Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Ò Nwere Ike Iru Gị Ala n’Ụwa A Nsogbu Juru?

Obi Ò Nwere Ike Iru Gị Ala n’Ụwa A Nsogbu Juru?

Obi Ò Nwere Ike Iru Gị Ala n’Ụwa A Nsogbu Juru?

UDO ọ̀ dị n’ebe i bi? Ihe ọtụtụ ndị ga-aza bụ mbanụ. Ha bi n’ebe agha, ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, otu agbụrụ imeso agbụrụ ibe ya ihe ike ma ọ bụ iyi ọha egwu na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ. Ọ bụrụgodị na ụdị ihe ọjọọ ndị ahụ anaghị eme n’ebe i bi, ime mpụ, mmadụ ịmaja mmadụ ibe ya, na esemokwu ndị na-azụkọ ahịa ma ọ bụ ndị agbata obi na-enwe nwere ike ime ka obi koro gị n’elu. Ihe e jikwa mara ọtụtụ ezinụlọ bụ ọgụ na mgba, kama ịbụ udo.

Ọtụtụ ndị na-achọsi obi iru ala ike. Ha nwere ike ịchọ ya n’okpukpe, ná nzukọ ọmụmụ ihe ndị na-akụzi otú e si atụgharị uche, ma ọ bụ ná mmega ahụ́ yoga. Ndị ọzọ nwere olileanya ịchọta ya n’ihe e kere eke, jiri oge ezumike ha na-eme njem, na-aga n’ugwu, n’ala ịkpa ma ọ bụ n’iyi ndị na-asọpụta mmiri ọkụ. Ọ bụrụgodị na o yie ka obi ò rutụla ha ala, ha nwere ike ịchọpụta n’oge na-adịghị anya na obi erubeghị ha ala n’ezie nakwa na obi iru ala ahụ ha nwetụrụ agaghị adịte aka.

N’ihi ya, olee ebe ị ga-achọta ezigbo udo? Udo na-esi n’aka Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke, abịa. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ ya bụ “Chineke onye na-enye udo.” (Ndị Rom 15:33) Mgbe Alaeze ya nke ga-abịa n’oge na-adịghị anya ga-amalite ịchị ụwa, ‘udo ga-adị ebe niile.’ (Abụ Ọma 72:7; Matiu 6:9, 10) Nke a abụtụdịghị udo a na-enwe ma e nwee nkwekọrịta udo elu ọnụ. Ọtụtụ mgbe, ihe ụdị nkwekọrịta udo ahụ na-eme bụ naanị ime ka a kwụsị agha obere oge. Ma, udo nke Chineke ga-ewepụ ihe niile na-akpata agha na esemokwu. N’eziokwu, o nweghị onye ga-amụkwa otú e si alụ agha. (Abụ Ọma 46:8, 9) Ezi udo ga-eruzi mmadụ niile aka!

N’agbanyeghị otú olileanya a si magbuo onwe ya, o nwere ike ịbụ na ọ na-agụsi gị agụụ ike ka obi rutụ gị ala ugbu a. Ò nwere otú obi ga-esi ruo gị ala n’oge anyị a nsogbu juru ebe niile? Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na Baịbụl gwara anyị ya. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka, bụ́ ndị dị n’isi nke 4 nke akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Filipaị. Anyị na-agba gị ume ka ị gụọ amaokwu nke 4 ruo nke 13 na Baịbụl gị.

“Udo nke Chineke”

Amaokwu nke 7 kwuru, sị: “Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” Ọ bụghị naanị anyị ịtụgharị uche ma ọ bụ ịkpagharị àgwà ga-eme ka anyị nweta udo a. Kama, ọ na-esi n’aka Chineke abịa. Udo a na-akpa ike nke na ọ “karịrị echiche niile.” N’ezie, ọ karịrị nchegbu, ihe ọmụma, na echiche niile anyị. O nwere ike ịbụ na nsogbu zuru anyị ahụ́ ugbu a, ma udo nke Chineke ga-eme ka anyị nwee ezigbo olileanya na otu ụbọchị nsogbu niile anyị ga-ebi.

Ọ̀ dị gị ka ihe na-agaghị eme eme? O nwere ike ịdị otú ahụ n’ebe ụmụ mmadụ nọ; ma “ihe niile kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:27) Inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ na ịtụkwasị ya obi ga-enyere anyị aka ịghara ichegbu onwe anyị gabiga ókè. Chegodị echiche banyere nwatakịrị furu ụzọ ná nnukwu ụlọ ahịa. O doro ya anya na ọ chọtahaala mama ya, o nwekwaghị nsogbu. Anyị nwere ike inwe ntụkwasị obi na otú ahụ mama nwata ahụ ga-esi ekuru ya ma ọ chọta ya, e nwere ike ikwu na ọ bụ otú ahụ ka Chineke ga-esi ekuru anyị. Ọ ga-agụgụ anyị ma mechaa mee ka nchegbu anyị niile kwụsị.

