Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Mere A Ga-eji Na-ekenye Ndị Ọzọ Ọrụ, Oleekwa Otú E Nwere Ike Isi Mee Ya?

Olee Ihe Mere A Ga-eji Na-ekenye Ndị Ọzọ Ọrụ, Oleekwa Otú E Nwere Ike Isi Mee Ya?

Olee Ihe Mere A Ga-eji Na-ekenye Ndị Ọzọ Ọrụ, Oleekwa Otú E Nwere Ike Isi Mee Ya?

O NWEELA onye kenyere onye ọzọ ọrụ tupu e kee Ụwa. Jehova kere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ma mee ya “onye ọkà ọrụ,” nke kere eluigwe na ụwa. (Ilu 8:22, 23, 30; Jọn 1:3) Mgbe Chineke kere di na nwunye mbụ, ọ gwara ha ka ha ‘baa ụba ma jupụta ụwa, meekwa ka ọ dịrị n’okpuru ha.’ (Jen. 1:28) Onye Okike nyere ụmụ mmadụ ọrụ ime ka ụwa dum ghọọ Paradaịs Iden. N’ezie, site ná mmalite, Jehova na ndị ohu ya na-ekenye ndị ọzọ ọrụ.

Gịnị ka ikenye ndị ọzọ ọrụ pụtara? Gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịna-ekenye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ dị n’ọgbakọ? Olee otú ha nwere ike isi mee nke a?

Gịnị Ka Ikenye Ndị Ọzọ Ọrụ Pụtara?

Ikenye ndị ọzọ ọrụ pụtara ime ka ha soro na-arụ ihe ụfọdụ. Nke a pụtara na e kwesịrị inye ha ikike.

Ndị e kenyere ọrụ n’ọgbakọ kwesịrị ịrụ ọrụ e kenyere ha, ha kwesịkwara ịna-agwa onye nyere ha ọrụ otú ọrụ ahụ si na-aga. Ha gakwa na-agakwuru onye kenyere ha ọrụ ma ha nwee ajụjụ. Ma, onye ọrụ ahụ dị n’aka bụ nwanna nwoke kenyere ha ya. O kwesịrị ịma otú o si na-aga ma na-atụ aro otú a ga-esi na-arụ ya. Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee ihe mere mmadụ ga-eji kenye ndị ọzọ ọrụ ebe ọ bụ na ọ ga-arụli ya n’onwe ya?’

Olee Ihe Mere A Ga-eji Na-ekenye Ndị Ọzọ Ọrụ?

Chegodị ihe mere Jehova ji kee Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ma nye ya ọrụ ike ihe ndị ọzọ. N’ezie, “e si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya.” (Kọl. 1:16) Onye Okike gaara eke ihe niile n’onwe ya ma ọ chọọ, ma, o kpebiri ka Ọkpara ya nweta ọṅụ dị n’ike ihe. (Ilu 8:31) Nke a mere ka Ọkpara Chineke mụtakwuo àgwà Nna ya. Ya bụ na Nna ya ji ohere ahụ zụọ Ọkpara Ọ mụrụ naanị.

Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, o ṅomiri Nna ya site n’ikenye ndị ọzọ ọrụ. O ji nwayọọ nwayọọ zụọ ndị na-eso ụzọ ya. O zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya dị iri na abụọ, ma mechaa zipụ mmadụ iri asaa, ka ha bute ụzọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma. (Luk 9:1-6; 10:1-7) Mgbe Jizọs mechara rute n’ebe ndị ahụ ha kwusara ozi ọma, ọ hụrụ na ndị mmadụ dịzi njikere ịnabata ozi ọma ya. Mgbe Jizọs na-achọ ịlaghachi eluigwe, o kenyere ndị na-eso ụzọ ya o nyere ọzụzụ ọrụ ka ukwuu, tinyere nke ikwusa ozi ọma n’ụwa dum.—Mat. 24:45-47; Ọrụ 1:8.

Ikenye ndị ọzọ ọrụ na inye ha ọzụzụ bụ ihe e ji mara ọgbakọ Ndị Kraịst. Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Ihe ị nụrụ n’ọnụ m, . . . nyefee ya n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ga-erukwa eru nke ọma ịkụziri ya ndị ọzọ.” (2 Tim. 2:2) Ndị nọterela aka n’ọgbakọ ga-azụ ndị ga-emecha zụọ ndị ọzọ.

