Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

3. Nabata Enyemaka Ndị Ọzọ

3. Nabata Enyemaka Ndị Ọzọ

Otú I Nwere Ike Isi Ghọta Baịbụl

3. Nabata Enyemaka Ndị Ọzọ

Mgbe onye na-eme nchọpụta, bụ́ Edward John Eyre, ji ụkwụ na-agafe Ọzara Nullarbor, ndị nwe obodo ahụ kụziiri Eyre otú e si enweta mmiri n’ikpo ájá nakwa n’osisi na-etokarị n’ọzara bụ́ eucalyptus. Ihe mechara zọọ Eyre ndụ bụ na ọ nabatara enyemaka nke ndị ma ala ahụ.

DỊ KA ihe atụ a na-egosi, ihe na-emekarị ka mmadụ nwee ike ịrụcha ọrụ tara akpụ ma rụọ ya nke ọma bụ inweta enyemaka nke onye ka ya mara ọrụ ahụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị mgbe mmadụ malitere ịgụ Baịbụl.

Jizọs atụghị anya ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta Baịbụl n’onwe ha n’enwetaghị enyemaka ndị ọzọ. Otu mgbe, “o mepere obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.” (Luk 24:45) Jizọs maara na enyemaka dị ndị na-agụ Baịbụl mkpa iji ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi.

Enyemaka Ole Ndị?

Jizọs nyere ezi ndị na-eso ụzọ ya ọrụ inyere ndị ọzọ aka ịghọta Baịbụl. Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, o nyere iwu, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ọrụ bụ́ isi Ndị Kraịst na-arụ bụ izi ihe. Ịkọwara ndị mmadụ otú ha nwere ike isi gbasoo ụkpụrụ Baịbụl ná ndụ ha kwa ụbọchị so n’ọrụ a. Ezi Ndị Kraịst na-enyere ndị ọzọ aka ịghọta Baịbụl.

Obere oge Jizọs nyechara ndị na-eso ụzọ ya ọrụ a, otu ihe dị ịrịba ama mere. Baịbụl kwuru na otu onye Itiopia nke na-arụ n’obí eze nọ na-agụ amụma Aịzaya. Ọ gụrụ otu ebe ọ na-aghọtaghị. Baịbụl sịrị na amaokwu ndị ahụ gbagwojuru ya anya kwuru, sị: “Dị ka atụrụ, a kpụtara ya n’ebe a ga-egbu ya, dịkwa ka nwa atụrụ na-adịghị ekwu okwu n’ihu onye na-akpacha ya ajị, otú ahụ ka ọ na-adịghị emepe ọnụ ya. N’oge e wedara ya ala, e wepụrụ ezi ikpe n’ebe ọ nọ. Ònye ga-akọ n’ụzọ zuru ezu banyere ọgbọ ya? N’ihi na e wepụwo ndụ ya n’ụwa.”—Ọrụ 8:32, 33; Aịzaya 53:7, 8.

Nwoke ahụ jụrụ Filip, bụ́ Onye Kraịst maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, sị: “Ọ̀ bụ onye ka onye amụma a na-ekwu ihe a banyere ya? Ọ̀ bụ banyere onwe ya ka ọ̀ bụ banyere onye ọzọ?” (Ọrụ 8:34) Onye Itiopia ahụ nke nwere ezi obi si Jeruselem na-alọta bụ́ ebe ọ gara kpọọrọ Chineke isiala, ọ ga-abụkwa na o kpere ekpere ka Chineke duzie ya. O dokwara anya na o ji ịnụ ọkụ n’obi na obi umeala na-agụ amụma ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ghọtaghị ebe ahụ ọ na-agụ. O ji obi umeala gwa Filip ka o nyere ya aka. Ihe Filip kọwaara nwoke ahụ mere ya obi ụtọ nke na ọ kpaliri ya ịghọ Onye Kraịst.—Ọrụ 8:35-39.

