị n’aka ndị Nazi weghaara Alsace-Lorraine. Ọchịchị ọhụrụ a tiri iwu na ndị niile torola eto ga-anọrịrị n’òtù Nazi. Papa anyị jụrụ na ya agaghị anọ, ndị uwe ojii kwukwara na ha ga-ejide ya ma o mee otú ahụ. Mgbe mama anyị jụrụ ịkwa uwe ndị agha, ndị uwe ojii ahụ kwukwara na ha ga-ejide ya.

Nsogbu m nọ na ya n’ụlọ akwụkwọ enweghị atụ. Kwa ụbọchị, tupu e mee ihe ọ bụla na klas anyị, a na-ebu ụzọ kpeere Hitler ekpere, kelee ekele e ji eto ya, setịa aka nri mgbe a na-ekwe ukwe e ji eto Germany. Kama ịgwa m ka m ghara ikele Hitler, papa m na mama m nyeere m aka zụọ akọnuche m. Ọ bụ ya mere m ji kpebie n’onwe m na m gaghị na-ekele ekele e ji eto Hitler. O nwere oge ndị nkụzi mara m ụra ma gwa m na ha ga-achụ m n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe m dị afọ asaa, a gwara m ka m guzo n’ihu ndị nkụzi iri na abụọ niile na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ anyị. Ha gbalịrị ka ha manye m ikele ekele e ji eto Hitler. Ma, Jehova nyeere m aka ịkwụrụ chịm.

Otu onye nkụzi malitere ịgwa m ihe ga-eme ka m gbanwee obi. Ọ gwara m na m bụ ezigbo nwa akwụkwọ, na ihe m masịrị ya nke ukwuu, nakwa na ọ ga-ewute ya ma a chụọ m n’ụlọ akwụkwọ. Ọ sịrị: “Esetịla aka esetị. Welitetụ ya ọtọ. Ekwula ‘Toonụ Hitler!’ Naanị ihe ị ga-eme bụ imegharịtụwa ọnụ gị ka ò nwere ihe ị na-ekwu.”

Mgbe m gwara mama anyị ihe onye nkụzi anyị gwara m, ya echetara m akụkọ a kọrọ na Baịbụl banyere ihe ụmụ okorobịa ndị Hibru atọ mere mgbe eze Babịlọn chọrọ ka ha kpọọrọ arụsị o guzobere isiala. Ọ jụrụ m, sị: “Gịnị ka a chọrọ ka ha mee?” Mụ asị ya na a chọrọ ka ha hulata isi ha. Ya asị m: “Ọ̀ ga-adị mma ma a sị na mgbe ahụ a sị ha kpọọ isiala ha hulatara na-ekezi akpụkpọ ụkwụ ha? Kpebie ihe ị ga-eme; mee ihe i chere kwesịrị ekwesị.” M kpebiri ife naanị Jehova, dị ka Shedrak, Mishak, na Abednego mere.—Dan. 3:1, 13-18.

Ndị nkụzi chụrụ m n’ụlọ akwụkwọ ọtụtụ ugboro, ha kwukwara na ha ga-akpọpụ m n’aka papa m na mama m. Ụjọ malitere ịtụ m, ma, papa m na mama m mesiri m obi ike. Mgbe ọ bụla m chọrọ ịga akwụkwọ, mama m na-ekpere m ekpere, wee rịọ Jehova ka o chebe m. M ma na Jehova ga-enyere m aka iguzosi ike. (2 Kọr. 4:7) Papa anyị gwara m na ọ bụrụ na e nyekarịa m nsogbu, ụjọ atụla m ịlọta. Ọ sịrị “Anyị hụrụ gị n’anya. Ị bụ nwa anyị nwaanyị. Okwu a bụ okwu dịịrị gị na Jehova.” Ihe a o kwuru mere ka m kpebisie ike iguzosi ike.—Job 27:5.

Ndị uwe ojii na-abịakarị achọ ma hà ga-enweta akwụkwọ Ndịàmà n’ụlọ anyị. Ha na-agbakwa papa m na mama m ajụjụ ma ha bịa. Ha na-akpụrụ mama anyị, ya anọọ ọtụtụ awa. Ha na-agakwa n’ebe papa m na-arụ ọrụ nakwa n’ebe nwanne m nwaanyị na-arụ ọrụ kpụrụ ha. M nọrọ n’ụlọ akwụkwọ, anaghị m ama ma mama anyị ọ̀ ga-anọkwa ya ma m lọta. Mgbe ụfọdụ, onye agbata obi anyị na-asị m: “Ha akpụrụla mama unu.” M na-aga zoo n’ime ụlọ, na-ajụ onwe m, sị: ‘Hà na-ata ya ahụhụ? M̀ ga-ahụkwa ya ọzọ?’