Ọ bụrụ na okenye ekenye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ọ na-arụ, ọ ga-eme ka ha soro na-enwe ọṅụ ọ na-enweta n’izi atụrụ Chineke ihe na ilekọta ha. Nghọta ndị okenye ghọtara na ọ bụghị ihe ọ bụla ka mmadụ ga-enwe ike ime n’onwe ya kwesịrị ime ka ha kenye ndị ọzọ ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. Baịbụl sịrị: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.” (Ilu 11:2) Onye dị obi umeala kwesịrị ịma otú ike ya hà. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka naanị gị na-eme ihe niile, ike nwere ike ịgwụ gị, ị gaghịkwa enwe oge gị na ezinụlọ gị ga-eji na-anọkọ. N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị ka e kee ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ ekee. Weregodị nwanna nwoke na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ dị ka ihe atụ. O nwere ike ịgwa ndị okenye ndị ọzọ ka ha nyochaa ihe ndekọ ego ọgbakọ. Mgbe ndị okenye ndị ọzọ na-enyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ, ha nwere ike ịmata otú ego ọgbakọ si na-aga.

Ikenye ndị ọzọ ọrụ na-eme ka ha mata otú e si arụ ọrụ dị iche iche, ọ na-emekwa ka ndị na-ekenye ha ọrụ mara ihe ha ga-arụli. Ọ bụrụ na ndị okenye ekenye ndị ọzọ ọrụ, ọ ga-enyere ha aka ịma ndị ‘ruru eru’ ịbụ ndị ohu na-eje ozi.—1 Tim. 3:10.

Nke ikpeazụ bụ na ọ bụrụ na ndị okenye ekenye ndị ọzọ ọrụ, ha na-egosi na ha tụkwasịrị ha obi. Pọl nyere Timoti ọzụzụ site n’ịkpọrọ ya na-eje ozi. Ha abụọ ghọrọ ezigbo enyi. Pọl kpọrọ Timoti “ezigbo nwa n’okwukwe.” (1 Tim. 1:2) Ọ bụkwa otú ahụ ka Jehova na Jizọs si dịrị n’ezigbo mma n’ihi na ha rụkọrọ ọrụ mgbe ha na-eke ihe. Ọ bụrụ na ndị okenye ekenye ndị ọzọ ọrụ, ọ ga-eme ka ha na ndị ha kenyere ọrụ dịrị n’ezigbo mma.

Ihe Mere O Ji Esiri Ụfọdụ Ike Ikenye Ndị Ọzọ Ọrụ

N’agbanyeghị na ndị okenye ma na ikenye ndị ọzọ ọrụ bara uru, ọ na-esiri ụfọdụ n’ime ha ike ime otú ahụ. Ikekwe, ihe mere o ji esiri ha ike bụ na ha na-eche na ime otú ahụ ga-eme ka ikike ha nwere n’ọgbakọ belata. Ha nwere ike ịna-eche na ọ bụ ha kwesịrị ịna-arụ ihe niile. Ma, cheta na tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ dị ukwuu ka ha rụọ, n’ihi na ọ ma na ha ga-arụ ọrụ karịrị nke ọ rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa.—Mat. 28:19, 20; Jọn 14:12.

O nwere ike ịbụ na o nweela mgbe ndị okenye kenyere mmadụ ọrụ ma onye ahụ arụpụtaghị ihe ha tụrụ anya ya. Nke a nwere ike ime ka ha chee na hanwa ga-aka rụọ ọrụ ahụ nke ọma, rụọkwa ya ọsọ ọsọ. Ma, cheta ihe banyere Pọl. Ọ ma na ọ bara uru ikenye ndị ọzọ ọrụ, marakwa na ọ bụghị mgbe niile ka ndị a na-enye ọzụzụ ga-emetacha ihe a tụrụ anya ya. Mgbe Pọl nọ na njem ozi ala ọzọ nke mbụ, o nyere nwa okorobịa ya na ya so, bụ́ Mak, ọzụzụ. O wutere Pọl mgbe Mak hapụrụ ọrụ ya lawa. (Ọrụ 13:13; 15:37, 38) Ma, nke ahụ emeghị ka Pọl ghara ịzụ ndị ọzọ. Dị ka anyị kwuru ná mbụ, ọ gwara nwa okorobịa bụ́ Timoti ka o soro ya. Mgbe Timoti ruru eru ịrụ ọrụ ndị ka ukwuu, Pọl hapụrụ ya n’Efesọs, wee nye ya ikike ịhọpụta ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi.—1 Tim. 1:3; 3:1-10, 12, 13; 5:22.