Ndịàmà Jehova ka na-arụ ọrụ ahụ Filip na Ndị Kraịst oge gboo ndị ọzọ rụrụ. Ndịàmà wepụtara onwe ha na-enyere ndị ọzọ aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi n’ezie n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ na ise. Otú ha si eme nke a bụ ịkụziri ndị mmadụ Akwụkwọ Nsọ n’isiokwu n’isiokwu. Ọmụmụ Baịbụl a a na-eji nwayọọ nwayọọ amụ na-eleba anya nke ọma n’ihe Baịbụl kwuru banyere isiokwu nke ọ bụla. *—Gụọ igbe bụ́  “Ajụjụ Baịbụl Ndị A Zara nke Ọma.”

‘A Zara Ajụjụ M Niile’

Ndịàmà Jehova malitere ịkụziri Steven, Valvanera, na Jo-Anne, bụ́ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu mbụ na magazin a, Baịbụl. Steven kwuru, sị: “Ọ tụrụ m n’anya na naanị iji otu ụkpụrụ dị n’Akwụkwọ Nsọ tụnyere ụkpụrụ ndị ọzọ dị n’Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ iji otu ihe e kwuru na ya tụnyere ihe ndị ọzọ e kwuru na ya na-emekarị ka mmadụ ghọta ihe na-agbagwoju ya anya. Tupu mụ na Ndịàmà Jehova amalite ịmụ Baịbụl, ọ dịghị onye kụziiri m otú e si eme nke a. Ahụ́ ruru m nnọọ ala mgbe m matara na ịmụ Baịbụl abụghị ịrụrịta ụka na-abaghị uru na onye ọ bụla ikwuwe echiche nke ya.”

Valvanera kwetara na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ihe niile ha kụziiri m doro m nnọọ anya. Ihe mere ha ji bụrụ eziokwu abụghị n’ihi na ‘Chọọchị’ sịrị na ha bụ eziokwu, kama ọ bụ n’ihi na a kọwaruru ihe niile ala.” Jo-Anne kọrọ, sị: “Otú e si jiri Baịbụl zaa m ajụjụ m niile mere ka m sọpụrụ Onye chepụtara Baịbụl maka otú o si buru ụzọ mee ka e dee ihe ndị ga-aza ajụjụ niile ụmụ mmadụ nwere ike ịjụ.”

Ọ̀ dị Onyeàmà Jehova ị maara? Ọ́ gaghị adị mma ka ị gwa ya ka o gosi gị otú e si enwe ọmụmụ Baịbụl a? Ọ bụrụ na ọ dịghị Onyeàmà Jehova ị maara, biko, jiri otu n’ime adres ndị e depụtara na peeji nke 4 na magazin a detara anyị akwụkwọ ozi. Ọ bụrụ na i nweta mmụọ nsọ nke Chineke, ghara ibu echiche na-ezighị ezi n’obi mgbe ị na-agụ Baịbụl ma kwe ka onye maara otú e si akụzi Baịbụl nyere gị aka, ịghọta Okwu Chineke agaghị esiri gị ike. I nwere nnọọ ike ịghọta Baịbụl!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Otu akwụkwọ nyeerela ọtụtụ ndị aka ịmụ Akwụkwọ Nsọ n’isiokwu n’isiokwu bụ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

 Ajụjụ Baịbụl Ndị A Zara nke Ọma

Ụfọdụ isiokwu Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị ọzọ mgbe ha na ha na-amụ Baịbụl:

• Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?

• Ebee ka ndị nwụrụ anwụ gara?

• Ànyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ”?

• N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị?

• Olee otú m nwere ike isi mee ka ezinụlọ m nwee obi ụtọ?

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọta Baịbụl . . . rịọ Chineke n’ekpere ka o nye gị mmụọ ya, ebula echiche na-ezighị ezi n’obi mgbe ị na-agụ ya, nabata enyemaka ndị ọzọ