Udo nke Chineke emeela ka obi ruo ọtụtụ ndị na-efe Jehova ala mgbe ọnwụnwa dị oké njọ bịaara ha. Weregodị ihe mere Nadine, bụ́ onye ime pụrụ, dị ka ihe atụ. Ọ kọrọ, sị: “Ọ na-esiri m ike ịgwa mmadụ otú obi dị m, m na-agbalịkwa mgbe niile ime ka ọ̀ bụ na mụ enweghị nsogbu. Ma, obi agbawaala m agbawaa. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na m na-agwa Jehova otú obi dị m n’ekpere kwa ụbọchị, na-arịọ ya ka o nyere m aka. Ahụla m na ekpere na-enye ezigbo aka, n’ihi na mgbe ọ bụla obi dara m mbà, mụ echeekwa na agaghị m edilizi ya, obi na-ada m jụụ. Ahụ́ na-eru m nnọọ ala.”

Ihe Ga-echekwa Obi Gị na Uche Gị

Ka anyị gaghachi ná Ndị Filipaị 4:7. Ebe ahụ kwuru na Chineke ga-eche obi anyị na ike iche echiche anyị nche. Otú ahụ onye nche si eche ebe e kenyere ya ọrụ nche, ọ bụ otú ahụ ka udo nke Chineke na-eche obi anyị nche ka ịhụ ego n’anya, nchegbu na-enweghị isi, na ọchịchọ na-ezighị ezi ghara imegharị anyị anya. Ka anyị leba anya n’otu ihe atụ.

Ọtụtụ ndị bi n’ụwa a nsogbu juru kweere na ọ bụ inwe ezigbo ego ga-eme ka ha nwee obi ụtọ na obi iru ala. N’ihi ndụmọdụ ndị ọkachamara nyere ha, ha nwere ike iji ụfọdụ ego ha dowere zụọ aka òkè. Nke a ọ̀ na-emezi ka obi ruo ha ala? Ọ naghị adịkarị otú ahụ. Kwa ụbọchị ha nwere ike na-ele ọnụ ahịa aka òkè, na-echegbu onwe ha ma ọ̀ bụ ha ree aka òkè ha, zụọ nke ọhụrụ, ka ọ̀ bụ hapụgodị nke ha zụrụla azụ. Ọ bụrụ na ọnụ ahịa aka òkè adaa, obi nwere ike ikoro ha n’elu. N’ezie, Baịbụl akatọghị mmadụ iji ego ya achụ ego, kama o kwuru eziokwu doro anya, sị: “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ. Nke a kwa bụ ihe efu. Ụra onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe ukwu ka o riri; ma ọtụtụ ihe onye ọgaranya nwere adịghị ekwe ya ka ọ rahụ ụra.”—Ekliziastis 5:10, 12.

Ihe ikpeazụ Ndị Filipaị 4:7 kwuru bụ na udo nke Chineke ga-eche obi anyị na ike iche echiche anyị nche “site n’aka Kraịst Jizọs.” Olee ihe jikọtara Kraịst Jizọs na udo nke Chineke? Jizọs na-arụ ọrụ dị ezigbo mkpa n’imezu nzube Chineke. Jizọs nyere ndụ ya ka e wee napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. (Jọn 3:16) Ọ bụkwa ya ka e mere Eze nke Alaeze Chineke. Ịmara ihe bụ́ ọrụ Jizọs nwere ike ime ka obi ruo anyị nnọọ ala. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu?

Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum chegharịa ná mmehie anyị ma rịọ mgbaghara n’ihi okwukwe anyị nwere n’àjà Jizọs, Chineke ga-agbaghara anyị, bụ́ nke ga-eso mee ka obi ruo anyị ala. (Ọrụ 3:19) Ọ bụrụ na anyị aghọta na ihe niile agaghị adịchara anyị mma ruo mgbe Alaeze Kraịst bịara, anyị ga-ezere ibi ndụ ugbu a ka ọ̀ bụ na e nwekwaghị ndụ ọzọ dịnụ. (1 Timoti 6:19) Ọ bụ ezie na anyị ka ga na-enwe nsogbu, ma olileanya doro anya anyị nwere na ndụ kacha mma ka na-abịa ga-akasi anyị obi.

Otú Ị Ga-esi Chọta Udo nke Chineke

Ya mere, olee otú ị ga-esi chọta udo nke Chineke? A gwatụrụ anyị nke a ná Ndị Filipaị 4:4, 5, bụ́ ebe na-agụ, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị. Aga m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ! Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche. Onyenwe anyị nọ nso.” Mgbe Pọl dere okwu ndị ahụ, a tụrụ ya mkpọrọ na Rom, ọ bụ ezie na aka ya dị ọcha. (Ndị Filipaị 1:13) Kama ịkwawa arịrị otú e si na-emejọ ya, ọ gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha na-aṅụrị ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị. O doro anya na ihe nyere ya ọṅụ abụghị otú ụwa dịịrị ya, kama ọ bụ na ya na Chineke dị ná mma. Anyị kwesịkwara ịmụta inwe ọṅụ n’ozi anyị na-ejere Chineke n’agbanyeghị otú ụwa dịịrị anyị. Ka anyị na-amatakwu Jehova ma na-agbalịkwu ime uche ya, ọ bụ otú ahụ ka ijere ya ozi ga na-atọkwu anyị ụtọ. Nke a ga-emekwa ka obi na-atọ anyị ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala.