N’otu aka ahụ, n’oge a, ndị okenye ekwesịghị ịhapụ ịzụ ndị ọzọ naanị n’ihi na otu n’ime ndị ha nyere ọzụzụ arụghị ihe ha tụrụ anya ya. O kwesịrị ekwesị, dịkwa mkpa, ka ndị okenye tụkwasị ndị ọzọ obi ma na-enye ha ọzụzụ. Ma, olee ihe ndị okenye kwesịrị iburu n’uche mgbe ha na-ekenye ndị ọzọ ọrụ?

Otú A Ga-esi Na-ekenye Ndị Ọzọ Ọrụ

Mgbe ndị okenye chọrọ ikenye ụmụnna nwoke ndị ọzọ ọrụ, ha kwesịrị ịma ma hà ruru eru. Mgbe a chọrọ ndị ga-eke ihe oriri na Jeruselem, ndịozi họpụtara ‘ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà, bụ́ ndị jupụtara na mmụọ nsọ na amamihe.’ (Ọrụ 6:3) Ọ bụrụ na e kenye onye na-erughị eru ọrụ, o nwere ike ọ gaghị arụ ya. N’ihi ya, ndị okenye kwesịrị ibu ụzọ kenye onye ahụ ọrụ na-esighị ike. Ọ bụrụ na onye ahụ arụlie ọrụ e nyere ya, ọ ga-enwe ike ịrụ ndị ka ukwuu.

Ma, e nwekwara ihe ọzọ e kwesịrị icheta. Mmadụ dị n’iche n’iche, ike ahaghịkwa otu. Amamihe dịkwa n’iche n’iche. Nwanna nwoke nwere ihu ọchị nwere ike ịrụ ọrụ atendantị nke ọma, ma, onye anya ruru ala, nke na-ahụ na ihe na-aga n’usoro, nwere ike inyere odeakwụkwọ ọgbakọ aka. E nwere ike ịgwa nwanna nwaanyị ma achọ ihe mma ka o jiri okooko osisi chọọ Ụlọ Nzukọ Alaeze mma mgbe a na-echeta ọnwụ Kraịst.

Mgbe ndị okenye na-ekenye ndị ọzọ ọrụ, ha kwesịrị ime ka ndị ha nyere ọrụ mara ihe ha chọrọ ka ha rụọ. Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim zigaara Jizọs ndị ozi ya, ọ gwara ha kpọmkwem ihe ọ chọrọ ka ha jụta ya. (Luk 7:18-20) Ma, mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpokọta nri fọdụrụ ná nri ahụ o ji ọrụ ebube mee ka ọ mụbaa, ọ gwaghị ha otú ha ga-esi mee ya. (Jọn 6:12, 13) Ihe kacha mkpa bụ ụdị ọrụ ndị okenye chọrọ ka onye ahụ rụọ, nakwa ma onye ahụ ò ruru eru ịrụ ya. Ma onye na-ekenye ọrụ ma onye o kenyere ọrụ kwesịrị ịma ihe a tụrụ anya ya, marakwa mgbe ha kwesịrị ịgwa onye nyere ha ọrụ otú ọrụ si na-aga. Ha abụọ kwesịrị ịma ihe a ga-ahapụrụ onye e nyere ọrụ ka o jiri aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. Ọ bụrụ na e nwere ụbọchị e kwesịrị ịrụcha ọrụ ahụ, ọ ga-aka mma ma ha kwurịta nke a. Ọ dịghị mma ma naanị onye ahụ nyere ọrụ kpebie ụbọchị ahụ n’onwe ya wee gwa onye o nyere ọrụ.