A Kpọga Anyị Ala Ọzọ

Na January 28, 1943, ndị uwe ojii kpọtere anyị n’ụra mgbe o ji ọkara gafee elekere atọ nke isi ụtụtụ. Ha kwuru na a gaghị akpọga anyị ala ọzọ ma ọ bụrụ na papa m na mama m, na mụ na nwanne m nwaanyị abanye n’òtù Nazi. Ha nyere anyị awa atọ anyị ga-eji jikere ọpụpụ. Mama anyị adịrịlarị mbụ jikere maka nke a. Ọ chịnyelarị ákwà anyị ga na-eyi n’akpa anyị, tinyekwa otu Baịbụl. Ya mere, anyị ji oge ahụ ha nyere anyị kpee ekpere ma gbarịta ibe anyị ume. Papa anyị chetaara anyị na ‘o nweghị ihe nwere ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke.’—Rom 8:35-39.

Ndị uwe ojii ahụ mechara bịaghachi. M gaghị echefu otú Nwanna Nwaanyị Anglade, bụ́ onye katarala ahụ́ n’oge ahụ, si na-ebe ákwá mgbe ọ nọ na-asị anyị gaa nke ọma. Ndị uwe ojii ahụ bugara anyị n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Metz. Anyị nọrọ n’ụgbọ okporo ígwè abalị atọ wee rute Kochlowice, bụ́ ụlọ mkpọrọ dị n’Auschwitz na Poland. Mgbe ọnwa abụọ gafere, a kpọgara anyị na Gliwice, bụ́ ụlọ ndị nọn a rụgharịrị ka ọ bụrụzie ụlọ mkpọrọ. Ndị ọchịchị gwara anyị na ha ga-ahapụ anyị, bunyeghachikwa anyị ngwongwo anyị niile ma ọ bụrụ na anyị abịanye aka n’akwụkwọ na anyị agaghịzi abụ Ndịàmà Jehova. Papa m na mama m jụrụ. Ha ewee gwa anyị, sị: “O nweghị ihe ga-eme ka unu lọta ọzọ.”

N’ọnwa June afọ ahụ, a kpọgara anyị Swietochlowice, bụ́ ebe m nọ malite inwe isi ọwụwa, nke m ka na-enwe ruo taa. Mkpịsị aka malitere igbu m mgbu, nke mere ka otu dọkịta fopụ ụfọdụ n’ime mbọ aka m n’agbasighị ahụ́ m agbasi. N’agbanyeghị ihe ndị a, mgbe ụfọdụ, m na-agara ndị na-eche anyị nche ozi n’ebe a na-eme bred. Otu nwaanyị na-arụ ebe ahụ na-enyekwa m bred.

Tupu mgbe ahụ, ebe ezinụlọ anyị nọ dị iche n’ebe ndị mkpọrọ ndị ọzọ nọ. N’October afọ 1943, a kpọgara anyị n’ụlọ mkpọrọ dị na Ząbkowice. Anyị na ndị ọzọ, ndị dị ihe dị ka mmadụ iri isii, ndị gụnyere ndị ikom, ndị inyom, na ụmụ ntakịrị, dinara n’àkwà ndị a rụkwasịrị n’elu ibe ha, bụ́ ndị dị n’uko. Ndị uwe ojii mere ihe niile ha nwere ike ime iji hụ na a na-enye anyị nri mebiri emebi, nke na-agaghị ekwe anyị oriri.

Anyị nọgidere na-enwe olileanya n’agbanyeghị ihe isi ike ndị ahụ niile. Anyị gụrụ otu Ụlọ Nche kwuru banyere nnukwu ọrụ nkwusa ozi ọma anyị ga-arụ ma agha bie. Ya mere, anyị ma ihe mere anyị ji na-ata ahụhụ, marakwa na ọ ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya.

Anyị ma na a ga-emecha merie ndị Nazi mgbe anyị nụrụ otú ndị agha America na ndị òtù ha si meriri na-abịa n’ike n’ike. Ná mmalite afọ 1945, ndị uwe ojii kpọpụtara anyị n’ụlọ mkpọrọ ahụ anyị nọ. Na February 19 afọ ahụ, anyị ji ụkwụ malite ịga ebe a manyere anyị ịga, bụ́ ebe fọrọ obere ka o ruo narị kilomita abụọ na iri anọ. Anyị gara ije a izu anọ wee rute na Steinfels, Germany, bụ́ ebe ndị uwe ojii kpọbara anyị n’otu ebe a na-egwute ihe n’ala. Ọtụtụ n’ime anyị chere na a ga-egbu anyị n’ebe ahụ. Ma, nrute ndị agha America na ndị òtù ha rutere n’ebe ahụ n’ụbọchị ahụ mere ka ndị uwe ojii ahụ hapụ anyị gbaa ọsọ.

M Mezuru Ihe Mgbaru Ọsọ M

Na May 5, 1945, bụ́ mgbe ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ abụọ na ọkara kemgbe e ji anyị, anyị bujuru inyi na igwu ahụ́ lọta Yutz. Anyị ka yi ákwà ndị anyị yi kemgbe ọnwa February. Ya mere, anyị gbara ákwà ndị ahụ ọkụ. M chetara mgbe mama anyị gwara anyị, sị: “Ka taa bụrụ ụbọchị unu ga-akacha nwee obi ụtọ ná ndụ unu. Anyị enweghị ihe ọ bụla. Ákwà anyị yi abụghịdị nke anyị. Ma, anyị anọ alọtala n’enweghị ihe mere okwukwe anyị. Anyị ahapụghị Jehova.”

