Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebe ọ bụ na Jizọs kwusara ozi ọma n’ala Izrel dum, olee ihe mere Pita ji kwuo na ndị Juu na ndị na-achị ha ‘mere ihe n’amaghị ama’ mgbe ha gburu Jizọs?—Ọrụ 3:17.

Mgbe Pita onyeozi na-agwa ndị Juu otú ha si tinye aka gbuo Mesaya ahụ, ọ sịrị: “Amaara m na unu mere ya n’amaghị ama, dịkwa nnọọ ka ndị na-achị unu mere.” (Ọrụ 3:14-17) O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị Juu aghọtaghị na Jizọs bụ Mesaya, ha aghọtaghịkwa ihe ndị ọ kụziri. Ma, ihe mere ndị ọzọ ji mee ihe ha mere bụ n’ihi na ha achọghị ime uche Chineke, nakwa n’ihi na ha kpọrọ Jizọs asị ma na-enwere ya anyaụfụ.

Ka anyị tụlee otú ọtụtụ ndị si ghara ige ntị n’ihe Jizọs kụziri n’ihi na ha enweghị ọchịchọ ime uche Jehova. Jizọs ji ihe atụ kụzie ihe ọtụtụ ugboro, ọ kọwakwaara ndị niile chọrọ ịmụtakwu ihe ihe atụ ndị ahụ. Ma, ụfọdụ n’ime ndị nụrụ ihe Jizọs kụziri gawaara onwe ha, ha achọghị ịghọta ihe ọ kụziiri ha. O nwedịrị mgbe ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs were iwe n’ihi ilu Jizọs tụụrụ ha. (Jọn 6:52-66) Ha amaghị na ihe atụ Jizọs nyere bụ iji mata ma hà dị njikere ịgbanwe echiche ha na omume ha. (Aịza. 6:9, 10; 44:18; Mat. 13:10-15) Ha leghaara amụma e buru na Mesaya ahụ ga-eji ihe atụ na-akụzi ihe anya.—Ọma 78:2.

Ndị ọzọ egeghị Jizọs ntị n’ihi na ha kpọrọ ya asị. Mgbe ọ kụziri ihe n’ụlọ nsọ dị n’obodo ya, bụ́ Nazaret, ihe ọ kụziri ‘juru ndị mmadụ anya.’ Ma, kama ha ga-ekwere na Jizọs bụ Mesaya ahụ, ha jụrụ, sị: “Olee ebe nwoke a nwetara ihe ndị a? . . . Onye a ọ́ bụghị ọkwá nkà ahụ, nwa Meri nakwa nwanne Jems na Josef na Judas na Saịmọn? Ọ̀ bụkwa na anyị na ụmụnne ya ndị inyom anọghị n’ebe a?” (Mak 6:1-3) Ndị bi na Nazaret ejighị ihe Jizọs kụziri kpọrọ ihe n’ihi na Jizọs si n’ezinụlọ ndị ogbenye.

Oleekwanụ maka ndị ndú okpukpe? Ọtụtụ n’ime ha egechaghị Jizọs ntị n’ihi ihe ndị a niile e kwuru. (Jọn 7:47-52) Ha anabataghịkwa ihe Jizọs kụziri n’ihi na ha nweere ya anyaụfụ maka na ndị mmadụ nwere mmasị n’ebe ọ nọ. (Mak 15:10) Ọtụtụ ndị a ma ama were iwe mgbe Jizọs katọrọ ha n’ihi na ha bụ ndị ihu abụọ na ndị na-aghọgbu ndị ọzọ. (Mat. 23:13-36) Jizọs mere ihe ziri ezi mgbe ọ katọrọ ha. Ọ gwara ha, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị maara Iwu, n’ihi na unu wepụrụ mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma; unu onwe unu abanyeghị [n’Alaeze ahụ], unu gbochikwara ndị chọrọ ịbanye!”—Luk 11:37-52.

Jizọs kwusara ozi ọma afọ atọ n’ọkara mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ zụkwara ọtụtụ ndị ka ga-arụ ọrụ ahụ. (Luk 9:1, 2; 10:1, 16, 17) Ọtụtụ ndị gere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ntị mgbe ha kwusara ozi ọma nke mere ka ndị Farisii kwuo, sị: “Lee! Ụwa dum esorola ya.” (Jọn 12:19) N’ihi ya, ọ bụghị na o nwetụghị ihe ọtụtụ n’ime ndị Juu ma banyere Jizọs, kama, ha ‘amaghị’ na ọ bụ Mesaya. Ha kwesịrị ịmata Mesaya ahụ ma hụ ya n’anya, ma ha emeghị otú ahụ. Aka ụfọdụ n’ime ha dị n’ogbugbu e gburu Jizọs. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji gwa ọtụtụ n’ime ha, sị: “Ya mere, chegharịanụ, chigharịakwanụ ka e wee hichapụ mmehie unu, ka oge inweta ume wee si n’ihu Jehova bịa, ka o wee zitekwa Kraịst a họpụtaara unu, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 3:19, 20) Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ ndị Juu, nakwa “oké ìgwè ndị nchụàjà,” malitere ige Jizọs ntị. Ha emeghịzi ihe n’amaghị ama. Kama, ha chegharịrị, ha na Jehova ewee dị ná mma.—Ọrụ 2:41; 4:4; 5:14; 6:7.