A gbakwara anyị ume ka anyị nwee ezi uche. Ọ bụrụ na anyị amụta inwe ezi uche, anyị agaghị na-atụ anya ime ihe anyị na-agaghị emeli. Anyị maara na anyị ezughị okè; anyị enweghị ike ịbụ ọkaibe n’ihe niile. Ya mere, gịnị mere anyị ga-eji chegbuwe onwe anyị banyere otú anyị ga-esi zuo okè ma ọ bụkwanụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ka mmadụ niile mma? Anyị ekwesịghịkwa ịtụ anya ka ndị ọzọ zuo okè. Ya mere, anyị nwere ike ijide onwe anyị mgbe ha mejọrọ anyị. Otú ọzọ e sị sụgharịa okwu Grik ahụ a sụgharịrị ‘inwe ezi uche’ bụ ‘ikwenye ekwenye.’ Ọ bụrụ na anyị na-ekwenye ekwenye mgbe ihe na-amasịghị anyị masịrị ndị ọzọ, anyị ga na-ezere esemokwu na-anaghị abacha uru, bụ́ nke nwere ike imebi adịm ná mma anyị na ndị ọzọ ma mee ka obi ghara iru anyị ala ruo oge ụfọdụ.

O nwere ike iyi ka ihe ọzọ e kwuru ná Ndị Filipaị 4:5, bụ́ “Onyenwe anyị nọ nso,” adabaghị n’ihe a na-ekwu. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-abịa iwepụ ọchịchị ọjọọ ndị dị ugbu a ma were nke ọhụrụ dochie ya mgbe Alaeze ya ga-amalite ịchị. Ma, ọbụna ugbu a, o nwere ike ịnọ onye ọ bụla na-abịaru ya nso nso. (Ọrụ 17:27; Jems 4:8) Anyị ịmara na ọ nọ anyị nso na-enyere anyị aka ịṅụrị ọṅụ, inwe ezi uche, na ịghara ichegbuwe onwe anyị maka nsogbu ndị dị ugbu a ma ọ bụ ndị nwere ike ịdapụta n’ọdịnihu, dị ka amaokwu nke 6 gosiri.

Ọ bụrụ na anyị elee anya n’amaokwu nke 6 na nke 7, anyị ga-ahụ na ọ bụ ekpere na-eme ka anyị nweta udo nke Chineke. Ụfọdụ ndị chere na ekpere bụ naanị ịtụgharị uche, cheekwa na ụdị ekpere ọ bụla nwere ike ime ka obi rukwuo ha ala. Ma, Baịbụl kwuru na ekpere bụ mmadụ ịgwa Jehova okwu, isi n’ala ala obi ya na-agwa ya okwu, dị ka ebe nwata na-akọrọ nna ya hụrụ ya n’anya ihe na-eme ya obi ụtọ na ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Ọ bụ nnọọ ihe na-akụjụ obi ịmara na anyị nwere ike ịkọrọ Chineke ‘ihe niile.’ Anyị nwere ike ịkọrọ Nna anyị nke eluigwe ihe ọ bụla dị anyị n’obi ma ọ bụ ihe nzuzo ọ bụla.

Amaokwu nke 8 gbara anyị ume iche naanị ihe ziri ezi. Ma, naanị iche ihe ziri ezi ezughị. Amaokwu nke 9 kwuru na anyị aghaghịkwa ịna-eme ihe Baịbụl kwuru eme. Ime nke a ga-eme ka anyị nwee akọ na uche dị ọcha. Ilu a bụ nnọọ eziokwu: Onye nwere ezi akọ na uche na-ehi ezigbo ụra!

N’ezie, obi nwere ike iru gị ala. Obi iru ala na-esi n’aka Jehova Chineke abịa, bụ́ onye na-enye ya ndị na-abịaru ya nso na ndị chọrọ iso nduzi ya. Ọ bụrụ na ị mụọ Okwu ya, bụ́ Baịbụl, ị ga-amata echiche ya. Iso ntụziaka ya anaghị adịcha mfe. Ma, mbọ niile ị gbara iji soro ya agaghị aghọ gị ahịa n’ihi na ‘Chineke nke udo ga-anọnyere gị.’—Ndị Filipaị 4:9.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

“Udo nke Chineke . . . ga-eche obi unu . . . nche.”​—NDỊ FILIPAỊ 4:7

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Ọ bụ nnọọ ihe na-akụjụ obi ịmara na anyị nwere ike ịkọrọ Chineke ‘ihe niile’