Mgbe m nọrọ ọnwa atọ na Switzerland wee gbakechaa, amaliteghachiri m ịga ụlọ akwụkwọ n’atụghị ụjọ ọ bụla na e nwere ike ịchụ m. Ugbu a, anyị na ụmụnna anyị na-aga ọmụmụ ihe, na-agakwa ozi ọma n’ezoghị ezo. N’August 28, n’afọ 1947, mgbe m dị afọ iri na atọ, m mere ka ọha mmadụ mara nkwa m kwere Jehova n’afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. Papa m mere m baptizim n’Osimiri Moselle. N’oge ahụ, m chọrọ ịmalite ịsụ ụzọ ozugbo, ma papa m gwara m ka m buru ụzọ mụọ ọrụ. Mụ ewee gaa mụọ ịkwa ákwà. N’afọ 1951, mgbe m dị afọ iri na asaa, a họpụtara m ịbụ ọsụ ụzọ, wee gwa m ka m jewe ozi na Thionville, bụ́ ebe dị anyị nso.

M gara mgbakọ na Paris n’afọ ahụ wee dejupụta akwụkwọ na m chọrọ ịga ozi ala ọzọ. M torubeghị ịga ozi ala ọzọ, ma Nwanna Nathan Knorr kwuru na ya ka ga-ejide akwụkwọ ahụ m dejupụtara ruo mgbe m ga-etoru ịga. Na June afọ 1952, m nwetara akwụkwọ ozi e ji gwa m ka m bịa gụọ akwụkwọ na klas nke iri abụọ na otu n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead na South Lansing, New York, U.S.A.

Otú M Si Gụọ Akwụkwọ na Gilead na Otú Ozi M Si Gaa Mgbe M Gụchara

Nnukwu ihe mere! Ọ na-esiri m ike ikwu okwu n’ihu ọha n’asụsụ m. Ma, ọ bụ Bekee ka m ga na-asụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ma, ndị nkụzi anyị ji ịhụnanya nyere m aka. Otu nwanne nwoke gụrụ m Ọchị Alaeze n’ihi ọchị m na-achịkarị mgbe ọ bụla ihere mewere m.

Na July 19, n’afọ 1953, anyị mere ememme anyị ji gụchaa akwụkwọ n’Ámá Egwuregwu Yankee nke dị na New York. E zigara mụ na Ida Candusso, bụ́ onye mechara lụọ di wee zawa Ida Seignobos, Paris. Izi ndị bi na Paris, bụ́ ndị bara ọgaranya, ozi ọma na-esiri m ike, ma, mụ na ọtụtụ ndị dị umeala n’obi mụrụ ihe. Ida lụrụ di wee gawa ozi n’Africa n’afọ 1956, ma, a hapụrụ m na Paris.

N’afọ 1960, m lụrụ otu nwanna nwoke na-eje ozi na Betel, e wee mee anyị ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, mụ na ya ewee jee ozi na Chaumontnakwa Vichy. Ka afọ ise gafere, m malitere ịrịa ụkwara nta wee kwụsị ịsụ ụzọ. Nke a mere ka obi jọọ m njọ n’ihi na ihe mgbaru ọsọ m kemgbe m bụ nwata bụ ịmalite ozi oge niile na ịnọgide na ya. Ka oge na-aga, di m hapụrụ m gaa kpọrọ nwaanyị ọzọ. Otú ụmụnna si lekọta m nyeere m aka idi ihe niile bịaara m n’ime afọ ndị ahụ. Jehova nọgidekwara na-eburu m ibu m.—Ọma 68:19.

Ugbu a, m bi na Louviers, Normandy, n’ebe dị nso n’alaka ụlọ ọrụ dị na France. N’agbanyeghị ọrịa na-arịa m, obi dị m ụtọ ịhụ otú Jehova si na-enyere m aka. Otú e si zụọ m na-enyere m aka inwe obi ụtọ ruo taa. Ndị mụrụ m kụziiri m na Jehova bụ Onye dị adị nke m kwesịrị ịhụ n’anya, gwa okwu, nakwa na ọ na-anụ ekpere m. N’ezie, “gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?”—Ọma 116:12.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 6]

“Obi dị m ụtọ ịhụ otú Jehova si na-enyere m aka”

[Foto dị na peeji nke 5]

Ebe m ji ihe m ji ekpuchi ihu m ka m wee ghara ikuru ikuku ọjọọ. M dị afọ isii mgbe ahụ

[Foto dị na peeji nke 5]

Mụ na ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ nọ na Luxembourg, mgbe anyị na-achọ ịga nkwusa pụrụ iche. M dị afọ iri na isii mgbe ahụ

[Foto dị na peeji nke 5]

Mụ na papa m na mama m, mgbe anyị gara mgbakọ n’afọ 1953