E kwesịrị inye onye ahụ e kenyere ọrụ ego na ngwá ọrụ, nyekwara ya aka ma ọ dị mkpa. Ọ ga-adịkwa mma ma ọ bụrụ na e mee ka ndị ọzọ mara na e nyere onye ahụ ọrụ. Mgbe Jizọs nyere Pita “mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe,” ọ nọ n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ nye ya mkpịsị ugodi ahụ. (Mat. 16:13-19) N’otu aka ahụkwa, ọ ga-adị mma ma a gwa ọgbakọ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche e nwere n’ọgbakọ.

Ndị okenye kwesịkwara ilezi anya. Ọ bụrụ na ndị okenye eweghara ọrụ ha nyere onye ọzọ ka ọ rụọ, ihe ha na-agwa onye ahụ bụ, “Anyị atụkwasịghị gị obi.” Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike ghara ịga otú a tụrụ anya ya, ma, ọ bụrụ na ndị okenye ahapụ nwanna e kenyere ọrụ ka o jiri aka ya hazie ọrụ ya, ọ ga-eme ka obi sie ya ike, meekwa ka ọrụ ahụ doo ya anya. Ma, nke a apụtaghị na ndị okenye agaghịzi ama otú nwanna ahụ si arụ ọrụ ya. N’agbanyeghị na Jehova nyefere Ọkpara ya ọrụ ike ihe, o so ya rụọ ọrụ ahụ. Ọ gwara Onye Ọkà Ọrụ ahụ, sị: “Ka anyị mee mmadụ n’onyinyo anyị.” (Jen. 1:26) N’ihi ya, site n’okwu ọnụ nakwa n’omume, ndị okenye kwesịrị igosi na ha na-akwado ọrụ onye ahụ na-arụ, kwesịkwa ịja onye ahụ mma maka mgbalị ọ na-eme. Ọ bụrụ na ha esoro ya tụlee ihe ọ rụpụtarala, ọ ga-enyere ya aka imekwu nke ọma. Ọ bụrụ na onye ahụ anaghị arụtacha ọrụ ahụ nke ọma, e kwesịrị ịtụrụ ya aro ga-enyere ya aka ozugbo. Cheta na mee elu mee ala, ọ bụ onye kenyere onye ọzọ ọrụ ka ọrụ ahụ dị n’aka.—Luk 12:48.

Ọtụtụ ụmụnna nwoke eritewo uru n’ihi na ndị okenye nwere mmasị n’ebe ha nọ kenyere ha ọrụ ka ha rụọ n’ọgbakọ. N’eziokwu, ndị okenye kwesịrị iṅomi Jehova site n’ịma ihe mere ha ga-eji na-ekenye ndị ọzọ ọrụ nakwa otú ha ga-esi na-arụ ya.

[Igbe dị na peeji nke 29]

IKENYE NDỊ ỌZỌ ỌRỤ

• na-eme ka ha soro na-enwe ọṅụ dị n’ịrụzu ihe a chọrọ

• na-eme ka a rụzuo ọtụtụ ihe

• bụ ụzọ mmadụ si egosi na ya nwere amamihe ma dịrị obi umeala

• bụ ụzọ e si enye ndị ọzọ ọzụzụ

• bụ ụzọ e si egosi na a tụkwasịrị ndị ọzọ obi

[Igbe dị na peeji nke 30]

OTÚ E SI EKENYE NDỊ ỌZỌ ỌRỤ

• Họrọ ndị ga-arụli ọrụ a chọrọ

• Mee ka ihe ha ga-arụ doo ha anya

• Gwa ha kpọmkwem ihe a tụrụ anya ya n’aka ha

• Nye ha ihe ha ga-eji rụọ ọrụ ahụ

• Mara otú ọrụ ahụ si na-aga, gosikwa na ị tụkwasịrị ndị na-arụ ya obi

• Mara na ihe niile banyere ọrụ ahụ dị gị n’aka

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ikenye ndị ọzọ ọrụ gụnyere ịgwa ha ihe ha ga-arụ na ịma otú ihe si na-aga