Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1. Gwa Onye Chepụtara ya ka o Nyere Gị Aka

1. Gwa Onye Chepụtara ya ka o Nyere Gị Aka

Otú I Nwere Ike Isi Ghọta Baịbụl

1. Gwa Onye Chepụtara ya ka o Nyere Gị Aka

Ninfa, bụ́ onye bi n’Ịtali, kwuru, sị: “O nwere mgbe m na-agụ Baịbụl tupu mụ alakpuo ụra. M na-agụ ya maka na m ghọtara na ọ bụ Okwu Chineke, m chọkwara ịma ihe Chineke dere na Baịbụl, ọ bụ ezie na ịgụ ya anaghị atọ m ụtọ. M bu n’obi ịgụcha ya. Ná mmalite, ọ dịịrị m mfe, ma mgbe m gụruru ebe ndị siiri m ike, m kwụsịrị.”

ỤDỊ ihe a mere Ninfa ò meela gị? O meela ọtụtụ ndị. Ma, dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Onye chepụtara Baịbụl, bụ́ Jehova Chineke, chọrọ ka ị ghọta Okwu ya. Ma, olee otú i nwere ike isi ghọta ya? Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịrịọ Onye chepụtara ya ka o nyere gị aka.

E weere ndịozi Jizọs dị ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị” n’ihi na ha agaghị ụlọ akwụkwọ ndị rabaị ka a kụziere ha banyere okpukpe. (Ọrụ 4:13) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs mesiri ha obi ike na ha ga-aghọtali Okwu Chineke. Olee otú ha ga-esi ghọta ya? Jizọs kọwara ya, sị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile.” (Jọn 14:26) Ọ bụ mmụọ nsọ a, ma ọ bụ ike nọ n’ọrụ, ka Chineke ji kee ụwa na ihe niile dị ndụ dị n’ime ya. (Jenesis 1:2) O jikwa ya mee ka ihe dị ka ndị ikom iri anọ dee echiche ya na Baịbụl. (2 Pita 1:20, 21) Mmụọ nsọ ahụ ka nwekwara ike inyere ndị na-achọ ịghọta Baịbụl aka.

Olee otú i nwere ike isi nweta mmụọ nsọ Chineke? Ị ghaghị iji okwukwe rịọ Chineke ka o nye gị ya. N’ezie, o nwere ike ịdị mkpa ka ị rịọ ya ugboro ugboro ka o nye gị ya. Jizọs sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu. . . . Ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, . . . lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:9, 13) Jehova ga-enye ndị ji ezi obi na-arịọ ya mmụọ nsọ ya mmụọ ahụ n’ụba. Ike ahụ nọ n’ọrụ nwere ike inyere gị aka ịghọta okwu ndị e si n’ike mmụọ nsọ dee na Baịbụl ọtụtụ puku afọ gara aga. Mmụọ Chineke nwekwara ike inye gị amamihe ị ga-eji na-eme ihe ndị dị mkpa e kwuru na Baịbụl ná ndụ gị.—Ndị Hibru 4:12; Jems 1:5, 6.

Ya mere, mgbe ọ bụla ị nọdụrụ ala ịgụ Baịbụl, kpekuo Chineke ekpere, rịọ ya ka o nye gị mmụọ nsọ iji nyere gị aka ịghọta Okwu ya.